Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịbụ Onye A Na-ata Ụta Mgbe Nile?
“A na-ata m ụta mgbe nile maka ihe dị iche iche. Ọ bụrụ na a kpọchighị ụzọ ma ọ bụ na a gbanyụghị stovu ma ọ bụ na ọ dị ihe ọ bụla dị ebe ọ na-ekwesịghị ịdị ma ọ bụ a na-emeghị, ọ bụ Ramon ka o si n’aka!”—Ramon.
MGBE ị nọ n’afọ iri na ụma, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ iyi ka a na-ata gị ụta maka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ọ bụla gahierenụ. N’isiokwu bu ụzọ, anyị kwetara na ndị nne na nna na-eme oké ngwa ngwa mgbe ụfọdụ ịta ụmụ ha ụta.a Ihe ndị na-akpata nke a pụrụ ịbụ malite ná nchegbu kwesịrị ekwesị nke ndị nne na nna ruo n’oké nsogbu mmetụta uche. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, ịta gị ụta maka ihe ndị na-esighị gị n’aka pụrụ ịdị na-afụ ụfụ ma na-eweda n’ala.
N’eziokwu, dị ka mmadụ na-ezughị okè, ị ga-ehie ụzọ site n’oge ruo n’oge. (Ndị Rom 3:23) Ọzọkwa, n’ihi na ị ka na-eto eto, i nwekebeghị ahụmahụ. (Ilu 1:4) O yikarịrị ka ị ga-eme mkpebi na-adịghị mma mgbe ụfọdụ. Ya mere mgbe i mejọrọ, ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na ihe ziri ezi na ị ga-aza ajụjụ maka ya.—Eklisiastis 11:9.
Mgbe ahụ, olee otú i kwesịrị isi meghachi omume mgbe a tara gị ụta maka ihe i mere n’ezie? Ndị ntorobịa ụfọdụ na-anwa ime ka a ga-asị na ha bụ ndị e kpere ajọ ikpe na-ezighị ezi. Ha na-emekarị mkpesa na nne na nna ha na-ata ha ụta mgbe nile maka ihe nile. Gịnị ka ọ na-arụpụta? Ndị nne na nna nwere obi nkoropụ na-eji ụzọ ndị siri ike karị eme ka a ghọta ha. Bible na-enye okwu ndụmọdụ a: “Amamihe na ịdọ aka ná ntị ka ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ledaworo anya. Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:7, 8) Mgbe i kwetara njehie gị ma mee mgbanwe ndị dị mkpa, ị pụrụ ịmụta ihe site n’ihie ụzọ gị.—Ndị Hibru 12:11.
Iso Ndị Mụrụ Gị Nwee “Izu Nzuzo”
Otú ọ dị, ọ bụ nnọọ ihe ọzọ dị iche mgbe a tara gị ụta maka ihe ndị na-esighị gị n’aka ma ọ bụ mgbe ịta ụta na-akwụsịghị akwụsị. N’ụzọ kwere nghọta, ị pụrụ iwe iwe ma nwee obi ilu. A pụrụ ọbụna ịnwa gị ime omume n’ụzọ na-adịghị mma, na-ekwubi na a ga-atakwarị gị ụta. (Eklisiastis 7:7) Otú ọ dị, omume iwe na-ewute onye ọ bụla. (Tụlee Job 36:18.) Ilu 15:22 na-atụ aka n’ụzọ ka mma isi mee ihe, na-ekwu, sị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” Ee, otu ụzọ isi gbanwee ụzọ nne na nna gị si emeso gị bụ ime ka ha mara mmetụta ị na-enwe.
Nke mbụ, chọọ ihe Bible kpọrọ “mgbe ya.” (Ilu 15:23) Onye edemede bụ́ Clayton Barbeau na-atụ aro, sị: “Họrọ oge na ebe mgbe isi jụrụ onye ọ bụla oyi na mgbe obi dị unu nile mma.” Ọzọkwa, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Ya mere gbalịa inwe obiọma na nkwanye ùgwù n’ụzọ i si ejekwuru ha, ọ bụghị n’obi iwe. Zere iwe iwe ọkụ. (Ilu 29:11) Kama ịbara nne na nna gị mba (‘Unu na-ata m ụta mgbe nile maka ihe ọ bụla!’), gbalịa ịkọwa otú ha ịta gị ụta mgbe nile na-adị gị. (‘Iwe na-eju m obi mgbe a tara m ụta maka ihe ndị na-esighị m n’aka.’)—Tụlee Jenesis 30:1, 2.
A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere oge ndị ahụ nne na nna gị na-ewe iwe n’ihi nghọtahie ụfọdụ. Nne na nna Jisọs na-eto eto nwere otu oge ha were iwe mgbe a na-amaghị ebe ọ nọ. Ma Jisọs etighị mkpu ma ọ bụ mee mkpesa. N’ụzọ dị jụụ, o mere ka ọnọdụ ahụ doo anya. (Luk 2:49) Gịnị ma ị gbalịa imeso nne na nna gị n’ụzọ onye toworo eto mgbe ị nọ ná nsogbu? Mata na ha na-ewe iwe n’ihi na ha na-eche banyere gị! Jiri nkwanye ùgwù gee ntị. (Ilu 4:1) Chere ruo mgbe ihe dajụlatara tupu ị malite ịkọ akụkụ nke gị.
‘Ịnwapụta Ihe Ọrụ nke Aka Gị Bụ’
Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ụfọdụ nne na nna na-eji amagakarị ná nkwubi okwu ndị na-ezighị ezi banyere ụmụ ha? N’ikwu eziokwu, mgbe ụfọdụ ndị na-eto eto na-eme ka nne na nna ha nwee ihe mere ha ga-eji na-enyo ha enyo. Ilu 20:11 na-ekwu, sị: “Ọbụna nwata na-eme ka a mata ya site n’omume ya nile, ma ọrụ ya dị ọcha, ma o zikwara ezi.” Olee ụdị aha i meworo n’ebe nne na nna gị nọ? “Omume” gị ò gosiwo na i ‘ziri ezi’ ma jiri ihe akpọrọ ihe ka ọ bụ dị aghara ma ghara ịdị na-eji ihe akpọrọ ihe? Ọ bụrụ na ndị ikpeazụ bụ otú ọ dị, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ha na-amagakarị ná nkwubi okwu ndị na-ezighị ezi banyere gị. “Aghaghị m ịgwa onwe m eziokwu,” ka Ramon, bụ́ nwa okorobịa e hotara na mbụ, kwetara banyere nkatọ nke nne na nna ya. “Mgbe ụfọdụ a na-enwetụ eziokwu dị na ha inyo ihe enyo ha.”
Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ọnọdụ gị, nanị ihe ị pụrụ ime bụ ịgbalị ibi ndụ iji kpuchie oge ndị gara aga. Site n’ịzụlite ụkpụrụ nke àgwà ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi na nke iji ihe akpọrọ ihe, ị pụrụ iji nke nta nke nta mee ka nne na nna gị kweta na ị gbanwewo na a pụkwara ịtụkwasị gị obi.
Ahụmahụ Ramon na-eme ka isi ihe a pụta ìhè. Ndị enyi na ndị ezinụlọ ya ji ọchị nye ya utu aha bụ prọfesọ uche mwagharị n’ihi omume ya nke ichefu ihe. Nne na nna gị hà enyewo gị aha na-adịghị mma dị ka “onye na-etozughị okè” ma ọ bụ “onye na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe”? Dị ka onye edemede bụ́ Kathleen McCoy na-ekwu, ndị nne na nna pụrụ iche na ụdị aha ndị ahụ na-enye aka “ịrụtụ ihe na-adịghị mma aka ka onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma nwee ike ịhụ ya ma gbanwee.” Otú ọ dị, n’ezie, ụdị aha ndị ahụ na-akpatakarị oké iwe. Ọ bụrụgodị otú ahụ, Ramon bịara ghọta na utu aha ahụ bụ eziokwu. “Uche m na-adịkarị n’otu ihe, ya mere m na-etufu ihe ndị dị ka ugodi ma ọ bụ ihe omume m ga-eme n’ụlọ ma na-echezọ ọrụ ụlọ,” ka ọ na-ekweta.
Ya mere Ramon malitere ime mgbanwe. “Amalitere m ịmụ banyere ibu ọrụ na isetịpụ ihe ndị ka mkpa,” ka ọ na-echeta. “Emere m usoro ihe omume ma malite iji ọmụmụ Bible onwe onye akpọrọ ihe karị. Amụtara m na Jehova na-ewere ụmụ obere ihe nakwa ndị buru ibu dị ka ihe ndị dị mkpa.” (Luk 16:10) Site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, Ramon mesịrị wepụ aha o nwetara n’ihi ichefu ihe. Gịnị ma ị gbalịa mee otu ihe ahụ? Ọ bụrụkwa na otu aha ma ọ bụ utu aha na-enye gị nsogbu n’ezie, soro nne na nna gị kwurịta ya. Ikekwe ha ga-ahụ ihe otú i si na-ahụ ha.
Mgbe O Yiri Ka Ọ Bụ Ile Mmadụ Anya n’Ihu
Mgbe ụfọdụ ile mmadụ anya n’ihu yiri ka ọ bụ ya na-akpata ụta ahụ. Ramon na-echeta, sị: “Ụmụnne m ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị tọrọ m ga-alọta n’abalị ma ọ dịghị ihe a ga-eme ha. M ga-alọta ma baa ná nsogbu n’ihi ya.” Otu nwoke onye Guyana aha ya bụ Albert na-echeta inwe mmetụta ndị yiri nke ahụ mgbe ọ na-etolite. Ọ dị ya ka nne ya o nyere ya ahụhụ n’ụzọ siri ike karịa ka o si enye nwanne ya nwoke.
Otú ọ dị, ihe anaghị adị otú ha na-eyi mgbe nile. Ndị nne na nna na-enyekarị ụmụ ha ndị mere okenye karị nnwere onwe ka ukwuu, ọ bụghị n’ihi ile mmadụ anya n’ihu, kama nanị n’ihi na ha chere na ha ga-eme omume n’ụzọ iji ihe kpọrọ ihe. Ma ọ bụ a pụrụ inwe ọnọdụ ndị pụrụ iche ọ gụnyere. Albert na-ekweta na a dịghị apịa nwanne ya nwoke ihe n’ihi na ọ dị “ntakịrị ma na-arịakarị ọrịa.” Ọ̀ bụ ile mmadụ anya n’ihu bụ́ ndị nne na nna ịmata mkpa ndị pụrụ iche ma ọ bụ adịghị ike nke otu nwatakịrị pụrụ inwe?
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ndị nne na nna na-enwe ndị ha hụrụ n’anya karị. (Tụlee Jenesis 37:3.) Albert na-ekwu banyere nwanne ya nwoke na-arịakarị ọrịa, sị: “Mama m nwere ịhụnanya pụrụ iche n’ebe ọ nọ.” Ọ dabara nke ọma na ịhụnanya ndị Kraịst na-agbasapụ agbasapụ. (2 Ndị Kọrint 6:11-13) Ya mere a sịgodị na nne na nna gị nwere “ịhụnanya pụrụ iche” maka otu n’ime ụmụnne gị, ọ pụtaghị na e nweghị ịhụnanya fọọrọ gị. Ihe bụ isiokwu n’ezie bụ, Hà na-emeso gị n’ụzọ na-ezighị ezi, na-ata gị ụta n’ihi ịhụnanya na-enweghị isi ha nwere maka nwanne gị? Ọ bụrụ na o yie ka ọ dị otú ahụ, gbalịa mee ka ha mara mmetụta gị. N’ụzọ dị jụụ, nke ezi uche dị na ya, nye ha ihe atụ ndị doro anya nke otú i si eche na ha egosiwo ile mmadụ anya n’ihu. Ikekwe ha ga-ege ntị.
Ezinụlọ Ndị Nwere Nsogbu
N’ụzọ a pụrụ ikweta, ọ bụghị ọnọdụ nile na-adị mfe ịgbanwe. Nye nne na nna ụfọdụ, imenye ihere na ịta ụta bụ àgwà ndị gbamiri mkpọrọgwụ. Nke a pụrụ ịdị otú a karịsịa n’etiti ndị nne na nna nwere nsogbu mmetụta uche ma ọ bụ ndị na-alụso ihe iri ahụ ọgụ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, a pụrụ ịrụpụta ntakịrị ihe site ná mgbalị iso ha kwurịta okwu. Ọ bụrụ na o yie ka nke a ọ bụ eziokwu n’ọnọdụ gị, mata na nsogbu nke nne na nna gị karịrị ike gị ịchịkwa, ikekwe ọ pụkwara ịbụ nke a ga-agwọta nanị site n’enyemaka sitere n’ebe ọzọ. Ihe kasị mma i nwere ike ime bụ inye ha nsọpụrụ na nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị na ịgbalị izere esemokwu na-enweghị isi. (Ndị Efesọs 6:1, 2) Ilu 22:3 na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.”b
N’otu oge ahụ, nweta enyemaka site n’ebe ọzọ. Soro onye toworo eto nke tozuru okè, ikekwe onye Kraịst bụ́ okenye, kwurịta okwu. Nlekọta ịhụnanya site n’aka onye dị otú ahụ pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ibelata mmetụta na ọ na-esi gị n’aka mgbe nile. N’otu oge ahụ, ‘bịaruo Chineke nso.’ (Jemes 4:8) Ọ bụ ezie na ndị ọzọ pụrụ ịta gị ụta n’ụzọ na-ezighị ezi, “ọ bụghị ruo mgbe nile ka [Chineke] ga [na-achọta mmejọ, NW]; ọ bụghịkwa ruo mgbe ebighị ebi ka Ọ ga na-edebe iwe. . . . N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:9, 14) Ịmata na ị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke pụrụ inyere gị aka idi ụta na-ezighị ezi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . N’ihi Gịnị Ka O Ji Esi M n’Aka Mgbe Nile?” nke pụtara ná mbipụta anyị nke August 8, 1997.
b Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Okwu Mkparị?” ná mbipụta anyị nke November 8, 1990. Leekwa usoro isiokwu bụ́ “Site n’Okwu Na-emerụ Ahụ Gaa n’Okwu Na-agwọ Agwọ,” na Teta! nke November 8, 1996.
[Foto dị na peeji nke 21]
Ikweta njehie anyị na-enyere anyị aka ịmụta ihe site n’ihie ụzọ anyị