-
Chebe Aha GịỤlọ Nche—2000 | Septemba 15
-
-
“Mmadụ adịghị eleda onye ohi anya, mgbe ọ na-ezu ohi imeju mkpụrụ obi ya mgbe agụụ na-agụ ya,” ka a na-echetara anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, “ma a sị na a chọta ya, ọ ga-akwụghachi okpukpu asaa; akụ̀ nile nke ụlọ ya ka ọ ga-enye.” (Ilu 6:30, 31) N’Israel oge ochie, a na-achọ ka onye ohi nye nkwụghachi ụgwọ, ọ bụrụgodị na ọ ga-eji ihe nile o nwere kwụọ ya.a Lee ka di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko si kwesị ịnata ntaramahụhụ karị, bụ́ onye na-enweghị ihe ngọpụ maka ihe o meworo!
-
-
Chebe Aha GịỤlọ Nche—2000 | Septemba 15
-
-
a Dị ka Iwu Mosis si kwuo, a na-achọ ka onye ohi kwụghachị okpukpu abụọ, okpukpu anọ ma ọ bụ ise. (Ọpụpụ 22:1-4) Okwu bụ́ “okpukpu asaa” yiri ka ọ na-ezo aka na ntaramahụhụ zuru ezu, nke pụrụ ịkarị ihe o zuru ọtụtụ ugboro.
-