Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 2/8 p. 4-7
  • Ịtụkwasị Obi Ka Ọ Bụ Atụkwasịghị Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịtụkwasị Obi Ka Ọ Bụ Atụkwasịghị Obi
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịtụkwasị Obi Pụrụ Ịdị Ize Ndụ
  • Atụkwasịghị Obi Pụrụ Ịdị Ize Ndụ
  • Jiri Nlezianya Tụlee Ijeụkwụ Gị
  • Nwee Ezi Uche na Ezi Nguzo
  • Ntụkwasị Obi Dị Mkpa Iji Bie Ndụ Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ị Ga-atụkwasịli Ụmụnna Gị Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Gịnị Mere na Ndị Mụrụ M Atụkwasịghị M Obi?
    Teta!—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 2/8 p. 4-7

Ịtụkwasị Obi Ka Ọ Bụ Atụkwasịghị Obi

Ọ PỤRỤ isi ike ịmata ma à ga-atụkwasị obi ka ọ bụ na a gaghị atụkwasị. Ụzọ nke ọ bụla a gbasoro nwere ihe ize ndụ ndị nke ya, karịsịa n’ụwa ebe aghụghọ na mmebi ntụkwasị obi jupụtara. Ka o sina dị, ndị enyi a tụkwasịrị obi bụ́ ndị ga-akwado anyị n’oge nsogbu dị anyị nile mkpa. (Ilu 17:17) Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, onye Rom na-ede akwụkwọ bụ́ Phaedrus kwupụtara ọnọdụ ọjọọ ahụ otú a: “Ịtụkwasị obi ma ọ bụ atụkwasịghị obi dị ize ndụ.”

Ịtụkwasị Obi Pụrụ Ịdị Ize Ndụ

N’ihi gịnị ka ịtụkwasị onye ọzọ obi pụrụ iji bụrụ ihe ize ndụ? Ọ dị mma, tụlee ịdọ aka ná ntị e nyere na magazin bụ́ Psychology Today. Ọ kọwara ụfọdụ ndị na-eji ntụkwasị obi ndị mmadụ azụ ahịa dị ka “ndị nrigbu” ndị “na-eji ọgwụ na nnwogha dị ka ogwumagala aghọgbu ma na-aghọrị ndị nọ ha gburugburu ma na-ebibi ndụ ha.” O doro anya na ebe ndị nghọgbu dị otú ahụ nọ ya, ịtụkwasị obi gabiga ókè dị nnọọ ize ndụ.

Onye na-atụkwasị obi gabiga ókè pụrụ ịdị mfe nrigbu, n’ihi ya kwa, dị mfe nghọgbu na nghọrị. Otu ihe atụ pụtara ìhè nke ịdị mfe nrigbu bụ Sir Arthur Conan Doyle, onye mepụtara ọkà nchọpụta mpụ ahụ na-eche echiche n’ụzọ dị nkọ bụ́ Sherlock Holmes. Na 1917 ụmụ agbọghọ abụọ, Elsie Wright na nwanne ya, bụ́ Frances Griffiths, zọọrọ na ha esowo ụmụ mmụọ gwurie egwu n’ubi dị n’ụlọ ha na Cottingley, England. Ha wepụtadịrị foto ụmụ mmụọ ahụ iji gbalịa ịnwapụta ya.

Conan Doyle, onye nwere oké mmasị ná mgbaasị mgbe nwa ya nwoke nwụsịrị, tụkwasịrị ha obi ma kwere akụkọ ha banyere ụmụ mmụọ ahụ—dị ka ọtụtụ ndị n’oge ahụ mere. Ọ bụ nanị ruo ihe dị ka 55 afọ n’ihu ka ụmụ agbọghọ abụọ ahụ kwetara na ha nile abụwo ihe wayo nakwa na ha ebepụtawo “ụmụ mmụọ” ahụ site n’otu akwụkwọ tupu ha esee ha foto. Frances Griffiths kwupụtara ijuanya ya na ọ dị onye kweere akụkọ ha. Ọ sịrị: “Otú mmadụ ọ bụla ga-esi nnọọ dị mfe nrigbu otú a nke ikwere na ha dịrị adị n’ezie bụ mgbe nile ihe omimi nye m.”—Hoaxers and Their Victims.

Ị̀ pụrụ ịhụ ọnyà Conan Doyle dabara na ya? Ọ sọọrọ ìsì tụkwasị obi n’akụkọ ahụ nanị n’ihi na ọ chọrọ ka ọ bụrụ eziokwu. Norman Moss na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “A pụrụ ime anyị ewu nanị n’ihi na akparamàgwà mere ka ọhụhụ ụzọ anyị dị inyoghị inyoghị, anyị na-elekwa ihe anya site n’anya e mechitụrụ emechitụ. . . . Mgbe ụfọdụ, anyị na-anakwere ihe dị ka eziokwu n’ihi na ọ bụ ihe anyị chọrọ ka ọ bụrụ eziokwu.” (The Pleasures of Deception) Nke ahụ na-enyeghachi ịdọ aka ná ntị ọkà okwu ihu ọha bụ́ onye Gris bụ́ Demosthenes nyere n’ihe dị ka 350 afọ tupu Oge Anyị: “Ihe kachasị mfe bụ ịghọgbu onwe onye, n’ihi na ihe mmadụ chọrọ ka ọ na-ekwerekarị na ọ bụ eziokwu.” Ịtụkwasị obi nanị ná mmetụta anyị pụrụ ịdị ize ndụ.

Otú ọ dị, ị pụrụ iche na nke a bụ ihe atụ gabigara ókè nakwa na Conan Doyle dị nzuzu karịa ka ị ga-adị mgbe ọ bụla. Ma ọ bụghị nanị ndị dị mfe nrigbu nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a ghọgburu. Ndị yiri ka ha kwesịrị ịtụkwasị obi emewo ọtụtụ ndị na-elezi anya ma na-akpacharakarị anya ewu ma ghọgbuo ha.

Atụkwasịghị Obi Pụrụ Ịdị Ize Ndụ

Ma, e nwere ihe ize ndụ n’atụkwasịghị onye ma ọ bụ ihe ọ bụla obi. Atụkwasịghị obi dị ka nchara na-agbụchapụ agbụchapụ. Ọ pụrụ irichapụ ma mebie ihe gaara abụ mmekọrịta obi ụtọ, nke chiri anya. Enweghị ntụkwasị obi nke gbamiri mkpọrọgwụ na nke na-enweghị ngwọta pụrụ ime gị onye na-enweghị obi ụtọ, nke na-enweghị enyi. Ọ pụrụ nnọọ ibibi mmekọrịta e so ndị ọzọ enwe nke na onye England na-ede akwụkwọ bụ́ Samuel Johnson dere, “ọ bụ ihe obi ụtọ karị ịbụ onye a ghọgburu mgbe ụfọdụ karịa atụkwasịghị obi.”

Enweghị ntụkwasị obi pụrụ ọbụna itinye ahụ ike anụ ahụ gị n’ihe ize ndụ. Ị pụrụ ịma na mmetụta uche ndị dị ike dị ka iwe pụrụ ikpughe gị nye ihe ize ndụ nke obi nkuchi. Ma ị̀ maara na nnyocha ụfọdụ na-enye echiche nke na enweghị ntụkwasị obi pụrụ ime otu ihe ahụ? Magazin bụ́ Chatelaine na-asị: “Ọ bụghị nanị ndị ọ na-adịrị mfe ibigbọ n’iwe pụrụ iwelite ohere ha nwere ibute ọrịa obi n’ihi omume ha. Nchọpụta ọhụrụ na-egosi na ọbụna ụdị ndị zoro ezo nke ibu iro, dị ka àgwà enweghị ntụkwasị obi, pụrụ itinye gị n’ihe ize ndụ.”

Jiri Nlezianya Tụlee Ijeụkwụ Gị

Gịnị ka ị pụrụ ime? Bible na-enye okwu ndụmọdụ ọma n’okwu a. “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla,” ka Ilu 14:15 na-ekwu. Nke a abụghị àgwà enweghị ntụkwasị obi nke na-ebibi ihe. Ọ bụ ihe ncheta ezi uche dị ya nke mkpa ọ dị ịkpachara anya. Nanị onye na-amaghị nke a na-akọ, onye na-enweghị uche gaje ịsọ ìsì tụkwasị obi n’okwu ọ bụla ọ nụrụ. Ọ bụ ezi ihe mere ilu Bible ahụ ji gaa n’ihu, sị: “Ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” Onye England na-ede egwuregwu bụ́ William Shakespeare dere: “Atụkwasịla ibe osisi ndị rere ere obi.” Onye ọ bụla chere na ibe osisi ndị dị n’elu àkwà gabigara nnukwute ndagwurugwu pụrụ ire ere ga-adị nzuzu ịzọkwasị ụkwụ na ha. Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi ‘ghọta ijeụkwụ gị’ ka ntụkwasị obi gị ghara ihie ụzọ?

Bible na-agba anyị ume ịnwale ihe ndị mmadụ na-ekwu kama ịsọrọ nnọọ ìsì nakwere ihe ọ bụla anyị nụrụ. “Ntị na-anwa okwu nile, okpo ọnụ na-edetụkwa ihe oriri,” ka ọ na-ekwu. (Job 34:3) Nke ahụ ọ́ bụghị eziokwu? Ọ̀ bụ na ọtụtụ mgbe anyị adịghị edetụ nri ire tupu anyị eloo ya? Anyị kwesịkwara ịnwale okwu na omume ndị mmadụ tupu anyị eloo ha. Ọ dịghị onye obi ya ziri ezi nke ga-ewe iwe ma anyị nyochaa iru eru ya. Na anyị kwesịrị ile ma ihe ọ̀ bụkwa nke ezigbo ya nwere nkwado n’ilu ndị Scotland nke na-asị: “Onye ghọgburu m otu ugbo, ihere mee ya; ọ ghọgbuo m ugboro abụọ, ihere mee m.”

Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Tinyenụ ihe nile n’ule.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21, Today’s English Version) E jikwara okwu Pọl onyeozi jiri mee ihe maka “ule” mee ihe n’ihe banyere ịnwale nkume ndị dị oké ọnụ ahịa iji lee ma ha bụ ndị ezigbo ya. Onye maara ihe na-anwale mgbe nile ma ihe ọ na-azụ ọ̀ bụ nke ezigbo ya. Ma ọ́ bụghị ya ọ pụrụ imesị nweta ihe a kpọrọ ọlaedo onye nzuzu—ihe yiri ọlaedo ma bụrụ, n’ezie, ihe na-abaghị uru.

Nwee Ezi Uche na Ezi Nguzo

Otú ọ dị, anyị kwesịrị inwe ezi uche n’okwu a ma ghara ịdị na-enyo ndị ọzọ enyo n’ụzọ na-enweghị isi. (Ndị Filipaị 4:5) Adịla ngwa iche na onye ọ bụla bu ihe ọjọọ n’uche. Ịgụjọ obi pụrụ ịbụ ụzọ kasị ngwa isi tikpọọ ọmarịcha mmekọrịta chiri anya. Ọ na-akakarị mma iche na ndị enyi gị chọrọ ime ihe kasị mma nye gị kama iche na ha bu ihe ọjọọ n’uche mgbe ọnọdụ ndị siri ike bilitere.

Nye ohere maka ezughị okè na ngahie nke ndị ọzọ. “Enyi ikpughe izu nzuzo mmadụ bụ imebi ntụkwasị obi,” ka Kristin von Kreisler na-ede akwụkwọ na-ekwu. Otú ọ dị, mkpughe dị otú ahụ pụrụ ịbụ nke a na-amaghị ụma mee ma ọ bụ bụrụ ihe sitere n’adịghị ike bụ́ nke a na-akwara oké ụta ugbu a. Ya mere, ọ na-aga n’ihu ịsị: “Atụkwasịla uche ná mkpughe ahụ—ma ọ bụ kwe ka o gbochie gị ịtụkwasị ndị ọzọ obi.” Ekwela ka ahụmahụ ndị dị ilu, ndị na-adịghị mma napụ gị ọṅụ ndị pụrụ ịbịa site n’iso ndị ọzọ nwee mmekọrịta nke ntụkwasị obi.

Nwee ezi nguzo. Ọ dịghị gị mkpa ikechi anya mgbe ị na-atụle ndị mmadụ; onye na-akpachara anya na-amụ anya mgbe nile. N’aka nke ọzọ, Dọkịta Redford Williams na-atụ aro ka anyị nwaa iche na ndị ọzọ na-eme ihe kasị mma ha pụrụ ime, nwaa ịghọta ụzọ ha si ele ihe anya, ma “nwee àgwà ịdị na-atụkwasị ndị ọzọ obi” mgbe ọ bụla o kwere omume. Ọ pụrụ ịka mma ịtụkwasị obi gabiga ókè kama atụkwasịghị obi ma ọlị.

Onye dere akwụkwọ Bible bụ́ Ilu kwetara na “onye na-enwe ọtụtụ enyi na-enwe ha ibibi onwe ya”—ya bụ, ndị ga-anwa iji ntụkwasị obi gị zụọ ahịa. Ha juru n’ụwa. Ma nye ndị ọzọ oge na ohere igosipụta na ha kwesịrị ịtụkwasị obi, ị ga-achọtakwa ndị enyi bụ́ ndị, n’ezie, “na-arapara n’ahụ karịa nwanne.”—Ilu 18:24.

Ya mere, è nwere onye ma ọ bụ ihe ọ bụla ị pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam, n’enweghị egwu ọ bụla nke na a ga-erigbu ma ọ bụ mebie ntụkwasị obi gị? Ee, e nwere n’ezie. Isiokwu nke na-eso ga-atụle ná mkpirikpi ebe ị pụrụ iji nchekwube nile tụkwasị obi gị.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”—Ilu 14:15

[Foto dị na peeji nke 7]

Nye ohere maka ezughị okè na ngahie nke ndị ọzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya