-
Ịghọta Nzube nke Ịdọ Aka ná NtịỤlọ Nche—2003 | Ọktoba 1
-
-
Otú ọ dị, Bible nwere ụzọ ọzọ o si akọwa ịdọ aka ná ntị. “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova,” ka Eze Solomọn maara ihe dere. (Ilu 3:11) Okwu ndị a na-ezo aka, ọ bụghị n’ịdọ aka ná ntị n’ozuzu ya, kama “n’ịdọ aka ná ntị nke Jehova,” ya bụ, n’ịdọ aka ná ntị dabeere n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Chineke. Ọ bụ nanị ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ pụrụ ịrụpụta ihe dị mma n’ụzọ ime mmụọ ma baa uru—ọbụna bụrụ ihe a na-achọsi ike. N’ụzọ dị iche, ịdọ aka ná ntị nke dabeere n’echiche ụmụ mmadụ bụ́ nke na-emegide ụkpụrụ dị elu nke Jehova na-abụkarị mkparị na ihe na-akpasu iwe. Nke a bụ ihe mere ọtụtụ ndị ji ele ịdọ aka ná ntị anya ọjọọ.
N’ihi gịnị ka e ji agba anyị ume ịnakwere ịdọ aka ná ntị Jehova? N’ime Akwụkwọ Nsọ, a na-akọwa ịdọ aka ná ntị Chineke dị ka ngosipụta nke ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ o kere eke nọ. N’ihi ya, Solomọn gara n’ihu ikwu, sị: “Onye Jehova na-ahụ n’anya ka Ọ na-abara mba; ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.”—Ilu 3:12.
Ịdọ Aka ná Ntị Ka Ọ Bụ Ntaramahụhụ—Ole Nke?
Ịdọ aka ná ntị dị ka e si kọwaa ya n’ime Bible, nwere ọtụtụ akụkụ—nduzi, ntụziaka, ọzụzụ, ịba mba, mgbazi, na ọbụna ntaramahụhụ. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ọ bụla, ọ bụ ịhụnanya na-akpali ịdọ aka ná ntị Jehova, nzube ya na-abụkwa iji mee ka onye a na-enye ya rite uru. Ịdọ aka ná ntị Jehova nke na-agbazi agbazi abụghị nanị n’ebumnobi nke inye ntaramahụhụ.
-
-
Ịghọta Nzube nke Ịdọ Aka ná NtịỤlọ Nche—2003 | Ọktoba 1
-
-
N’echiche dị aṅaa ka ntaramahụhụ ndị a “na-esetịpụrụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ihe atụ nke ihe ndị gaje ịbịa”? N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Tesalonaịka, ọ kpọtụrụ uche n’oge anyị dị ka mgbe Chineke ga-esi n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst weta “ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma.” Pọl na-agbakwụnye, sị: “Ndị a kpọmkwem ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:8, 9) N’ụzọ doro anya, e nyeghị ntaramahụhụ dị otú ahụ iji zie ndị e nyere ya ihe ma ọ bụ iji nụchaa ha. Otú ọ di, mgbe Jehova na-agwa ndị na-efe ya ka ha nara ịdọ aka ná ntị ya, ọ dịghị ekwu banyere ntaramahụhụ a na-enye ndị mmehie na-enweghị nchegharị.
Ọ dị ịrịba ama na Bible adịghị akọwa Jehova n’ụzọ bụ́ isi dị ka onye na-ata mmadụ ahụhụ. Kama nke ahụ, ọ na-akọwakarị ya dị ka onye ozizi na-ahụ n’anya na onye nkụzi nwere ndidi. (Job 36:22; Abụ Ọma 71:17; Aịsaịa 54:13) Ee, ịdọ aka ná ntị Chineke nke e nyere n’ihi mgbazi na ịhụnanya na ndidi na-agakarị ụkwụ na ụkwụ. Site n’ịghọta nzube nke ịdọ aka ná ntị, Ndị Kraịst na-anọ n’ọnọdụ ka mma iji àgwà kwesịrị ekwesị na-anakwere ma na-enye ịdọ aka ná ntị.
-