Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/15 p. 18-23
  • “Ozi Dị Nsọ Site n’Ike nke Uche Unu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ozi Dị Nsọ Site n’Ike nke Uche Unu”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịzụlite Ike nke Uche Gị
  • Ndị Ohu Chineke na Kraịst, Ọ Bụghị nke Mmadụ
  • Ịzụlite “Uche nke Kraịst”
  • Ibi Ndụ Kwekọrọ n’Iwu Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Otú Anyị Ga-esi Na-ahọrọ Ntụrụndụ Dị Mma
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Akọ na Uche Gị Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Kwe Ka Iwu na Ụkpụrụ Chineke Na-azụ Akọnuche Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/15 p. 18-23

“Ozi Dị Nsọ Site n’Ike nke Uche Unu”

“Cheenụ ahụ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anakwere, ozi dị nsọ site n’ike nke uche unu.”—NDỊ ROM 12:1, NW.

1, 2. Olee otú ịmụta itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ si yie ịmụta asụsụ ọhụrụ?

Ọ̀ DỊWO mgbe ị nwara ịmụ asụsụ ọhụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekwere na ọ bụ ọrụ siri ike. E kwuwerị, ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịmụta okwu ndị ọhụrụ. Iji asụsụ eme ihe n’ụzọ dị irè chọrọ ịmụta ụtọ asụsụ ya nke ọma. Ị ghaghị ịghọta ụzọ okwu dị iche iche si emetụta ibe ha na ụzọ ha si ejikọ ọnụ iji wepụtazuo echiche dị iche iche.

2 Otú ahụ ka ọ dị n’anyị ịnara ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịmụta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị dịsasịrị adịsasị. Anyị aghaghị ịmụtakwa ụtọ asụsụ nke Bible, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ọ dị anyị mkpa ịghọta ụzọ akụkụ akwụkwọ nsọ si emetụta ibe ha na ụzọ ha si eje ozi dị ka ụkpụrụ ndị a pụrụ iji mee ihe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Anyị pụrụ isi otú ahụ ghọọ ndị ‘e mere ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’—2 Timoti 3:17.

3. Banyere ijere Chineke ozi, mgbanwe dị aṅaa weere ọnọdụ na 33 O.A.?

3 N’okpuru ndokwa ụkpụrụ Iwu Mosis, a pụrụ igosipụta ikwesị ntụkwasị obi, ruo n’ókè dị ukwuu, site n’ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ ndị a kọwara nke ọma. Otú ọ dị, na 33 O.A., Jehova kachapụrụ Iwu ahụ, ya bụ “na-akpọgide ya n’elu osisi ịta ahụhụ” nke e gburu Ọkpara ya n’elu ya. (Ndị Kọlọsi 2:13, 14, NW) Mgbe nke ahụ gasịrị, e nyeghị ndị Chineke ndepụta dị ogologo nke àjà ndị a ga na-achụ na ụkpụrụ iwu ndị a ga-agbaso. Kama nke ahụ, a gwara ha, sị: “Cheenụ ahụ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anakwere, ozi dị nsọ site n’ike nke uche unu.” (Ndị Rom 12:1, NW) Ee, ndị Kraịst ga-adọgbu onwe ha n’ọrụ, site n’obi, mkpụrụ obi, uche, na ike ha dum n’ozi Chineke. (Mak 12:30; tụlee Abụ Ọma 110:3.) Ma gịnị ka ọ pụtara bụ́ ije “ozi dị nsọ site n’ike nke uche unu”?

4, 5. Gịnị ka ijere Jehova ozi site n’ike nke uche anyị gụnyere?

4 A sụgharịtara nkebi ahịrị okwu ahụ bụ́ “ike nke uche” site n’okwu Grik bụ́ lo·gi·kosʹ, nke pụtara “ezi echiche” ma ọ bụ “ọgụgụ isi.” A na-akpọku ndị ohu Chineke iji akọ na uche ha e ji Bible zụọ na-eme ihe. Kama ịdabere mkpebi ha n’ọtụtụ ụkpụrụ iwu ndị e bu ụzọ guzobe, ndị Kraịst gaje iji nlezianya tụlee ụkpụrụ dị iche iche nke Bible. Ọ dị ha mkpa ịghọta “ụtọ asụsụ” nke Bible, ma ọ bụ ụzọ ụkpụrụ ya dị iche iche si emetụta ibe ha. N’ụzọ dị otú a, ha pụrụ ime mkpebi ndị ziri ezi site n’ike nke uche ha.

5 Nke a ọ̀ pụtara na ndị Kraịst enweghị iwu ọ bụla? Ee e ma ọlị. Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ụzọ doro anya machibidoro ikpere arụsị, mmekọahụ rụrụ arụ, igbu mmadụ, ịgha ụgha, ịgwọ nsí, iji ọbara eme ihe na-ezighị ezi, na mmehie ndị ọzọ. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Mkpughe 21:8) Ma, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ ukwuu karịa otú a chọrọ n’aka ndị Israel, anyị aghaghị iji ike nke uche anyị mụta ma tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Dị nnọọ ka n’ịmụta asụsụ ọhụrụ, nke a na-ewe oge na mgbalị. Olee otú a pụrụ isi zụlite ike nke uche anyị?

Ịzụlite Ike nke Uche Gị

6. Gịnị ka ịmụ Bible gụnyere?

6 Nke mbụ, anyị aghaghị ịbụ ndị na-amụsi Bible ike. Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ “bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) Anyị ekwesịghị ịtụ anya mgbe nile ka e depụta nke ọma azịza nye otu nsogbu n’otu mkpụrụ amaokwu nke Bible. Kama nke ahụ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịtụgharị uche n’ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ na-enye nghọta banyere otu ọnọdụ ma ọ bụ nsogbu. Ọ ga-adị anyị mkpa iji ịdị uchu mee nchọpụta maka echiche Chineke n’okwu ahụ. (Ilu 2:3-5) Nghọta dịkwa anyị mkpa, n’ihi na ‘onye nghọta bụ onye na-enwetakwa ezi ndụmọdụ.’ (Ilu 1:5) Onye nwere nghọta pụrụ ịtụrịsị ihe dị iche iche dị n’otu okwu wee ghọtazie ụzọ ha si na-emetụta ibe ha. Dị ka n’iji okwe foto na-eme ihe, ọ na-ewekọta mpekere ya nile ọnụ ka o wee nwee ike ịhụ onyinyo ahụ dum.

7. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi tụgharịa uche n’ụkpụrụ Bible ndị metụtara ịdọ aka ná ntị?

7 Dị ka ihe atụ, were okwu nke ịbụ nne ma ọ bụ nna. Ilu 13:24 na-asị na nna nke na-ahụ nwa ya n’anya “na-adọsi ya aka ná ntị ike.” E were nanị ya, a pụrụ iji akụkụ akwụkwọ nsọ a mejọọ ihe n’ịkwado ntaramahụhụ obi ọjọọ, nke na-enweghị nkwụsị. Ma, Ndị Kọlọsi 3:21 na-enye okwu ịdọ aka ná ntị na-eme ka e nwee ezi uche: “Ndị bụ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” Ndị nne na nna na-eji ike nke uche ha eme ihe ma na-eme ka ụkpụrụ ndị a kwekọọ agaghị enye ịdọ aka ná ntị a pụrụ iwere dị ka nke “mmetọ.” Ha ga-emeso ụmụ ha ihe n’ịhụnanya, nghọta, na ịdị ùgwù. (Ndị Efesọs 6:4) Otú a, n’ịbụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ n’okwu ọ bụla ọzọ metụtara ụkpụrụ Bible, anyị pụrụ ịzụlite ike nke uche anyị site n’ịtụle ihe nile metụtara okwu ahụ. N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ịghọta “ụtọ asụsụ” nke ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, ihe Chineke bu n’obi na ụzọ isi mezuo nke ahụ.

8. Olee otú anyị pụrụ isi zere echiche adịghị nro, nke ikwesi olu ike mgbe a bịara n’okwu ntụrụndụ?

8 Ụzọ nke abụọ anyị pụrụ isi zụlite ike nke uche anyị bụ izere iwere echiche adịghị nro, nke nkwenkwe ikwesi olu ike. Ụzọ ile ihe anya nke na-adịghị nro na-egbochi uto nke ike nke uche anyị. Tụlee okwu nke ntụrụndụ. Bible na-asị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Nke a ọ̀ pụtara na akwụkwọ, ihe nkiri, ma ọ bụ usoro ihe omume telivishọn ọ bụla ụwa mepụtara rụrụ arụ ma bụrụ nke ofufe Setan? Echiche dị otú ahụ agaghị eyitụ nke ezi echiche. Otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ ịhọrọ ịhapụ telivishọn, ihe nkiri, ma ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ ụwa kpam kpam. Nke ahụ bụ ihe ruuru ha, e kwesịghịkwa ịkatọ ha n’ihi ya. Ma ha ekwesịghịkwa ịrụgide ndị ọzọ iwere otu nguzo ahụ siri ike. Society ebipụtawo isiokwu ndị na-esetịpụ ụkpụrụ Bible ndị kwesịrị inyere anyị aka ịdị na-eme nhọrọ n’ụzọ amamihe n’izu ike ma ọ bụ ná ntụrụndụ anyị. Ịgabiga ụkpụrụ nduzi ndị a ma na-ekpughepụ onwe anyị nye echiche rụrụ arụ, ajọ ime ihe ike, ma ọ bụ ịgwọ nsí dị n’ihe ka ukwuu ná ntụrụndụ nke ụwa nke a bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ma ọlị. N’ezie, nhọrọ amamihe nke ntụrụndụ na-achọ ka anyị jiri ike nke uche anyị tinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ ka anyị wee nwee akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke na mmadụ.—1 Ndị Kọrint 10:31-33.

9. Gịnị ka “nghọta nile” pụtara?

9 Ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ nke taa doro anya na ha ekwesịghịrị ndị Kraịst.a Ya mere, anyị aghaghị ịzụ obi anyị ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị’ ka anyị wee ghara ịdị ka ụfọdụ na narị afọ mbụ ndị “gabigaworo echiche omume nile.” (Abụ Ọma 97:10; Ndị Efesọs 4:17-19, NW) Iji tụgharịa uche n’okwu ndị dị otú ahụ, “mmazu na nghọta nile” dị anyị mkpa. (Ndị Filipaị 1:9) Okwu Grik a sụgharịrị “nghọta” na-enye echiche nke “nghọta omume nke na-enwe mmetụta.” Okwu ahụ na-ezo aka n’ike nkịtị mmadụ nwere ịma ihe na-emenụ, dị ka ọhụhụ ụzọ. Mgbe a bịara ná ntụrụndụ ma ọ bụ n’okwu ọ bụla ọzọ na-achọ mkpebi onwe onye, echiche omume anyị kwesịrị ịbụ nke a hịziri nke ọma ka anyị wee hụta ọ bụghị nanị okwu ndị a kapịrị ọnụ, ndị doro anya kamakwa ndị na-edochaghị anya. N’otu oge ahụ, anyị kwesịrị izere iji ụkpụrụ Bible mee ihe ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ gabigara ókè ezi echiche na-adịghị na ya ma na-esi ọnwụ ka ụmụnna anyị nile mee otu ihe ahụ.—Ndị Filipaị 4:5.

10. Olee otú anyị pụrụ isi ghọta ụdị onye Jehova bụ dị ka e gosiri ya n’Abụ Ọma nke 15?

10 Ụzọ nke atọ isi zụlite ike nke uche anyị bụ inweta nghọta nke echiche Jehova ma kụbanye ya n’ime ime obi anyị. N’Okwu ya, Jehova na-ekpughe ụdị onye ọ bụ na ụkpụrụ ya dị iche iche. N’Abụ Ọma nke 15, dị ka ihe atụ, anyị na-agụ banyere ụdị onye Jehova na-akpọ ịbụ ọbịa n’ụlọikwuu ya. Onye dị otú ahụ na-eme ezi omume, na-ekwu eziokwu n’obi ya, na-ekwesị ntụkwasị obi ná nkwa ya, ọ dịghịkwa erigbu ndị ọzọ. N’ịgụ abụ ọma nke a, jụọ onwe gị sị, ‘Àgwà ndị a hà na-akọwa m? Jehova ọ̀ ga-akpọ m ịbụ ọbịa n’ụlọikwuu ya?’ A na-ewusi ike nghọta anyị ike ka anyị na-ekwekọ n’ụzọ na n’echiche Jehova.—Ilu 3:5, 6; Ndị Hibru 5:14.

11. Olee otú ndị Farisii si “na-agabiga ikpe na ịhụnanya Chineke”?

11 Ọ bụ n’akụkụ nke a kpọmkwem ka ndị Farisii dara ajọ ọdịda. Ndị Farisii maara ụkpụrụ ndị nkịtị nke Iwu ahụ ma ha apụghị ịghọta “ụtọ asụsụ” ya. Ha pụrụ ịgụ ọtụtụ akụkụ nke Iwu ahụ n’isi, ma ha aghọtaghị Onye kwụ n’azụ ya. Jisọs gwara ha, sị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na rue na mkpá akwụkwọ nile, ma unu na-agabiga ikpe na ịhụnanya Chineke.” (Luk 11:42) Site n’uche ha nke na-adịghị nro na obi ha kpọrọ nkụ, ndị Farisii dara n’iji ike nke uche ha mee ihe. Iche echiche ha na-adịghị ekwekọ ekwekọ pụtara ìhè mgbe ha katọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs maka ịghọrọ mkpụrụ na ịta akị ha n’Ụbọchị Izu Ike; ma, e mesịa n’otu ụbọchị ahụ, o metụdịghị ha n’obi ma ọlị mgbe ha kpara nkata igbu Jisọs!—Matiu 12:1, 2, 14.

12. Olee otú anyị pụrụ isi kwekọkwuo n’ebe Jehova nọ dị ka Onye?

12 Anyị chọrọ ịdị iche n’ebe ndị Farisii nọ. Ihe ọmụma anyị nke Okwu Chineke aghaghị inyere anyị aka ikwekọkwu n’ebe Jehova nọ dị ka Onye. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Mgbe a gụsịrị otu akụkụ nke Bible ma ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ dabeere na Bible, e nyeworo ụfọdụ aka site n’ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị dị ka ndị a, ‘Gịnị ka ihe ọmụma a na-akụziri m banyere Jehova na àgwà ya dị iche iche? Olee otú m pụrụ isi gosipụta àgwà Jehova n’otú m si emeso ndị ọzọ?’ Ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị dị otú a na-azụlite ike nke uche anyị ma na-enyere anyị aka ịbụ “ndị na-eṅomi Chineke.”—Ndị Efesọs 5:1.

Ndị Ohu Chineke na Kraịst, Ọ Bụghị nke Mmadụ

13. Olee otú ndị Farisii si kpaa àgwà ka ndị mkpebi omume?

13 Ndị okenye aghaghị inye ndị ha na-elekọta ohere iji ike nke uche ha na-eme ihe. Ndị òtù ọgbakọ abụghị ndị ohu mmadụ. “Ọ bụrụ na anọ m na-eme ihe ga-atọ mmadụ ụtọ,” ka Pọl dere, “m gaghị abụworị ohu nke Kraịst.” (Ndị Galetia 1:10; Ndị Kọlọsi 3:23, 24) N’ụzọ dị iche, ndị Farisii chọrọ ka ndị mmadụ kwere na ọ ka mkpa inweta nnwapụta ụmụ mmadụ karịa nke Chineke. (Matiu 23:2-7; Jọn 12:42, 43) Ndị Farisii mere onwe ha ịbụ ndị mkpebi nke omume bụ́ ndị hiwere ụkpụrụ iwu ndị nke ha ma na-ekpezi ndị ọzọ ikpe n’ókè ha deberuru ya nke ọma. Ndị gbasoro ndị Farisii dara mbà n’ojiji ha ji akọ na uche ha e ji Bible zụọ na-eme ihe, si otú ahụ na-abụ ndị ohu nke mmadụ.

14, 15. (a) Olee otú ndị okenye pụrụ isi gosi onwe ha ịbụ ndị ọrụ ibe ìgwè atụrụ ahụ? (b) Olee otú ndị okenye kwesịrị isi lekọta okwu ndị dịịrị akọ na uche?

14 Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst taa maara na ìgwè atụrụ ahụ abụghị ha ka ha ga-emere mpịazi n’ụzọ bụ isi. Onye Kraịst ọ bụla aghaghị ibu ibu nke ya. (Ndị Rom 14:4; 2 Ndị Kọrint 1:24; Ndị Galetia 6:5) Ọ bụ otú a ka o kwesịrị ịdị. N’ezie, ọ bụrụ na ndị òtù nke ìgwè atụrụ ahụ gaje ịbụ ndị ohu mmadụ, na-erube isi nanị n’ihi na a na-ele ha anya, gịnị ka ha ga-eme mgbe ndị ikom ahụ na-anọghị ya? Pọl nwere ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa n’isi ndị Filipaị: “Dị ka unu ṅara ntị mgbe nile, ọ bụghị nanị mgbe m nọ n’etiti unu, kama ugbu a mgbe m na-anọghị, werenụ egwu na ịma jijiji rụpụta karị nzọpụta nke onwe unu nke ukwuu.” Ha bụ n’ezie ndị ohu Kraịst, ọ bụghịkwa nke Pọl.—Ndị Filipaị 2:12.

15 Ya mere, n’okwu ndị dịịrị akọ na uche, ndị okenye adịghị emere ndị nọ n’okpuru nlekọta ha mkpebi. Ha na-akọwa ụkpụrụ Bible ndị metụtara okwu ahụ ma nyezie ndị ahụ o metụtara ohere iji ike nke uche ha mee mkpebi. Nke a bụ ibu ọrụ siri ike, ma ọ bụ nke onye ahụ n’onwe ya na-aghaghị ibu.

16. Usoro dị aṅaa dịrị n’Israel maka idozi nsogbu?

16 Tụlee oge mgbe Jehova jiri ndị ikpe duzie Israel. Bible na-agwa anyị: “Na mgbe ahụ eze adịghị n’Israel, onye ọ bụla na-eme ihe ziri ezi n’anya ya.” (Ndị Ikpe 21:25) Ma Jehova nyere ụzọ ndị ya ga-esi nweta nduzi. Obodo ọ bụla nwere ndị okenye pụrụ inye enyemaka tozuru okè n’ajụjụ na nsogbu dị iche iche. Ọzọkwa, ndị nchụàjà Livaị jere ozi dị ka ike na-akwalite ihe ọma site n’ịkụziri ndị mmadụ iwu Chineke. Mgbe okwu ndị siri oké ike bilitere, onye isi nchụàjà pụrụ ijekwuru Chineke site n’Ìhè na Izu Okè ahụ. Akwụkwọ Insight on the Scriptures na-ekwu, sị: “Onye jiri ndokwa ndị a mee ihe, nke nwetara ihe ọmụma nke iwu Chineke ma tinye ya n’ọrụ, nwere ihe nduzi dị mma maka akọ na uche ya. Ya ime ‘ihe dị mma n’anya nke ya’ n’ọnọdụ dị otú ahụ agaghị arụpụta ihe ọjọọ. Jehova nyere ndị ahụ ohere igosi àgwà na ụzọ nke ọchịchọ obi na nke esiteghị n’ọchịchọ obi.”—Mpịakọta nke 2, peji nke 162-163.b

17. Olee otú ndị okenye pụrụ isi gosi na ha na-enye ndụmọdụ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị kama ịbụ nke ha?

17 Dị ka ndị ikpe na ndị nchụàjà Israel, ndị okenye ọgbakọ na-enye enyemaka tozuru okè ná nsogbu dị iche iche ma na-enye ndụmọdụ bara uru. Mgbe ụfọdụ, ọbụna na ha ‘na-atụ mmehie n’anya, na-aba mba, na-arịọ arịrịọ, n’ogologo ntachi obi nile na ozizi nile.’ (2 Timoti 4:2) Ha na-eme otú ahụ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị, ọ bụghị nke ha. Lee ka nke a si adị irè mgbe ndị okenye setịpụrụ ihe nlereanya ma na-agbalịsi ike iru n’obi!

18. N’ihi gịnị ka o ji adị irè karịsịa ka ndị okenye na-eru n’obi?

18 Obi bụ “injin” nke ọrụ ndị Kraịst anyị. Ya mere Bible na-asị: “Site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) Ndị okenye na-akpali obi ga-achọpụta na a na-esi otú ahụ akpali ndị nọ n’ọgbakọ ime ihe nile ha pụrụ ime n’ozi Chineke. Ha ga na-akpake onwe ha, ọ bụghị mgbe nile na-achọ ka ndị ọzọ na-akwa ha aka. Jehova achọghị nrubeisi a manyere amanye. Ọ na-achọ nrubeisi nke na-esite n’obi nke jupụtara n’ịhụnanya. Ndị okenye pụrụ ịgba ume ije ozi dị otú ahụ sitere n’obi site n’inyere ndị nọ n’ìgwè atụrụ ahụ aka ịzụlite ike nke uche ha.

Ịzụlite “Uche nke Kraịst”

19, 20. N’ihi gịnị ka o ji dịrị anyị mkpa ịzụlite uche nke Kraịst?

19 Dị ka e kwuru, o zughị ezu nanị ịmara iwu Chineke. “Mee ka m ghọta ihe,” ka ọbụ abụ ahụ rịọrọ, “m ga-echebekwa iwu Gị; m ga-ewerekwa obi m nile debe ya.” (Abụ Ọma 119:34) Jehova ekpughewo n’Okwu ya “uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Dị ka onye jeere Jehova ozi site n’ike nke uche ya, Jisọs hapụụrụ anyị ihe ilereanya zuru okè. Ọ ghọtara iwu na ụkpụrụ nile nke Chineke, o tinyekwara ha n’ọrụ n’adaghị n’otu ihe. Site n’ịmụ ihe nlereanya ya, anyị ga-enwe ike ‘ịnara ike ịghọta ihe bụ obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi, na ịmara ịhụnanya Kraịst nke karịrị ọmụma nke ukwuu hie nne.’ (Ndị Efesọs 3:17-19) Ee, ihe anyị na-amụta na Bible banyere Jisọs karịrị ihe ọmụma ndị e bu n’isi nke ukwuu; ọ na-enye anyị nghọta doro anya nke ihe Jehova n’onwe ya dị ka ya.—Jọn 14:9, 10.

20 Ya mere, ka anyị na-amụ Okwu Chineke, anyị pụrụ ịghọta echiche Jehova n’okwu dị iche iche ma ruo mkpebi ndị guzoziri eguzozi. Nke a ga-ewe mgbalị. Anyị aghaghị ịbụ ndị na-amụsi Okwu Chineke ike, na-eme ka ụdị onye Jehova bụ na ụkpụrụ ya nile na-emetụ anyị n’obi. Anyị na-amụ ụtọ asụsụ ọhụrụ dị ka a pụrụ ikwu ya. Ma, ndị mere otú ahụ ga na-agbaso okwu ịdọ aka ná ntị Pọl bụ́ ‘iche ahụ ha dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anakwere, ozi dị nsọ site n’ike nke uche ha.’—Ndị Rom 12:1.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke a ga-akachapụ ntụrụndụ nwere ihe metụtara ndị mmụọ ọjọọ, ihe na-akpali ọchịchọ mmekọahụ, ma ọ bụ ime ihe ike, nakwa ihe a na-akpọ ihe ntụrụndụ ezinụlọ nke na-akwalite echiche omume rụrụ arụ ma ọ bụ nke ime otú masịrị onye nke ndị Kraịst na-apụghị ịkwado.

b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

◻ Mgbanwe dị aṅaa banyere ijere Chineke ozi weere ọnọdụ na 33 O.A.?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ike nke uche anyị?

◻ Olee otú ndị okenye pụrụ isi nyere ndị nọ n’ìgwè atụrụ ahụ aka ịbụ ndị ohu Chineke na Kraịst?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zụlite “uche nke Kraịst”?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị okenye na-enyere ndị ọzọ aka iji ike nke uche ha eme ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya