Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 5/15 p. 30
  • Zere Mmụọ Mpako!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Zere Mmụọ Mpako!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 5/15 p. 30

Zere Mmụọ Mpako!

Otu ilu amamihe nke Bible na-asị: “Onye na-eme ka ọnụ ụzọ ya dị elu na-achọ ntipịa.” (Ilu 17:19) Gịnị dị njọ banyere ọnụ ụzọ dị elu? Gịnịkwa bụ isi ihe dị n’ilu nke a?

N’OGE ochie ndị mmadụ na usuu ndị agha nọ n’azụ ịnyịnya abụghị ihe dị ụkọ. Ebe obibi ndị na-enweghị nchebe e wuru ná mba na-enweghị oké ọhịa dịịrị ndị ohi mfe ịba. Iji gbochie ka a ghara izuru ihe onwunwe ha, ụfọdụ ndị nwere ụlọ wuru mgbidi nwere geti pụrụ iche. Mgbidi ahụ dị elu, ma ụzọ geti ya dị ala. N’ezie, ụfọdụ erughị ihe karịrị otu mita n’ịdị elu​—⁠bụ́ nke dị ala nke ukwuu maka ịnyịnya na onye na-anọkwasị ya ịbata. Ndị na-arụghị ọnụ ụzọ e si abata n’ogige ụlọ ha ka ọ dị ala nọ n’ihe ize ndụ nke ime ka ndị nọ n’azụ ịnyịnya bata wee kwakọrọ ngwongwo ha.

Ná nnukwu obodo, a na-arụkarị ọnụ ụzọ mbata ka ọ dị ala ma ghara ịma mma, ka a ghara inye ihe àmà nke akụ pụrụ ịdị n’ime ogige ụlọ ahụ e wuchiri mgbidi. Otú ọ dị, na Peasia geti dị elu bụ otu n’ime ihe ndị na-egosi ọnọdụ eze, bụ́ nke ụfọdụ ndị a na-achị achị na-agbalị iṅomi n’ụzọ dị oké ize ndụ nye ha. Onye ọ bụla nke wuru geti dị elu maka ụlọ ya na-akpọ ndị abalị dị egwu òkù n’ihi igosi ihe ndị o nwere.

Ilu 17:19 si otú a na-egosi na ndị na-ewu ọnụ ụzọ mbata dị elu na-akpọ ọdachi òkù site n’iweli onwe ha elu karịa otú ha hà. Ilu nke a pụkwara imetụta ọnụ dị ka ọnụ ụzọ mbata e wuliri elu site n’ikwu okwu itu ọnụ na mpako. Ụdị okwu dị otú ahụ na-akpali esemokwu, ọ pụkwara imesị duga onye nganga n’ọdachi. Mgbe ahụ, lee otú o si bụrụ ihe amamihe izere mmụọ nke mpako!

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

Picturesque Palestine, Sinai na Egypt, Mpịakọta nke 1, nke Colonel Wilson dere (1881)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya