Nweta Amamihe, Narakwa Ịdọ Aka ná Ntị
JEHOVA CHINEKE bụ Onye Nkụzi Ukwu nke ndị ya. Ọ bụghị nanị banyere onwe ya ka ọ na-akụziri ha kamakwa banyere ndụ. (Aịsaịa 30:20; 54:13; Abụ Ọma 27:11) Dị ka ihe atụ, Jehova nyere mba Israel ndị amụma, ndị Livaị—karịsịa ndị nchụàjà—na ndị amamihe ọzọ ije ozi dị ka ndị nkụzi. (2 Ihe E Mere 35:3; Jeremaịa 18:18) Ndị amụma kụziiri ndị ahụ nzube na àgwà Chineke ma gosipụta ụzọ ziri ezi ịgbaso. Ndị nchụàjà na ndị Livaị nwere ịbụ ọrụ nke ịkụzi Iwu Jehova. Ndị amamihe ahụ, ma ọ bụ ndị okenye, nyekwara ndụmọdụ rijuru afọ n’ihe banyere ndụ a na-adị kwa ụbọchị.
Nwa Devid, bụ́ Solomọn, pụtara ìhè n’etiti ndị amamihe nke Israel. (1 Ndị Eze 4:30, 31) Mgbe otu n’ime ndị ọbịa ya a kasị mara amara, bụ́ eze nwanyị Sheba, hụrụ ebube na akụ̀ na ụba ya, o kwupụtara, sị: “E gosighị m nkera ya: ị tụkwasịwo amamihe na ịdị mma n’akụkọ nke m nụrụ.” (1 Ndị Eze 10:7) Olee ebe amamihe Solomọn sitere? Mgbe ọ ghọrọ eze Israel na 1037 T.O.A., Solomọn kpere ekpere maka “amamihe na ihe ọmụma.” N’ịbụ onye arịrịọ ya tọrọ ụtọ, Jehova nyere ya ihe ọmụma, amamihe, na obi na-aghọta ihe. (2 Ihe E Mere 1:10-12; 1 Ndị Eze 3:12) Ka a sịkwa ihe mere Solomọn jiri “tụọ [puku ilu atọ]”! (1 Ndị Eze 4:32) E dekọrọ ụfọdụ n’ime ha, tinyere “okwu Agua” na nke “Lemuel, bụ́ eze,” n’akwụkwọ Bible bụ́ Ilu. (Ilu 30:1; 31:1) Eziokwu ndị e kwupụtara n’ilu ndị a na-egosipụta amamihe Chineke, ha na-adịrukwa ebighị ebi. (1 Ndị Eze 10:23, 24) Otú ha si dị oké mkpa mgbe mbụ e kwuru ha ka ha sịkwa dị taa nye onye ọ bụla nke na-achọ ndụ obi ụtọ na nke na-aga nke ọma.
Ihe Ịga nke Ọma na Ịdị Ọcha nke Omume—N’ụzọ Dị Aṅaa?
A kọwara nzube nke akwụkwọ Ilu n’okwu mmalite ya bụ́: “Ilu dị iche iche nke Solomọn nwa Devid, bụ́ eze Israel: ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị; ịghọta okwu ọnụ nile nke nghọta; ịnara ịdọ aka ná ntị nke inwe uche, na ezi omume na ikpe na izi ezi; inye ndị na-enweghị uche ezi uche, inye nwa okorobịa ihe ọmụma na izuzu.”—Ilu 1:1-4.
Lee nzube bụ́ ịgba “ilu dị iche iche nke Solomọn” gaje imezu! Ha bụ maka “ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị.” Amamihe na-agụnye ịghọta ihe otú ha dị na iji ihe ọmụma ahụ mee ihe iji dozie nsogbu, ruo ihe mgbaru ọsọ, zere ma ọ bụ gbanahụ ihe ize ndụ, ma ọ bụ nyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ. “N’Akwụkwọ Ilu,” ka otu akwụkwọ na-ekwu, “‘amamihe’ pụtara iji nkà ebi ndụ—ikike nke ime nhọrọ ndị amamihe dị na ha na ibi ndụ n’ụzọ na-aga nke ọma.” Lee ka o si dị mkpa inweta amamihe!—Ilu 4:7.
Ilu Solomọn na-enyekwa ịdọ aka ná ntị. Ọzụzụ a ọ̀ dị anyị mkpa? N’Akwụkwọ Nsọ, ịdọ aka ná ntị na-enye echiche nke mgbazi, ịba mba, ma ọ bụ inye ahụhụ. Dị ka otu ọkà mmụta Bible si kwuo, ọ “na-egosi ọzụzụ nke ọnọdụ omume, nke na-agụnye ịgbazi ọchịchọ nke nnupụisi.” Ịdọ aka ná ntị, ma ọ̀ bụ nke anyị na-enye onwe anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ na-enye anyị, abụghị nanị na ọ na-egbochi anyị itinye aka n’ime ihe ọjọọ kamakwa ọ na-akwali anyị ime mgbanwe ịbụ ndị ka mma. Ee, ịdọ aka ná ntị dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-adị ọcha n’omume.
Mgbe ahụ, nzube nke ilu ndị ahụ gbara mkpị—inye amamihe na ịdọ aka ná ntị. Ịdọ aka ná ntị nke omume na ikike iche echiche nwere ọtụtụ akụkụ. Dị ka ihe atụ, ezi omume na ikpe ziri ezi bụcha àgwà omume ọma, ha na-enyekwara anyị aka ịrapara n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova.
Amamihe bụ ihe ọtụtụ ihe mejupụtara, nke gụnyere nghọta, ezi uche, na izuzu. Nghọta bụ ikike nke ileba anya n’okwu ma ghọta ihe ndị mejupụtara ya site n’ịghọta njikọ ndị e nwere n’akụkụ ya nile na okwu ahụ n’ozuzu ya, si otú a na-aghọta ya nke ọma. Ezi uche na-achọ ịmara ihe ndị kpatara ihe na ịghọta ihe mere otu ụzọ ji zie ezie ma ọ bụ dị njọ. Dị ka ihe atụ, onye nwere nghọta pụrụ ịghọta mgbe mmadụ na-etinye isi n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ pụkwara ịdọ ya aka ná ntị ozugbo banyere ihe ize ndụ dị na ya. Ma ọ na-achọ ezi uche n’aka ya iji ghọta ihe mere onye ahụ ji na-etinye isi n’ụzọ ahụ ma chọọ ụzọ kasị dị irè isi zọpụta ya.
Ndị nwere ezi uche na-adị akọ—ọ bụghị ndị a na-aghọgbu n’ụzọ dị mfe. (Ilu 14:15) Ha na-enwe ike ibu ụzọ hụ ihe ọjọọ ma jikere maka ya. Amamihe na-enyekwara anyị aka ichepụta echiche ndị dị mma bụ́ ndị na-enye nduzi nwere nzube ná ndụ. Ịmụ ilu Bible na-akwụghachi ụgwọ n’ezie n’ihi na e dekọrọ ha ka anyị wee nwee ike ịmara amamihe na ịdọ aka ná ntị. Ọbụna “ndị na-enweghị uche,” bụ́ ndị na-aṅa ntị n’ilu ndị ahụ ga-enweta ezi uche, “nwa okorobịa” kwa, ga-enweta ihe ọmụma na izuzu.
Ilu Ndị Dịịrị Onye Maara Ihe
Otú ọ dị, ilu Bible abụghị nanị maka ndị na-enweghị uche na ndị ntorobịa. Ha bụ maka onye ọ bụla nke nwere amamihe zuru ezu ịṅa ntị. “Ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya,” ka Eze Solomọn na-ekwu, “ka onye nghọta wee nwetakwa ezi ndụmọdụ: ịghọta ilu, na okwu miri emi; okwu nile nke ndị maara ihe, na okwu omimi nile ha.” (Ilu 1:5, 6) Onye nwetaworo amamihe ga-amụba ihe mmụta ya site n’ịṅa ntị n’ilu ndị ahụ, onye nwere nghọta ga-amụchakwa ikike o nwere iduzi ndụ ya n’ụzọ na-aga nke ọma.
Ilu na-ejikarị okwu ole na ole ekwupụta eziokwu gbara ọkpụrụkpụ. Ilu Bible pụrụ ịdị n’ụdị nke okwu miri emi. (Ilu 1:17-19) Ilu ụfọdụ bụ gwam gwam gwam—okwu ndị dị mgbagwoju anya ma taa akpụ bụ́ ndị chọrọ nkọwa. Ilu pụkwara inwe okwu na-egosi ihe yiri ihe, okwu ntụnyere, na atụmatụ okwu ndị ọzọ. Ọ na-ewe oge na ntụgharị uche iji ghọta ha. N’ezie, Solomọn, bụ́ onye tụrụ ọtụtụ ilu, nwere ikike nke ịghọta ilu. N’akwụkwọ Ilu, ọ rụrụ ọrụ nke ịkụbanye ikike ahụ n’ebe ndị na-agụ akwụkwọ ya nọ, bụ́ ihe onye maara ihe ga-achọ ịṅa ntị na ya.
Mmalite nke Na-eduga n’Ihe Mgbaru Ọsọ Ahụ
Olee ebe mmadụ si amalite ịchụso amamihe na ịdọ aka ná ntị? Solomọn na-aza, sị: “Egwu Jehova bụ mmalite ihe ọmụma: amamihe na ịdọ aka ná ntị ka ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ledaworo anya.” (Ilu 1:7) Ihe ọmụma na-eji egwu Jehova amalite. E wezụga ihe ọmụma, amamihe ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị apụghị ịdị. Mgbe ahụ, egwu Jehova bụ mmalite amamihe na ịdọ aka ná ntị.—Ilu 9:10; 15:33.
Egwu Chineke abụghị ịtụ ya egwu ọjọọ. Kama nke ahụ, ọ bụ nsọpụrụ ofufe miri emi na ụjọ. Ezi ihe ọmụma apụghị ịdị ma e wezụga egwu a. Ndụ si n’aka Jehova Chineke bịa, n’ezie kwa, ndụ dị oké mkpa maka anyị inwe ihe ọmụma ọ bụla. (Abụ Ọma 36:9; Ọrụ 17:25, 28) Ọzọkwa, ọ bụ Chineke kere ihe nile; ya mere ihe ọmụma nile nke mmadụ na-adabere n’ịmụ ọrụ aka ya. (Abụ Ọma 19:1, 2; Mkpughe 4:11) Chineke jikwa ike mmụọ nsọ mee ka e dee Okwu ya, bụ́ nke “[bara] uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16, 17) N’ihi ya, nke kasị mkpa n’ezi ihe ọmụma nile bụ nke e nwere n’ebe Jehova nọ, onye na-achọkwa ya aghaghị ịtụ ya egwu nsọpụrụ.
Uru gịnị ka ihe ọmụma mmadụ na amamihe ụwa bara ma ọ bụrụ na e nweghị egwu Chineke? Pọl onyeozi dere, sị: “Olee ebe onye maara ihe nọ? olee ebe odeakwụkwọ nọ? olee ebe onye oge a, onye ya na ibe ya na-ajụrịta ajụjụ, nọ? Chineke [ó] meghị ka amamihe ụwa bụrụ ihe nzuzu?” (1 Ndị Kọrint 1:20) N’ịbụ onye na-adịghị atụ egwu Chineke, onye amamihe ya bụ nke ụwa na-eme mkpebi na-ezighị ezi site n’ihe ndị a maara na-eme eme ma si otú a bụrụ ‘onye gbagọrọ agbagọ n’uche.’
“Ihe Ịnya n’Olu Ka Ha Ga-abụrụ Olu Gị”
Eze ahụ maara ihe gwaziri ndị ntorobịa okwu: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị: n’ihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, ihe ịnya [n’olu] ka ha ga-abụrụ olu gị.”—Ilu 1:8, 9.
N’Israel oge ochie, ndị nne na nna nwere ibu ọrụ sitere n’aka Chineke nke ịkụziri ụmụ ha ihe. Mosis gbara ndị bụ́ nna ume, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ndị nne nwekwara mmetụta dị ukwuu. N’okpuru ịbụisi nke di ya, nwanyị bụ́ onye Hibru pụrụ ịhụ na e debere iwu ezinụlọ.
N’ezie, n’ime Bible, ezinụlọ bụ ebe bụ́ isi maka ịkụzi ihe. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ụmụaka irubere nne na nna ha bụ́ ndị kwere ekwe isi bụ ha ịbụ ndị e ji okpu amara mara mma na ihe ịnya n’olu, chọọ mma n’ụzọ ihe atụ.
“Ndụ nke Ndị Nwe Ya Ka Ọ Na-ewepụ”
Tupu otu nna bụ́ onye Esia eziga nwa ya nwoke dị afọ 16 United States maka agụmakwụkwọ dị elu, ọ dụrụ ya ọdụ ka ọ ghara iso ndị ọjọọ akpakọrịta. Ndụmọdụ a kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị Solomọn bụ́: “Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie araa gị ụrà, ekwela.” (Ilu 1:10) Otú ọ dị, Solomọn rụtụrụ aka n’ihe ụrà ha ji eme ihe: “Ọ bụrụ na ha asị, Soro anyị jee, ka anyị chee anwụ ọbara, ka anyị zobe onwe anyị ijide onye na-emeghị ihe ọjọọ n’efu; ka anyị loo ha ná ndụ dị ka [Sheol, “NW”], bụ́ ndị zuru okè, dị ka ndị na-arịda n’olulu; ihe nile dị oké ọnụ ahịa ka anyị ga-achọta, anyị ga-akwaju ụlọ anyị nile n’ihe anyị kwatara n’agha; nzà gị ka ị ga-efe n’etiti anyị; otu akpa ego ka anyị nile ga-enwekọ.”—Ilu 1:11-14.
N’ụzọ doro anya, ihe ụrà ahụ bụ akụ̀ na ụba. Ná ndabere nke inweta uru ọkụ ọkụ, “ndị mmehie” na-arata ndị ọzọ isonye n’atụmatụ ha nke ime ihe ike ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi. Ndị ajọ omume a adịghị ala azụ n’ịkwafu ọbara n’ihi ihe onwunwe. Ha ‘na-elo onye ha jidere ná ndụ dị ka Sheol, bụ́ onye zuru okè,’ na-anapụ ya ihe nile o nwere, dị nnọọ ka ili na-ewekọrọ ahụ nile. Òkù ha na-akpọ bụ maka ime mpụ—ha na-achọ ‘ịkwaju ụlọ ha nile n’ihe ha kwatara n’agha,’ ha na-achọkwa ka onye na-enweghị uche ‘soro ha fee nzà.’ Lee ịdọ aka ná ntị bịara n’oge ya nke a bụụrụ anyị! Ọ̀ bụ na ndị nọ n’ajọ òtù ndị ntorobịa na ndị na-agba mgbere ọgwụ ọjọọ adịghị eji usoro yiri nke a enweta ndị òtù? Ọ̀ bụ na nkwa nke ịba ọgaranya ọkụ ọkụ abụghị ọnwụnwa dị n’ọtụtụ atụmatụ achụmnta ego a na-enyo enyo?
“Nwa m,” ka eze ahụ maara ihe na-adụ n’ọdụ, “esola ha jee n’ụzọ; gbochie ụkwụ gị n’ịga n’okporo ụzọ ha: n’ihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, ha na-emekwa ngwa ịwụsị ọbara.” N’ibu amụma banyere njedebe ha dị njọ, ọ na-agbakwụnye, sị: “N’ihi na ọ bụ n’efu ka a na-agbasa ụgbụ, n’anya nnụnụ ọ bụla: ndị a kwa, ọbara onwe ha ka ha na-eche anwụ, ha na-ezobe onwe ha ịnwụde ndụ nke aka ha. Otú a ka ụzọ nile nke onye ọ bụla nke akpịrị uru na-ezighị ezi na-akpọ nkụ si dị; ndụ nke ndị nwe ya ka ọ na-ewepụ.”—Ilu 1:15-19.
“Onye ọ bụla nke akpịrị uru na-ezighị ezi na-akpọ nkụ” ga-ala n’iyi n’ụzọ ya. Anwụ nke ndị na-emebi iwu na-eche megide ndị ọzọ ga-aghọrọ ha onwe ha ọnyà. Ndị ma ụma eme ihe ọjọọ hà ga-agbanwe ụzọ ha? Ee e. Ụgbụ pụrụ ịdị n’ebe a na-ahụ ya anya nke ọma, ma n’agbanyeghị nke ahụ, “nnụnụ” na-efeba n’ime ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, n’ịbụ ndị anyaukwu ha na-eme ka ha kpuo ìsì, ndị na-emebi iwu na-aga n’ihu n’ime mpụ ha ọ bụ ezie na a ga-ejide ha ka oge na-aga.
Ònye Ga-ege Ntị n’Olu Amamihe?
Ndị mmehie hà maara n’ezie na ụzọ ha na-eweta ọdachi? À dọọla ha aka ná ntị banyere ihe ga-esi n’ụzọ ha pụta? Amaghị nke a na-akọ abụghị ihe ngọpụ, n’ihi na a na-akpọsa otu ozi dị oké mkpa n’ámá nile.
Solomọn kwupụtara, sị: “Amamihe na-eti mkpu n’èzí; n’ámá nile ka ọ na-eme ka olu ya daa ụda; n’isi ebe nile a na-atụ ụ̀zụ̀ ka ọ na-akpọ òkù; n’oghere ọnụ ụzọ ámá nile, n’obodo, ka ọ na-ekwu okwu ọnụ ya nile.” (Ilu 1:20, 21) Amamihe na-eti mkpu n’ámá nile n’olu dara ụda ma doo anya ka mmadụ nile nụrụ. N’Israel oge ochie, ndị okenye nyere ndụmọdụ amamihe, kpeekwa ikpe n’ọnụ ụzọ ámá obodo. Jehova emewo ka e dekọọrọ anyị ezi amamihe n’Okwu ya, bụ́ Bible, bụ́ nke dị ebe nile. Ndị ohu ya taa jikwa ọrụ n’aka na-ekwusa ozi ya n’ihu ọha n’ebe nile. N’ezie, Chineke mere ka a kpọsaara mmadụ nile amamihe.
Gịnị ka ezi amamihe na-ekwu? Ọ bụ nke a: “Unu ndị na-enweghị uche, ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ enweghị uche n’anya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-achọsikwara onwe ha ịkwa emo ike? . . . Akpọwo m òkù, unu wee jụ; esetịpụwo m aka m, ma ọ dịghị onye na-aṅa ntị.” Ndị nzuzu adịghị aṅa ntị n’olu amamihe. N’ihi ya, “ha ga-erikwa ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ụzọ ha.” Ọ bụ ‘nchigharị azụ na ịnọ n’udo nke ha ga-eme ka ha laa n’iyi.’—Ilu 1:22-32.
Otú ọ dị, gịnị banyere onye wepụtaworo oge iji gee ntị n’olu amamihe? “[Ọ] ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.” (Ilu 1:33) Ka i soro n’etiti ndị ahụ na-enweta amamihe ma na-anara ịdọ aka ná ntị site n’ịṅa ntị n’ilu Bible.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ezi amamihe dị ebe nile