“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”
Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Ụkpụrụ Bible Mere Ka E Nwee Ọdịiche
DỊ KA onye ntorobịa, Adrian bụ onye ọnụma juru obi na onye na-ebu iwe n’obi. Ịbụ onye a na-akpasu iwe ngwa ngwa mere ka ọ bụrụ onye na-ewe iwe ọkụ. Ọ na-aṅụ oké mmanya, na-ese siga ma na-ebi ndụ rụrụ arụ. A maara Adrian dị ka onye òtù egwú rock, o gburu egbugbu na-egosipụta echiche ya nke ekweghị n’ọchịchị. N’ịkọwa ihe mere n’afọ ndị ahụ, ọ na-ekwu, sị: “Ana m akpụ isi m dị ka nke ndị òtù egwú rock, jiri mgba nyakọta ntutu isi m, mgbe ụfọdụkwa, m na-eji uhie ma ọ bụ àgwà ọzọ tejie ya.” Adrian gbapukwara imi ya.
Adrian sooro ndị ntorobịa nnupụisi ole na ole ndị ọzọ kwaba n’otu ụlọ dakasịrị adakasị. N’ebe ahụ, ha na-aṅụ oké mmanya ma na-eji ọgwụ ike eme ihe. “M na-eji ọgwụ ike bụ́ speed eme ihe ma na-agbanyekọta ya na ọgwụ Valium na ihe ọ bụla ọzọ ruru m aka n’ahụ́ m,” ka Adrian na-echeta. “Mgbe m na-enweghị ọgwụ ike ma ọ bụ mgba, m na-amịrị mmanụ ụgbọala site n’ụgbọala ndị mmadụ ma na-ekuru ya n’imi.” N’ihi ibi ndụ nke ime mpụ n’okporo ámá, Adrian ghọrọ onye na-eyi egwu na onye na-eme ihe ike n’ụzọ gabigara ókè. Ndị mmadụ n’ozuzu achọghị ihe ọ bụla ga-ejikọ ha na ya. N’otu oge ahụ, aha ọjọọ o meere onwe ya dọtaara ya ndị enyi ọjọọ.
Nwayọọ nwayọọ, Adrian ghọtara na “ndị enyi” ya na-eso ya akpakọrịta nanị n’ihi ihe ha pụrụ irite. Ọzọkwa, o kwubiri na “iwe na ime ihe ike nile ahụ arụpụtaghị ezi ihe ọ bụla.” N’ịbụ onye ndụ ya na-enweghị nzube na onye nwere nkụda mmụọ, ọ hapụrụ ndị ahụ ya na ha na-akpakọrịta. Mgbe ọ hụrụ otu Ụlọ Nche n’ebe a na-ewu ụlọ, ozi ya dabeere na Bible dọọrọ mmasị ya, nke a dugakwara ya n’iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Adrian ji oké mmasị zaghachi n’òkù ahụ bụ́: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Dị ka ihe si na ya pụta, n’oge na-adịghị anya, Adrian hụrụ mkpa ọ dị ịmalite itinye ụkpụrụ ndị a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ.
Ihe ọmụma Bible ọ nọ na-enwewanye nwere mmetụta dị mma n’akọ na uche Adrian, o mekwara ka ụzọ ndụ ya gbanwee. E nyeere ya aka imeri iwe ọkụ ya ma mee ka o nwee njide onwe onye. N’ihi ikike nke Okwu Chineke, Adrian ghọrọ nnọọ onye dị iche.—Ndị Hibru 4:12.
Otú ọ dị, olee otú Bible pụrụ isi nwee mmetụta siri ike dị otú ahụ? Ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka ‘iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ.’ (Ndị Efesọs 4:24) Ee, a na-agbanwe ụdị mmadụ anyị bụ site n’anyị itinye ezi ihe ọmụma a na-achọta n’ime Bible n’ọrụ. Ma olee otú ihe ọmụma dị otú ahụ si agbanwe ndị mmadụ?
Nke mbụ, Bible na-eme ka a ghọta àgwà ndị na-adịghị mma bụ́ ndị ọ dị mkpa ka a hapụ. (Ilu 6:16-19) Nke abụọ, Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume igosipụta àgwà ndị dị mma bụ́ ndị mmụọ nsọ Chineke na-amịpụta. Ha gụnyere “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.
Nghọta miri emi nke ihe ndị Chineke chọrọ nyeere Adrian aka inyocha onwe ya ma hụta àgwà ndị ọ dị mkpa ka ọ zụlite na ndị o kwesịrị ịhapụ. (Jems 1:22-25) Ma nke ahụ bụ nanị mmalite. Tụkwasị n’ihe ọmụma, mkpali dị mkpa—ihe ga-akpali Adrian ịchọ ime mgbanwe.
Adrian mụtara na a na-akpụzi ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ dị mma “dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị.” (Ndị Kọlọsi 3:10) Ọ bịara ghọta na àgwà Onye Kraịst aghaghị iyi nke Chineke. (Ndị Efesọs 5:1) Site n’ọmụmụ Bible, Adrian mụtara otú Jehova si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe ma hụta àgwà ọma ndị Chineke nwere, ndị dị ka, ịhụnanya, obiọma, ịdị mma, ebere, na ezi omume. Ihe ọmụma dị otú ahụ kpaliri Adrian ịhụ Chineke n’anya na ịgbalịsi ike ịbụ ụdị onye Jehova na-anakwere.—Matiu 22:37.
Ka oge na-aga nakwa site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, Adrian kwụsịrị iwe iwe ọkụ. Ya na nwunye ya nọ ugbu a na-enyere ndị ọzọ aka ịgbanwe ndụ ha site n’enyemaka nke ihe ọmụma Bible. “N’adịghị ka ndị enyi m mbụ bụ́ ndị nwụrụlanụ ugbu a, m ka dị ndụ ma nwee ndụ ezinụlọ obi ụtọ,” ka Adrian na-ekwu. Adrian bụ ihe àmà a na-ahụ anya nke ike Bible nwere ịgbanwe ndụ ndị mmadụ ịka mma.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]
“Iwe na ime ihe ike nile ahụ arụpụtaghị ezi ihe ọ bụla”
[Igbe dị na peeji nke 25]
Ụkpụrụ Bible Ndị Nọ n’Ọrụ
Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ụkpụrụ Bible ndị nyewooro ọtụtụ ndị na-ewe oké iwe na ndị na-eme ihe ike aka ịghọ ndị na-eme udo:
“Bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere.” (Ndị Rom 12:18, 19) Kwee ka Chineke kpebie mgbe na ndị ọ ga-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ́ ha. Ọ pụrụ ime otú ahụ na-ama ihe nile metụtara okwu ahụ, nkwụghachi ọ bụla o nyekwara ga-egosipụta ikpe ziri ezi ya nke zuru okè.
“Weenụ iwe, ma unu emehiekwala; ka anyanwụ ghara ịda n’ebe unu nọ n’ọnọdụ mkpasu iwe, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Ndị Efesọs 4:26, 27) Mmadụ pụrụ iwe iwe n’ụzọ ziri ezi mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na nke a emee, o kwesịghị ịnọgide “n’ọnọdụ mkpasu iwe.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na nke a pụrụ ịkpali ya ime ihe ọjọọ, si otú ahụ na-enye “Ekwensu ohere,” bụ́ nke ga-eme ka Jehova Chineke jụ ya.
“Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:8) Mmetụta ndị a na-achịkwaghị achịkwa na-eduga n’omume ndị a na-achịkwaghị achịkwa. Ọ bụrụ na mmadụ achịkwaghị iwe ya achịkwa, o yikarịrị ka ọ̀ ga-ekwu ma ọ bụ mee ihe ga-ewute ndị nile o metụtara.