Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/15 p. 15-20
  • Nlekọta Dị Nro Dị Atụrụ Jehova Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nlekọta Dị Nro Dị Atụrụ Jehova Mkpa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ji Ọchịchọ Obi Na-azụ Atụrụ
  • Mgbe Ndị Ọhụrụ Chọrọ Ime Nkwusa
  • Ime Ihe Banyere Mkpa Ndị Pụrụ Iche
  • Ọ Bụrụ na Onye Ọhụrụ Emehie
  • Nyere Ha Aka ‘Iru Ntozu Okè’
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • “Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Nke Unu Na-elekọta”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Iji Ịdị Nro Na-azụ Atụrụ Jehova Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/15 p. 15-20

Nlekọta Dị Nro Dị Atụrụ Jehova Mkpa

“Maranụ na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke. . . . Anyị bụ ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya.”—ABỤ ỌMA 100:3.

1. Olee ụzọ Jehova si emeso ndị ohu ya?

JEHOVA bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu ya, ọ na-ele anyị anya dị ka atụrụ ya, na-enyekwa anyị nlekọta dị nro. Nna anyị nke eluigwe na-akasi anyị obi, na-enyekwa anyị ume ọhụrụ, na-edukwa anyị “n’ụzọ nile nke ezi omume n’ihi aha Ya.” (Abụ Ọma 23:1-4) Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nke na ọ tọgbọrọ ndụ ya n’ihi anyị.—Jọn 10:7-15.

2. N’ọnọdụ dị aṅaa ka ndị Chineke na-achọta onwe ha?

2 Dị ka ndị na-enweta nlekọta dị nro, anyị pụrụ isoro onye ọbụ abụ ahụ kwuo, sị: “Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe: werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu Ya. Maranụ na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke: Ya onwe ya emewo anyị, ọ bụkwa Ya nwe anyị; anyị bụ ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya.” (Abụ Ọma 100:2, 3) Ee, anyị nwere ọṅụ ma nọrọ ná ntụkwasị obi. Ọ dị nnọọ ka e chebewo anyị n’ime ogige atụrụ nke nwere mgbidi nkume siri ike pụọ n’aka ndị mwakpo ọjọọ.—Ọnụ Ọgụgụ 32:16; 1 Samuel 24:3; Zefanaịa 2:6.

Ndị Ji Ọchịchọ Obi Na-azụ Atụrụ

3. Olee ụzọ ndị okenye ndị Kraịst a họpụtara ahọpụta si emeso ìgwè atụrụ Chineke?

3 Ka a sịkwa ihe mere anyị ji enwe ọṅụ dị ka atụrụ Chineke! Ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-edu ndú n’etiti anyị. Ha adịghị ‘eme onwe ha ndi isi,’ eme onwe ha dị ka ndị nwe anyị, ma ọ bụ na-anwa ime onwe ha ndị nwe okwukwe anyị. (Ọnụ Ọgụgụ 16:13; Matiu 20:25-28; 2 Ndị Kọrint 1:24; Ndị Hibru 13:7) Kama nke ahụ, ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ ịhụnanya na-etinye ndụmọdụ Pita onyeozi n’ọrụ: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu, na-elekọta ha anya, ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa unu, kama site n’ọchịchọ obi, dị ka Chineke chọrọ; ọ bụghịkwa n’ihi uru na-eweta ihere, kama n’ihi na unu dị ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa dị ka a ga-asị na unu na-eme ndị bụ ihe nketa dị ka unu bụ ndị nwe ha, kama na-eme onwe unu ihe atụ ìgwè atụrụ nta ahụ ga-eṅomi.” (1 Pita 5:2, 3) Pọl onyeozi gwara ndị okenye ibe ya, sị: “Na-ezenụ onwe unu na ìgwè atụrụ nta nile, nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya, ka unu na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ, nke O ji ọbara nke [Ọkpara, NW] ya onwe ya zụtara Onwe ya.” Leekwa aha ekele atụrụ ahụ na-enwe n’ihi na ndị ikom mmụọ nsọ họpụtara ‘na-emere ìgwè atụrụ ahụ ebere’!—Ọrụ 20:28-30.

4. Ụdị mmekọrịta dị aṅaa nke ya na ìgwè atụrụ ahụ ka e ji mara Charles T. Russell nke ọma?

4 Jisọs nyere ọgbakọ ahụ ‘onyinye dị iche iche e nyere ná mmadụ,’ ụfọdụ dị ka “ndị pastọ,” ma ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-emeso ìgwè atụrụ Jehova n’ụzọ dị nro. (Ndị Efesọs 4:8, 11; King James Version) Otu n’ime ndị ikom a bụ Charles T. Russell, onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society. A na-akpọ ya Pastọ Russell n’ihi omume ịhụnanya na ọmịiko ya n’ịzụ ìgwè atụrụ ahụ n’okpuru Onye Isi Ọzụzụ Atụrụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Taa, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-ahọpụta ndị okenye ndị Kraịst, a na-elezikwa anya ka a ghara iji okwu ndị dị ka “pastọ,” “okenye,” ma ọ bụ “onye ozizi” eme ihe dị ka utu aha. (Matiu 23:8-12) Ma, ndị okenye nke oge a na-arụ ọrụ ndị pastọ, ma ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ, maka abamuru nke atụrụ nke ọzụzụ anụ Jehova.

5. N’ihi gịnị ka ndị ọhụrụ kwesịrị iji mara ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ Kraịst?

5 Dị ka ndị ọzụzụ atụrụ, ndị okenye na-ekere òkè dị mkpa n’ọganihu ime mmụọ nke ndị ọhụrụ. N’ihi ya, akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na-ekwu na peji nke 168, sị: “Mata ndị okenye a họpụtara n’ime ọgbakọ. Ha nwere ahụmahụ dị ukwuu n’itinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ, n’ihi na ha eruwo ihe ndị a chọrọ maka ndị nlekọta bụ́ ndị e setịpụrụ n’ime Bible. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) Alala azụ ijekwuru otu n’ime ha ma ọ bụrụ na i nwere mkpa enyemaka ime mmụọ iji merie otu àgwà nke megidere ihe ndị Chineke chọrọ. Ị ga-achọpụta na ndị okenye na-agbaso okwu ịdọ aka ná ntị Pọl bụ́: ‘Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.’—1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8; 5:14.”

Mgbe Ndị Ọhụrụ Chọrọ Ime Nkwusa

6. Usoro dị aṅaa ka a na-agbaso ma ọ bụrụ na onye a na-eduziri ọmụmụ Bible na-achọ ịghọ onye nkwusa Alaeze?

6 Mgbe onye a na-eduziri ọmụmụ Bible narasịịrị ihe ọmụma ma bịakwa nzukọ ruo nwa oge, ọ pụrụ ịchọ ịghọ onye nkwusa Alaeze, onye na-ekwusa ozi ọma. (Mak 13:10) Ya bụrụ otú ahụ, Onyeàmà ahụ na-eduziri ya ọmụmụ Bible kwesịrị ịkpọtụrụ onye isi oche ndị nlekọta, bụ́ onye ga-ahazi ka otu n’ime ndị okenye nọ na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ na onye okenye ọzọ soro onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ Bible na onye nkụzi ya zukọọ. Nkwurịta okwu ahụ ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, peji nke 98 na 99. Ọ bụrụ na ndị okenye abụọ ndị a ahụ na onye ọhụrụ ahụ kweere ozizi Bible ndị bụ́ isi ma na-ekwekọkwa n’ụkpụrụ Chineke, a ga-agwa ya na o ruru eru ikere òkè n’ozi ihu ọha.a Mgbe o nyere akụkọ ozi ya site n’idejupụta akụkọ ozi ubi, a ga-edebanye ya na kaadị Ihe Ndekọ Ọgbakọ Maka Onye Nkwusa nke e mepụtara n’aha ya. Onye ọhụrụ ahụ pụrụ ugbu a isoro nde ndị ọzọ ndị ji ọṅụ ‘ekwusa okwu Chineke’ nyekọọ akụkọ ọrụ ịgba àmà ya. (Ọrụ 13:5) A ga-amara ọgbakọ ọkwa na ọ bụrụwo onye nkwusa a na-emebeghị baptism.

7, 8. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ isi nyere onye nkwusa a na-emebeghị baptism aka n’ozi?

7 Onye nkwusa a na-emebeghị baptism nwere mkpa enyemaka nke ndị okenye na ndị Kraịst ọzọ tozuru okè. Dị ka ihe atụ, ọganihu ime mmụọ ya ga-abụ ihe mmasị nye onye na-eduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke ọ na-aga. Ọ pụrụ isiri onye nkwusa ọhụrụ ahụ ike ikwu okwu n’ụzọ dị irè n’ọrụ ụlọ n’ụlọ. (Ọrụ 20:20) Ya mere, ọ ghaghị ịbụ na ọ ga-anabata enyemaka, karịsịa site n’aka onye ahụ nọworo na-eduziri ya ọmụmụ Bible site n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ụdị enyemaka ahụ dị irè kwesịrị ekwesị, n’ihi na Jisọs Kraịst kwadebere ndị na-eso ụzọ ya maka ozi ahụ.—Mak 6:7-13; Luk 10:1-22.

8 Ọ bụrụ na ozi anyị ga-adị irè, nkwadebe dị mma nke e bu ụzọ mee dị mkpa. Ya mere, ndị nkwusa abụọ ahụ pụrụ ibu ụzọ nọkọta ọnụ ịmụgharị ụzọ isi jekwuru mmadụ bụ́ ndị a tụrụ aro ha n’Ozi Alaeze Anyị ndị na-abịa kwa ọnwa. Mgbe ha malitere ozi ubi ha, onye nke ka nwee ahụmahụ pụrụ ikwu okwu n’ọnụ ụzọ nke mbụ ma ọ bụ abụọ. Mgbe okwu mmalite nke enyi gasịrị, ndị nkwusa abụọ ahụ pụrụ ikere òkè n’ịgba àmà. Ịrụkọta ọrụ ọnụ n’ozi ruo izu ole na ole pụrụ iduga ná nletaghachi na ọbụna ọmụmụ Bible ebe obibi n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Onye nkwusa nke ka nwee ahụmahụ pụrụ iduzi ọmụmụ ihe ahụ ruo nwa oge ma nyefezie ya onye nkwusa Alaeze ọhụrụ ahụ. Lee obi ụtọ ndị nkwusa abụọ ahụ ga-enwe ma ọ bụrụ na onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ Bible egosipụta ekele maka ihe ọmụma Chineke!

9. Ndokwa ndị dịgasị aṅaa ka a na-eme mgbe onye nkwusa chọrọ ka e mee ya baptism?

9 Ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism na-aga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ, ọ pụrụ ịrara onwe ya nye Chineke n’ekpere ma chọọkwa ka e mee ya baptism. (Tụlee Mak 1:9-11.) O kwesịrị ime ka onye isi oche ndị nlekọta mara ọchịchọ ya maka baptism, bụ́ onye ga-ahazi ka ndị okenye soro onye nkwusa ahụ tụleghachi ajụjụ ndị dị na peji nke 175 ruo 218 nke Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ndị okenye atọ dị iche iche pụrụ iji oge ọmụmụ ihe atọ tụlezuo akụkụ anọ ahụ nke e kewara ajụjụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na ha ekweta na onye nkwusa a na-emebeghị baptism nwere ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe ọmụma nke ozizi Bible ma ruokwa eru n’ụzọ ndị ọzọ, ha ga-agwa ya na a pụrụ ime ya baptism. Dị ka ihe si ná nraranye na baptism ya pụta, ọ na-aghọ onye ‘a kara akara’ maka nlanarị.—Ezikiel 9:4-6.

Ime Ihe Banyere Mkpa Ndị Pụrụ Iche

10. Mgbe ọ mụzuru akwụkwọ Ihe Ọmụma ma meekwa baptism, n’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ ga-esi mee ka ihe ọmụma ya nke Akwụkwọ Nsọ baa ụba?

10 Mgbe mmadụ nwezusịrị ọmụmụ Bible ya n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, e meekwa ya baptism, o nwere ike ọ gaghị adị mkpa iduziri ya ọmụmụ ihe ọzọ n’akwụkwọ nke abụọ, dị ka Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ.b Otú ọ dị, onye a ka mere baptism ọhụrụ ga-amụtakwu ọtụtụ ihe ka ọ na-akwado maka nzukọ ndị Kraịst ma na-ejechikwa ha anya. Ọ ga-enwetakwa ihe ọmụma ndị ọzọ ka akpịrị ịkpọ nkụ ya maka eziokwu na-akwali ya ịgụ na ịmụ akwụkwọ ndị Kraịst n’onwe ya na isoro ndị kwere ekwe ibe ya na-atụlekọ ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na mkpa ndị pụrụ iche ebilite?

11. (a) Olee ụzọ Prisila na Akwịla si nyere Apọlọs aka? (b) Enyemaka dị aṅaa ka a pụrụ inye onye toruru ogo mmadụ a ka mere baptism ọhụrụ onye na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye?

11 Ọbụna Apọlọs, onye “dịkwa ike n’ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ” ma ziekwa banyere Jisọs n’ehieghị ụzọ, ritere uru mgbe ndị Kraịst bụ́ Prisila na Akwịla bụ́ ndị nweworo ahụmahụ “kutara ya n’ebe ha nọ, wee kọọrọ ya ụzọ Chineke nke ọma karị.” (Ọrụ 18:24-26; tụlee Ọrụ 19:1-7.) Ya mere, gịnị ma ọ bụrụ na onye toruru ogo mmadụ nke a ka mere baptism ọhụrụ na-atụle ime mbedo na ọlụlụ di na nwunye. Onye Kraịst nke ka nwee ahụmahụ pụrụ inyere ya aka ịchọta ihe ọmụma n’isiokwu ndị a ná mbipụta dị iche iche nke Watch Tower. Dị ka ihe atụ, e nwere ihe ndị na-enye aka n’akụkụ nke a n’akwụkwọ bụ́ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, isi nke 19 na 20 na n’akwụkwọ Questions Young People Ask—Answers That Work, Nkebi nke 7.c Onye nkwusa nke duziiri ya ọmụmụ Bible pụrụ isoro onye ọhụrụ ahụ tụlee ihe ọmụma nke a, ọ bụ ezie na ọ gaghị abụ ọmụmụ ihe chiri anya.

12. Enyemaka dị aṅaa ka a pụrụ inye di na nwunye e mere baptism ọhụrụ ndị na-enwe nsogbu alụmdi na nwunye?

12 Tụlee ihe atụ ọzọ. Ikekwe di na nwunye e mere baptism ọhụrụ na-enwe nsogbu n’itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ. Ha pụrụ ijekwuru otu onye okenye, onye pụrụ iji oge uhuruchi ụfọdụ soro ha na-atụle Akwụkwọ Nsọ, na-adọrọkwa uche ha gaa n’ihe ọmụma ndị a na-achọta ná mbipụta dị iche iche nke Watch Tower. Otú ọ dị, onye okenye ahụ agaghị eguzobeghachi ọmụmụ Bible chiri anya ya na di na nwunye ahụ.

Ọ Bụrụ na Onye Ọhụrụ Emehie

13. N’ihi gịnị ka ndị okenye ọgbakọ kwesịrị iji gosi onye a ka mere baptism ọhụrụ bụ́ onye mehierenụ ma nwee nchegharị ebere?

13 Ndị okenye na-eṅomi Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, bụ́ Jehova, onye na-asị: “Mụ onwe m ga-azụ ìgwè ewu na atụrụ nke m, . . . ọkpụkpụ a gbajiri agbaji ka M ga-ekezikwa, nke ahụ ya na-adịghị ike ka M ga-emekwa ka ọ dị ike.” (Ezikiel 34:15, 16; Ndị Efesọs 5:1) N’ụzọ kwekọrọ ná mmụọ ahụ, Jud onye na-eso ụzọ gbara ume ka e gosi ndị Kraịst e tere mmanụ ebere bụ́ ndị nwere obi abụọ ma ọ bụ ndị dabaworo ná mmehie. (Jud 22, 23) Ebe anyị na-ele anya ọtụtụ ihe n’aka ndị Kraịst nwere ahụmahụ n’ụzọ ziri ezi, n’ezie e kwesịrị igosi onye e mere baptism ọhụrụ ebere—nwa atụrụ efu—onye mehiere ma nwee nchegharị. (Luk 12:48; 15:1-7) Ya mere, ndị okenye, bụ́ ndị ‘na-ekpere Jehova ikpe,’ na-enye atụrụ dị otú ahụ nlekọta dị nro ma na-eme ka ha guzozie ná mmụọ dị nwayọọ.—2 Ihe Emere 19:6; Ọrụ 20:28, 29; Ndị Galetia 6:1.d

14. Gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye nkwusa a ka mere baptism ọhụrụ emee mmehie dị oké njọ, oleekwa ụzọ a pụrụ isi nyere ya aka?

14 Mgbe ahụ, ka e were ya na onye nkwusa a ka mere baptism ọhụrụ nweburu nsogbu nke ịṅụ mmanya wee daba n’ịṅụbiga ya ókè n’otu mgbe ma ọ bụ abụọ. Ma ọ bụ ikekwe o meriri àgwà dịtere anya nke ise ụtaba ma daba n’ọnwụnwa nke ise ya ná nzuzo n’otu oge ma ọ bụ abụọ. N’agbanyeghị na nwanna ọhụrụ anyị nke a ekpeworo Chineke ekpere maka mgbaghara, o kwesịrị ịchọ enyemaka nke onye okenye ka mmehie ahụ ghara ịbụ àgwà ya. (Abụ Ọma 32:1-5; Jemes 5:14, 15) Mgbe ọ kọọrọ otu n’ime ndị okenye mmejọ ya, onye okenye ahụ kwesịrị ịgbalị ime ka onye ọhụrụ ahụ guzozie n’ụzọ obi ebere. (Abụ Ọma 130:3) Ndụmọdụ nke Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịbụ ihe zuru ezu iji nyere ya aka ịkwara ụkwụ ya ụzọ nke kwụ ọtọ mgbe e mesịrị. (Ndị Hibru 12:12, 13) Onye okenye a ga-esoro onye isi oche nke ndị nlekọta ọgbakọ tụlee ọnọdụ ndị ahụ iji wee mara enyemaka ndị e kwesịrị inyekwu.

15. N’ọnọdụ ụfọdụ, gịnị pụrụ ịdị mkpa mgbe onye a ka mere baptism ọhụrụ mehiere?

15 N’ọnọdụ ụfọdụ ihe ka nke ahụ pụrụ ịdị mkpa. Ọ bụrụ na ọ gụnyere ihe ọjọọ a ma ama, ihe ize ndụ nye ìgwè atụrụ ahụ, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ dị njọ, òtù ndị okenye ga-ekenye ndị okenye abụọ ọrụ inyocha okwu ahụ. Ọ bụrụ na ndị okenye a achọpụta na okwu ahụ dịruru njọ nke na kọmitii ikpe dị mkpa, ha kwesịrị ịkọrọ òtù ndị okenye nke a. Mgbe ahụ òtù ndị okenye ga-ahọpụta kọmitii ikpe iji nyere onye mmehie ahụ aka. Kọmitii ikpe ahụ kwesịrị imeso ya ihe n’ụzọ dị nro. Ha kwesịrị ịgbalị iji Akwụkwọ Nsọ mee ka o guzozie. Ọ bụrụ na ọ zaghachi nke ọma nye mgbalị obi ọma ahụ nke ndị kọmitii ikpe, mgbe ahụ ha pụrụ ikpebi ma ọ ga-aba uru ọ bụla ịghara iji ya eme ihe n’elu ikpo okwu ná nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ma e kwesịrị ikwe ka ọ zaa ajụjụ ná nzukọ.

16. Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji nyere onye mmehie aka?

16 Ọ bụrụ na onye mmehie ahụ azaghachi, otu okenye ma ọ bụ abụọ so na kọmitii ikpe ahụ pụrụ ịhazi ime nleta ọzụzụ atụrụ nke a kwadebere iji kwalite okwukwe ya ma wulite obi ekele ya maka ụkpụrụ ezi omume Chineke. Onye ọ bụla n’ime ha pụrụ isoro ya rụọ ọrụ n’ozi ubi site n’oge ruo n’oge. Ha pụrụ isoro ya nwee nkwurịta okwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ma eleghị anya na-eji isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche na Teta! eme ihe ma ọ bụghị iguzobe ọmụmụ Bible chiri anya. N’inwe nlekọta dị nro dị otú ahụ, a pụrụ iwusi onye mmehie ahụ ike iguzogide adịghị ike nke anụ ahụ n’ụbọchị ndị na-abịa n’ihu.

17. Nzọụkwụ dịgasị aṅaa ka a ga-ewere ma ọ bụrụ na onye mmehie e mere baptism echegharịghị ma hapụ ụzọ ọjọọ ya?

17 Otú ọ dị, ịbụ onye e mere baptism ọhụrụ abụghị ihe ngọpụ maka ime mmehie n’enweghị nchegharị. (Ndị Hibru 10:26, 27; Jud 4) Ọ bụrụ na onye mmehie ọ bụla e mere baptism echegharịghị ma hapụ ụzọ ọjọọ ya, a ga-achụpụ ya n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:6, 11-13; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:11, 12; 2 Jọn 9-11) Mgbe ọ dị mkpa ka e mee nke a, òtù ndị okenye ga-ahọpụta kọmitii ikpe. Ọ bụrụ na ọ pụta nchụpụ, a ga-ama ọkwa nke a dị mkpirikpi: “A chụpụwo . . .”e

Nyere Ha Aka ‘Iru Ntozu Okè’

18. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji jide n’aka na ndị Kraịst a ka mere baptism ọhụrụ na ndị ọzọ ga na-enwe mgbe nile ihe ndị ọzọ ha ga-amụta banyere Jehova na uche ya?

18 Ihe ka n’ọtụtụ ná ndị ohu Chineke ga-anọgide n’ìgwè atụrụ ahụ. Ọ bụkwa ihe obi ụtọ na onye ọ bụla n’ime anyị ga-enwe ike ịnọgide na-abịaru Nna anyị nke eluigwe nso n’ihi na anyị ga-anọgide mgbe nile na-amụta banyere ya na ọchịchọ ya. (Eklisiastis 3:11; Jemes 4:8) Ọtụtụ puku ndị e mere baptism na 33 O.A. nwere nnọọ ihe ndị ọzọ ha ga-amụta. (Ọrụ 2:5, 37-41; 4:4) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Jentaịl, bụ́ ndị na-enweghị nzụlite Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, nke ahụ bụ eziokwu banyere ndị e mere baptism mgbe Pọl kwusịrị okwu n’Areọpagọs nke Atens. (Ọrụ 17:33, 34) Taakwa, ndị ọhụrụ e mere baptism nwere ihe ndị ọzọ ha ga-amụta, oge na enyemaka iji mee ka mkpebi ha sie ike ime ihe dị mma n’anya Chineke dịkwa ha mkpa.—Ndị Galetia 6:9; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:13.

19. Olee ụzọ a pụrụ isi nyere ndị a na-eme baptism aka ‘iru ntozu okè’?

19 Kwa afọ a na-eme ọtụtụ puku baptism, ha na-achọkwa enyemaka ka ha wee nwee ike ‘iru ntozu okè.’ (Ndị Hibru 6:1-3) Site n’okwu, ihe nlereanya, na enyemaka dị irè n’ozi, ị pụrụ inwe ike inyere ụfọdụ aka iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ ma “na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4; Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa nweworo ahụmahụ, ndị okenye pụrụ ịkpọ gị ka i nyere onye ọhụrụ kwere ekwe ibe gị aka n’ozi ubi ma ọ bụ isoro ya tụlee isi ihe ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ ruo izu ole na ole iji wusie ike okwukwe ya n’ebe Chineke nọ, obi ekele ya maka nzukọ ndị Kraịst, na ihe ndị ọzọ. Mmekọrịta dị n’etiti ndị ọzụzụ atụrụ n’ebe ìgwè atụrụ ahụ nọ yiri nke nna n’ịgba ume na nke nne n’ịdị nro. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8, 11) Ma, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ole na ole apụghị ilekọtacha ihe nile dị mkpa n’ime ọgbakọ. Anyị nile dị ka otu ezinụlọ nke ndị òtù ya na-enyere ibe ha aka. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ime ihe iji nyere ndị ofufe ibe anyị aka. Gị onwe gị pụrụ inwe ike inye agbamume, ịgụgụ ndị dara mbà n’obi, inyere ndị na-adịghị ike aka.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14, 15.

20. Gịnị ka ị pụrụ ime iji gbasaa ihe ọmụma Chineke na inye atụrụ nke ọzụzụ anụ Jehova nlekọta dị nro?

20 Ihe ọmụma Chineke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa, dịkwa ka Onyeàmà nke Jehova, ị pụrụ iji ọṅụ kere òkè n’ịgbasa ya. Nlekọta dị nro dị atụrụ Jehova mkpa, ị pụkwara iji ịhụnanya kere òkè n’inye aka inye nke a. Ka Jehova gọzie ozi gị, ka ọ kwụghachikwa gị ụgwọ n’ihi mgbalị si gị n’obi inyere ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ ya aka.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’oge a, onye ọhụrụ ahụ pụrụ inweta otu mkpụrụ nke akwụkwọ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị.

b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

c Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

d E depụtara ihe banyere nhazi dị otú ahụ maka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism n’isiokwu bụ́ “Inyere Ndị Ọzọ Aka Ife Chineke,” nke pụtara n’Ụlọ Nche nke November 15, 1988, peji 15-20.

e Ọ bụrụ na mkpebi e mere bụ nchụpụ, e wee tinye akwụkwọ maka mkpegharị ikpe, a ga-ahapụgodị ịma ọkwa ahụ. Lee peji nke 147-148 nke akwụkwọ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Olee ụzọ Jehova si emeso atụrụ ya?

◻ Gịnị ka a na-eme mgbe onye ọhụrụ chọrọ ime nkwusa?

◻ Olee ụzọ ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ nwere mkpa pụrụ iche aka?

◻ Enyemaka dị aṅaa ka ndị okenye pụrụ inye ndị mehiere ma nwee nchegharị?

◻ Olee ụzọ ị pụrụ isi nyere onye a ka mere baptism ọhụrụ aka ‘iru ntozu okè’?

[Foto dị na peeji nke 16]

A maara Charles T. Russell nke ọma dị ka onye ọzụzụ atụrụ ịhụnanya nke ìgwè atụrụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị ọzụzụ atụrụ nwere ọmịiko na-eji ịdị nro emeso ìgwè atụrụ Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya