-
Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ ArụỤlọ Nche—2000 | Julaị 15
-
-
Olee ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ime ka ụzọ anyị dịrị n’ebe dị nnọọ anya pụọ na nke onye na-ebi ndụ ọjọọ? Solomọn na-aza, sị: “Ka i wee ghara inye ndị ọzọ ebube gị, ka i wee gharakwa inye onye na-enweghị obi ebere afọ gị nile: ka afọ wee ghara iju ndị na-abụghị ndị nke gị n’ume gị; ka ihe nile ị dọgburu onwe gị n’ọrụ inweta wee gharakwa ịdị n’ụlọ onye na-abụghị nke gị; i wee sụọ ude n’ikpeazụ gị, mgbe anụ ahụ gị na ahụ gị ga-agwụsị.”—Ilu 5:9-11.
-
-
Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ ArụỤlọ Nche—2000 | Julaị 15
-
-
Otú ọ dị, gịnị ka ‘inye ndị na-abụghị ndị nke anyị, afọ anyị, ume anyị, na ihe anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ inweta’ gụnyere? Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Isi ihe dị n’amaokwu ndị a doro anya: Ihe ekwesịghị ntụkwasị obi na-efu pụrụ ịdị ukwuu; n’ihi na ihe nile mmadụ dọgburu onwe ya n’ọrụ inweta—ọkwá, ike, ọganihu—pụrụ ifunahụ ya ma ọ́ bụghị site n’ihe nwanyị ahụ ji anyaukwu na-achọ n’aka ya ọ bụrụ site n’ihe ndị obodo ji iti mkpu na-ekwu ka o mee n’ihi omume ahụ.” Mmekọahụ rụrụ arụ pụrụ ifu ọtụtụ ihe!
-