Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 8/15 p. 32
  • “Ònye Mụworo Mkpụrụ Igirigi?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ònye Mụworo Mkpụrụ Igirigi?”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 8/15 p. 32

“Ònye Mụworo Mkpụrụ Igirigi?”

OTU odeakụkọ nke narị afọ nke 19 kọwara igirigi dị ka “ọla dị mmiri mmiri nke ụwa, nke ikuku kpụrụ.” Onye Okike anyị jụrụ nna ochie ahụ bụ́ Job, sị: “Ònye mụworo mkpụrụ igirigi?” (Job 38:28) Chineke na-echetara Job na igirigi ahụ dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka ya.

E wezụga mgbukepụ ya, ịma mma ya dị ka ọla, n’ime Bible e jikọrọ igirigi na ngozi, ala iru ihe, ụba na nchebe nke ndụ. (Jenesis 27:28; Deuterọnọmi 33:13, 28; Zekaraịa 8:12) N’oge okpomọkụ nke mmiri na-adịghị ezo n’Israel, “igirigi Heamọn” chebere ihe ọkụkụ nke ala ahụ, wee si otú a chebe ndị ya. Elu Ugwu Heamọn nke oké ọhịa na snow kpuchiri ka na-ewepụta alụlụ abalị nke na-abịakọta ọnụ ịghọ igirigi hiri nne. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid jiri ume ọhụrụ nke igirigi a wetara tụnyere ahụmahụ dị ụtọ nke mmadụ isoro ndị na-efe Jehova ibe ya bikọọ.—Abụ Ọma 133:3.

Ntụziaka onye amụma bụ́ Mosis nyere Israel dị nro, na-enyekwa ume ọhụrụ, dị ka igirigi. O kwuru, sị: “Okwu ọnụ m ga na-erupụta dị ka igirigi; dị ka nshansha mmiri n’elu ahịhịa ndụ, dịkwa ka oké mmiri ozuzo n’elu ihe ọkụkụ.” (Deuterọnọmi 32:2) Taa, Ndịàmà Jehova na-akpọsa ozi ọma na-enye ndụ banyere Alaeze Chineke ruo ebe ụwa sọtụrụ. (Matiu 24:14) Chineke na-akpọ òkù ahụ, bụ́: “Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Ọtụtụ nde ndị mmadụ nke mba nile na-anara onyinye nke ume ọhụrụ ime mmụọ a sitere n’aka Chineke, nke pụrụ ịkwado ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya