Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/1 p. 10-15
  • Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe
  • Gịnị Ka Jehova Na-ahụ n’Ime Anyị
  • Ihe Jehova Meworo Iji Gosipụta Ịhụnanya Ya
  • Ọ Dịghị Ihe Pụrụ “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
  • “Chineke Bụ Ịhụnanya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ị Bara Uru n’Anya Chineke!
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/1 p. 10-15

Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!

“Ọ bụ ịhụnanya nke dị mgbe ebighị ebi ka M jiworo hụ gị n’anya: n’ihi nke a ka M meworo ka ebere dịgidere gị.”—JEREMAỊA 31:3.

1. Olee otú omume Jisọs n’ebe ndị nkịtị n’oge ya nọ si dị iche na nke ndị Farisii?

HA PỤRỤ ịhụ ya n’anya ya. Nwoke a, bụ́ Jisọs, adịghị ka ndị ndú okpukpe ha; ọ na-eche banyere ha. O nwere ọmịiko maka ndị a n’ihi na “a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Ndị ndú okpukpe ha kwesịrị ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya ndị na-anọchite anya Chineke na-ahụ n’anya, nke ebere. Kama nke ahụ, ha ledara ndị nkịtị anya dị ka nanị ndị dịkarịsịrị ala—ndị a bụrụ ọnụ!a (Jọn 7:47-49; tụlee Ezikiel 34:4.) N’ụzọ pụtara ìhè, ụdị echiche ahụ na-ezighị ezi, nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị dị nnọọ iche n’otú Jehova na-esi ele ndị ya anya. Ọ gwawo mba ya bụ́ Israel, sị: “Ọ bụ ịhụnanya nke dị mgbe ebighị ebi ka M jiworo hụ gị n’anya.”—Jeremaịa 31:3.

2. Olee otú ndị enyi Job atọ si gbalịa ime ka o kwere na ọ baghị uru n’anya Chineke?

2 Otú ọ dị, ndị Farisii abụtụghị ndị mbụ nwara ime ka atụrụ Jehova hụrụ n’anya nke ukwuu kwere na ha abaghị uru. Tụlee ihe atụ nke Job. N’ebe Jehova nọ ọ bụ onye ezi omume na onye na-enweghị ntụpọ, ma “ndị nkasi obi” atọ ahụ nyere echiche nke na Job bụ onye rụrụ arụ, onye ajọ omume dapụrụ n’ezi ofufe nke gaje ịnwụ n’ahapụghị ihe na-egosi na ọ dịtụrụ adị. Ha zọọrọ na Chineke agaghị ewe ezi omume ọ bụla Job mere dị ka ihe bara uru, ebe ọ bụ na Chineke atụkwasịghị ọbụna ndị mmụọ ozi nke ya onwe ya obi ma lee eluigwe n’onwe ya anya dị ka ebe na-adịghị ọcha!—Job 1:8; 4:18; 15:15, 16; 18:17-19; 22:3.

3. Ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan na-eji eme ihe taa iji gbalịa ime ka ndị mmadụ kwere na ha bụ ndị na-abaghị uru na ndị a na-apụghị ịhụ n’anya?

3 Taa, Setan ka na-ejikwa ‘ụzọ aghụghọ’ nke a nke ịgbalị ime ka ndị mmadụ kwere na ha bụ ndị a na-ahụghị n’anya na ndị na-abaghị uru eme ihe. (Ndị Efesọs 6:11, NW, nkọwa n’ala ala peji) N’eziokwu, ọ na-arafukarị ndị mmadụ site n’ịkpasu àgwà nke ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi na ịdị mpako. (2 Ndị Kọrint 11:3) Ma ọ na-enwekwa mmasị n’itikpọ ùgwù onwe onye nke ndị a pụrụ ime otú ahụ. Nke a dị otú ahụ karịsịa na “mgbe ikpeazụ” ndị a dị oké egwu. Ọtụtụ ndị taa na-etolite n’ezinụlọ ebe “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ”; ọtụtụ aghaghị ịnagide ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-ebu ọdịmma nke nanị onwe ha n’obi, ndị isi ike kwa ụbọchị. (2 Timoti 3:1-5) Ọtụtụ afọ nke mmeso ọjọọ, ịkpa ókè agbụrụ, ịkpọasị, ma ọ bụ mmetọ pụrụ imewọrị ka ndị dị otú ahụ kwere na ha bụ ndị na-abaghị uru na ndị a na-apụghị ịhụ n’anya. Otu nwoke dere, sị: “Adịghị m enwe mmetụta ịhụnanya maka onye ọ bụla ma ọ bụ ịbụ onye onye ọ bụla hụrụ n’anya. Ọ na-esiri m oké ike ikwere na Chineke na-eche ihe ọ bụla banyere m.”

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka echiche nke abaghị uru onwe onye ji dị iche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru? (b) Gịnị bụ otu ihe ize ndụ na-esi n’anyị ikwere na ọ dịghị mgbalị anyị ọ bụla bara uru apụta?

4 Echiche nke abaghị uru onwe onye na-emegide nnọọ eziokwu bụ isi nke Okwu Chineke, bụ́ ozizi nke ihe mgbapụta ahụ. (Jọn 3:16) Ọ bụrụ na Chineke ga-akwụ oké ụgwọ dị otú a—ndụ dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ya onwe ya—iji zụtara anyị ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi, n’ezie Ọ ghaghị ịhụ anyị n’anya; n’ezie ọ ghaghị ịbụ na anyị bara uru n’anya Ya!

5 Ọzọkwa, lee otú ọ ga-esi bụrụ ihe na-akụda mmụọ iche na anyị adịghị eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, na ọ dịghị mgbalị anyị bara uru ọ bụla! (Tụlee Ilu 24:10.) N’ihi echiche a na-ezighị ezi, ọbụna agbamume kwesịrị ekwesị, nke a haziri iji nyere anyị aka ịga n’ihu n’ozi anyị na-ejere Chineke n’ebe ndị o kwere mee, pụrụ ịda ndị ụfọdụ ná ntị dị ka amamikpe. Ọ pụrụ iyi ihe na-ekwupụta ihe anyị kwenyere n’ime onwe anyị na ihe ọ bụla anyị mere ezughị ezu.

6. Gịnị bụ ọgwụ kasị mma maka oké echiche na-ezighị ezi banyere onwe anyị?

6 Ọ bụrụ na ị hụta ụdị echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ n’ime onwe gị, adala mbà. Ọtụtụ n’ime anyị na-akatọ onwe anyị n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya site n’oge ruo n’oge. Chetakwa, e mere Okwu Chineke maka “iji mee ka uche mmadụ guzozie” na maka “ịkwada ebe e wusiri ike.” (2 Timoti 3:16; 2 Ndị Kọrint 10:4) Jọn onyeozi dere, sị: “N’ime nke a ka anyị ga-amara na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ, meekwa ka obi anyị kwenye ekwenye n’ihu Ya, n’ihe ọ bụla nke obi anyị na-ama anyị ikpe n’ime ya; n’ihi na Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwara ihe nile.” (1 Jọn 3:19, 20) Mgbe ahụ, ka anyị tụlee ụzọ atọ Bible si na-akụziri anyị na anyị dị oké ọnụ ahịa n’ebe Jehova nọ.

Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe

7. Olee otú Jisọs si kụziere ndị Kraịst nile banyere uru ha n’anya Chineke?

7 Na mbụ, Bible na-akụzi kpọmkwem na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’anya Chineke. Jisọs kwuru, sị: “Á dịghị ere egwele ise na penny abụọ? ma a dịghị echezọ otu n’ime ha n’ihu Chineke. Ma ọbụna agịrị isi nile nke isi unu ka a gụworo. Unu atụla egwu: ọnụ ahịa unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Luk 12:6, 7) N’ụbọchị ndị ahụ, egwele bụ nnụnụ kasị ọnụ ala e rere dị ka nri, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha Onye Okike ya na-arịbaghị ama. Otú a a tọrọ ntọala maka iwepụta ọdịiche dị ịtụnanya: Mgbe a bịara n’ebe ndị mmadụ nọ—bụ́ ndị ọnụ ahịa ha ka nnọọ ukwuu—Chineke maara irighiri ihe ọ bụla. Ọ na-adị ka à gụrụ agịrị isi nke isi anyị ọnụ n’otu n’otu!

8. N’ihi gịnị ka o ji zie ezi iche na Jehova pụrụ ịgụ agịrị isi nke isi anyị?

8 Ị̀gụ agịrị isi ọnụ? Ọ bụrụ na i chere na akụkụ a nke ilu Jisọs bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya, tụlee: Chineke na-echeta nnọọ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu nke na o nwere ike ịkpọlite ha n’ọnwụ—na-ekegharị ha n’akụkụ nile, tinyere mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa dị mgbagwoju anya nakwa afọ nile nke ihe ndị ha na-echeta na ahụmahụ. Ịgụ agịrị isi anyị ọnụ (nke isi nkịtị na-etopụta ihe dị ka 100,000) ga-abụ ihe omume dị mfe ma e jiri ya tụnyere nke ahụ!—Luk 20:37, 38.

Gịnị Ka Jehova Na-ahụ n’Ime Anyị

9. (a) Gịnị bụ ụfọdụ àgwà ndị Jehova na-eji akpọrọ ihe? (b) N’ihi gịnị ka i ji chee na ụdị àgwà ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa nye ya?

9 Nke abụọ, Bible na-akụziri anyị ihe Jehova na-eji akpọrọ ihe n’ime anyị. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ na-enwe obi ụtọ n’ezi àgwà na mgbalị anyị. Eze Devid gwara nwa ya Solomọn, sị: “Mkpụrụ obi nile ka Jehova na-enyocha, Ọ na-aghọtakwa nchepụta nile ọ bụla nke echiche.” (1 Ihe Emere 28:9) Ka Chineke na-enyocha ọtụtụ nde mkpụrụ obi ndị mmadụ n’ụwa nke a jupụtara n’ime ihe ike na ịkpọasị, lee ka ọ ga-esi nwee obi ụtọ mgbe ọ bịaruru n’obi nke hụrụ udo, eziokwu, na ezi omume n’anya! (Tụlee Jọn 1:47; 1 Pita 3:4.) Gịnị na-eme mgbe Chineke chọtara obi nke na-ejupụta n’ịhụnanya nye ya, nke na-achọ ịmụ banyere ya ma soro ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma ahụ? Na Malakaị 3:16, Jehova na-agwa anyị na ọ na-aṅa ndị na-agwa ndị ọzọ okwu banyere ya ntị na ọbụna nwee “akwụkwọ ncheta” maka ‘ndị nile na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya.’ Àgwà ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa nye ya!

10, 11. (a) Olee otú ụfọdụ pụrụ isi belata ihe àmà na-egosi na Jehova ji àgwà ọma ha akpọrọ ihe? (b) Olee otú ihe atụ nke Abaịja si gosi na Jehova ji àgwà ọma n’ọ̀tụ̀tụ̀ nile kpọrọ ihe?

10 Otú ọ dị, obi nke na-ama onwe ya ikpe pụrụ iguzogide ihe àmà dị otú ahụ nke na-egosi uru anyị bara n’anya Chineke. Ọ pụrụ ịnọgide na-atakwụnyere mmadụ okwu sị, ‘Ma e nwere nnọọ ọtụtụ ndị ọzọ bụ ihe nlereanya n’àgwà ndị ahụ karịa mụ. Lee ka ọ na-aghaghị isi wute Jehova mgbe o ji m tụnyere ha!’ Jehova abụghị onye na-eji mmadụ atụnyere ibe ya, ọ bụghịkwa onye nwere ụkpụrụ a na-adịghị agbanwe agbanwe. (Ndị Galetia 6:4) Ọ na-eji oké nghọta enyocha obi, ọ na-ejikwa àgwà ọma n’ọ̀tụ̀tụ̀ nile akpọrọ ihe.

11 Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova nyere iwu ka e gbuo ndị ọchịchị nile dapụrụ n’ezi ofufe nke Eze Jeroboam, kpochapụ ha dị ka “nsị anụ,” O nyere iwu ka e nye nanị otu n’ime ụmụ eze, bụ́ Abaịja, olili dị mma. N’ihi gịnị? “A hụrụ n’ime ya ezi ihe n’ebe Jehova, bụ́ Chineke Israel, nọ.” (1 Ndị Eze 14:10, 13) Nke a ọ̀ pụtara na Abaịja bụ onye na-efe Jehova n’ikwesị ntụkwasị obi? Ọ bụchaghị otú ahụ, ebe ọ nwụrụ dị ka ndị ọzọ nke ezinụlọ ajọ omume ya. (Deuterọnọmi 24:16) Ma, Jehova ji “ezi ihe” nke ọ hụrụ n’obi Abaịja kpọrọ ihe ma mee ihe kwekọrọ na nke ahụ. Akwụkwọ bụ́ Matthew Henry’s Commentary on the Whole Bible sịrị: “Ebe e nwere nanị ezi ihe ụfọdụ dị otú ahụ, a ga-achọta ya: Chineke nke na-achọ ya, na-ahụ ya, ọ masị ya ya dị nnọọ nta, ọ na-adịkwa ya mma.” Echefukwala na ọ bụrụ na Chineke achọta ọbụna ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ezi àgwà ụfọdụ n’ime gị, ọ pụrụ ime ka o too ma ọ bụrụhaala na ị na-agbalịsi ike ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.

12, 13. (a) Olee otú Abụ Ọma 139:3 si gosi na Jehova na-eji mgbalị anyị akpọrọ ihe? (b) N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na Jehova na-ayọcha ihe anyị na-eme?

12 Jehova na-eji mgbalị anyị akpọrọ ihe n’otu ụzọ ahụ. N’Abụ Ọma 139:1-3, anyị na-agụ, sị: “Jehova, I gwupụtawo ala obi m, I wee mara m. Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m, Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya. Okporo ụzọ m na ndina ala m ka Ị fụchaworo dị ka ọka, ọ bụkwa ụzọ m nile ka Ị maworo nke ọma.” Ya mere Jehova maara ihe nile anyị na-eme. Ma ọ gabigara nnoọ nanị ịmata ihe. Ná Hibru ahịrị okwu bụ́ “ụzọ m nile ka Ị maworo nke ọma” pụrụ ịpụtakwa “i weere ụzọ m nile dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa” ma ọ bụ “ị hụrụ ụzọ m nile n’anya.” (Tụlee Matiu 6:19, 20.) Otú ọ dị, ụzọ dị aṅaa ka Jehova ga-esi hụ ụzọ anyị n’anya ebe anyị bụ nnọọ ndị na-ezughị okè na ndị mmehie?

13 N’ụzọ na-akpali mmasị, dị ka ndị ọkà mmụta ụfọdụ kwuru, mgbe Devid dere na Jehova ‘a fụchawo’ okporo ụzọ na ndina ala ya nile, okwu Hibru ya pụtara n’ụzọ nkịtị “ịyọcha ihe.” Otu akwụkwọ nkà mmụta kwuru, sị: “Ọ pụtara . . . ịyọchapụ igbógbó nile, na ịhapụ mkpụrụ ya nile—ichebe ihe nile bara uru. Ya mere ebe a ọ pụtara na Chineke, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, yọchara ya. . . . Ọ kpaghasịrị ihe nile bụ igbógbó ọka, ma ọ bụ ihe nile na-abaghị uru, ma hụ ihe fọdụrụnụ dị adị ma gbaa ọkpụrụkpụ.” Obi nke na-ama onwe ya ikpe pụrụ ịyọcha ihe anyị na-eme n’ụzọ megidere nke ahụ, na-abakasị anyị mba ahụ n’emeghị ebere maka njehie ndị gara aga ma na-agụpụ ihe ndị anyị na-arụzu dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ. Ma Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị echegharịa site n’ezi obi ma gbalịsie ike ịghara imeghachi ngahie anyị ọzọ. (Abụ Ọma 103:10-14; Ọrụ 3:19) Ọ na-ayọchapụta ma na-echeta ọrụ ọma anyị. N’ezie, ọ na-echeta ha ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụhaala na anyị anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye ya. Ọ ga-ele ya anya dị ka ajọ omume ichezọ ihe ndị a, ọ dịghịkwa eme ajọ omume ma ọlị!—Ndị Hibru 6:10.

14. Gịnị na-egosi na Jehova na-eji ọrụ anyị n’ozi ndị Kraịst akpọrọ ihe?

14 Olee ụfọdụ n’ime ọrụ ọma ndị Chineke na-eji akpọrọ ihe? Ihe ọ bụla nnọọ anyị mere n’iṅomi Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (1 Pita 2:21) Mgbe ahụ, n’ezie, otu ọrụ dị nnọọ mkpa bụ ịgbasa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ná Ndị Rom 10:15, anyị na-agụ, sị: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!” Ọ bụ ezie ọ pụrụ ịbụ na anyị adịghị eche banyere ụkwụ nkịtị anyị dị ka ‘ihe mara mma,’ okwu Pọl ji mee ihe n’ebe a bụ otu ihe ahụ e ji mee ihe ná nsụgharị Septuagint nke Grik iji kọwaa Rebeka, Rechel, na Josef—ha atọ dum bụ ndị a rịbara ama maka ịma mma ha. (Jenesis 26:7; 29:17; 39:6) Ya mere anyị ịgagharị n’ozi anyị na-ejere Chineke anyị, bụ́ Jehova, mara mma nke ukwuu ma dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

15, 16. N’ihi gịnị ka Jehova ji na-eji ntachi obi anyị akpọrọ ihe, oleekwa otú okwu Eze Devid n’Abụ Ọma 56:8 si gosipụta eziokwu a?

15 Àgwà ọzọ nke Chineke na-eji akpọrọ ihe bụ ntachi obi anyị. (Matiu 24:13) Cheta, Setan chọrọ ka ị gbakụta Jehova azụ. Ụbọchị ọ bụla ị nọgidesiri ike n’ezi ihe nye Jehova bụ ụbọchị ọzọ nke i nyeworo aka ịzaghachi ịta ụta Setan. (Ilu 27:11) Mgbe ụfọdụ ntachi obi adịghị adị mfe. Nsogbu ahụ ike, oké nsogbu ego, mmekpa ahụ nke mmetụta uche, na ihe mgbochi ndị ọzọ pụrụ ime ụbọchị ọ bụla na-agafenụ ihe ule. Ntachi obi n’ihu ọnwụnwa ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu n’anya Jehova. Ọ bụ ya mere Eze Devid ji rịọ Jehova ka ọ gbanye anya mmiri ya n’ime “karama akpụkpọ” ihe atụ, jiri obi ike na-ajụ, “Há adịghị n’akwụkwọ Gị?” (Abụ Ọma 56:8) Ee, Jehova na-ewere dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ma na-echeta anya mmiri na ahụhụ nile anyị na-atachiri obi n’ịnọgidesi ike n’ezi ihe anyị nye ya. Ha kwa dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.

16 N’ihi ezi àgwà na mgbalị anyị ndị ka mma, lee ka o si doo anya na Jehova hụrụ ihe dị ukwuu ọ ga-eji akpọrọ ihe n’ime anyị! N’agbanyeghị otú ụwa Setan siworo mesoo anyị, Jehova na-ele anyị anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa na akụkụ nke “ihe a na-achọsi ike nke mba nile.”—Hagaị 2:7.

Ihe Jehova Meworo Iji Gosipụta Ịhụnanya Ya

17. N’ihi gịnị ka àjà mgbapụta Kraịst kwesịrị iji mee ka anyị kwere na Jehova na Jisọs hụrụ anyị n’anya n’otu n’otu?

17 Nke atọ, Jehova na-eme ihe dị ukwuu iji gosi ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ. N’ezie, àjà mgbapụta Kraịst bụ azịza kasị dị irè nye ụgha Setan na anyị bụ ndị na-abaghị uru ma ọ bụ ndị a na-apụghị ịhụ n’anya. Anyị ekwesịtụghị ichezọ na ọnwụ na-egbu mgbu Jisọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ na ọbụna ihe mgbu ka ukwuu Jehova tachiri obi n’ikiri ọnwụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya nke ukwuu bụcha ihe àmà nke ịhụnanya ha maka anyị. Ọzọ, ịhụnanya ahụ dịịrị anyị n’otu n’otu. Otú ahụ ka Pọl onyeozi si hụ ya, n’ihi na o dere, sị: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi m.”—Ndị Galetia 2:20.

18. N’echiche dị aṅaa ka Jehova na-adọrọ anyị gaa na Kraịst?

18 Jehova egosipụtawo ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ site n’inyere anyị aka n’otu n’otu iji uru nke àjà Kraịst eme ihe. Jisọs sịrị na Jọn 6:44: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” Site n’ọrụ nkwusa ahụ, nke ruru anyị aka n’otu n’otu, sitekwa na mmụọ nsọ ya, nke Jehova na-eji enyere anyị aka ịghọta na itinye eziokwu ime mmụọ n’ọrụ n’agbanyeghị erughị eru na ezughị okè dị iche iche anyị nwere, Jehova n’onwe ya na-adọrọ anyị gaa n’Ọkpara ya na olileanya nke ndụ agwụghị agwụ. Ya mere Jehova pụrụ ikwu banyere anyị dị ka o kwuru banyere Israel, sị: “Ọ bụ ịhụnanya nke dị mgbe ebighị ebi ka M jiworo hụ gị n’anya: n’ihi nke a ka M meworo ka ebere dịgidere gị.”—Jeremaịa 31:3.

19. N’ihi gịnị ka ihe ùgwù nke ekpere kwesịrị iji mee ka anyị kwere n’ịhụnanya onwe onye Jehova nwere n’ebe anyị nọ?

19 Otú ọ dị, ma eleghị anya ọ bụ site n’ihe ùgwù nke ekpere ka anyị na-enweta ịhụnanya Jehova n’ụzọ kasị chie anya. Ọ na-akpọ onye ọ bụla n’ime anyị òkù ‘ikpe ekpere n’ewepụghị aka’ nye ya. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Ọ na-aṅa ntị! Ọbụna na a kpọrọ ya “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) O nyefebeghị onye ọ bụla ọzọ ọrụ nke a, ọbụnadị Ọkpara ya onwe ya. Chetụdị echiche: Onye Okike nke eluigwe na ala na-agba anyị ume ka anyị bịakwute ya n’ekpere, ná nkwuwa okwu. Arịrịọ gị nile pụrụ ọbụna ịkpali Jehova ime ihe o nwere ike ọ garaghị eme.—Ndị Hibru 4:16; Jemes 5:16; lee Aịsaịa 38:1-16.

20. N’ihi gịnị ka ịhụnanya Chineke ji ghara ịbụ ihe ngọpụ maka inwe ịdị mkpa onwe onye ma ọ bụ ibuli onwe onye elu n’akụkụ nke anyị?

20 O nweghị onye Kraịst ọ bụla nwere ezi uche ga-ewe ihe àmà dị otú ahụ nke na-egosi ịhụnanya na mmasị Chineke dị ka ihe ngọpụ iji lee onwe ya anya dị ka onye dị mkpa karịa ihe ọ bụ n’ezie. Pọl dere, sị: “Esitere m n’amara nke e nyere m sị onye ọ bụla nọ n’etiti unu, ka ọ ghara ịtụkwasị uche n’onwe ya karịa nke o kwesịrị ịtụkwasị uche; kama ịtụkwasị uche n’inwe uche zuru okè, dị ka Chineke kere ọ̀tụ̀tụ̀ nke okwukwe nye mmadụ nile n’otu n’otu.” (Ndị Rom 12:3) Ya mere ka anyị na-eme nke ọma n’ikpo ọkụ nke ịhụnanya Nna anyị nke eluigwe, ka anyị nwee uche zuru okè ma cheta na ịhụnanya ebere Chineke bụ ihe na-erughịrị anyị.—Tụlee Luk 17:10.

21. Olee ụgha Setan nke anyị na-aghaghị ịnọgide na-eguzogide, eziokwu Chineke dịkwa aṅaa ka anyị na-aghaghị ịdị na-atụgharị n’uche mgbe nile?

21 Ka onye ọ bụla n’ime anyị mee ihe nile o nwere ike ime iji guzogide echiche nile ndị Setan na-akwalite n’ụwa ochie nke a na-anwụ anwụ. Nke ahụ gụnyere ịjụ echiche nke na anyị bụ ndị na-abaghị uru ma ọ bụ ndị a na-ahụghị n’anya. Ọ bụrụ na ndụ n’ime usoro ihe a akụziworo gị ịhụ onwe gị dị ka ihe mgbochi siri oké ike ọbụna maka ịhụnanya dị ukwuu nke Chineke imeri, ma ọ bụ na ọrụ ọma gị dị oké nta nke na ọbụna anya ya na-ahụzu ihe nile adịghị ahụta ha, ma ọ bụ na mmehie ndị i mere buru ibu nke ukwuu nke na ọbụna ọnwụ nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya agaghị ekpuchili ha, a kụziworo gị okwu ụgha. Jiri oké ịkpọasị kwesịrị ha jụ ụgha ndị dị otú ahụ! Ka anyị buru okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pọl onyeozi dị ná Ndị Rom 8:38, 39 n’uche mgbe nile: “E mewo ka m kwenye, na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụisi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ezie, ha chụpụrụ ndị ogbenye site n’okwu ịkpọasị bụ́ “ʽam-ha·ʼaʹrets,” ma ọ bụ “ndị nke ala.” Dị ka otu onye ọkà mmụta si kwuo, ndị Farisii kụziri na mmadụ ekwesịghị inye ha ihe ndị bara uru ná ntụkwasị obi, ma ọ bụ ịtụkwasị akaebe ha obi, ma ọ bụ kpọbata ha dị ka ndị ọbịa, ma ọ bụ bụrụ ndị ọbịa ha, ma ọ bụ ọbụna zụnara ha ihe. Ndị ndú okpukpe ahụ kwuru na nwa nwanyị mmadụ ịlụ otu onye n’ime ndị a ga-adị ka ike ya agbụ ma tụhapụrụ ya anụ ọhịa.

Gịnị Ka I Chere?

◻ N’ihi gịnị ka Setan ji agbalị ime ka anyị kwere na anyị bụ ndị na-abaghị uru na ndị a na-ahụghị n’anya?

◻ Olee otú Jisọs si kụzie na Jehova ji onye ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe?

◻ Olee otú anyị si mara na Jehova nwere mmasị n’àgwà ọma anyị?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na mgbalị anyị nile dị oké ọnụ ahịa n’ebe Jehova nọ?

◻ Olee otú Jehova siworo gosipụta ịhụnanya ya n’ebe anyị nọ n’otu n’otu?

[Foto dị na peeji nke 13]

Jehova na-ahụ ma na-echeta ndị nile na-eche echiche banyere aha ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya