Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Isi nke 48. Ebe ndị enyi anọ na-ese foto.

      ISI NKE 48

      Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi

      Ezigbo ndị enyi na-eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ mgbe ihe dịịrị anyị ná mma. Ha na-anọkwa anyị nso imesi anyị obi ike mgbe anyị nọ ná nsogbu. Ma, Baịbụl gosiri na ọ bụghị onye ọ bụla anyị hụrụ ka anyị kwesịrị imete enyi. N’ihi ya, olee otú ị ga-esi mete ezigbo ndị enyi? Chebara ajụjụ ndị na-esonụ echiche.

      1. Olee ihe jikọrọ ndị enyi gị na otú i si akpa àgwà?

      Ndị mmadụ na-akpakarị àgwà ka ndị ha na ha na-akpa. Ha nwere ike ịmụta àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ n’aka ha, ma hà na-ahụ ihu na ihu ma hà na-akpa n’Ịntanet. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na “onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu [ya bụ, ndị na-ahụghị Jehova n’anya] na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Ọ bụrụ na ndị enyi gị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya, ha nwere ike ime ka gị na ya dịkwuo ná mma, nyekwara gị aka ịna-eme ihe dị mma. Ma, ọ bụrụ na ndị enyi anyị ahụghị Jehova n’anya, ha nwere ike ime ka anyị na ya gharazie ịdị ná mma. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị saa anya ná mmiri mgbe anyị na-emete ndị enyi. Ọ bụrụ na ndị enyi anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-amụta ihe n’aka ha, hanwa ga-amụtakwa ihe n’aka anyị. Anyị na ha ga ‘na-agba ibe anyị ume ma na-eme ka ibe anyị dị ike.’​—1 Ndị Tesalonaịka 5:11.

      2. Olee otú obi ga-adị Jehova n’ihi ndị i metere enyi?

      Jehova na-eleru anya ala tupu ya emete mmadụ enyi. “Ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.” (Ilu 3:32) Olee otú obi ga-adị Jehova ma anyị mete ndị na-ahụghị ya n’anya enyi? Obi agaghị adị ya mma. (Gụọ Jems 4:4.) Ma, ọ bụrụ na anyị na ndị ọjọọ anaghị akpa, ọ bụrụkwa na anyị abịaruo Jehova nso ma mete ndị hụrụ ya n’anya enyi, obi ga-adị ya mma, ọ ga-abụkwa enyi anyị.​—Abụ Ọma 15:1-4.

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta ihe mere mmadụ imete ezigbo ndị enyi ji dị mkpa nakwa otú i nwere ike isi mete ndị enyi ga-abara gị ezigbo uru.

      3. Lezie anya ka gị na ndị ọjọọ ghara ịna-akpa

      Anyị na ndị na-ahụghị Chineke n’anya, ndị jụkwara ịna-erubere ya isi ekwesịghị ịna-akpa. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Mụta Ịjụ Mkpakọrịta Ọjọọ (6:17)

      • Olee otú o nwere ike isi bụrụ na anyị na ndị ọjọọ na-akpa ma anyị amaghị?

      Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee ụdị onye gị na ya na-ekwesịghị ịna-akpa? Maka gịnị?

      Gụọnụ Abụ Ọma 119:63. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee ihe mmadụ ga na-eme, gị amara na ọ ga-abụ ezigbo enyi?

      Ebe apụl juru otu efere. Otu apụl na-adịghị mma ijiji na-akpụ emeela ka apụl ndị nke ọzọ malite imebi.

      Otu mkpụrụ osisi mebie, o nwere ike ime ka ndị ọzọ mebie. Olee otú àgwà gị nwere ike ịdị ma gị na otu onye ọjọọ na-akpa?

      4. Ndị na-abụghị ọ dị ka ọ dị anyị nwere ike ịbụ ezigbo ndị enyi anyị

      Baịbụl kọrọ akụkọ mmadụ abụọ bụ́ ndị Izrel oge ochie. Aha ha bụ Devid na Jonatan. Jonatan tọgburu Devid atọgbu, bụrụkwa nwa eze. Ma, ha abụọ bụ nnu na mmanụ. Gụọnụ 1 Samuel 18:1. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú amaokwu a si gosi na ndị enyi anyị ekwesịghị ịbụ naanị ndị ọgbọ anyị ma ọ bụ ndị ọ dị ka ọ dị anyị?

      Gụọnụ Ndị Rom 1:11, 12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú ndị enyi hụrụ Jehova n’anya si agba ibe ha ume?

      Na vidio a, chọpụta otú otu nwa okorobịa si mete enyi ebe ọ na-atụghị anya ya. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a.

      VIDIO: Ị Ga-esili n’Ebe Ị Na-atụghị Anya Ya Mete Enyi (5:06)

      • Na vidio a, gịnị mere na ndị ha na Akil na-akpa n’ụlọ akwụkwọ adịghị papa na mama Akil mma?

      • Ná mmalite, gịnị mere Akil ji chee na ụmụ ­okorobịa ahụ ga-abụ ezigbo ndị enyi?

      • Olee otú o si mechaa mete ezigbo enyi?

      5. Otú ị ga-esi abụ ezigbo enyi

      Chọpụta otú ị ga-esi emete ezigbo ndị enyi nakwa otú ị ga-esi abụ ezigbo enyi. Kpọnyenụ VIDIO a.

      VIDIO: Olee Otú E Si Amata Ezigbo Enyi? (4:14)

      Foto si na vidio bụ́ ‘Olee Otú E Si Amata Ezigbo Enyi?’ Ebe ndị enyi otu onye na-eto eto gbara ya gburugburu. Afọ ha dị iche iche, ha si obodo dị iche iche, aka ọrụ ha dịkwa iche iche.

      Gụọnụ Ilu 18:24 na 27:17. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee otú ezigbo ndị enyi si enyere ibe ha aka?

      • Ì nwere ụdị ndị enyi na-enyere gị aka otú ahụ? Ọ bụrụ na i ­nweghị, olee otú ị ga-esi enweta ha?

      Gụọnụ Ndị Filipaị 2:4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ị chọọ inwe ezigbo ndị enyi, i kwesịrị ịbụ ezigbo enyi. Olee otú ị ga-esi abụ ezigbo enyi?

      Foto anọ: Ebe otu nwa agbọghọ na ndị enyi ya atọ gara ileta mmadụ. 1. Nwa agbọghọ ahụ na-akpọ otu n’ime ndị enyi ya ahụ n’ekwentị. 2. Nwa agbọghọ ahụ na enyi ya nke katarala ahụ na-akparịta ụka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. 3. Nwa agbọghọ ahụ gara ileta otu n’ime ndị enyi ya ahụ na-eru uju.

      Ị chọọ inwe ezigbo ndị enyi, i kwesịrị ịbụ ezigbo enyi

      ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ụdị onye enyi mmadụ bụ enweghị ihe o mere ma ọ bụrụhaala na ihe na-adabara ha abụọ.

      • Gịnị ka i nwere ike ịgwa onye kwuru ụdị ihe a?

      NCHỊKỌTA

      Anyị saa anya ná mmiri mgbe anyị ­na-emete ndị enyi, obi na-atọ Jehova ụtọ, anyị na-eritekwa uru.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Gịnị mere Jehova ji achọ ka anyị mete ndị ezigbo mmadụ enyi?

      • Olee ụdị ndị anyị na-ekwesịghị imete enyi?

      • Olee otú ị ga-esi eme ka ndị ezigbo mmadụ bụrụ ndị enyi gị?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Chọpụta otú ezigbo ndị enyi nwere ike isi nyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị.

      “Mee Ka Gị na Ụmụnna Gị Dịkwuo ná Mma Tupu Ọgwụgwụ Eruo” (Ụlọ Nche, Nọvemba 2019)

      Chọpụta ụfọdụ ihe i nwere ike ime ka i nweta ezigbo ndị enyi.

      “Olee Otú M Ga-esi Emeta Ezigbo Ndị Enyi?” (Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ​—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, isi nke 8)

      Olee ihe i kwesịrị ịma gbasara imete ndị enyi n’Ịntanet?

      Kpachara Anya n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet (4:12)

      Gụọ isiokwu bụ “Ọ gụrụ m ezigbo agụụ inwe onye m ga-ewere ka nna,” ka ị hụ ihe mere otu nwoke ji hapụ ndị enyi ya mete ndị ọzọ enyi.

      “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Eprel 1, 2012)

  • Jiri Ihe Ga-amasị Jehova Na-eme Onwe Gị Obi Ụtọ
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 1. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-achọ ihe anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ?

      Gịnị ka obi na-adị gị mma ime ma ị na-ezu ike? Ụfọdụ ndị na-anọdụrụ onwe ha n’ụlọ na-agụ akwụkwọ, na-egere egwú, na-ele fim, ma ọ bụ jiri Ịntanet na-eme ihe dị iche iche. Ndị ọzọ anaghị achọ ịnọ otu ebe. Ha na-achọ ka ha na ndị enyi ha soro na-agbagharị ígwè, na-egwu mmiri, ma ọ bụ na-azụ okwe. Nke ọ sọrọ ya bụrụ ya na-amasị anyị, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na ihe anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ “dị Onyenwe anyị mma.” (Ndị Efesọs 5:10) Ọ dị mma ka anyị buru ihe a n’obi n’ihi na a na-ahụ ihe dị iche iche Jehova kpọrọ asị n’ihe ọtụtụ ndị mmadụ ji eme onwe ha obi ụtọ. A na-ahụ ihe ndị dị ka tigbuo zọgbuo, ịkwa iko, ma ọ bụ ime mgbaasị. (Gụọ Abụ Ọma 11:5.) Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ihe dị mma anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ?

      Ọ bụrụ na anyị na ndị hụrụ Jehova n’anya bụ enyi, ha ga-enyere anyị aka ịma ihe dị mma anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ. Dị ka anyị mụrụ n’otu isiokwu bu nke a ụzọ, “onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe.” Ma, “ihe agaghị agaziri” anyị ma anyị na ndị na-emebi iwu Chineke na-akpa.​—Ilu 13:20.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya