Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ws isi 15 p. 121-128
  • A Gaje Ikpochapụ Ihe Dị n’Oge A nke Yiri Edọm

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Gaje Ikpochapụ Ihe Dị n’Oge A nke Yiri Edọm
  • Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Amụma Aịsaịa Buru Megide Edọm
  • Ọdachi Yiri nke Edọm
  • Jehova Ewesa Mba Dị Iche Iche Iwe
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Obedaya
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Jehova Emeere Onwe Ya Aha Mara Mma
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Obadaịa, Jona, na Maịka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
ws isi 15 p. 121-128

Isi 15

A Gaje Ikpochapụ Ihe Dị n’Oge A nke Yiri Edọm

1, 2. Olee otú Onye Okike si ele mba ndị nwere oké ngwá agha anya, gịnịkwa bụ mkpebi Jehova, dị ka amụma Aịsaịa si dị?

TAA ụwa nwere ngwá agha n’ụzọ dị ukwuu karịa otú o nweworo mgbe ọ bụla ọzọ tupu ugbu a. Ngwá agha nuklia nke mba ndị dị iche iche bụ ihe iyi egwu dị adị nye ndịgide ndụ nke ihe a kpọrọ mmadu. Mgbe ahụ, olee otú Onye Okike nke ezinụlọ nke ụmụ mmadụ, bụ Jehova Chineke, si ele ọnọdụ ahụ anya? E kwupụtara nke a n’ụzọ doro anya n’isi nke 34 nke amụma Aịsaịa, bụ́ nke jiri okwu ndị a mepee:

2 “Bịanụ nso, unu mba, ịnụ ihe; unu ndị dị iche iche kwa, ṅaanụ ntị: ka ụwa nụ, ya na ùjú ya; elu ụwa dum mmadụ, na ihe nile si n’ime ya apụta. N’ihi na iwe ka Jehova na-ewesa mba nile, ọ na-ejidekwa ọnụma n’ahụ usuu nile nke ndị agha ha: o wezụgawo ha ka e bibie ha, o weere ha nye ka e gbuo ha. A ga-atụfukwa ndị ha e gburu egbu, ma ozu ha, ísì ọjọọ ha ga-arịgo n’elu, a ga-agbazekwa ugwu site n’ọbara ha. Usuu nile nke ihe eluigwe ga-edekwa, a ga-apịakọtakwa eluigwe [gọọmenti ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-adịghị irè] dị ka akwụkwọ odide: usuu ha nile ga-akpọnwụkwa, dị ka akwụkwọ si akpọnwụ dapụ n’osisi vine, na dị ka akwụkwọ nke na-akpọnwụ akpọnwụ si adapụ n’osisi fig.” (Aịsaịa 34:​1-⁠4) Nke a bụ amụma na-atụ egwu n’ezie!

3. (a) Nye gịnị ka a kpọrọ mba dị iche iche òkù ige ntị, n’ihi gịnịkwa ka Jehova pụrụ izi ezi otú a inye ha iwu? (b) Gịnị na-egosi na mba dị iche iche egebeghị ntị?

3 Onye Okike nke eluigwe na ala na mba dị iche iche nwere esemokwu taa. Ọ bụ n’ihi nke ahụ mere e ji kpọọ mba dị iche iche òkù ka ha gee ntị n’ozi nke dabeere na Bible nke o meworo ka a kpọsaa gburugburu ụwa nile kemgbe 1919. Ha kwesịrị ige ntị n’ihe o nwere ikwu site n’ọnụ Ndịàmà ya. Ma usoro ihe omume dị iche iche nke ụwa egosiwo na ha emebeghị otú a, mba dị iche iche ejiribeghịkwa ihe Ndịàmà ya na-ekwu kpọrọ ihe dị mkpa, bụ́ ndị ihe ha họọrọ bụ òtù United Nations kama ịhọrọ Alaeze eluigwe ahụ nke dị n’aka Ọkpara ya e chiworo eze, bụ́ “Onyeisi Udo” ahu.

Amụma Aịsaịa Buru Megide Edọm

4, 5. (a) Olee ndị bụ ndị Edọm, àgwà dịkwa aṅaa ka ha kpasoro mba ejima ha, bụ́ Israel? (b) N’ihi ya gịnị ka Jehova kwupụtara metụta Edọm?

4 E nwere otu ihe na-arụ ọrụ taa n’etiti òtù mba dị iche iche nke taa bụ́ nke a ga-ajụ ajụjụ. Ihe ahụ bụ nke mba Edọm nọchiri anya ya, bụ́ nke a kpọrọ aha kpọmkwem n’amụma nke a. Ndị Edọm bụ ụmụ sitere n’Ịsọ, onye resịrị ejima ya bụ Jekọb ọnọdụ ọkpara ya, n’ihi “achịcha na ofe lentil.” Ọ bụ n’oge ahụ ka a kpọrọ Ịsọ Edọm, nke pụtara “Ọbara Ọbara.” (Jenesis 25:​24-⁠34) N’ihi na Jekọb weghaara ọnọdụ ya n’ọnọdụ ịbụ ọkpara ahụ nke dị oké ọnụ ahịa, ịkpọasị jupụtara Isọ n’obi megide ejima ya bụ́ nwanne ya nwoke. Edọm ghọrọ onye iro afọ na-adịghị eju nke mba ochie nke Israel, ma ọ bụ Jekọb, ọ bụ ezie na ha bụ mba bụ ejima. N’ihi ịkpọasị nke a megide ndị Chineke, Edọm nwetara iwe ruuru ya nke Jehova, Chineke nke Israel, O wee kwupụta mkpochapụ ebighị ebi nke Edọm. Mkpebi nke a nke Chineke ka e kwupụtara n’okwu ndị ahụ nke Aịsaịa onye amụma kwuru:

5 “N’ihi na mma agha m aṅụjuwo afọ n’eluigwe: lee, Edọm ka ọ ga-arịdakwasị, rịdakwasịkwa ndị m wezụgara ka e bibie ha, ikpe ikpe. Mma agha Jehova jupụtara n’ọbara, e mewo ka ọ maa abụba site n’abụba, site n’ọbara ụmụ atụrụ na mkpi, site n’abụba nke akụrụ ebulu: n’ihi na àjà dị Jehova nwere na Bọzra [obodo a kasị mara amara nke Edọm], o nwekwara oké ogbugbu n’ala Edọm.”​—⁠Aịsaịa 34:​5, 6.

6. (a) N’ihi gịnị ka Jehova pụrụ iji kwuo okwu banyere ibuli “mma agha” ya megide Edọm “n’eluigwe”? (b) Mgbe Babilọn wakwasịrị alaeze Juda, àgwà dị aṅaa nke abụghị nwanne ka Edọm gosipụtara n’ebe ndị Jehova nọ?

6 Mba Edọm ahụ igbu mmadụ jupụtara n’uche aghaghị ịbụ nke e jiri ọbara nke onwe ha dee ala ya site ná “mma agha” nke Jehova. Edọm dị n’ógbè dị elu, nke dị n’ugwu. (Jeremaịa 49:16) Ya mere n’ime ka e nwee ogbugbu mmadụ n’ala ahụ, Jehova pụrụ ikwu n’ụzọ ihe atụ na ya na-ebuli mma agha ya nke ikpe “n’eluigwe.” Edọm nwere ndị agha dị ike, ndị agha ya jikwa ngwá agha na-agagharị n’elu ugwu dị iche iche ndị ahụ ịdị elu ha ruru n’eluigwe iji chebe mba ahụ megide ndị na-eme mwakwasị. Ya mere n’ụzọ kwesịrị ekwesị a pụrụ ịkpọ ndị agha Edọm ‘usuu elu-igwe.’ Ma Edọm siri ike agbataghị ọsọ enyemaka ọ bụla maka mba ejima ya bụ Israel mgbe ndị agha Babilọn wakwasịrị ya. Kama inyere ha aka, Edọm ṅụrịrị ọṅụ ịhụ nkwatu a kwaturu alaeze nke Juda, ọbụna gbaakwa ndị bibiri ya ume. (Abụ Ọma 137:7) Aghụghọ Edọm ruru n’ókè nke ịchụdasị ndị mmadụ na-agba ọsọ maka ndụ ha ma na-enyefe ha n’aka ndị iro ha. (Obadaịa 10-⁠14) Ndị Edọm mere atụmatụ iweghara obodo ndị Israel ahụ a gbahapụrụ agbahapụ, na-ekwu okwu nganga megide Jehova.​—⁠Ezikiel 35:​10-⁠15.

7. Olee otú Chineke nke Israel si lee àgwà aghụghọ nke mba Edọm anya?

7 Jehova, bụ́ Chineke nke Israel oge ochie, ò leghaara omume abụghị nwanne nke a n’akụkụ ndị Edọm anya, bụ́ nke ha mere megide ndị ya ọ họpụtara? Ee e. Ọ bụ n’ihi nke ahụ mere obi Chineke ji nwee nzube nke “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀” na “afọ nkwụghachi” ná nkwụghachi ụgwọ ọrụ maka ihe e ji ịkpọasị mee nzukọ ya nke elu ala, bụ́ nke a kpọrọ Zaịọn. Amụma ahụ kwuru, sị: “N’ihi na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ dị Jehova nwere, afọ nkwụghachi dịịrị iseokwu [n’ihu Ụlọikpe nke Eluigwe na Ala] Zaịọn.”​—⁠Aịsaịa 34:8; Ezikiel 25:​12-⁠14.

8. (a) Ònye ka Jehova jiri mee ihe iwetara Edọm ntaramahụhụ? (b) Gịnị ka onye amụma bụ́ Obadaịa buru n’amụma banyere Edọm?

8 N’oge na-adịghị anya mgbe e bibisịrị Jerusalem, Jehova malitere igosipụta ịbọ ọ́bọ̀ ezi omume ya n’ahụ ndị Edọm site n’aka eze Babilọn, bụ́ Nebukadneza. (Jeremaịa 25:​8, 15, 17, 21) Mgbe ndị agha nile nke Babilọn biliri imegide Edọm, ọ dịghị ihe pụrụ ịzọpụta ndị Edọm! Ndị agha Babilọn nupụrụ ndị Edọm site n’ebe dị elu ha nke jupụtara ná nkume. Ọ bụ “afọ nkwụghachi” n’ahụ Edọm. Dị ka Jehova buru n’amụma site n’ọnụ onye amụma ọzọ: “N’ihi ihe ike e mere nwanne gị, bụ́ Jekọb, ka ihere ga-ekpuchi gị, a ga-ebipụkwa gị ruo mgbe ebighị ebi. . . . Dị ka i meworo, otú a ka a ga-eme gị; mmeso gị ga-alaghachi n’isi gị.”​—⁠Obadaịa 10, 15.

9. Gịnị bụ ihe dị n’oge a nke yiri Edọm, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

9 Nke a na-egosipụtakwa àgwà Jehova n’ebe ihe dị n’oge a nke yiri Edọm dị. Ònye ka nke ahụ bụ? Ọ dị mma, na narị afọ nke 20, ònye buteworo ụzọ n’ịkatọ na ịkpagbu ndị ohu Jehova? Ọ̀ bụ na ọ bụghị Krisendọm ahụ dapụrụ n’ezi ofufe site n’aka òtù ndị ụkọchukwu ya ndị dị mpako? Ee! Krisendọm, ógbè nke Iso Ụzọ Kraịst ụgha, ebuliwo onwe ya elu ruo ebe dị oké elu dị ka ugwu n’ihe omume dị iche iche nke ụwa nke a. Ọ bụ akụkụ e buliri elu nke nzukọ nke usoro ihe nke ihe a kpọrọ mmadụ, okpukpe ya nile mejupụtakwara akụkụ kachasị ukwuu nke Babilọn Ukwu ahụ. Ma Jehova ekwupụtawo “afọ nkwụghachi” megide ihe ahụ dị n’oge a nke yiri Edọm n’ihi omume na-adịghị mma nke obi ọjọọ ha mere n’ebe ndị ya nọ, bụ́ Ndịàmà ya.

Ọdachi Yiri nke Edọm

10. Olee otú Aịsaịa 34:​9, 10 si kọwaa ihe ga-adabara Edọm, ma olee ndị ka amụma ahụ metụtara taa?

10 Ka anyị na-atụle akụkụ ndị ọzọ nke amụma nke a nke Aịsaịa, anyị pụrụ iburu Krisendọm nke oge a n’uche: “Iyi ya nile ga-agbanwe pitch, ájá ya ga-agbanwekwa brimstone, ala ya ga-aghọkwa pitch na-ere ọkụ. N’abalị ma ọ bụ n’ehihie ọ gaghị anyụ anyụ; ruo mgbe ebighị ebi ka anwụrụ ọkụ ya ga-akwụgo.” (Aịsaịa 34:​9, 10) E si otú a gosipụta ala Edọm dị ka ihe kpọrọ nkụ nke ukwuu nke na ọ dị ka à ga-asị na mmiri iyi ya dị iche iche na-agbapụta pitch, dịkwa ka à ga-asị na ájá ya bụ brimstone, mgbe ahụ e sunye ihe ndị a na-enwu ọkụ ọkụ.​—⁠Tụlee Mkpughe 17:16.

11, 12. Site ná nkọwa amụma e nyere n’Aịsaịa 34:​10-⁠15, gịnị ga-eme ala Edọm, ogologo oge hàkwa aṅaa ka ọnọdụ nke ala ahụ gadịru?

11 Amụma Aịsaịa gara n’ihu, sị: “Site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ ọ ga-atọgbọrọ n’efu; ruo mgbe nile ebighị ebi ọ dịghị onye na-agabiga n’ime ya. Ma okwolo na ebinta ga-enweta ya; okwukwu na ugoloọma ga-ebi n’ime ya: ọ ga-esetikwa eriri nke ịtọgbọrọ n’efu na nkume ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịtọgbọrọ nkịtị n’elu ya. Ndị ya a maara aha ha ka ha ga-akpọ inwe alaeze, ma ọ dịghị onye nọ n’ebe ahụ; ndị isi ya nile ga-aghọkwa ihe efu. Ogwu ga-epukwa n’ụlọ elu ya nile, akụba na ọhịa ogwu n’ebe ya nile e wusiri ike: o wee ghọọ ebe obibi nkịta ọhịa, ogige nke dịịrị enyi nnụnụ. Anụ ọhịa bi n’ala kpọrọ nkụ ga-ezutekwa anụ ọhịa n’ebe ebe, mkpi ọhịa ga-akpọkwa ibe ya; ọzọ, n’ebe ahụ ka lilith ga-anọdụ, chọtara onwe ya ebe izu ike. N’ebe ahụ ka agwọ dị ngwa ga-eme akwụ ya, yie àkwá.”​—⁠Aịsaịa 34:​10-⁠15.

12 Edọm ga-aghọ ala “ịtọgbọrọ n’efu” ma a bịa n’ihe banyere mmadụ. Ọ gaje ịbụ ala tọgbọrọ nkịtị nke nwere nanị anụ ọhịa, nnụnụ, na agwọ n’ime ya. Ọnọdụ ihe na-adịghị ya nke ala ahụ gaje ịga n’ihu, dị ka Aịs 34 amaokwu nke 10 na-ekwu, “mgbe nile ebighị ebi.” Ndị bi n’ime ya ná mbụ agajeghị ịlọghachite.​—⁠Obadaịa 18.

13. Gịnị ka e buru n’amụma maka Krisendọm “n’akwụkwọ Jehova,” gịnịkwa kpọmkwem ka akwụkwọ a bụ?

13 Lee ajọ ihe nke nke a sere onyinyo ya maka ihe dị n’oge a nke nọchiri anya Edọm​—⁠Krisendọm! O gosipụtawo onwe ya ịbụ onye iro nwere obi ilu nke Jehova Chineke, bụ́ onye o jiworo obi ọjọọ sogbuo Ndịàmà ya. Ya mere mbibi nke a a gaje ibibi ya n’oge na-adịghị anya tupu Amagedọn abụrụwo nke e buru n’amụma “n’akwụkwọ Jehova.” (Aịsaịa 34:16) N’ikwu ya kpọmkwem, ‘akwụkwọ Jehova’ nke a bụ akwụkwọ ya nke ihe ndekọ, na-edepụtazu akụkọ nke ihe ndị iro ya na ndị na-akpagbu ndị ya ga-azara ọnụ ha na ya. Ihe e dere “n’akwụkwọ Jehova” banyere Edọm oge ochie mezuru, nke a bụkwa ihe na-eme ka e jide n’aka na amụma ahụ dị ka o si emetụta Krisendọm, Edọm nke oge a, ga-emezukwa n’otu aka ahụ.

14. Gịnị ka ihe dị n’oge a nke yiri Edọm na-anakwerebeghị, ihe nlereanya dị aṅaa nke ndị Jehova ka ha na-agbasoghịkwa?

14 Ndị dị taa yiri ndị Edọm anarabeghị Jehova Chineke dị ka Eze n’oge “ọgwụgwụ oge” nke a. Ọzọkwa, ebe Krisendọm bụ akụkụ pụtara ìhè otú a nke Babilọn Ukwu ahụ, ọ gaje ịta ahụhụ nke ikere òkè n’ihe otiti ya nile. O mebeghị ihe kwekọrọ n’iwu Jehova nyere ‘ịpụta n’ime’ Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 18:4) O ṅomibeghị ihe nlereanya nke ihe fọdụrụ ahụ nke ndị Israel ime mmụọ ma ọ bụ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ.”

15, 16. Gịnị bụ ọdịnihu dị nso nke Krisendọm, dị ka e buru n’amụma na Mkpughe isi 17 na 18 na n’Aịsaịa nke 34?

15 Ọdịnihu na-adịghị anya nke Krisendọm bụ nke olileanya na-adịghị na ya n’ezie. Ọ na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji mee ka obi jụrụ ndị enyi ya bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma gbochie ha ijikọta aka n’otu n’omume mwakwasị megide ya, nke gaje ịrụpụta mbibi a gaje ibibi ya kpam kpam, ma o nweghị nke nwere isi!

16 Dị ka Mkpughe isi 17 na 18 si kwuo, Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, ga-etinye ya n’obi ha inye ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke agha ha maka omume anụ ọhịa megide Babilọn Ukwu ahụ n’akụkụ okpukpe ya nile, tinyere Krisendọm. Nke a ga-ewepụsị Iso Ụzọ Kraịst ụgha n’ụwa nile. Ọnọdụ nke Krisendọm ga-adị ka ọnọdụ enweghị olileanya ahụ a kọwara n’Aịsaịa nke 34. Ọ gaghị anọ ya ịhụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” bụ́ nke ga-ekpebi ihe nile, megide mba nile, bụ́ ndị ga-ebibiworị Babilọn Ukwu ahụ. A ga-ekpochapụ kpam kpam n’elu ala, ihe ahụ yiri Edọm, bụ́ Krisendọm, “ruo mgbe nile ebighị ebi.”

[Foto dị na peeji nke 122]

Krisendọm ga-enweta ikpe yiri nke ndị Edọm, bụ́ ụmụ Ịsọ, bụ́ onye rere ọnọdụ ọkpara ya n’ihi otu nri

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya