-
Olee Otú Anyị Ga-esi Dịrị Ọcha Otú Chineke Chọrọ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
2. Anyị chọọ ịna-adị ọcha, olee àgwà ndị anyị na-agaghị na-akpa?
Baịbụl gwara anyị “ka anyị sachapụ ihe niile na-emerụ ahụ́ anyị na obi anyị.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị ghara ime ihe ọ bụla nwere ike imebi ahụ́ anyị ma ọ bụ obi anyị. Ihe anyị na-eche kwesịrị ịbụ ihe dị Jehova mma. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji gbasie mbọ ike ka anyị ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma. (Abụ Ọma 104:34) Anyị ekwesịghịkwa ịna-ekwu okwu rụrụ arụ.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:8.
Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị ghara ịdị ọcha n’ahụ́ ma ọ bụ mee ka otú anyị si eche echiche, otú anyị si ekwu okwu na omume anyị ghara ịdị ọcha? E nwere ihe ụfọdụ nwere ike imerụ ahụ́ anyị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-akpọ ụtaba, ịna-aṅụ sịga, ịna-ata akị osisi bitel ma ọ bụ ahịhịa koka, ma ọ bụkwanụ ịna-aṅụ ọgwụ ike. Anyị kwesịrị izere ha na ihe ndị yiri ha. Anyị hapụ ime ihe ndị a, anyị agaghị na-arịa ọrịa ndị ha na-akpata, anyị na-egosikwa na anyị ji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe. Otú anyị ga-esikwa eme ka omume anyị dị ọcha bụ ịgba mbọ ghara ime omume abụọ na-adịghị ọcha, ya bụ, igbo onwe anyị agụụ mmekọahụ na ile ndị gba ọtọ. (Abụ Ọma 119:37; Ndị Efesọs 5:5) Ịkwụsị àgwà ndị a adịchaghị mfe, ma Jehova ga-enyere anyị aka ịkwụsị ha.—Gụọ Aịzaya 41:13.
-
-
Olee Otú Anyị Ga-esi Dịrị Ọcha Otú Chineke Chọrọ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
5. Na-agba mbọ ka ị ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma ma ọ bụ na-akpa àgwà ọjọọ
Gụọnụ Ndị Kọlọsi 3:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị si mara na ile ndị gba ọtọ, iji ekwentị ezigara mmadụ ozi iberiibe, na mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ adịghị Jehova mma?
Ì chere na anyị ga-akwụsịli ịkpa àgwà dị iche iche Jehova chọrọ ka anyị ghara ịna-akpa? Maka gịnị?
Chọpụta ihe mmadụ nwere ike ime ka ọ kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma. Kpọnyenụ VIDIO a.
O nwere ihe atụ Jizọs mere iji gosi na e nwere ihe anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị ghara ime ihe ọjọọ. Gụọnụ Matiu 5:29, 30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ bụ eziokwu na Jizọs anaghị ekwu na anyị kwesịrị imerụ onwe anyị ahụ́, ma ihe o kwuru gosiri na e nwere ihe anyị kwesịrị ime. Olee ụfọdụ ihe mmadụ nwere ike ime ga-enyere ya aka ka ọ kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma?b
Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma, Jehova na-ahụ mbọ ị na-agba. Gụọnụ Abụ Ọma 103:13, 14. Unu gụcha ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ bụrụ na e nwere àgwà ọjọọ ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịkpa, olee otú amaokwu ndị a si agba gị ume ka ị ghara ịkwụsị mbọ a ị na-agba?
Otu ugboro i mere ihe ahụ ọzọ apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ime ya
I nwere ike ịna-eche, sị ‘Ebe ọ bụ na m mere ihe a ọzọ, ịgbawa mbọ ka m kwụsị ya abaghịzi uru.’ Ma chegodị ihe a: Ọ bụrụ na onye na-agba ọsọ azọhie ụkwụ ma daa, ọ pụtaghị na e nweghịzi ihe ọ ga-agbata n’ọsọ ahụ ma ọ bụkwanụ na ọ ga-agazi malite n’isi. Ọ bụ otú ahụ ka ime ihe ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ime na-apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ime ihe ahụ. Ọ pụtaghịkwa na mbọ niile ị gbara efuola ọhịa. Imejọ ihe na ịgba mbọ na-agakọ. Onye ọ bụla na-agba mbọ ka ọ kwụsị ime ihe na-adịghị mma ga-enwerịrị mgbe ọ ga-eme ihe ahụ na-adịghị mma. N’ihi ya, adala mbà. Jehova ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ime ihe ahụ na-adịghị mma.
-