Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2006 | Jenụwarị 1
    • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

      Abụ Ọma 102:26 kwuru na eluigwe na ụwa “ga-ala n’iyi.” Nke a ọ̀ pụtara na a ga-ebibi mbara Ụwa?

      N’ekpere o kpegaara Jehova, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Na mgbe ochie ka ị tọrọ ntọala nke ụwa; ọrụ aka Gị ka eluigwe bụkwa. Ha onwe ha ga-ala n’iyi, ma Gị onwe gị na-eguzogide: ha nile ga-akakwa nká dị ka uwe; Dị ka ákwà mgbokwasị ka ị ga-agbanwe ha, a ga-agbanwekwa ha.” (Abụ Ọma 102:25, 26) Ihe ndị gbara amaokwu ndị ahụ gburugburu na-egosi na ha na-ekwu banyere ịdịru ebighị ebi nke Chineke ọ bụghị banyere mbibi nke ụwa. Ọ na-egosikwa ihe mere eziokwu ahụ dị oké mkpa ji bụrụ ihe nkasi obi nye ndị ohu Chineke.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2006 | Jenụwarị 1
    • N’agbanyeghị ogologo oge eluigwe na ụwa nọrọla, a pụghị iji ha tụnyere Jehova bụ́ onye na-adịru ebighị ebi. Ọbụ abụ ahụ gbakwụnyere, sị: “Ha onwe ha [eluigwe na ụwa] ga-ala n’iyi, ma Gị onwe gị na-eguzogide.” (Abụ Ọma 102:26) Eluigwe na ụwa nkịtị pụrụ ịla n’iyi. N’ezie, e nwere ebe Jehova kwuru na ha ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 119:90; Eklisiastis 1:4) Ma, a pụrụ ibibi ha ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ nzube Chineke. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Chineke apụghị ịnwụ anwụ. Ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya ‘na-eguzo ruo mgbe nile ebighị ebi’ nanị n’ihi na Chineke na-elekọta ha. (Abụ Ọma 148:6) Ọ bụrụ na Jehova anwa anwaa kwụsị inyeghachi ihe ndị o kere eke ume ọhụrụ, mgbe ahụ, “ha nile ga-akakwa nká dị ka uwe.” (Abụ Ọma 102:26) Dị ka mmadụ na-anọte aka karịa uwe ya, n’otu aka ahụ, Jehova pụrụ ịnọte aka karịa ihe ndị o kere eke—ma ọ bụrụ na ọ chọọ. Otú ọ dị, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ mere ka anyị mata na nke ahụ abụghị nzube ya. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na Jehova ekpebiwo na eluigwe na ụwa nkịtị ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 104:5.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya