Gịnị Kasị Mkpa ná Ndụ Gị?
“Mee m ka m mara ụzọ nke m ga-eje ije n’ime ya.”—ABỤ ỌMA 143:8.
1. Gịnị ka Eze Solomọn kwubiri banyere nchụso ụmụ mmadụ na ihe ndị ha rụzuru?
MA ELEGHỊ anya ị maara dị ka onye ọ bụla maara na ndụ jupụtara n’ihe omume na nchegbu. Mgbe i chere banyere ya, ị pụrụ ịhụ ụfọdụ n’ime ha dị ka ndị dị mkpa. Ihe omume na nchegbu ndị ọzọ adịchaghị mkpa ma ọ bụ ọbụna bụrụ ihe efu. Na ị matara nke a pụtara na i kwenyeere otu n’ime ndị ikom kasị mara ihe dịtụworonụ, bụ́ Eze Solomọn. Mgbe ọ tụlesịworo ihe omume ndị a na-eme ná ndụ, o kwubiri: “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.” (Eklisiastis 2:4-9, 11; 12:13) Gịnị ka nke a pụtara nye anyị taa?
2. Ajụjụ dị aṅaa gbara ọkpụrụkpụ kwesịrị ka ndị na-atụ egwu Chineke jụọ onwe ha, na-eduje n’ajụjụ dịgasị aṅaa metụtara ya?
2 Ọ bụrụ na ị chọrọ ‘ịtụ egwu Chineke ma debe ihe nile O nyere n’iwu,’ jụọ onwe gị ajụjụ a na-ama aka, ‘Gịnị kasị mkpa ná ndụ m?’ N’eziokwu, i nwere ike ị gaghị eche banyere ajụjụ ahụ kwa ụbọchị, ma gịnị ma ị tụlee ya ugbu a? N’ezie, ọ na-atụ aro ajụjụ ụfọdụ metụtara ya, dị ka, ‘Ọ̀ pụrụ ịbụ na m ji ọrụ m ma ọ bụ ihe ndị a na-ahụ anya kpọrọ ihe gabiga otú o kwesịrị? Olee ebe ebe obibi m, ezinụlọ m, na ndị m hụrụ n’anya dabara n’okwu ahụ?’ Onye ntorobịa pụrụ ịjụ, ‘Ruo ókè hà aṅaa ka agụmakwụkwọ na-adọrọ uche na oge m? N’ezie, ọ̀ bụ ihe omume ntụsara ahụ, egwuregwu, otu ụdị ihe ntụrụndụ ma ọ bụ nkà na ụzụ kasị amasị m?’ N’agbanyeghịkwa ihe bụ afọ ndụ ma ọ bụ ọnọdụ anyị, anyị kwesịrị ịjụ n’ezie, ‘Olee ọnọdụ ijere Chineke ozi nwere ná ndụ m?’ Ọ ghaghị ịbụ na ị ga-ekweta na e nwere mkpa maka isetịpụ usoro ịka mkpa. Ma olee ụzọ, ọ̀ bụkwa n’ole ebe ka anyị pụrụ inweta enyemaka isetịpụ ya n’ụzọ amamihe?
3. Gịnị ka iguzobe ihe ndị ka mkpa gụnyere maka ndị Kraịst?
3 “Kasị mkpa” nwere echiche bụ isi nke ihe na-anọ n’ihu ihe nile ọzọ ma ọ bụ nke dị mkpa ka e buru ụzọ tụlee. Ma ị̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma ị̀ bụ otu n’ime ọtụtụ nde na-amụ Okwu Chineke n’obi eziokwu bụ́ ndị na-esonyere ha, tụlee eziokwu a: “Ihe ọ bụla nwere oge, mgbe dịkwaara ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe.” (Eklisiastis 3:1) N’ụzọ ziri ezi, nke ahụ na-agụnye igosi nchegbu ịhụnanya maka mmekọrịta ezinụlọ. (Ndị Kọlọsi 3:18-21) Ọ na-agụnye ime ndokwa n’eziokwu maka ezinụlọ gị site n’ọrụ ego. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12; 1 Timoti 5:8) Maka mgbanwe ihe omume kwa, ị pụrụ iweretụ oge maka ihe omume ntụsara ahụ ma ọ bụ nke ntụrụndụ mgbe mgbe. (Tụlee Mak 6:31.) Ma, mgbe i chemiri echiche, ị́ dịghị ahụ na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a kasị mkpa ná ndụ? Ọ dị ihe ọzọ ka mkpa.
4. Olee otú Ndị Filipaị 1:9, 10 si metụta anyị isetịpụ ihe ndị ka mkpa?
4 Ma eleghị anya ị maara na ụkpụrụ nduzi Bible bụ ihe enyemaka ndị bara uru n’isetịpụ ihe ndị ka mkpa na ime mkpebi amamihe. Dị ka ihe atụ, ná Ndị Filipaị 1:9, 10, a gbara ndị Kraịst ume ka ha “na-ababigakwa ókè karị nke ukwuu n’ime mmazu na nghọta nile.” Ná nzube dị aṅaa? Pọl onyeozi gbakwụnyere: “Ka unu wee nwaa ihe ha na ibe ha dị iche.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ezi uche ọ́ dịghị na nke ahụ? Ná ndabere nke mmazu, onye Kraịst na-aghọta ihe pụrụ ikpebi ihe kwesịrị ịbụ mmasị mbụ—ihe kasị mkpa—ná ndụ.
Ihe Nlereanya Banyere Ihe Kasị Mkpa
5. N’ịkọwa ihe ilereanya a hapụụrụ ndị Kraịst, olee otú Akwụkwọ Nsọ si egosi ihe kasị mkpa ná ndụ Jisọs?
5 Anyị na-ahụ otu akụkụ ihe ọmụma dị oké ọnụ ahịa n’okwu Pita onyeozi: “A kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ ya nile.” (1 Pita 2:21) Ee, maka ihe ndị a ga-eji mara ihe kasị mkpa ná ndụ, anyị pụrụ ịtụle ihe Jisọs Kraịst chere banyere ya. Abụ Ọma 40:8 kwuru n’ụzọ amụma banyere ya, sị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.” Otú a ka o kwupụtara otu echiche ahụ: “Ihe oriri m bụ ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ, ka M rụzuokwa ọrụ Ya.”—Jọn 4:34; Ndị Hibru 12:2.
6. Olee otú anyị pụrụ isi rụpụta ụdị ihe Jisọs rụpụtara n’ibute ihe dị Chineke ụtọ ụzọ?
6 Rịba isi ihe ahụ ama—ime ihe dị Chineke ụtọ. Ihe nlereanya Jisọs na-emesi ike ihe ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime ihe kasị mkpa ná ndụ ha n’ụzọ ziri ezi, n’ihi na o kwuru na “onye ọ bụla mgbe e mere ya ka o zuo okè ga-adị ka onye ozizi ya.” (Luk 6:40) Ka Jisọs na-agakwa n’ụzọ Nna ya zubere, o gosiri na e nwere “ojuju afọ ọṅụ” n’ime ihe dị Chineke ụtọ ihe kasị mkpa. (Abụ Ọma 16:11; Ọrụ 2:28) Ị̀ na-ahụ ihe nke ahụ gụnyere? Ka ụmụazụ Jisọs na-ahọrọ ime ihe dị Chineke ụtọ dị ka ihe kasị mkpa ná ndụ ha, ha ga-enweta “ojuju afọ ọṅụ” na ndụ nke bụ ndụ n’ezie. (1 Timoti 6:19) Ya mere e nwere ihe karịrị otu ihe mere ime ihe dị Chineke ụtọ ga-eji bụrụ ihe dị mkpa ná ndụ anyị.
7, 8. Olee ule ndị Jisọs chere ihu, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
7 Kpọmkwem ka Jisọs gosipụtasịrị mwepụta onwe ya ime ihe dị Chineke ụtọ, Ekwensu nwara iwezụga uche ya. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ọnwụnwa n’akụkụ atọ. Na nke ọ bụla Jisọs ji okwu Akwụkwọ Nsọ, nke na-adịghị mgbagwoju anya zaghachi. (Matiu 4:1-10) Ma ule ndị ọzọ na-eche ya—mkpagbu, ịkwa emo, Judas ịrara ya nye, ebubo ụgha, e mesịakwa ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị nke n’ime ule ndị a mere ka Ọkpara Chineke na-eguzosi ike n’ihe si n’ụzọ ya wezụga onwe ya. N’otu oge siri ike, Jisọs kpere ekpere, sị: “Ọ bụghị dị ka Mụ onwe m na-achọ, kama dị ka Gị onwe gị na-achọ. . . . Ka e mee ihe Ị na-achọ.” (Matiu 26:39, 42) Ọ̀ bụ na akụkụ a nke ihe ilereanya a hapụụrụ anyị ekwesịghị ịkpali onye ọ bụla n’ime anyị n’ụzọ miri emi, na-eme ka anyị ‘na-anọgidesi ike n’ekpere’?—Ndị Rom 12:12.
8 Ee, mgbe anyị na-esetịpụ ihe ndị ka anyị mkpa ná ndụ, nduzi Chineke dị nnọọ mkpa, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị na-eche ndị iro nke eziokwu na ndị na-emegide ihe dị Chineke ụtọ ihu. Cheta arịrịọ Eze Devid kwesịrị ntụkwasị obi rịọrọ maka nduzi mgbe o nwere mmegide ndị iro. Anyị ga-ahụ nke a ka anyị na-atụle otu akụkụ nke Abụ Ọma 143. Nke a kwesịrị inyere anyị aka ịchọpụta ụzọ anyị pụrụ isi mee ka mmekọrịta onwe onye nke anyị na Jehova sie ike ma bụrụ ndị e wusiri ike idebe ime ihe dị Chineke ụtọ ihe mbụ ná ndụ anyị.
Jehova Na-anụ ma Na-aza Ekpere Anyị
9. (a) Ọ bụ ezie na Devid bụ onye mmehie, gịnị ka okwu na omume ya na-ekpughe? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji daa mbà n’ime ihe ziri ezi?
9 Ọ bụ ezie na ọ bụ onye mmehie pụrụ ịnwụ anwụ, Devid nwere okwukwe na Jehova ga-aṅa ntị n’arịrịọ ya. O ji obi umeala rịọ: “Jehova, nụrụ ekpere m; ṅaa ntị n’arịrịọ amara m nile: n’ikwesị ntụkwasị obi Gị zaa m, na n’ezi omume Gị. Ejikwala ohu Gị baa n’ikpe; n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla nke dị ndụ bụ onye ezi omume n’ihu Gị.” (Abụ Ọma 143:1, 2) Devid maara ezughị okè ya, ma obi ya zuru okè n’ebe Chineke nọ. Ya mere, obi siri ya ike na ọ ga-enweta azịza n’ezi omume. Ọ̀ bụ na nke a adịghị agba anyị ume? Ọ bụ ezie na anyị adịghị eru ezi omume Chineke, obi pụrụ isi anyị ike na ọ na-anụ olu anyị ma ọ bụrụ na obi anyị zuru okè n’ebe ọ nọ. (Eklisiastis 7:20; 1 Jọn 5:14) Ka anyị na-anọgidesi ike n’ekpere, anyị aghaghị izube ‘iwere ezi ihe merie ihe ọjọọ’ n’ajọ ụbọchị ndị a.—Ndị Rom 12:20, 21; Jemes 4:7.
10. N’ihi gịnị ka Devid ji nwee oge nchegbu?
10 Devid nwere ndị iro, dị ka anyị nwere. Ma ọ bụ dị ka onye gbara ọsọ ndụ pụọ n’ihu Sọl, nke a manyere ịgbaba n’ebe ọ nọ nanị ya, nke siri ike ịbịaru, ma ọ bụ dị ka eze ndị iro na-amaja, Devid nwere oge nchegbu ndị nke ya. Ọ kọwara otú nke a si metụta ya: “Onye iro esogbuwo mkpụrụ obi m . . . O mewo ka m biri n’ebe dị iche iche gbara ọchịchịrị . . . Mmụọ m wee ghara inwe ike n’ime m; ibobo na-anwụ obi m n’ime m.” (Abụ Ọma 143:3, 4) Ọ̀ dịwo ihe mere ị ga-eji nwee ụdị mmetụta ahụ?
11. Oge nchegbu dịgasị aṅaa ka ndị ohu Chineke n’oge a cheworo ihu?
11 Nrụgide ndị iro, ule n’ihi oké ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba, ajọ nrịanrịa, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ na-akpata nchekasị edubawo ụfọdụ ndị Chineke n’iche na mmụọ ha na-achọ ịda mbà. N’otu oge obi ha eyiwokwa ka ibobo ọ̀ na-anwụ ya. Ọ bụ dị ka hà etiwo mkpu n’otu n’otu, sị: ‘N’ihi na i mewo ka m hụ ọtụtụ mkpagbu nke jọkwara njọ, meekwa ka m dịkwa ndụ ọzọ. Chigharịakwa kasie m obi.’ (Abụ Ọma 71:20, 21) Olee otú e siworo nyere ha aka?
Ụzọ Isi Chee Mgbalị Ndị Iro Ihu
12. Olee otú Eze Devid si nagide ihe ize ndụ na ule?
12 Abụ Ọma 143:5 na-egosi ihe Devid mere mgbe ihe ize ndụ na oké ule dị iche iche chere ya ihu: “Echetawo m ụbọchị nile nke mgbe ochie; atụgharịwo m uche n’omume Gị nile: n’ọrụ aka Gị abụọ ka m tụgharịworo obi.” Devid chetara mmeso Chineke mesoro ndị ohu Ya na ụzọ ya onwe ya siworo nweta mgbapụta. Ọ tụgharịrị uche n’ihe Jehova meworo n’ihi aha ukwu Ya. Ee, Devid nọgidere na-atụgharị uche n’ọrụ Chineke.
13. Mgbe anyị chere ule ihu, olee otú anyị ịtụgharị uche n’ihe atụ oge ochie na ndị nke oge a nke ndị ozi kwesịrị ntụkwasị obi ga-esi nyere anyị aka ịtachi obi?
13 Ọ̀ bụ na anyị echetabeghị ọtụtụ mgbe mmeso Chineke mesoro ndị ya? Kpọmkwem! Nke a na-agụnye ihe ndekọ nke “oké ìgwè ndị àmà” nọrọ n’oge dị tupu ndị Kraịst mere. (Ndị Hibru 11:32-38; 12:1) A gbakwara ndị Kraịst e tere mmanụ na narị afọ mbụ ume ‘ịdị na-echeta ụbọchị ndị mbụ ahụ’ na ihe ndị ha diworo. (Ndị Hibru 10:32-34) Gịnị banyere ahụmahụ ndị nke ndị ohu Chineke n’oge ndị a, dị ka ndị a kọrọ n’akwụkwọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom?a Akụkọ ndị e dekọrọ na ya na n’ebe ndị ọzọ na-eme ka anyị nwee ike icheta ụzọ Jehova siworo nyere ndị ya aka idi mmachibido, ịnọ mkpọrọ, mwakpo ìgwè ndị na-eme ihe ike, na ogige ịta ahụhụ na ịgba ohu. E nwewo ule n’ala ebe ndị agha tijasịrị, dị ka Burundi, Liberia, Rwanda, na ebe bụbu Yugoslavia. Mgbe mmegide pụtara ìhè, ndị ohu Chineke tachiri obi n’ihi ịnọgide na-eso Jehova enwe mmekọrịta siri ike. Aka ya kwagidere ndị mere ime ihe dị ya ụtọ ihe kasị mkpa ná ndụ ha.
14. (a) Olee otu ihe atụ nke Chineke ịkwagide mmadụ n’otu ọnọdụ nke pụrụ iyi nke anyị? (b) Gịnị ka ị mụtara n’ihe atụ ahụ?
14 Otú ọ dị, ị pụrụ ịza na i nwebeghị ahụmahụ ajọ mmetọ dị otú ahụ, ọ pụkwara ịdị gị ka ọ ga-esi ike ya ịdị mgbe ị ga-enwe ya. Ma, nkwado Chineke na-enye ndị ya abụbeghị mgbe nile n’ihe ụfọdụ pụrụ ile anya dị ka ọnọdụ ndị dị ịrịba ama. Ọ kwadowo ọtụtụ ndị “nkịtị” n’ọnọdụ “nkịtị.” Nke a bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ihe atụ: Ị̀ matara foto dị n’elu, ọ̀ na-enyekwara gị aka icheta mmeso Chineke na-emeso ndị ya? Ọ pụtara n’Ụlọ Nche nke December 1, 1996. Ị̀ gụrụ akụkọ Penelope Makris kọrọ? Lee ihe nlereanya mara mma nke iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Kraịst ọ bụ! Ị̀ pụrụ icheta ihe o diri site n’aka ndị agbata obi, ụzọ o si gbasoo ajọ ahụ adịghị ike dị iche iche mgba, na mgbalị ndị o tinyere iji nọgide n’ozi oge nile? Gịnị banyere ahụmahụ ya na-enye ụgwọ ọrụ na Mytilene? Isi ihe dị ya bụ, Ị̀ na-ahụ ihe atụ ndị ahụ dị ka ihe enyemaka nye anyị nile n’isetịpụ ihe ndị ka mkpa, ibute ime ihe dị Chineke ụtọ ụzọ ná ndụ anyị?
15. Olee ụfọdụ ọrụ Jehova ndị anyị kwesịrị ịtụgharị n’uche?
15 Ịtụgharị uche n’ọrụ Jehova, dị ka Devid mere, na-ewusi anyị ike. N’imezu nzube ya, Jehova mere ndokwa maka nzọpụta site n’ọnwụ, mbilite n’ọnwụ, na ịba n’ebube nke Ọkpara ya. (1 Timoti 3:16) O guzobewo Alaeze eluigwe ya, kpochapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, weghachikwa ezi ofufe n’elu ụwa ebe a. (Mkpughe 12:7-12) O wulitewo paradaịs ime mmụọ, jirikwa mmụba gọzie ndị ya. (Aịsaịa 35:1-10; 60:22) Ndị ya na-agba àmà ikpeazụ ugbu a tupu ntiwapụ nke mkpagbu ukwu ahụ. (Mkpughe 14:6, 7) Ee, anyị nwere ihe dị ukwuu anyị ga-atụgharị uche na ha.
16. Gịnị ka a na-agba anyị ume ịdị na-atụgharị n’uche, gịnịkwa ka nke a pụrụ ịkụbanye n’obi anyị?
16 Anyị ịdị na-atụgharị uche n’ọrụ aka Chineke kama itinye uche ná mgbalị ụmụ mmadụ na-akụbanye n’obi anyị na ike Jehova tinyere n’ihe enweghị mgbochi. Ma, ọrụ ndị ahụ akwụsịghị n’ọrụ ebube ndị a na-ahụ anya nke okike n’eluigwe na n’ebe a n’elu ụwa. (Job 37:14; Abụ Ọma 19:1; 104:24) Ọrụ ebube ya gụnyere ọrụ mgbapụta dị iche iche maka ndị ya site n’aka ndị mmegbu bụ́ ndị iro, dị ka e gosiri n’ahụmahụ nke ndị ya a họpụtara ahọpụta n’oge ochie.—Ọpụpụ 14:31; 15:6.
Ịmata Ụzọ A Ga-eje Ije na Ya
17. Ruo ókè hà aṅaa ka Jehova dị adị nye Devid, oleekwa otú nke a pụrụ isi mesie anyị obi ike?
17 Devid kpere ekpere maka enyemaka ka mmiri ndụ ghara ịtakọ n’ime ya: “Agbasawo m aka m abụọ n’ebe Ị nọ: mkpụrụ obi m dị ka ala nke ịda mbà n’ebe Ị nọ. Zaa m ngwa ngwa, Jehova; mmụọ m agwụsịwo: ezonarịla m ihu Gị; ka m wee ghara iyi ndị na-arịda n’olulu.” (Abụ Ọma 143:6, 7) Devid, bụ́ onye mmehie, maara na Chineke maara ọnọdụ ya. (Abụ Ọma 31:7) Mgbe ụfọdụ anyị onwe anyị kwa pụrụ iche na ọnọdụ ime mmụọ anyị eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ala. Ma ọnọdụ ahụ abụghị nke olileanya na-adịghị ya. Jehova, onye na-anụ ekpere anyị, pụrụ ime ka anyị inwetaghachi onwe anyị gaa ngwa ngwa site n’inye anyị ume ọhụrụ site n’aka ndị okenye na-ahụ n’anya, isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche, ma ọ bụ akụkụ ihe omume ndị na-eyi ka a haziri ha kpọmkwem maka anyị.—Aịsaịa 32:1, 2.
18, 19. (a) Gịnị kwesịrị ịbụ arịrịọ anyị sitere n’ala ala obi nye Jehova? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?
18 Ntụkwasị obi anyị na Jehova na-akwali anyị ịrịọ ya, sị: “Mee m ka m nụrụ ebere Gị n’ụtụtụ; n’ihi na Gị ka m tụkwasịworo obi: mee m ka m mara ụzọ nke m ga-eje ije n’ime ya.” (Abụ Ọma 143:8) Ò mechuru Nwanna Nwanyị Makris ihu, onye nọrọ nanị ya n’otu àgwàetiti Gris? Ya mere ọ̀ ga-emechu gị ihu ka ị na-eme ime ihe dị ya ụtọ ihe kasị mkpa ná ndụ gị? Ekwensu na ndị ọrụ ya ga-achọ ịdọghachi azụ ma ọ bụ ịkwụsị kpam kpam ọrụ anyị nke mkpọsa Alaeze Chineke. Ma ànyị na-eje ozi n’ala ebe a na-ekwe n’ozuzu ya ka ezi ofufe dịrị ma ànyị na-eje ozi n’ebe a na-abịada ya, ekpere anyị jikọrọ ọnụ na-ekpe na-ekwekọ n’arịrịọ Devid: “Napụta m n’aka ndị iro m, Jehova: n’ebe Ị nọ ka m kpuchiworo onwe m.” (Abụ Ọma 143:9) Nchebe anyị megide mbibi ime mmụọ na-adabere n’ibi n’ebe nzuzo nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu.—Abụ Ọma 91:1.
19 Nkweta anyị nke ihe kasị mkpa nwere ebe ndabere siri ike. (Ndị Rom 12:1, 2) Mgbe ahụ, guzogide mgbalị nile nke ụwa ịmanye gị ịnakwere ihe ọ na-eche na ọ dị mkpa n’ihe omume mmadụ. Nọgide na-eme ka akụkụ ọ bụla nke ndụ gị na-egosipụta ihe ị maara kasị mkpa—ime ihe dị Chineke ụtọ.—Matiu 6:10; 7:21.
20. (a) Gịnị ka anyị mụtaworo banyere Devid n’Abụ Ọma 143:1-9? (b) Olee otú ndị Kraịst taa si egosipụta mmụọ Devid?
20 Amaokwu itoolu ndị mbụ nke Abụ Ọma 143 na-emesi mmekọrịta onwe onye chiri anya Devid so Jehova nwee ike. Mgbe ndị iro gbachibidoro ya, o nweere onwe ya ịrịọ Chineke maka nduzi. O kwuru obi ya, na-arịọ enyemaka maka ụzọ ziri ezi isi jee ije. Ọ bụ otu ihe ahụ taa n’ebe ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ n’elu ụwa na ndị na-esonyere ha nọ. Ha na-ewere mmekọrịta ha na Jehova dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ka ha na-arịọ ya maka nduzi. Ha na-ebute ime ihe dị Chineke ụtọ ụzọ, n’agbanyeghị nrụgide sitere n’aka Ekwensu na ụwa.
21. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa isetịpụ ezi ihe nlereanya ma ọ bụrụ na anyị ga-akụziri ndị ọzọ ihe kwesịrị ịkasị mkpa ná ndụ ha?
21 Ọ dị ọtụtụ nde mmadụ so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible mkpa ịghọta na ime ihe dị Chineke ụtọ kasị mkpa. Anyị pụrụ inyere ha aka ịghọta nke a mgbe a na-atụle isi nke 13 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke na-emesi ike ụkpụrụ ndị ịṅa Okwu ahụ ntị gụnyere.b N’ezie, ha kwesịrị ịhụ ka e mere ihe atụ ihe anyị na-akụziri ha n’ime onwe anyị. Mgbe nwa oge gasịrị, ha onwe ha kwa ga-abịa mara ụzọ ha kwesịrị ije ije. Ka ọtụtụ nde ndị a na-aghọta n’onwe ha ihe kwesịrị ịkachasị mkpa ná ndụ ha, a ga-akwali ọtụtụ iwere nzọụkwụ nke nraranye na baptism. Nke ahụ gasịa, ọgbakọ pụrụ inyere ha aka ịnọgide na-eje ije n’ụzọ nke ndụ.
22. Olee ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
22 Ọtụtụ na-anakwere ozugbo na ihe dị Chineke ụtọ kwesịrị ịkachasị mkpa ná ndụ ha. Ma, olee otú Jehova si akụziri ndị ya ihe n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu ime ihe dị ya ụtọ? Olee uru nke a na-ewetara ha? A ga-atụle ajụjụ ndị a, tinyere ntụle nke otu amaokwu gbara ọkpụrụkpụ, Abụ Ọma 143:10, n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1992.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1995.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Site n’itinye Ndị Filipaị 1:9, 10 n’ọrụ, olee otú anyị pụrụ isi guzobe ihe ndị ka mkpa?
◻ Olee otú Jisọs si gosi ihe kasị mkpa ná ndụ ya?
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’omume Devid mgbe ọ nọ n’okpuru ule?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Abụ Ọma 143:1-9 si enyere anyị aka taa?
◻ Gịnị kwesịrị ịkasị mkpa ná ndụ anyị?
[Foto dị na peeji nke 10]
Omume Devid gosipụtara ndabere ọ dabeere na Jehova
[Ebe E Si Nweta Foto]
E sepụtaghachiri ya site na Illustrirte Pracht - Bibel/Heilige Schrift des Alten und Neuen Testaments, nach der deutschen Uebersetzung D. Martin Luther’s