Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Baịbụl Baara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Isi nke 11. Ebe otu nwaanyị na-agụ Baịbụl mgbe ọ na-ezu ike n’ọrụ ụlọ ọ na-arụ.

      ISI NKE 11

      Ihe Ị Ga-eme Ka Baịbụl Baara Gị Ezigbo Uru

      Ò nwetụla ihe ị chọrọ ime, ma ịmalite ime ya esiere gị ike n’ihi otú o si buo ibu? Ka ihe ahụ dịrị gị mfe ime, i nwere ike ikeri ya ekeri. Ụdị ihe a ka anyị nwere ike ime gbasara ịgụ Baịbụl. I nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Olee ebe m ga-ebido ebido?’ N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụmụ obere ihe ndị ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na ịmụ ya na-atọ gị ụtọ.

      1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agụ Baịbụl mgbe niile?

      Ọ bụrụ na mmadụ ana-agụ Baịbụl ma ọ bụ “Iwu Jehova” mgbe niile, obi ga na-atọ ya ụtọ, ihe ana-agakwara ya nke ọma. (Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.) Iji malite, jiri nkeji ole na ole na-agụ ya kwa ụbọchị. Ịgụ ya ga-abịa tọwa gị ụtọ ma ị hụ na ị na-amụta ihe.

      2. Olee ihe ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl baara gị uru?

      Anyị chọọ ka ịgụ Baịbụl baara anyị uru, anyị kwesịrị ịna-eme anyị gụtụ, anyị akwụsị, chebara ihe anyị na-agụ echiche. Anyị kwesịrị ịna-agụ ya “ma na-atụgharị uche na ya.” (Joshụa 1:8) Ị na-agụ Baịbụl, na-ajụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m gbasara Jehova Chineke? Olee otú m ga-esi na-eme ihe a m gụrụ? Olee otú m ga-esi jiri amaokwu a nyere ndị ọzọ aka?’

      3. Olee otú ị ga-esi ewepụta ohere ị ga-eji na-agụ Baịbụl?

      Ọ̀ na-esiri gị ike iwepụta ohere ị ga-eji na-agụ Baịbụl? Ọ na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike. Gbalịa ‘na-eji oge gị eme ihe kacha mkpa.’ (Ndị Efesọs 5:16) Otú ị ga-esi eme ya bụ iwepụta oge a kapịrị ọnụ ị ga-eji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ụfọdụ na-agụ Baịbụl n’isi ụtụtụ. Ndị ọzọ na-agụ ya n’oge ọzọ n’ụbọchị, dị ka n’oge ha kwụsitụrụ ọrụ n’ehihie. E nwekwara ndị na-agụ nke ha n’abalị tupu ha alakpuo. Olee oge nke ga-akara gịnwa mma?

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta ihe ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ. Chọpụtakwa otú ị ga-esi akwadebe nke ọma ka iji akwụkwọ a amụ Baịbụl na-atọ gị ụto.

      Foto atọ na-egosi ebe otu nwatakịrị nwoke na-amụ iri nri ọ na-eritụbeghị, nri ahụ emechaa tọwa ya ụtọ. 1. O ji nri ahụ egwu egwu. 2. Mgbe o tolitekwuru, o ritụwara nri ahụ. 3. Mgbe o tolitetụkwukwara, nri ahụ bịaziri tọwa ya ụtọ.

      Otú ahụ anyị nwere ike malite iri nri anyị na-eritụbeghị, ya atọwazie anyị ụtọ ka anyị nwere ike isi malite ịgụ Baịbụl, ya atọwazie anyị ụtọ

      4. Mụta ịgụ Baịbụl otú ọ ga na-atọ gị ụtọ

      Ịmalite ịgụ Baịbụl nwere ike isiri gị ike. Ma, anyị nwere ike ime ka ịgụ ya na-atọ anyị ụtọ otú ahụ mmadụ nwere ike malite iri nri ọ na-eritụbeghị, ya atọwazie ya ụtọ. Gụọnụ 1 Pita 2:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ì chere na e nwere mgbe ọ ga-eru ịgụ ya ana-atọzi gị ụtọ, ya ana-adịkwa gị ka oge i ji agụ ya ruwe eruwe?

      Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú ịgụ Baịbụl si bido tọwa ụfọdụ ndị ụtọ. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Ụmụ Okoro na Agbọghọ Ndị Na-amụta Ịhụ Okwu Chineke n’Anya (5:33)

      • Olee ihe ndị mere ka ịgụ Baịbụl na-esiri ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị hụrụ na vidio a ike?

      • Gịnị nyeere ha aka ịna-agụ Baịbụl n’oge ha wepụtara maka ya?

      • Olee otú ha si mee ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu ha ụtọ?

      Ihe ndị ị ga-eme ná mmalite:

      • Na-agụ Baịbụl a sụgharịrị otú ndị mmadụ si asụ asụsụ unu ugbu a. I nwere ike na-agụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ma ọ bụrụ na ọ dị n’asụsụ ị na-asụ.

      • Buru ụzọ gụwa ebe ndị na-akacha amasị gị na Baịbụl. Ị chọọ ịmatakwu otú ị ga-esi eme ya, gụọ chaatị isiokwu ya bụ “Malite Ịgụ Baịbụl.”

      • Na-edetu otú i si na-agụ. Jiri chaatị isiokwu ya bụ “Katụ Ihe n’Ebe Ị Kwụsịrị n’Ọgụgụ Baịbụl Gị” na-eme ya. Ọ dị n’akwụkwọ a.

      • Na-eji JW Library® agụ Baịbụl. Ihe ị ga-eji na-aga na ya bụ ekwentị na-aga n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ dị ka ya. I nwere ike ịnọ ebe ahụ gụọ Baịbụl ma ọ bụ gere ya egere n’agbanyeghị ebe ị nọ.

      • Na-agụ ebe a kpọrọ Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ihe ị ga-ahụ ebe ahụ bụ map, chaatị, na ebe a kọwara okwu ndị dị na Baịbụl. Ha ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ.

      5. Na-akwadebe akwadebe maka ọmụmụ ihe unu

      Gụọnụ Abụ Ọma 119:34. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị mere o ji dị mma ka ị na-ekpe ekpere tupu gị agụwa Baịbụl ma ọ bụkwanụ tupu gị akwadebewe maka ọmụmụ ihe unu?

      Olee ihe ị ga-eme ka ọmụmụ ihe unu na-abara gị ezigbo uru? Ị na-akwadebe ihe unu ga-amụ, gbalịa mee ihe ndị a:

      1. A. Gụọ paragraf niile dị tupu ebe a kpọrọ “Mụtakwuo Ihe.”

      2. B. Chọta amaokwu Baịbụl ndị e dere na ha ma gụọ ha. Gbalịakwa ka ị mata otú ha si akọwa ihe a na-ekwu n’isiokwu ahụ.

      3. CH. Kanye ihe n’okpuru okwu ma ọ bụ n’ahịrịokwu zara ajụjụ nke ọ bụla. Ọ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịza ajụjụ mgbe unu ga-amụwa ya.

      Foto atọ na-egosi ebe otu nwaanyị na-akwadebe ihe ya na onye na-amụrụ ya ihe ga-amụ. A. Ọ na-agụ peeji mbụ n’isiokwu ọ na-akwadebe. B. Ọ sapetara amaokwu Baịbul e dere na ya ma na-agụ ya. CH. Ọ na-akanye ihe n’okwu nakwa n’ahịrịokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na paragraf ọ na-agụ.

      Ị̀ ma ihe a?

      Ndịàmà Jehova na-agụ Baịbụl dị iche iche. Ma, nke kacha amasị anyị bụ Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, n’ihi na a sụgharịrị ya nke ọma, ọ dị mfe ọgụgụ, aha Chineke dịkwa na ya n’ebe niile o kwesịrị ịdị.—Gụọ isiokwu gbara n’Ịntanet bụ́ “Ndịàmà Jehova Hà Nwere Baịbụl nke Ha?”

      ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ịmụ Baịbụl abụghị obere ọrụ, na ike ya adịghị ha, nakwa na ha enweghị ohere ya.

      • Gịnị ka i chere gbasara ihe a ha na-ekwu?

      NCHỊKỌTA

      Ị chọọ ka Baịbụl baara gị ezigbo uru, wepụta oge ị ga-eji na-agụ ya, na-ekpe ekpere ka ị ghọta ihe ị na-agụ, na-akwadebekwa akwadebe maka ọmụmụ ihe unu.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Olee ihe ị ga-eme ka Baịbụl baara gị ezigbo uru?

      • Olee oge i nwere ike iwepụta n’ụbọchị ị ga-eji na-agụ ma na-amụ Baịbụl?

      • Gịnị mere o ji dị mma ịkwado akwado maka ọmụmụ ihe unu?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Chọpụta ihe ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ezigbo ụtọ.

      “Olee Ihe Ị Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ Gị Ụtọ?” (Ụlọ Nche Nke 1 2017)

      Chọpụta ụzọ atọ i nwere ike isi na-agụ Baịbụl.

      “Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka? —Nke 1: Na-agụ Baịbụl Gị” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

      Chọpụta ihe ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ.

      “Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?—Nke 2: Mee Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ Gị Ụtọ” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

      Chọpụta ihe ndị gụrụla Baịbụl ọtụtụ afọ kwuru ga-enyere gị aka ka ịmụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ.

      Na-amụ Ihe nke Ọma (2:06)

  • Nọgide Na-eme Ka Gị na Jehova Na-adị ná Mma
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 4. Nọgide na-agwa ezigbo enyi gị okwu ma na-ege ya ntị

      Ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl enyerela gị aka gị na Jehova abụrụ enyi. Olee otú ha ga-esi mee ka gị na ya na-adịkwu ná mma?

      Gụọnụ Abụ Ọma 62:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ebe ọ bụ na ekpere ga-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma, olee ihe i nwere ike ime ka ekpere gị na-erijukwu afọ?

      Gụọnụ Abụ Ọma 1:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ebe ọ bụ na ịgụ Baịbụl ga-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma, olee otú i nwere ike isi na-agụ Baịbụl otú ga-abara gị uru?

      Olee ihe i nwere ike ime ka otú i si amụ ihe n’onwe gị bakwuoro gị uru? Unu chọọ ịhụ ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Na-amụ Ihe nke Ọma (5:22)

      • Olee ụfọdụ ihe e kwuru na vidio a i nwere ike ime ma ị mụwa Baịbụl n’onwe gị?

      • Olee isiokwu ndị ị ga-achọ ịmụ gbasara ha ma ị mụwa ihe?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya