“Dị Ike Iwere Karịa Obodo Siri Ike”
“N’Ọ̀TỤ̀TỤ̀ ndị e nwere ugbu a, ihe dị ka 40% nke ụmụaka United States ga-ahụ ntisasị nke alụmdi na nwunye nne na nna ha tupu ha eruo afọ 18.” (Science, June 7, 1991) Lee ngụkọ na-atụ ụjọ nke ahụ bụ! Gịnị mere nke a ji eme?
Edward M. Ginsburg bụ́ ọkà ikpe nke ụlọikpe na-ekpezi nsogbu ezinụlọ na ike ekpe, ná nnọkọ ịgba ajụjụ ọnụ nke ya na The Boston Globe, nyere echiche ya. Ọ sịrị: “Anyị bụ ọha mmadụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Anyị chọrọ ‘nke m.’ Anyị na-ajụ, ‘Gịnị ka m ga-erite na ya ugbu a?’ Anyị chọrọ inweta afọ ojuju ozugbo.”
Ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị dị otú ahụ nke ndị na-etozughị okè na-eduba n’ihe ilu na esemokwu n’alụmdi na nwunye. Ọkà Ikpe Ginsburg na-asị na mgbe di na nwunye mesịrị ruo ụlọikpe ịgba alụkwaghịm, di na nwunye na-achọ ka e wepụ ha n’ụta. Ha na-achọ ka mmadụ gwa ha na ha meziri emezi nakwa na onye ha na-alụ emezighị. Ha chọrọ ka mmadụ kwuo sị: “I meriwo n’agha.”
Okwu ya na-echetara anyị ilu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ: “Nwanne e jehieworo megide dị ike iwere karịa obodo siri ike.” (Ilu 18:19) Ee, mgbe esemokwu tiwapụrụ n’alụmdi na nwunye, akụkụ abụọ ahụ na-ebu agha pụrụ ịghọ ndị na-adịghị echezi echiche ma na-akpọ ekwo nkụ. Ọtụtụ mgbe, ha na-agba isi akwara jụ na ha agaghị ekwe ekwe, dị ka “obodo siri ike” ndị agha gbara gburugburu.
Ọ̀ bụ iwu na ihe ga-adị otú a? Ee e, e nwere nhọrọ ọzọ. Alụmdi na nwunye na-esi ike ma na-adịgide adịgide mgbe mmadụ abụọ ahụ, site ná mmalite, na-aṅa ntị n’okwu Pọl onyeozi: “Nwerịtanụ obi ọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:32) Ọ̀ dị mfe ịzụlite àgwà ndị dị otú ahụ? Ọ bụghị mgbe nile. Ma ruo ókè hà aṅaa ka alụkwaghịm dị mfe? Ruo ókè hà aṅaa ka mmetụta uche na ibu arọ ego nke alụmdi na nwunye tisara etisa na-egburu ná mgbu? Gịnịkwa banyere ụmụaka, ndị na-ebukarị apa nke alụkwaghịm ndị mụrụ ha banye ná ndụ agadi ha?
Ọ kaara mmadụ abụọ ahụ mma ịrụ ọrụ iji chebe alụmdi na nwunye ma ghara ịdị na-agba isi akwara n’ebe ibe ha nọ, dị ka “obodo siri ike.” Ndụmọdụ Pọl nyere ndị Kraịst metụtakarịsịrị ndị di na nwunye: “Yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:14.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji 32]
The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck