-
Ị Ga-abụli Enyi JehovaNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 08
Ị Ga-abụli Enyi Jehova
Jehova chọrọ ka ị mara ya nke ọma. Maka gịnị? O bu n’obi na ọ bụrụ na ị mata ụdị onye ọ bụ, mata otú o si emeso ndị ọzọ ihe nakwa ihe ndị ọ chọrọ imere gị, ị ga-achọ ka gị na ya bụrụ enyi. Ma, ị̀ ga-abụli enyi Chineke n’eziokwu? (Gụọ Abụ Ọma 25:14.) Olee ihe ị ga-eme ka i nwee ike bụrụ enyi ya? Baịbụl zara ajụjụ ndị a, kwuokwa ihe mere Jehova ji bụrụ enyi kacha mma mmadụ nwere ike inwe.
1. Gịnị ka Jehova na-agwa gị ka i mee?
Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Gịnị ka ihe a Baịbụl kwuru pụtara? Jehova na-agwa gị ka ị bịa bụrụ enyi ya. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na o siri ezigbo ike mmadụ na onye ọ na-anaghị ahụ anya ịbụ enyi, ma ya fọdụkwa mmadụ na Chineke ịbụ enyi. Ma, n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, Jehova kwuru ihe niile anyị kwesịrị ịma gbasara ụdị onye ọ bụ ka anyị nwee ike ịbịaru ya nso. Ka anyị na-agụ ihe Jehova gwara anyị na Baịbụl, anyị na ya na-adịkwu ná mma n’agbanyeghị na anyị ahụtụbeghị ya.
2. Gịnị mere Jehova ji bụrụ Enyi kacha ndị enyi niile i nwere mma?
N’ime ndị niile hụrụ gị n’anya, ọ bụ Jehova kacha hụ gị n’anya. Ọ chọrọ ka ị na-enwe obi ụtọ nakwa ka ị kpọtụrụ ya mgbe ọ bụla ị chọrọ ka o nyere gị aka. I nwere ike ‘ịkọrọ ya ihe niile na-echegbu gị, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Jehova nọ ya mgbe niile inyere ndị enyi ya aka, ịkasi ha obi, na ige ha ntị.—Gụọ Abụ Ọma 94:18, 19.
3. Olee ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha na ya bụrụ enyi?
Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya, “ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.” (Ilu 3:32) Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme ihe dị ya mma ma na-agbara ihe ọ kpọrọ asị ọsọ. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ha agaghị emetachali ihe niile Jehova chọrọ ka anyị na-eme nakwa na ha agaghị enwe ike izere ihe niile ọ sịrị na ha dị njọ. Ma, Jehova na-eme ebere. Ọ na-anabata onye ọ bụla hụrụ ya n’anya n’eziokwu, onye na-emekwa ike ya niile ime ihe dị ya mma.—Abụ Ọma 147:11; Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo ihe ị ga-eme ka gị na Jehova bụrụ enyi nakwa ihe mere o ji bụrụ Enyi kacha ndị enyi ọzọ niile i nwere mma.
4. Ebreham bụ enyi Jehova
Ihe Baịbụl kọrọ gbasara Ebreham (a na-akpọkwa ya Ebram) na-egosi anyị ihe mmadụ ịbụ enyi Chineke dị ka ya. Gụọnụ gbasara Ebreham na Jenesis 12:1-4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jehova gwara Ebreham ka o mee?
Olee nkwa Jehova kwere ya?
Gịnị ka Ebreham mere gbasara ihe ahụ Jehova gwara ya?
5. Ihe Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme
E nwere ihe ụfọdụ anyị na-achọ ka ndị enyi anyị na-eme.
Olee ihe ụfọdụ ị na-achọ ka ndị enyi gị na-emere gị?
Gụọnụ 1 Jọn 5:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme?
Anyị chọọ ịna-erubere Jehova isi, anyị kwesịrị ịhapụ ihe na-adịghị mma anyị na-eme. Gụọnụ Aịzaya 48:17, 18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere Jehova ji gwa ndị enyi ya ka ha hapụ ihe na-adịghị mma ha na-eme?
Ezigbo enyi anyị na-agwa anyị ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị ghara imerụ ahụ́ nakwa ihe ndị ga-abara anyị uru. Jehova na-emekwara ndị enyi ya ụdị ihe ahụ
6. Ihe Jehova na-emere ndị enyi ya
Jehova na-enyere ndị enyi ya aka idi nsogbu dị iche iche. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú Jehova si nyere nwaanyị anyị lere na vidio a aka ka obi kwụsị ịna-ajọ ya njọ?
Gụọnụ Aịzaya 41:10, 13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jehova kwere nkwa na ọ ga-emere ndị enyi ya niile?
Ì chere na Jehova ga-abụli ezigbo Enyi mmadụ? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
Ezigbo enyi na-enyere enyi ya aka. Jehova ga-enyekwara gị aka
7. Jehova na onye ya na ya bụ enyi ga na-akparịta ụka
Enyi na enyi na-adịkwu ná mma ma ha na-akparịta ụka. Gụọnụ Abụ Ọma 86:6, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị nwere ike isi na-agwa Jehova okwu?
Olee otú Jehova si agwa anyị okwu?
Anyị na-agwa Jehova okwu ma anyị kpewe ekpere; yanwa na-agwa anyị okwu ma anyị gụwa Baịbụl
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na mmadụ na Chineke emekataghị bụrụ enyi.
Olee amaokwu Baịbụl ị ga-eji gosi mmadụ na anyị na Jehova ga-abụli enyi?
NCHỊKỌTA
Jehova chọrọ ịbụ Enyi gị, ọ ga-enyekwara gị aka ka gị na ya dị ná mma.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee otú Jehova si enyere ndị enyi ya aka?
Gịnị mere Jehova ji gwa ndị enyi ya ka ha hapụ ihe na-adịghị mma ha na-eme?
Ì chere na ihe Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme karịrị akarị? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Olee uru ịbụ enyi Chineke ga-abara gị?
“Jehova—Chineke nke Kwesịrị Ka A Mara Ya” (Ụlọ Nche, February 15, 2003)
Chọpụta otú ị ga-esi abụ enyi Chineke.
Chọpụta ihe mere otu nwaanyị ji kwuo na enyi ya na Jehova bụ zọrọ ya ndụ.
Gere ihe ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa kwuru gbasara Jehova.
-
-
Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo UruNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
6. Anyị na-esoro n’ezinụlọ Jehova ma anyị mee baptizim
Anyị mee baptizim, anyị na-esoro n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova niile merela baptizim si n’obodo dị iche iche, sikwa n’ezinụlọ dị iche iche, ha niile kweere otu ihe, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru. Gụọnụ Abụ Ọma 25:14 na 1 Pita 2:17. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mmadụ mee baptizim, olee otú adịm ná mma ya na Jehova nakwa adịm ná mma ya na ndị ọzọ na-efe Jehova na-abịa dịrị?
-
-
Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
2. Olee ihe anyị ga-eme ka ndụ anyị nwee isi?
Jehova kere anyị otú anyị ga-ama ‘na ọ bụ ya kwesịrị ịna-eduzi anyị,’ ya bụ, o kere anyị ka ịmụ gbasara ya na ife ya na-agụ anyị agụụ. (Gụọ Matiu 5:3-6.) Ọ chọrọ ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma, ‘ka anyị na-eme uche ya n’ihe niile, ka anyị hụ ya n’anya, ka anyị jirikwa obi anyị niile’ na-efe ya. (Diuterọnọmi 10:12; Abụ Ọma 25:14) Anyị mee ihe ndị a, obi ga na-atọ anyị ezigbo ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị nwere. Ọ bụrụ na anyị ana-efe Jehova, ndụ anyị ga-enwe isi n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ihe dị ya mma.
-