Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/1 p. 32
  • “Ònye Tinyeworo Amamihe n’Igwe Ojii”?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ònye Tinyeworo Amamihe n’Igwe Ojii”?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/1 p. 32

“Ònye Tinyeworo Amamihe n’Igwe Ojii”?

“MGBE ọ bụla unu hụrụ igwe ojii ka o si n’Ọdịda anyanwụ na-arịgo, ngwa ngwa unu na-asị, Nsha nsha mmiri na-abịa; ọ wee mee otú a. Mgbe ọ bụla unu hụkwara ifufe Ndịda ka ọ na-efe, unu na-asị, Ifufe dị ọkụ ga-adị; ọ wee mee.” Okwu ndị a nke Jisọs, bụ́ nke onye ahụ so dee Oziọma bụ́ Luk dere, bụ ihe atụ nke ịkọ ihe ọnọdụ ihu igwe ga-abụ dị ka e mere ha na Palestine oge ochie. (Luk 12:54, 55) N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị mgbe ochie pụrụ ịgụ ihe àmà, buokwa amụma ziri ezi ndị na-ewe oge dị nta.

Taa, ndị ọkà mmụta ihu igwe na-eji ngwá ọrụ ndị bụ ọkpọka, dị ka ígwè ọrụ satellite ndị na-agba ụwa gburugburu, ígwè ọrụ Doppler radar, na kọmputa ndị dị ike, atụ usoro ihu igwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ ruo oge ka ogologo. Ma amụma ha na-abụkarị nke na-ezighị ezi. N’ihi gịnị?

Ọtụtụ ihe na-eme ka ịkọta ihe ọnọdụ ihu igwe ga-abụ sie ike. Dị ka ihe atụ, mgbanwe ndị a na-atụghị anya ha nke ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ, ikuku mmiri, ọ̀tụ̀tụ̀ ifufe, na ife ọsọ nke ikuku na ebe ọ ga-eche ihu, pụrụ ime ka ihe sikwuo ike. Tinyekwuo ná ndị a bụ mmekọrịta dị mgbagwoju anya nke anyanwụ, igwe ojii, na oké osimiri, bụ́ nke ndị ọkà mmụta sayensị na-aghọtachabeghị. N’ihi nke ahụ, ịkọ ihe ọnọdụ ihu igwe ga-abụ anọgidewo na-abụ sayensị na-ezichaghị ezi.

Ọmụma dị nta nke mmadụ maara ihu igwe na-echetara anyị ajụjụ ndị ahụ a jụrụ Job: “Ònye mụworo mkpụrụ igirigi? N’afọ ònye ka ice na-esi pụta? . . . Ị̀ na-eweli olu gị elu ruo igwe ojii, ka njubiga mmiri wee kpuchie gị?. . . Ònye tinyeworo amamihe [n’igwe ojii NW]? Ma ọ bụ ònye nyeworo akọ na uche nghọta? Ònye na-agụ mbara igwe ọnụ site n’amamihe? Ma ọ bụ ònye na-atọgbọ karama akpụkpọ nile nke eluigwe ịgbapụ mmiri ha?”—Job 38:28-37.

Azịza nye ajụjụ a nile bụ, Ọ bụghị mmadụ kama ọ bụ Jehova Chineke. Ee, n’agbanyeghị ókè ọ pụrụ iyi ka ụmụ mmadụ ha maruru n’ihe, amamihe nke Onye Okike anyị ka elu nke ukwuu. Ọ bụ n’ezie ihe ịhụnanya n’ebe ọ nọ na o mewo ka anyị hụ amamihe ya n’ime Bible, ka anyị wee nwee ike mee ka ụzọ anyị gaa nke ọma.—Ilu 5:1, 2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya