Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ònye Nwere Ike Ịnapụta Ndị Na-eti Mkpu Enyemaka?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọgọst 15
    • 14, 15. Olee otú anyị si mara na Jizọs ma ụmụ mmadụ nke ọma nakwa na “ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka”?

      14 Ụmụ mmadụ, bụ́ ndị mmehie nọ n’ọnọdụ ọjọọ, chọsiri enyemaka ike. Ma, anyị nwere olileanya. (Gụọ Abụ Ọma 72:12-14.) Jizọs, bụ́ Sọlọmọn Ka Ukwuu, na-emere anyị ebere n’ihi na ọ ma na anyị ezughị okè. Ihe ọzọ bụ na Jizọs tara ahụhụ maka ezi omume, Chineke hapụkwara ya ka o jiri aka ya die ọnwụnwa ndị bịaara ya. E nwedịrị mgbe obi na-erughị Jizọs ala nke mere ka ‘ọsụsọ ya dị ka ọbara nke na-atapụsị n’ala’! (Luk 22:44) N’oge ọzọ, mgbe a kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ, o tiri mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?” (Mat. 27:45, 46) N’agbanyeghị ahụhụ niile Jizọs tara nakwa mbọ niile Setan gbara ka ọ kwụsị irubere Jehova isi, ọ nọgidere na-erubere Jehova Chineke isi.

  • Ònye Nwere Ike Ịnapụta Ndị Na-eti Mkpu Enyemaka?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọgọst 15
    • 16. Gịnị mere Sọlọmọn ji nwee ike ịmata nsogbu ndị ọ na-achị nwere?

      16 Sọlọmọn ‘meere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere’ n’ihi na ọ ma ihe, ghọtakwa ọnọdụ ndị ọ na-achị. E wezụga nke a, o nwere ọtụtụ nsogbu na ihe isi ike ná ndụ ya. Nwanne Sọlọmọn bụ́ Amnọn dinara nwanne ya nwaanyị bụ́ Tema, nwanne ya nke ọzọ bụ́ Absalọm gburu Amnọn n’ihi nke a. (2 Sam. 13:1, 14, 28, 29) O nwedịrị mgbe Absalọm chụpụrụ Devid n’ocheeze ya. Ma, ọ nọteghị aka n’ocheeze ahụ, Joab mechakwara gbuo Absalọm. (2 Sam. 15:10, 14; 18:9, 14) Ka oge na-aga, nwanne Sọlọmọn bụ́ Adọnaịja chọrọ ịnaghara Sọlọmọn ọchịchị. A si na ọ naghaara ya, ọ gaara egbu Sọlọmọn. (1 Eze 1:5) Ihe Sọlọmọn kpere n’ekpere mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ ahụ ọ rụrụ nye Jehova gosiri na ọ ma ụdị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. O kpere ekpere banyere ndị ọ na-achị, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha maara ihe na-egbu ya mgbu na ihe na-afụ ya ụfụ; . . . gị onwe gị [Jehova] . . . gbagharakwa wee kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya niile si dị.”—2 Ihe 6:29, 30.

      17, 18. Olee ihe mgbu ụfọdụ ndị ohu Chineke na-edi, oleekwa ihe ndị nyeerela ha aka idi ya?

      17 Ihe ndị anyị mere n’oge gara aga nwere ike ịbụ ya kpatara ‘ihe na-egbu anyị mgbu.’ Meri,a bụ́ otu Onyeàmà gaferela afọ iri atọ, dere, sị: “M kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ, ma, ọ na-abụ m cheta ihe ndị m mere n’oge gara aga, ihere onwe m ana-eme m. M na-enwe mwute dị ukwuu, ákwá ana-agụkwa m dị ka a ga-asị na ihe ndị a mere ụnyaahụ. M cheta ha, ọ na-adị m ka o nweghị ihe m dị mma ya, obi m na-amakwa m ikpe.”

      18 Ọ na-adị ọtụtụ ndị ohu Chineke otú a ọ dị nwanna nwaanyị a, ma, gịnị nwere ike inyere ha aka ịtachi obi? Meri kwukwara, sị: “Ezigbo ndị enyi m na ụmụnna na-eme ka m na-enwe obi ụtọ. M na-agbalị ime ka obi m dịrị n’ihe ndị Jehova kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu, obi sikwara m ike na mkpu m na-eti maka enyemaka ga-aghọ mkpu ọṅụ.” (Ọma 126:5) Anyị kwesịrị inwe obi ike na Ọkpara Chineke, bụ́ Onye Ọchịchị ọ họpụtara, ga-enyere anyị aka. E buru amụma banyere ya, sị: “Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike, ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” (Ọma 72:13, 14) Nke a na-akasi anyị nnọọ obi.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya