Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 10/15 p. 8-13
  • Ndokwa Ezinụlọ nke Jehova Ji Ịhụnanya Mee

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndokwa Ezinụlọ nke Jehova Ji Ịhụnanya Mee
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ n’Oge Bible
  • Ọrụ nke Ndị Kraịst Bụ Di
  • Ndị Kraịst Bụ Nwunye Ndị Na-enye Nkwado
  • Ụmụ Ndị Na-enwe Ekele
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Unu Atọsala Ihe Chineke Kekọtara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 10/15 p. 8-13

Ndokwa Ezinụlọ nke Jehova Ji Ịhụnanya Mee

“Ọ bụ n’ihi nke a ka m ji gbuo ikpere m abụọ n’ala nye Nna anyị, onye e sitere na ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha.”—NDỊ EFESỌS 3:14, 15.

1, 2. (a) N’ihi nzube dị aṅaa ka Jehova ji kee njikọ ezinụlọ? (b) Òkè dị aṅaa ka ezinụlọ kwesịrị ikere taa ná ndokwa Jehova?

JEHOVA kere njikọ ezinụlọ. Site na ya, o mere ihe karịrị igbo mkpa mmadụ maka nnọkọrịta, nkwado, ma ọ bụ ịhụnanya. (Jenesis 2:18) Ezinụlọ bụ ụzọ a ga-esi mezuo nzube Chineke nke dị ebube nke ịmụju ụwa. Ọ gwara mmadụ abụọ mbụ ahụ bụ di na nwunye, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28) Ọnọdụ ezinụlọ nke na-ekpo ọkụ ma na-edozi ahụ ga-abụ nke ga-aba uru nye ìgwè ụmụ ndị Adam na Iv ga-amụta nakwa ụmụ ụmụ ha.

2 Otú ọ dị, di na nwunye mbụ ahụ họọrọ ụzọ nnupụisi—na-akpatara onwe ha na ụmụ ha ọdachi. (Ndị Rom 5:12) Ndụ ezinụlọ taa si otú ahụ bụrụ ihe na-adịghị otú Chineke si chọọ ka ọ dịrị. Ma, ezinụlọ nọgidere na-enwe ọnọdụ dị mkpa ná ndokwa Jehova, na-aghọ njikọ bụ isi nke òtù ndị Kraịst. Nke a abụghị ikwu na anyị enweghị ekele maka ọrụ ọma nke ọtụtụ ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-arụ n’etiti anyị. Kama nke ahụ, anyị na-aghọta òkè dị ukwuu nke ezinụlọ dị iche iche na-ekerekwa n’ahụ ike ime mmụọ nke nzukọ ndị Kraịst n’ozuzu ya. Ezinụlọ ndị dị ike na-eme ka e nwee ọgbakọ ndị dị ike. Otú ọ dị, olee ụzọ ezinụlọ gị pụrụ isi na-enwe ọganihu n’okpuru nrụgide nile nke oge a? Iji zaa nke ahụ, ka anyị nyochaa ihe Bible nwere ikwu banyere ndokwa ezinụlọ.

Ezinụlọ n’Oge Bible

3. Ọrụ ndị dị aṅaa ka di na nwunye rụrụ n’ezinụlọ nke ndị nna oge ochie?

3 Ma Adam ma Iv jụrụ ndokwa ịchịisi nke Chineke. Ma ndị ikom nwere okwukwe, dị ka Noa, Abraham, Aịsak, Jekọb, na Job, nakweere ọrụ ha n’ụzọ ziri ezi, dị ka ndị isi ezinụlọ. (Ndị Hibru 7:4) Ezinụlọ ndị nna oge ochie dị ka otu obere ọchịchị, onye bụ nna na-arụ ọrụ dị ka onye ndú okpukpe, onye ozizi, na onye ikpe. (Jenesis 8:20; 18:19) Ndị nwunye nwekwara òkè dị mkpa, na-eje ozi ọ bụghị dị ka ndị ohu kama dị ka ndị na-enye aka n’ilekọta ezinụlọ.

4. Olee ụzọ ndụ ezinụlọ si gbanwee n’okpuru Iwu Mosis, ma òkè dị aṅaa ka ndị mụrụ ụmụ nọgidere na-ekere?

4 Mgbe Israel ghọrọ mba n’afọ 1513 T.O.A., iwu ezinụlọ ghọrọ nke nọ n’okpuru Iwu mba ahụ nke e nyere site n’aka Mosis. (Ọpụpụ 24:3-8) E nyere ikike nke ikpebi okwu, gụnyere okwu ndị metụtara ọnwụ na ndụ, n’aka ndị ikpe a họpụtara ahọpụta. (Ọpụpụ 18:13-26) Usoro ndị nchụàjà nke Livaị weghaara akụkụ ofufe ndị metụtara ịchụ àjà. (Levitikọs 1:2-5) Otú o sina dị, onye bụ nna nọgidere na-ekere òkè dị mkpa. Mosis gbara ndị bụ nna ume, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ndị nne nwere ikike ụfọdụ. Ilu 1:8 nyere ndị ntorobịa iwu, sị: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” Ee, n’ime ndokwa nke ikike di ya, onye Hibru bụ nwunye pụrụ ime—meekwa ka ọ dị irè—iwu ezinụlọ. Ọ ga-abụ onye ụmụ ya nyere nsọpụrụ ọbụna mgbe o meworo agadi.—Ilu 23:22.

5. Olee ụzọ Iwu Mosis si kọwaa ọnọdụ ụmụ ná ndokwa ezinụlọ?

5 Ọnọdụ ụmụ bụkwa nke a kọwara nke ọma n’Iwu Chineke. Deuterọnọmi 5:16 na-asị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị, dị ka Jehova, bụ́ Chineke gị, nyere gị iwu: ka ụbọchị gị wee dị anya, ka o wee dịkwara gị mma, n’elu ala ahụ nke Jehova, bụ́ Chineke gị, na-enye gị.” Mmadụ ịbụ onye na-enweghị nsọpụrụ maka ndị mụrụ ya bụ ịda oké iwu n’okpuru Iwu Mosis. (Ọpụpụ 21:15, 17) “N’ihi na onye ọ bụla nke na-akọcha nna ya ma ọ bụ nne ya,” ka Iwu ahụ kwuru, “a ghaghị ime ka ọ nwụọ.” (Levitikọs 20:9) Mmadụ inupụ isi megide ndị mụrụ ya dịkwa ka inupụ isi megide Chineke n’onwe ya.

Ọrụ nke Ndị Kraịst Bụ Di

6, 7. N’ihi gịnị ka okwu Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 5:23-29 ji yie mgbanwe dị ukwuu nye ndị gụrụ ihe o dere na narị afọ mbụ?

6 Iso Ụzọ Kraịst wepụtakwuru ihe ọmụma banyere ndokwa ezinụlọ, karịsịa banyere ọrụ nke onye bụ di. N’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst nọ, ọ bụ ihe a ma ama nye ndị bụ di na narị afọ mbụ imeso nwunye ha omume n’aka ike, n’ụzọ mmegbu. A jụrụ inye ụmụ nwanyị ihe ndị bụ isi ruuru ha na nkwanye ùgwù. Akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible na-ekwu, sị: “Onye Grik a zụrụ azụ lụrụ nwunye maka ịmụta ụmụ. Ihe ndị ruuru ya enweghị mgbochi ọ bụla n’ebe agụụ mmekọahụ nwoke dị. Ịhụnanya adịghị ná njikọ alụmdi na nwunye ahụ. . . . Nwanyị ahụ nke bụ ohu enweghị ihe ọ bụla ruuru ya. Ahụ ya bụ nke onye nwe ya mgbe ọ bụla ọ chọrọ.”

7 Na gburugburu ebe dị otú ahụ, Pọl dere okwu ndị ahụ dị ná Ndị Efesọs 5:23-29: “Di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzukọ ya, ebe ya onwe ya bụ onye nzọpụta nke ahụ. . . . Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ ya n’anya, rarakwa onye ya nye n’ihi ya . . . Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma.” Nye ndị gụrụ ihe a na narị afọ mbụ, okwu ndị a bụ mgbanwe dị ukwuu. Akwụkwọ ahụ bụ́ The Expositor’s Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla n’Iso Ụzọ Kraịst nke yiri ihe ọhụrụ kpam kpam na ihe siri ike, ma e jiri ya tụnyere omume imebiga ihe ọjọọ ókè nke oge ahụ, karịa echiche ndị Kraịst banyere alụmdi na nwunye. . . . [O] mepere ọgbọ ọhụrụ nye ihe a kpọrọ mmadụ.”

8, 9. Àgwà ndị na-adịghị mma dị aṅaa e nwere n’ebe ụmụ nwanyị nọ ka a na-ahụkarị n’etiti ụmụ nwoke, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ka ndị Kraịst bụ́ nwoke jụ echiche ndị dị otú ahụ?

8 Ndụmọdụ ahụ Bible nyere ndị bụ di bụkwa kpọmkwem mgbanwe dị ukwuu n’oge a. N’agbanyeghị ihe nile e kwuworo banyere nnwere onwe ụmụ nwanyị, ọtụtụ ụmụ nwoke ka na-ele ụmụ nwanyị anya dị nnọọ ka ihe ndị e ji egbo agụụ mmekọahụ. Site n’ikwere n’akụkọ ọdịbendị ahụ na-emeghị eme nke na ọ na-atọ ụmụ nwanyị ụtọ n’ezie ịbụ ndị a na-achị achị, ndị a na-eduziri ụzọ, ma ọ bụ a na-amanye ime ihe, ọtụtụ ụmụ nwoke emetọwo nwunye ha n’ụzọ anụ ahụ na mmetụta uche. Lee ihe ihere ọ ga-abụrụ onye Kraịst bụ nwoke ịbụ onye e megharịrị anya site n’echiche ụwa na imeso nwunye ya omume mmetọ! “Di m bụ ohu na-eje ozi, nke nyekwara okwu ihu ọha,” ka otu onye Kraịst bụ́ nwanyị kwuru. Ma, o kpughere, sị, “aghọrọ m onye di ya na-eti ihe.” N’ụzọ doro anya, omume ndị dị otú ahụ ekwekọghị ná ndokwa nke Chineke. Nwoke ahụ adịghị ka ndị ọzọ; ọ dị ya mkpa ịchọ enyemaka iji kwụsị iwe ọkụ ya ma ọ bụrụ na o nwere olileanya inweta ihu ọma Chineke.—Ndị Galetia 5:19-21.

9 Chineke nyere ndị bụ di iwu ịhụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ nke onwe ha. Ịjụ ime otú ahụ bụ nnupụisi megide kpọmkwem ndokwa ahụ Chineke mere, ọ pụkwara imebi mmekọrịta nke mmadụ nwere n’ebe Chineke nọ. Okwu Pita onyeozi doro anya: “Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, . . . ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Mmadụ imeso nwunye ya omume n’aka ike pụkwara inwe mmetụta na-emebi ihe n’ọnọdụ ime mmụọ ya nakwa n’ọnọdụ ime mmụọ nke nwa onye ahụ ga-amụta.

10. Olee ụzọ ụfọdụ ndị bụ di pụrụ isi jiri ịchịisi ha mee ihe n’ụzọ yiri nke Kraịst?

10 Ndị bụ di, ezinụlọ unu ga-eme nke ọma n’okpuru ịchịisi unu ma ọ bụrụ na unu ejiri ya mee ihe n’ụzọ yiri nke Kraịst. Ọ dịghị mgbe Kraịst mere omume aka ike ma ọ bụ nke mmetọ. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ pụrụ ikwu, sị: “Mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.” (Matiu 11:29) Ezinụlọ gị ọ̀ pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere gị? Kraịst mesoro ndị na-eso ụzọ ya omume dị ka ndị enyi ma tụkwasị ha obi. (Jọn 15:15) Ị̀ na-enye nwunye gị otu ụdị nkwanye ùgwù ahụ? Bible kwuru banyere ‘nwunye nke na-ejide onwe ya nke ọma,’ sị: “Obi di ya atụkwasịwo ya obi.” (Ilu 31:10, 11) Nke ahụ pụtara inye ya ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe ime nhọrọ, ọ bụghị igechi ya site n’ihe mgbochi ndị ezi uche na-adịghị na ha. Ọzọkwa, Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha kwupụta ihe bụ mmetụta na echiche ha. (Matiu 9:28; 16:13-15) Ị̀ na-eme otu ihe ahụ n’ebe nwunye gị nọ? Ka ị̀ na-ele ọjụjụ ọ jụrụ n’obi eziokwu anya dị ka ịma aka nye ikike gị? Site n’ichebara ihe bụ mmetụta nwunye gị echiche kama ịdị na-eleghara ha anya, n’ezie ị na-ewulite nkwanye ùgwù ya maka ịchịisi gị.

11. (a) Olee ụzọ ndị bụ nna pụrụ isi lekọta mkpa ime mmụọ nke ụmụ ha? (b) N’ihi gịnị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-aghaghị isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ilekọta ezinụlọ ha?

11 Ọ bụrụ na ị bụ nna, a chọkwara ka ị na-ebute ụzọ n’ilekọta mkpa ime mmụọ, mmetụta, na anụ ahụ nke ụmụ gị. Nke ahụ gụnyere inwe usoro ihe ime mmụọ dị mma maka ezinụlọ gị: iso ha na-arụ ọrụ n’ozi ubi, iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Bible na-egosi na onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ “onye na-achị ezinụlọ nke aka ya nke ọma.” Ndị ikom na-eje ozi n’ọnọdụ ndị a kwesịrị isi otú ahụ bụrụ ndị isi ezinụlọ e ji ama atụ. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ibu ibu dị arọ nke ọrụ ọgbakọ, ha aghaghị inye ezinụlọ ha ọnọdụ mbụ. Pọl gosiri ihe kpatara nke ahụ: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla amataghị otú ọ ga-achị ezinụlọ nke aka ya, ọ̀ ga-esi aṅaa lee nzukọ Chineke anya nke ọma?”—1 Timoti 3:4, 5, 12.

Ndị Kraịst Bụ Nwunye Ndị Na-enye Nkwado

12. Òkè dị aṅaa ka onye bụ nwunye na-ekere ná ndokwa ndị Kraịst?

12 Ị̀ bụ onye Kraịst bụ nwunye? Ya bụrụ otú ahụ, ị ghaghị ịrụ ọrụ dị mkpa ná ndokwa ezinụlọ. A gbara ndị Kraịst bụ nwunye ume ịbụ ndị “na-ahụ di ha n’anya, ndị na-ahụ ụmụ ha n’anya, ndị uche ha zuru okè, ndị dị ọcha, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ, ezi mmadụ, ndị na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha.” (Taịtọs 2:4, 5) Otú a, i kwesịrị ime mgbalị ịbụ nwanyị nọ na di nke e ji ama atụ, na-enwe ebe obibi dị ọcha nke na-enye obi ụtọ n’ezinụlọ gị. Ọrụ dị n’ụlọ pụrụ isi ike mgbe ụfọdụ, ma ọ dịghị eweda gị ala ma ọ bụ bụrụ obere ọrụ. Dị ka onye bụ nwunye, ị “na-achịkwa ezinụlọ,” ị pụkwara inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe ime nhọrọ na nke a. (1 Timoti 5:14) Dị ka ihe atụ, ‘nwunye ahụ nke na-ejide onwe ya nke ọma’ zụtara ngwá ụlọ, zụta ala, ọbụna kpatakwa ego site n’ịzụ obere ahịa. Ka a sịkwa ihe mere o ji nweta ịja mma nke di ya! (Ilu, isi nke 31) Dị ka anyị ga-atụ anya ya, nchepụta ndị dị otú ahụ kwekọrọ ná ntụziaka nke di ya nyere dị ka onye isi ya.

13. (a) N’ihi gịnị ka ịnọ n’okpuru pụrụ iji bụrụ ihe siri ike nye ụfọdụ ụmụ nwanyị? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe bara uru nye ndị Kraịst bụ ụmụ nwanyị ido onwe ha n’okpuru ndị di ha?

13 Otú ọ dị, ido onwe gị n’okpuru di gị pụrụ ịbụ ihe na-adịchaghị mfe n’oge nile. Ọ bụghị ụmụ nwoke nile na-eme ihe e ji enye mmadụ nsọpụrụ. Ọ pụkwara ịbụ na ị na-eme nnọọ nke ọma ma a bịa n’ihe metụtara iji ego eme ihe, ime atụmatụ, ma ọ bụ ime nhazi. Ị pụrụ inwe ọrụ ego ma na-akpata ego buru ibu n’ezinụlọ. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ị tawo ahụhụ n’ụzọ ụfọdụ site n’ịnọ n’okpuru ụmụ nwoke n’oge gara aga, ị pụkwara ịhụ ya dị ka ihe siri ike ịnọ n’okpuru nwoke. Otú o sina dị, igosipụta “nsọpụrụ dị omimi,” ma ọ bụ “egwu,” maka di gị na-egosi nsọpụrụ i nwere maka ịchịisi nke Chineke. (Ndị Efesọs 5:33, Kingdom Interlinear; 1 Ndị Kọrint 11:3) Ịnọ n’okpuru dịkwa oké mkpa maka ezinụlọ gị inwe ihe ịga nke ọma; ọ na-enyere gị aka izere itinye ezinụlọ gị n’ihe isi ike na ajọ ọnọdụ ndị na-adịghị mkpa.

14. Gịnị ka onye bụ nwunye pụrụ ime ma ọ bụrụ na o kwetaghị ná mkpebi nke di ya mere?

14 Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na ị ga-agbachi nkịtị mgbe i chere na di gị na-eme mkpebi nke na-emegide ezi ọdịmma nile nke ezinụlọ gị? Ọ bụchaghị otú ahụ. Nwunye Abraham bụ́ Sera agbachighị nkịtị mgbe ọ chọpụtara egwu a na-eyi ọdịmma nke nwa ya nwoke, bụ́ Aịsak. (Jenesis 21:8-10) N’otu aka ahụ, ị pụrụ ịhụ na ọ dị mkpa ka i kwupụta ihe bụ mmetụta gị mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na e mee nke a n’ụzọ na-egosi nsọpụrụ ná “mgbe kwesịịrị ya,” onye Kraịst bụ nwoke nke na-asọpụrụ Chineke ga-aṅa ntị. (Ilu 25:11) Ma ọ bụrụ na a gbasoghị aro ị tụrụ, na ọ dịghịkwa mmebi dị oké njọ e mebiri ụkpụrụ Bible, ọ̀ bụ na ime ihe megidere ọchịchọ nile nke di gị agaghị abụ mmadụ imegide onwe ya? Cheta, “nwanyị ọ bụla nke maara ihe ewuwo ụlọ ya: ma nwanyị nke gbagọrọ agbagọ n’uche ya ji aka ya abụọ akwada ya.” (Ilu 14:1) Otu ụzọ isi wulie ụlọ gị bụ ịkwado ịchịisi nke di gị, na-aja ihe ndị ọ rụpụtara mma ma na-ewere mmejọ ya nile n’obi ọma.

15. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka onye bụ nwunye pụrụ isi kere òkè n’ịdọ aka ná ntị nakwa ọzụzụ nke ụmụ ya?

15 Ụzọ ọzọ isi wulie ụlọ gị bụ ikere òkè n’ime ụmụ gị ndị na-eso ụzọ na inye ha ọzụzụ. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ime òkè gị n’ime ka ọmụmụ Bible ezinụlọ bụrụ nke chiri anya na nke na-ewuli elu. “Ewepụkwala aka gị” mgbe a bịara n’isoro ụmụ gị kerịta eziokwu nile nke Chineke n’ohere ọ bụla—mgbe a na-eme njem ma ọ bụ nnọọ mgbe a kpọ ha jee ahịa. (Eklisiastis 11:6) Nyere ha aka ịkwadebe azịza ha maka nzukọ ndị a na-enwe nakwa ihe omume ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ka anya gị na-eru ná mkpakọrịta ha. (1 Ndị Kọrint 15:33) Mgbe a bịara n’okwu ndị metụtara ụkpụrụ na ịdọ aka ná ntị Chineke, mee ka ụmụ gị mara na gị na di gị dị n’otu. Ekwela ka ha rakọta gị na di gị iji nweta ihe ha chọrọ.

16. (a) Ihe atụ Bible dị aṅaa ka e nwere iji gbaa ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ nwa na ndị lụrụ ndị na-ekweghị ekwe ume? (b) Olee ụzọ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ pụrụ isi nyere ndị dị otú ahụ aka?

16 Ọ bụrụ na ị bụ nne nke nanị ya na-azụ nwa ma ọ bụ nwee di na-ekweghị ekwe, ọ pụrụ ịdị mma ka ị na-ebute ụzọ n’ihe ime mmụọ. Nke a pụrụ ịbụ ihe siri ike nakwa mgbe ụfọdụ ọbụna ihe na-akụda mmụọ. Ma adala mbà. Nne Timoti, bụ́ Yunaịsi, nwere ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ya Akwụkwọ Nsọ ‘site na nwa ọhụrụ,’ n’agbanyeghị na ọ lụrụ di na-ekweghị ekwe. (2 Timoti 1:5; 3:15) Ọtụtụ ndị n’etiti anyị na-enwe ihe ịga nke ọma yiri nke ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa inwe enyemaka na nke a, ị pụrụ ime ka ndị okenye mara mkpa gị. Ha pụrụ inwe ike ime ndokwa ka otu onye nyere gị aka ịdị na-abịa nzukọ na ịpụta n’ozi ubi. Ha pụrụ ịgba ndị ọzọ ume ịgụnye ezinụlọ gị n’ọpụpụ ma ọ bụ nnọkọ ntụrụndụ. Ma ọ bụ ha pụrụ ime ndokwa ka otu onye nkwusa nwere ahụmahụ nyere gị aka ịmalite ọmụmụ ihe ezinụlọ.

Ụmụ Ndị Na-enwe Ekele

17. (a) Olee ụzọ ndị ntorobịa pụrụ isi tinye ihe n’ọdịmma ezinụlọ? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ na nke a?

17 Ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa pụrụ itinye ihe n’ọdịmma ezinụlọ site n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 6:1-3: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” Site n’inye ndị mụrụ gị nkwado, ị na-egosi nsọpụrụ gị maka Jehova. Jisọs Kraịst bụ onye zuru okè, ọ pụkwara ịdịrị ya mfe icheworị na ọ bụ iwetu ùgwù ya ala ịnọ n’okpuru nne na nna na-ezughị okè. Ma, “o wee nọdụ n’okpuru ha. . . . Jisọs wee na-aga n’ihu n’amamihe na ogologo, na-agakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.”—Luk 2:51, 52.

18, 19. (a) Gịnị ka ọ pụtara mmadụ ịsọpụrụ ndị mụrụ ya? (b) Olee otú ebe obibi pụrụ isi ghọọ ebe na-enye ume ọhụrụ?

18 Í kwesịghị n’otu aka ahụ ịsọpụrụ ndị mụrụ gị? “Nsọpụrụ” n’ebe a pụtara ịnakwere ịchịisi e guzobere eguzobe. (Tụlee 1 Pita 2:17.) N’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị e nwere, nsọpụrụ dị otú ahụ kwesịrị ekwesị ọbụna ma ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ ndị na-ekweghị ekwe ma ọ bụ ndị na-ada ada n’isetịpụ ezi ihe nlereanya. I kwesịrị ịsọpụrụ ndị mụrụ gị karịsịa ma ọ bụrụ na ha bụ ndị Kraịst e ji ama atụ. Chetakwa na nzube nke ịdọ aka ná ntị na ntụziaka ndị mụrụ gị nyere abụghị igbochi gị n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Kama nke ahụ, ọrụ ha bụ ichebe gị ka i wee nwee ike ‘nọgide ndụ.’—Ilu 7:1, 2.

19 Mgbe ahụ, lee aha ndokwa ịhụnanya nke ezinụlọ bụ! Mgbe ndị bụ di, nwunye, na ụmụ na-agbaso ụkpụrụ Chineke maka ndụ ezinụlọ, ebe obibi na-aghọ ebe obi ụtọ, ebe na-enye ume ọhụrụ. Otú o sina dị, nsogbu ndị metụtara nkwurịta okwu na ọzụzụ ụmụaka pụrụ ibilite. Isiokwu anyị ọzọ ga-atụle ụzọ a pụrụ isi gwọta ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị bụ di, nwunye, na ụmụ ndị na-atụ egwu Chineke setịpụrụ n’oge Bible?

◻ Ihe ọmụma dị aṅaa ka Iso Ụzọ Kraịst wepụtakwuru banyere ọrụ nke onye bụ di?

◻ Òkè dị aṅaa ka onye bụ nwunye kwesịrị ikere n’ezinụlọ ndị Kraịst?

◻ Olee ụzọ ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa pụrụ isi tinye ihe n’ọdịmma nke ezinụlọ?

[Foto dị na peeji nke 9]

“Ọ dịghị ihe ọ bụla n’Iso Ụzọ Kraịst nke yiri ihe ọhụrụ kpam kpam na ihe siri ike, ma e jiri ya tụnyere omume imebiga ihe ọjọọ ókè nke oge ahụ, karịa echiche ndị Kraịst banyere alụmdi na nwunye. . . . [O] mepere ọgbọ ọhụrụ nye ihe a kpọrọ mmadụ”

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị Kraịst bụ́ di na-agba nwunye ha ume ka ha na-ekwupụta ihe bụ mmetụta ha, na-echebara mmetụta ndị a echiche

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya