-
Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme IheỤlọ Nche—2004 | Disemba 1
-
-
2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle banyere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe?
2 Onyinye na-enye ọṅụ dị mma nanị mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, mmanụ aṅụ “dị mma,” ma “ịracha mmanụ aṅụ hie nne adịghị mma.” (Ilu 24:13; 25:27) Ọ bụ ezie na ịṅụ “obere mmanya” pụrụ ịdị mma, iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi bụ ezigbo nsogbu. (1 Timoti 5:23) “Onye na-akwa emo ka mmanya vaịn bụ,” ka Bible na-adọ aka ná ntị, “onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya bụ; onye ọ bụla nke na-awagharị site na ya amaghị ihe.” (Ilu 20:1) Otú ọ dị, gịnị ka ịwagharị n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya gụnyere?a Ịṅụ mmanya ha aṅaa bụ ịṅụbiga ya ókè? Gịnị bụ echiche ziri ezi n’akụkụ a?
‘Ịwagharị’ Site n’Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya—N’ụzọ Dị Aṅaa?
3, 4. (a) Gịnị na-egosi na Bible katọrọ mmadụ ịṅụgide mmanya ruo mgbe o gbuwere ya egbuwe? (b) Olee ihe ụfọdụ e ji amata mgbe a ṅụbigara mmanya ókè?
3 N’Izrel oge ochie, a na-eji nkume atụgbu nwa ọ bụla nke na-eribiga ihe ókè ma na-aṅụbiga mmanya ókè ma ghara igosi nchegharị. (Deuterọnọmi 21:18-21) Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ọbụna unu na onye dị otú a erikọla ihe.” N’ụzọ doro anya, Akwụkwọ Nsọ kagburu mmadụ ịṅụgide mmanya ruo mgbe o gbuwere ya egbuwe.—1 Ndị Kọrint 5:11; 6:9, 10.
4 N’ịkọwa ihe e ji amata mgbe a ṅụbigara mmanya ókè, Bible na-ekwu, sị: “Elekwasịla mmanya vaịn anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-enye ụdị ya n’iko, mgbe ọ na-asụgharị n’iko nke ọma: n’ikpeazụ ya ọ bụ dị ka agwọ ka ọ na-ata, ọ bụkwa dị ka ajụala ka ọ na-atụ. Anya gị abụọ ga-ahụ ndị inyom na-abụghị nwunye gị [ma ọ bụ, “ihe ndị dị omimi”], obi gị ga-ekwukwa okwu ịgbakụta Chineke azụ.” (Ilu 23:31-33) Ịṅụbiga mmanya ókè na-ata ka agwọ, na-akpata ọrịa, uche mgbasasị, ọbụna ntụbọ. Onye aṅụrụma pụrụ ịhụ “ihe ndị dị omimi” n’ụdị na ọ pụrụ ịmụ anya na-arọ nrọ. O nwekwara ike ghara ịkwa ire ya nga n’ikwupụta echiche na ọchịchọ ndị rụrụ arụ bụ́ ndị a na-ekwesịghị ikwupụta.
5. N’ụzọ dị aṅaa ka ịṅụ oké mmanya si bụrụ ihe na-emerụ ahụ́?
5 Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ na-eji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe ma na-elezi anya ịghara ịṅụ ya ruo n’ókè ọ ga-apụta ìhè na ọ ṅụbigara mmanya ókè? Ihe àmà nke ịṅụbiga mmanya ókè adịghị apụtacha ìhè n’ahụ́ ụfọdụ ndị ọbụna mgbe ha ṅụsịworo ọtụtụ iko mmanya. Otú ọ dị, iche na omume dị otú ahụ adịghị ihe o mere bụ mmadụ iduhie onwe ya. (Jeremaịa 17:9) Nke nta nke nta, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ iri onye ahụ ahụ́, ya aghọọkwa “ohu nye oké mmanya.” (Taịtọs 2:3) Banyere otú mmadụ si aghọ onye aṅụrụma, onye edemede bụ́ Caroline Knapp na-ekwu, sị: “A na-eji nwayọọ nwayọọ, nke nta nke nta aghọ onye aṅụrụma.” Lee ka ịṅụ oké mmanya si bụrụ ọnyà na-egbu mmadụ!
6. N’ihi gịnị ka mmadụ ji kwesị izere ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè ya na iribiga nri ókè?
6 Tụleekwa ịdọ aka ná ntị Jizọs: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile.” (Luk 21:34, 35) Ọ dịghị mkpa ka mmanya gbuwe mmadụ egbuwe tupu ya emee ka onye ahụ mewe anya ụra ma ọ bụ dịrị umengwụ—n’ụzọ nkịtị nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Gịnị ma ọ bụrụ na ụbọchị Jehova abịakwasị onye ahụ n’ọnọdụ dị otú ahụ?
-
-
Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme IheỤlọ Nche—2004 | Disemba 1
-
-
10. Olee otú ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ isi metụta uche anyị, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji dịrị ize ndụ?
10 Ọ bụghị nanị na ịṅụbiga mmanya ókè na-emerụ ndị mmadụ ahụ́ n’ụzọ nkịtị, kamakwa ọ na-emerụ ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. “Mmanya vaịn na mmanya vaịn ọhụrụ na-ewepụ obi amamihe,” ka Bible na-ekwu. (Hosea 4:11) Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-emetụta uche. “Mgbe mmadụ ṅụrụ mmanya,” ka akwụkwọ Ụlọ Ọrụ Mba U.S. Maka Iji Ọgwụ Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi na-akọwa “ihe ọṅụṅụ ahụ na-aba n’anya na-esi n’usoro nri si agbari abanye n’ọbara ma na-eru n’ụbụrụ ngwa ngwa. Ọ na-amalite ibelata ikike nke akụkụ ụbụrụ ndị na-achịkwa echiche na mmetụta uche. Onye ahụ na-akwụsịlata inwe njide onwe onye.” N’ọnọdụ dị otú ahụ, o yikarịrị ka ànyị ‘ga na-awagharị,’ na-eme ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime, bụrụkwa ndị ọ ga-adịrị mfe ịdaba n’ọtụtụ ọnwụnwa.—Ilu 20:1.
-