Isi 18
Iguzosi Ike n’Ihe nye Nzukọ Chineke A Na-ahụ Anya Taa
1, 2. Olee otú a ga-esi ghọta akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ dị n’Abụ Ọma 50:5?
N’ABỤ ỌMA 16:10 (NW) e dere, sị: “Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Sheol. Ị gaghị ekwe ka onye gị nke na-eguzosi ike n’ihe hụ olulu.” N’Abụ Ọma 50:5 kwa e dere, sị: “Chịkọtaranụ m ndị ebere m [“ndị m na-eguzosi ike n’ihe,” NW]; bụ́ ndị mụ na ha gbara ndụ n’elu àjà.” Ọ̀ bụ ndị ahụ ha na Jehova gbara ọgbụgba ndụ nyere ihe ịchụ “àjà” ahụ? Ee e, ndị a na-eguzosi ike n’ihe adịghị achụ “àjà” nke onwe ha n’otu n’otu, na-enyefe anụ ahụ ha iji wee mee ka ha na Chineke kwekọọ.
2 Mgbe ahụ, olee otú e si gbaa ọgbụgba ndụ ahụ? N’elu “àjà” nke ‘onye ahụ na-eguzosi ike n’ihe’ nke a na-ahapụghị mkpụrụ obi ya n’ime Sheol, kama nke ahụ, a kpọlitere ya site ná ndị nwụrụ anwụ. Pita onyeozi jiri okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 16:10 mee ihe n’ebe Jisọs Kraịst nọ ma gaa n’ihu ikwu, sị: “Ebe [Devid] buru ụzọ hụ nke a o kwuru okwu banyere mbilite n’ọnwụ nke Kraịst ahụ, na a hapụghị ya n’ime Hedis, anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.”—Ọrụ 2:25, 27, 31, 32.
3. Olee ndị bụ ndị a chịkọtara dị ka iwu ahụ si dị, bụ́ nke dị n’Abụ Ọma 50:5, n’ihi gịnịkwa ka ha kwesịrị ịbụ ndị a kpaliri iguzosi ike n’ihe nye Chineke?
3 Jisọs nke a e mere ka o si n’ọnwụ bilie bụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ọ bụkwa ná ndabere nke àjà ya ka e mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị iré. (Ndị Hibru 9:15, 17) Ya mere, olee ndị bụ ndị a ga-achịkọta dị ka iwu ahụ e nyere si dị, bụ́ nke dị n’Abụ Ọma 50:5? Ha bụ ndị na-eso Jisọs nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ihi àjà ya. N’ihi ekele ha nye Jehova maka àjà nke a na-enweghị atụ, ha kwesịrị ịbụ ndị a kpaliri iguzosi ike n’ihe nye ya.
4, 5. (a) Ihe ịga nke ọma dị aṅaa ka Setan bụ Ekwensu nwere n’oge Agha Ụwa Mbụ ná mgbalị ya ibibi nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova? (b) Olee ebe e bugara isi ụlọ ọrụ Society, n’ihi gịnịkwa? (ch) N’ihe ya na Abụ Ọma 137:1 yiri n’oge a, gịnị bụ ọnọdụ uche nke ihe fọdụrụ ahụ na-eguzosi ike n’ihe mgbe ha tụlere ọnọdụ arụghị ọrụ nke nzukọ Chineke?
4 Mgbe e guzobere Alaeze Jehova n’eluigwe na 1914, mba nile were iwe wee megide Alaeze ahụ site n’ịbanye n’Agha Ụwa Mbụ, Chineke kwekwara ka nke a mee. (Abụ Ọma 2:1, 2) Setan bụ Ekwensu gbalịrị iji nsogbu ụwa ahụ mee ihe ibibi akụkụ a na-ahụ anya nke nzukọ Jehova. O nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka a tụọ onyeisi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta, Georgia. A tụkọkwara ya na ndị nnọchianya asaa ndị ọzọ nke Society mkpọrọ.
5 N’ihi mkpagbu, e buuru isi ụlọ ọrụ Society dị na Brooklyn, New York, gaa n’ụlọ a na-akwụ ụgwọ maka ya na Pittsburgh, Pennsylvania. E mere nke a iji nọgide na-ebipụta magazin Ụlọ Nche. A tụrụ anya na n’oge na-adịghị anya a ga-eme ka ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwee ihe ebube nke ije eluigwe. Ma ndị ahụ nke ihe fọdụrụ ahụ kwara ákwá ka ha na-atụle ọnọdụ mmegbu na nke arụghị ọrụ nke nzukọ Jehova nọ na ya.—Abụ Ọma 137:1.
Iguzosi Ike n’Ihe n’Oge Mkpọrọ
6-8. N’oge mkpọrọ ya, olee otú onyeisi oche Society, bụ́ J. F. Rutherford, si gosipụta iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova?
6 N’igosipụta nguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova n’oge ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, onyeisi oche nke Watch Tower Society, bụ́ J. F. Rutherford, na December 25, 1918, degaara J. A. Bohnet akwụkwọ, bụ́ ohu ibe ya nke Jehova, onye a tụkwasịrị obi. E degaara ya akwụkwọ ozi ahụ n’ụlọ ọrụ Society dị na Pittsburgh. Rutherford dere ihe na-esonụ:
7 “N’ihi na m jụrụ ikwenyere Babilọn, kama jiri ikwesị ntụkwasị obi gbalịa ijere Onyenwe m ozi, anọ m n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ nke m nwere obi ekele n’ihi ya. . . . M ga-ahọrọ n’ụzọ dị ukwuu nnwapụta na ịmụmụ ọnụ ọchị Ya ma nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, kama ikwenyere ma ọ bụ ịnakwere Anụ Ọhịa ahụ ma nwere onwe m, nweekwa otuto nke ụwa dum. Ọ bụ ahụmahụ a gọziri agọzi, na nke dị ụtọ ịta ahụhụ maka ozi e ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Onyenwe anyị. N’ime Alaeze ahụ anyị ga-agụ ịmụmụ ọnụ ọchị nke Nna ahụ n’ihe dị ukwuu karịa ihe nile. Nke a kwesịrị ịbụ ihe kasị elu n’uche nwa ọ bụla nke Chineke. Njikọ ahụ na-agụsi anyị agụụ ike, bụ́ nke ga-eme ka anyị bụrụ Otu n’ebe ahụ. Obi dị m ụtọ, ma ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu nile ọzọ. Mgbakọ na nzukọ kwa afọ na-abịa nso. Ka mmụọ nke Kraịst jupụta obi nke ndị nile ga-abịa . . .
8 “A ka nwere ọtụtụ ihe a ga-eme. Ọ ga-abụ ihu ọma dị ukwuu ikere òkè na ya. Ọ bụ nanị ndị ahụ hụrụ Ya n’anya n’ụzọ kasị ukwuu bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ha ka a ga-asọpụrụ n’ụzọ dị otú ahụ. . . . Tupu ụbọchị obi ụtọ ahụ, a ghaghị ịgba àmà siri ike. . . . Ụdị na ụzọ ime ihe ndị nke oge gara aga agaghị emezu ihe a chọrọ, ma Onyenwe anyị n’ụzọ ọma nke Ya ga-enye ihe a chọrọ. . . . Obi dị m ụtọ na ahụmahụ nke ụlọ mkpọrọ bụ nke e debeere anyị kama ịbụ nke Nwanna Russell. Ọ dịbeghị mgbe m kpọrọ ihe ọjọọ asị ma hụ ezi omume n’anya n’ụzọ zuru ezu otú a ma nwee ezi ọchịchọ nke inyere ndị ọzọ aka. . . . Mmeri nke Zaịọn dị nso.”
Nzukọ Chineke “Isi Ọṅụ” Ha
9. Àgwà dị aṅaa nke onye ọbụ abụ ahụ ka ndị nnọchianya Society ahụ a tụrụ mkpọrọ gosipụtara?
9 Ọ bụ ezie na n’ime ụwa a kpọrọ ndị ohu Jehova aha ọjọọ dị ka ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-agba mba ha mgba okpuru, na ndị na-adịghị ahụ mba ha n’anya, ha ajụghị nzukọ Jehova. Ha jụrụ imebi okwukwe ha n’okpuru nrụgide ahụ. Ha kwere ịtụfu ojiji ha ji aka nri ha eme ihe ma ọ bụ ịda ogbi kama ichefu nzukọ Chineke ma hapụzie ikwere ka ọ bụrụ “isi ọṅụ” ha.—Abụ Ọma 137:5, 6.
10, 11. (a) Gịnị ka ihe fọdụrụ ahụ na-eguzosi ike n’ihe kpere ekpere maka ya, okwu ndị dị aṅaa nke onye ọbụ abụ banyere Edọm ka ha weere? (b) Gịnị ka ndị iro nke nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova nweworo ike ime, gịnịkwa ka ndị iro dị otú ahụ na-atụghị anya ya ma ọlị?
10 Ndị iro Jehova jiri obi ọjọọ ṅụrịa ọṅụ n’ihi omume nke e mere megide ndị nnọchianya elu ala nke nzukọ eluigwe na ala ya. Ma ndị ohu Jehova kpere ekpere ka ụbọchị ịbọ ọbọ ya bịa n’ihi nkọcha nke a a kọchaworo nzukọ ya. Ha weere okwu ndị ahụ nke onye ọbụ abụ ahụ kwuru n’ihe banyere Edọm oge ochie: “Jehova, cheta ụbọchị Jerusalem megide ụmụ Edọm; ndị na-asị, Gbabanụ ya ọtọ, gbabanụ ya ọtọ, ruo ntọala dị n’ime ya.” (Abụ Ọma 137:7; Ndị Galetia 4:26) Aa, ee enụ, Jehova hụrụ nzukọ ya nke yiri nwunye n’anya nke ukwuu nke na ọ gaghị echefu ihe ndị bụ akụkụ nke nzukọ Ekwensu na-ekwu ma na-eme megide ndị nọ na nzukọ ya nke elu ala, bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ihe.
11 N’ile ya anya n’elu n’elu n’oge ahụ, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị otú ahụ, ndị na-akwado Babilọn Ukwu ahụ mere ka nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova ‘gbara ọtọ ruo ntọala dị n’ime ya.’ Ọ dịghị mgbe ha tụrụ anya ịhụ ka o siri n’ájá bilie ịghọ nzukọ zuru ụwa ọnụ nke ọ bụ taa.
Obi Ụtọ nke Onye Ọ́bọ̀ Ya
12. (a) Ònye ghọrọ onye ntọhapụ nke ndị Jehọva a dọtara n’agha na Babilọn oge ochie, Abụ Ọma 137:8, 9 ọ̀ na-ezo aka n’ebe ọ nọ n’ụzọ kasị zuo ezu? (b) Gịnị ka amaokwu ndị a buru n’amụma banyere onye ọ́bọ̀ nke nzukọ elu ala nke Chineke?
12 Jehova jiri Saịrọs onye ọchịchị Peasia mee ihe ịtọhapụ ndị ya site n’ike ụwa oge ochie ahụ bụ Babilọn. Ma n’echiche zuru ezu, ọ bụghị Saịrọs ka e bu n’uche n’okwu mmechi nke Abụ Ọma nke 137, bụ́ nke zoro aka na Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha: “Gị ada Babilọn, nke bụ onye a na-apụnara ihe; onye ihe na-agara nke ọma [“onye obi ụtọ,” NW] ka ọ bụ, bụ́ onye ga-akwụghachi gị mmeso gị nke i mesoworo anyị. Onye ihe na-agara nke ọma [“onye obi ụtọ,” NW] ka ọ bụ, bụ́ onye ga-achịrị ụmụ gị na-aṅụ ara tụpịa ha na nkume dị elu.”—Abụ Ọma 137:8, 9.
13, 14. N’ihi gịnị ka “onye obi ụtọ” nke Abụ Ọma 137:8, 9 na-apụghị izo aka n’ebe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile nke ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ nọ?
13 Ònye ga-abụ “onye obi ụtọ” ahụ? “Onye obi ụtọ” ahụ ọ̀ nọchiri anya “mpì iri” ihe atụ ndị dị n’isi “anụ ọhịa” ahụ, nke usoro okpukpe agadi nwanyị ahụ na-akwa iko ji otuto efu dị otú ahụ na-anọkwasị n’elu ya ruo ogologo oge? Ee e, n’ihi na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-ebibi alaeze ụwa nke okpukpe ụgha agaghị ebibi ya iji meghepụ ụzọ maka ofufe dị ọcha nke ezi Chineke ahụ. Ha agaghị eme ya maka otuto nke Chineke nke Bible. Mgbe ahụ, olee otú ndị dị otú ahụ pụrụ isi n’ezie bụrụ onye “obi ụtọ” ahụ nke onye ọbụ abụ ahụ gosipụtara?
14 Ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile nke ụwa nke a abụghị n’ihi ịhụnanya ha maka ndị na-efe Jehova ka ha ji arụzu ọrụ nke a nke imegide okpukpe. N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị otú a? N’ihi na Ndịàmà Jehova ga-anọchiri ha ụzọ iwepụta ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke ma ọlị. Ya mere ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile bụ nanị ihe ọrụ nke Chineke nke Ndịàmà ahụ ga-eji mee ihe imezu ihe bụ nzube ya.—Mkpughe 17:17.
15. Ònye n’ezie na-akpali ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile, sitekwa n’ònye?
15 Otú a, ọ bụ ezie na a pụrụ iji ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị a mee ihe kpọmkpem n’ikpochapụ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ọ bụ Jehova Chineke n’ezie bụ onye na-akpali ha. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ ga-eji Ọkpara ya bụ eze nke e nyeworo ike, Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, mee ihe. Otú a, Jisọs Kraịst n’ike Alaeze bụ “onye obi ụtọ” ahụ nke onye ọbụ abụ ahụ buru n’amụma!
16. Olee otú Jehova ga-esi bibie “ụmụ” nke Babilọn?
16 Ọ bụ ezie na Jehova ga-echebe ndị ya na-eguzosi ike n’ihe, n’ụzọ ihe atụ, ọ ga-ejide nke ọ bụla n’ime “ụmụ” nke okpukpe nke usoro ozizi ụgha ahụ nke yiri nwanyị na-akwa iko ma tirisịa ha n’ahụ ihe na-eyi egwu dị ka “nkume dị elu”—Alaeze dị ike nke Jehova Chineke n’aka Jisọs Kraịst.
17. (a) Dị ka Aịsaịa 61:1, 2 si kwuo, gịnị ka Jisọs ga-akpọsa mgbe e jisịrị mmụọ Chineke tee ya mmanụ? (b) Olee otú e si na-eme mkpọsa ahụ taa?
17 Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, e ji mmụọ nke Onye Nkwado ya bụ Chineke tee ya mmanụ ọ bụghị nanị “ịkpọsa afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ” kamakwa ikwusa “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.” (Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:16-21) N’oge anyị, na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe nke a, Jehova na-eme ka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi kwusaa “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere” n’elu ala nile mmadụ bi ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye mba nile. Ná nkwusa nke a “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-aba ụba nke ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst yiri atụrụ esonyeworo ihe fọdụrụ ahụ, dị ka e buru ụzọ hụ ya n’ọhụụ ná Mkpughe 7:9-17.
18. N’obi ụtọ dị aṅaa ka ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe ga-ekere òkè na ya?
18 Ndị a nile, ihe fọdụrụ ahụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ, erubewo isi n’iwu nke onye mmụọ ozi ahụ nke dị ná Mkpughe 18:4. Ha esiwo na Babilọn Ukwu ahụ pụta. N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ime ihe n’ụzọ dị otú a? N’ihi na ha aghaghị ịgbapụ na Babilọn Ukwu ahụ tupu a kụrisịa ma bibisịa “ụmụ” nke okpukpe ya site n’aka “anụ ọhịa” ahụ na “mpì iri” ya kpọmkwem tupu Amagedọn. Ndị a na-eguzosi ike n’ihe ga-ekere òkè n’obi ụtọ nke Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst. Ha ga-esonyere eluigwe n’ịsị: “Haleluya; Nzọpụta nile na otuto nile na ike nile na-adịrị Chineke anyị: n’ihi na ikpe ya nile bụ eziokwu bụrụkwa ikpe ziri ezi; n’ihi na o kpere oké nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, bụ́ nwanyị nke weere ịkwa iko ya mebie ụwa.”—Mkpughe 19:1, 2; tụlee Jeremaịa 51:8-11.
19. Obi ụtọ dị aṅaa ka ihe fọdụrụ ahụ na-eguzosi ike n’ihe nwere ugbu a, obi ụtọ ka ukwuu dịkwa aṅaa na-echere ha?
19 Kemgbe 1919, Jehova emeworo ndị ya “ihe ukwu.” (Abụ Ọma 126:1-3) Maka omume nke a e mere ka ike ntọhapụ ya dị ukwuu, na-egosipụta na ọ bụ “Chineke ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi,” ihe fọdụrụ ahụ a tọhapụrụ ka nwere obi ụtọ. (Deuterọnọmi 7:9) Ha nwere obi ụtọ n’ụzọ zuru ezu, ma e nwere obi ụtọ ka ukwuu nke na-echere ha. Nke a ga-abụ mgbe ha pụrụ isonye n’obi ụtọ nke Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, Eze ahụ na-achị achị, bụ́ Jisọs Kraịst, n’oge ahụ mgbe ọ ga-etirisị “ụmụ” nile nke nzukọ ekwensu ahụ.
20. Olee ndị ọzọ na-ekere òkè n’obi ụtọ nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
20 Ọtụtụ nde ndị bụbu “ndị a dọtara n’agha” nke Babilọn Ukwu ahụ abụrụworị ndị e nyeere aka ịgbapụ ná nzukọ okpukpe ahụ mbibi na-eche ihu tupu mbibi ya dị ike abịa. Ihe si n’ime ya pụta abụrụwo “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ. Gburugburu ụwa, ọnụ ọgụgụ ha dị ihe karịrị 4,000,000, n’enweghị ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè nke a ka ga-azọpụta site ná mbibi nke alaeze okpukpe ụgha zuru ụwa ọnụ. N’iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova, ha na-ekere òkè n’obi ụtọ nke ihe fọdụrụ ahụ site n’isonyere ha n’ikwusa ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ nke Jehova megide Babilọn Ukwu ahụ nke okpukpe.
21. Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe Babilọn Ukwu ahụ na ndị ya a dọtara n’agha nọ?
21 Ya mere, ka a ghara inwe nkwenyere ọ bụla a ga-ekwenyere alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ka a ghara inwe nlaghachi ọ bụla a ga-alaghachikwuru ya n’ụbọchị ndị a nke ntalata ya. Ka anyị nọgide na-enyere ọtụtụ ndị aka ruo otú o kwere mee, bụ́ ndị a dọtara n’agha na Babilọn Ukwu ahụ, isi n’ime usoro ihe ahụ nke mbibi na-eche ihu pụta tupu Saịrọs ahụ Ka Ukwuu enwee mmeri ya nke na-enye obi ụtọ.