N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji “Jekwuru Ndanda”?
ONYE amamihe bụ́ Eze Solomọn nke Israel oge ochie nyere ndụmọdụ nke a, sị: “Jekwuru ndanda.” N’ihi gịnị ka o ji kwuo nke a? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ebe ndanda nọ?
Solomọn kwukwara, sị: “Lee ụzọ [ndanda] nile, wee mara ihe: nke na-enweghị onye isi, ma ọ bụ onye na-ele anya n’ọrụ, ma ọ bụ onye na-achị achị, ma ọ na-edozi nri ya na mgbe okpomọkụ, na-ekpokọtakwa ihe oriri ya na mgbe owuwe ihe ubi.” (Ilu 6:6-8) Okwu ahụ e kwuru mgbe dị anya gara aga na-egosipụta eziokwu nke ndị ọkà n’ihe okike nke oge a chọpụtaworo.
Onye ahụ na-atụ ilu bụ Agua na-egosi na ndanda “maara ihe nke ukwuu.” (Ilu 30:24, 25) Otú ọ dị, amamihe ha abụghị n’ihi iche echiche ọgụgụ isi kama ọ na-esite ná mkpali nke Onye Okike nyeworo ha. Dị ka ihe atụ, n’ihi amamihe ebumpụta ụwa, ndanda na-ekpokọta ihe oriri ha n’oge kwesịrị ekwesị.
Ndanda na-eme nhazi n’ụzọ dị ebube. N’ịbụ ndị dị ịrịba ama n’inyerịta nkwado na ilebara ndị ọrụ ibe ha anya, ha na-enyere ndanda ndị merụrụ ahụ ma ọ bụ ike gwụrụ aka ịlaghachi n’ọnụ ha. Site n’amamihe ebumpụta ụwa, ha na-akwadebe maka ọdịnihu ma na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike iji rụzuo ọrụ ha.
Omume ahụ sitere n’okike nke ndanda na-eme na-egosi na ụmụ mmadụ kwesịrị ime atụmatụ maka ọdịnihu ma bụrụ ndị na-arụsi ọrụ ike. Otú a ka o kwesịrị ịdị n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, na n’ihe omume ime mmụọ. Ka ndanda na-erite uru site n’ịdị uchu ya, otú ahụ ka Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ ‘hụ ezi ihe n’ime ndọgbu ha nile.’ (Eklisiastis 3:13, 22; 5:18) Dị ka ndanda ndị ji ọrụ n’aka, ezi ndị Kraịst na-arụ ọrụ nke ọma n’ụbọchị. Ha ‘na-eji ike ha eme ihe ọ bụla aka ha hụrụ ime,’ ọ bụghị n’ihi na onye nlekọta na-ele ha, kama site n’obi eziokwu na site n’ọchịchọ nke ịbụ ndị ọrụ dị uchu, na-emepụta ihe bara uru.—Eklisiastis 9:10; tụlee Ilu 6:9-11; leekwa Taịtọs 2:9, 10.
N’ezie, anyị ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ‘ejekwuru ndanda’ ma tinye ihe anyị mụtara n’ebe ha nọ n’omume. Obi ụtọ kasị ukwuu ga-abụkwa nke anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu na-eme uche Jehova Chineke, dị ka e kpughere na Bible.