Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 3/15 p. 17-22
  • Ka Nghọta Chebe Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Nghọta Chebe Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa Pụrụ Iche Maka Nghọta
  • Gịnị Banyere Itinye Ego n’Azụmahịa?
  • Mgbe Atụmatụ Achụmnta Ego Dara
  • Gịnị Ma Ọ Bụrụ na E Gwuru Wayo?
  • Nghọta na Ime Mkpebi
  • Wezụga Obi Gị Inwe Nghọta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị̀ Pụrụ Ịzụlitekwu Nghọta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “Jehova Na-enye Amamihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Ka Achụmnta Ego Gị Ga-efu Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 3/15 p. 17-22

Ka Nghọta Chebe Gị

“Ìzùzù ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.”—ILU 2:11.

1. Nghọta pụrụ ichebe anyị pụọ na gịnị?

JEHOVA chọrọ ka i gosipụta nghọta. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ maara na ọ ga-echebe gị pụọ n’ihe ize ndụ dị iche iche. Ilu 2:10-19 na-amalite site n’ikwu, sị: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; ìzùzù ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.” Chebe gị pụọ na gịnị? Site n’ihe ndị dị ka ‘ụzọ ọjọọ,’ ndị na-ahapụ ụzọ ziri ezi, na ndị na-esihiekwa n’ụzọ ha nile.

2. Gịnị bụ nghọta, oleekwa ụdị nke ndị Kraịst na-achọ karịsịa?

2 Eleghị anya ị ga-echeta na nghọta bụ ikike nke uche nke o ji amata ọdịiche nke otu ihe n’ebe ibe ya dị. Onye nwere nghọta na-aghọta ọdịiche ndị dị n’echiche ma ọ bụ n’ihe, na-emekwa ezi mkpebi. Dị ka ndị Kraịst, anyị chọrọ igosipụta nghọta ime mmụọ karịsịa, nke na-adabere n’ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Mgbe anyị na-amụ Akwụkwọ Nsọ, ọ dị nnọọ ka ànyị na-egwupụta blọkụ iwu ụlọ nke nghọta ime mmụọ. Ihe anyị na-amụta pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị na-atọ Jehova ụtọ.

3. Olee otú anyị pụrụ isi nweta nghọta ime mmụọ?

3 Mgbe Chineke jụrụ Eze Solomọn nke Israel ngọzi ọ chọrọ, onye ọchịchị ahụ na-akatabeghị ahụ sịrị: “Nye ohu Gị obi na-anụ ihe ikpe ndị Gị ikpe, ịghọta ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.” Solomọn rịọrọ maka nghọta, Jehova nyekwara ya ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ pụrụ iche. (1 Ndị Eze 3:9; 4:30) Iji nweta nghọta, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere, anyị aghaghịkwa ịmụ Okwu Chineke site n’enyemaka nke mbipụta ndị na-enye ihe ọmụma bụ́ ndị a na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Nke a ga-enyere anyị aka ịzụlite nghọta ime mmụọ ruo n’ókè nke na anyị na-aghọ ‘ndị tozuru okè n’uche,’ nwee ike “ịtụle [ma ọ bụ, ịghọta ọdịiche dị n’etiti] ihe ọma na ihe ọjọọ.”—1 Ndị Kọrint 14:20; Ndị Hibru 5:14.

Mkpa Pụrụ Iche Maka Nghọta

4. Gịnị ka inwe anya “na-ele otu ebe” pụtara, oleekwa otú ọ pụrụ isi bara anyị uru?

4 N’inwe nghọta kwesịrị ekwesị, anyị pụrụ ime ihe kwekọrọ n’okwu Jisọs Kraịst: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume [Chineke]; a ga-atụkwasịkwara unu ihe [onwunwe] ndị a nile.” (Matiu 6:33) Jisọs kwukwara, sị: “Oriọna nke ahụ gị bụ anya gị: mgbe ọ bụla anya gị na-ele otu ebe, ahụ gị dum jupụtakwara n’ìhè.” (Luk 11:34) Anya bụ oriọna ihe atụ. Anya “na-ele otu ebe” na-eme ihe n’eziokwu, na-ele n’otu ụzọ. N’inwe anya dị otú ahụ, anyị pụrụ igosi nghọta ma na-eje ije n’asụghị ngọngọ n’ụzọ ime mmụọ.

5. N’ihe banyere mmekọrịta azụmahịa, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi banyere nzube nke ọgbakọ ndị Kraịst?

5 Kama ile anya ha n’otu ebe, ụfọdụ ejiriwo mmekọrịta azụmahịa ndị na-adọrọ adọrọ mee ka ndụ ha na nke ndi ọzọ sie ike. Ma anyị kwesịrị icheta na ọgbakọ ndị Kraịst bụ “ide na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) Dị ka ogidi nke ụlọ, ọgbakọ na-akwado eziokwu nke Chineke, ọ bụghị ọrụ achụmnta ego nke onye ọ bụla. E guzobeghị ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova dị ka ebe a na-akwalite ọdịmma azụmahịa, ngwá ahịa, ma ọ bụ ije ozi azụmahịa. Anyị aghaghị izere ịchụso ihe metụtara azụmahịa onwe onye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nghọta na-enyere anyị aka ịhụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova bụ ebe a na-enwe mkpakọrịta ndị Kraịst na ntụle ihe ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri mmekọrịta ime mmụọ na-akwalite ụdị ọ bụla nke azụmahịa, nke a ọ́ gaghị egosi ma ọ dịghị ihe ọzọ ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? E kwesịghị mgbe ọ bụla iji mmekọrịta ọgbakọ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi maka uru ego.

6. N’ihi gịnị ka a na-ekwesịghị ire ma ọ bụ ịkwalite ngwá ahịa na ije ozi azụmahịa ná nzukọ ọgbakọ?

6 Ụfọdụ ejiriwo mmekọrịta ọchịchị Chineke mee ihe iji ree ihe enyemaka ahụ ike ma ọ bụ nke ịchọ mma, ihe ndị na-enye vitamin, ije ozi nzirịta ozi telifon, ihe ndị e ji ewu ụlọ, atụmatụ ime njem usoro ihe omume na ngwá ọrụ kọmputa, na ndị ọzọ. Otú ọ dị, nzukọ ọgbakọ abụghị ebe ire ma ọ bụ ịkwado ngwá ahịa ma ọ bụ ije ozi azụmahịa. Anyị pụrụ ịghọta ụkpụrụ bụ isi ma ọ bụrụ na anyị echeta na Jisọs ‘chụpụrụ ha nile n’ụlọ ukwu Chineke, ma atụrụ ma ehi ahụ; Ọ wụsie ego ndị na-agbanwe ego, kpuokwa table ha ihu; Ọ sị ndị na-ere nduru, Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a; unu emela ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ụlọ ahịa.’—Jọn 2:15, 16.

Gịnị Banyere Itinye Ego n’Azụmahịa?

7. N’ihi gịnị ka nghọta na mkpachara anya ji dị mkpa n’ihe banyere itinye ego n’azụmahịa?

7 Ma nghọta ma nlezianya dị mkpa mgbe a na-atụle itinye ego n’atụmatụ azụmahịa. Were ya na mmadụ chọrọ ịgbaziri ego ma na-ekwe nkwa ndị yiri nke a: “M na-ekwe gị nkwa na ị ga-enweta uru.” “O nweghị ihe pụrụ ifunahụ gị. Nke a bụ ihe e ji n’aka.” Kpachara anya mgbe onye ọ bụla na-enye mmesi obi ike ndị dị otú ahụ. Ma ọ́ bụghị na ọ naghị eche echiche nke ọma ọ bụrụ na ọ naghị eme ihe n’eziokwu, n’ihi na itinye ego n’azụmahịa na-esi ike ịbụ ihe e ji n’aka. N’ezie, ụfọdụ ndị ire ụtọ, na-enweghị ụkpụrụ egwuwo ndị òtù ọgbakọ wayo. Nke a na-echetara anyị “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” bụ́ ndị gbebatara n’ọgbakọ narị afọ mbụ, ma ‘ghaa amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko.’ Ha yiri nkume dị n’okpuru mmiri ndị nwere ọnụ ọnụ kapịrị akapị ndị pụrụ ịdọwasị ndị na-egwu mmiri ahụ ma gbuo ha. (Jud 4, 12) N’eziokwu, ebumnobi nke ndị wayo dị iche, ma ha na-ejikwa ndị òtù ọgbakọ emere anụ oriri.

8. Gịnị meworo n’ihe metụtara ụfọdụ atụmatụ achụmnta ego ndị yiri ka uru dị na ha?

8 Ọbụna ndị Kraịst nwere ezi nzube ekerịtawo ihe ọmụma banyere atụmatụ azụmahịa ndị yiri ka ha na-eweta uru, nanị ịchọpụta na ego ha tinyere n’azụmahịa funahụrụ ha na ndị na-agbaso ihe nlereanya ha. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Kraịst atụfuwo ihe ùgwù n’ime ọgbakọ. Mgbe azụmahịa ịba ọgaranya ngwa ngwa ghọrọ atụmatụ aghụghọ, nanị onye na-erite uru bụ onye wayo ahụ, bụ́ onye na-agbafu ngwa ngwa. Olee otú nghọta pụrụ isi nyere mmadụ aka izere ọnọdụ ndị dị otú ahụ?

9. N’ihi gịnị ka nghọta ji dị mkpa iji tụlee nzọrọ ndị a na-eme banyere itinye ego n’azụmahịa?

9 Nghọta na-enwe echiche nke inwe ike ịghọta ihe na-edoghị anya. Ikike nke a dị mkpa iji tụlee nzọrọ a na-eme banyere itinye ego n’azụmahịa. Ndị Kraịst tụkwasịrị onwe ha obi, ụfọdụ pụkwara iche na ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmuọ ha agaghị etinye aka n’atụmatụ ndị ga-etinye ihe onwunwe ndị kwere ekwe ibe ha n’ihe ize ndụ. Ma eziokwu ahụ bụ na onye ọchụ nta ego bụ onye Kraịst adịghị eme ka e jide n’aka na ọ na-emekarịsị nke ọma n’okwu azụmahịa ma ọ bụ na azụmahịa ya ga-aga nke ọma.

10. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst ji achọ ego mgbazinye achụmnta ego n’aka ndị ofufe ibe ha, gịnịkwa pụrụ ime ntinye ego ndị dị otú ahụ n’azụmahịa?

10 Ụfọdụ ndị Kraịst na-achọ ego mgbazinye azụmahịa site n’aka ụmụnna nwoke na nwanyị n’ihi na ụlọ ọrụ na-agbazinye ego bụ́ ndị a maara aha ha agaghị anwa anwa inye ego maka atụmatụ azụmahịa ha dị ize ndụ. A rafuwo ọtụtụ ndị ikwere na nanị site n’itinye ego ha, ha pụrụ inweta oké akụ̀ na ụba ngwa ngwa, n’arụghị oké ọrụ ma ọ bụ ikekwe n’arụghị ọrụ ọ bụla. A ratawo ụfọdụ n’itinye ego n’azụmahịa n’ihi oké mkpali na-eso ya na-aga, nanị ịbụ ndị ihe nile ha kpatara ná ndụ funahụrụ! Otu onye Kraịst tinyere ego buru ibu n’azụmahịa, na-atụ anya inweta uru n’ọ̀tụ̀tụ̀ 25 pasent n’ime nanị izu abụọ. Ọ tụfuru ego nile ahụ mgbe a kpọsara ndakpọ. N’atụmatụ azụmahịa ọzọ, otu onye na-emepe ala na ụlọ gbaziiri ọkpụrụkpụ ego site n’aka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. O kwere nkwa oké uru nke ezi uche na-adịghị na ya ma banye n’ụgwọ, ego ndị ahụ ọ gbaziiri funahụkwara ya.

Mgbe Atụmatụ Achụmnta Ego Dara

11. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere banyere anyaukwu na ịhụ ego n’anya?

11 Ọdịda atụmatụ azụmahịa edugawo ná ndakpọ olileanya na ọbụna mfu nke ọnọdụ ime mmụọ n’akụkụ nke ụfọdụ ndị Kraịst banyere n’atụmatụ na-adịghị mma. Ekweghị ka nghọta rụọ ọrụ dị ka ihe nchebe akpatawo obi mgbu na obi ilu. Anyaukwu amatawo ọtụtụ ndị n’ọnyà. “Ma . . . anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịrị ndị nsọ,” ka Pọl dere. (Ndị Efesọs 5:3) Ọ dọkwara aka ná ntị, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9, 10.

12. Ọ bụrụ na ndị Kraịst na ibe ha azụkọọ ahịa, gịnị ka ha kwesịrị icheta karịsịa?

12 Ọ bụrụ na onye Kraịst azụlite ịhụ ego n’anya, ọ pụrụ ịkpatara onwe ya ọtụtụ mmerụ ahụ ime mmụọ. Ndị Farisii bụ ndị hụrụ ego n’anya, nke a bụkwa otu n’ime njimara nke ndị mmadụ na mgbe ikpeazụ a. (Luk 16:14; 2 Timoti 3:1, 2) N’ụzọ megidere nke ahụ, ụzọ ndụ onye Kraịst kwesịrị ịbụ nke ‘na-adịghị n’ịhụnanya ego.’ (Ndị Hibru 13:5) N’eziokwu, ndị Kraịst na ibe ha pụrụ ịzụkọ ahịa ma ọ bụ malitekọ azụmahịa. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, e kwesịrị idebe nkwurịta okwu na nkwekọrịta iche pụọ n’ihe metụtara ọgbakọ. Chetakwa: Ọbụna n’etiti ụmụnna ime mmụọ, dee nkwekọrịta azụmahịa ede mgbe nile. Ihe na-enye aka n’ihe banyere nke a bụ isiokwu bụ́ “Dee Ya n’Akwụkwọ!,” nke e bipụtara na Teta! nke August 8, 1984, peji nke 14 ruo 17.

13. Olee otú ị pụrụ isi jiri Ilu 22:7 mee ihe n’atụmatụ achụmnta ego?

13 Ilu 22:7 na-agwa anyị, sị: “Ohu ka onye na-ebiri ego bụụrụ onye mbinye.” Ọ na-abụkarị ihe amamihe na-adịghị ya nye anyị itinye onwe anyị ma ọ bụ ụmụnna anyị n’ọnọdụ ohu dị otú ahụ. Mgbe onye ọ bụla gwara anyị ka anyị binye ya ego maka atụmatụ azụmahịa, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịtụle ikike ya ịkwụghachi ego ahụ. À maara ya ịbụ onye a pụrụ ịdabere na ya na onye a pụrụ ịtụkwasị obi? N’ezie, anyị kwesịrị ịghọta na ịgbazinye ego dị otú ahụ pụrụ ịrụpụta mfu nke ego ahụ n’ihi na ọtụtụ atụmatụ azụmahịa na-ada. Nkwekọrịta n’onwe ya nanị adịghị eme ka e jide n’aka na atụmatụ azụmahịa ga-aga nke ọma. N’ezie ọ bụghịkwa ihe amamihe ka onye ọ bụla tinye ego dị ukwuu n’azụmahịa karịa ka ọ pụrụ ikwe ka o funahụ ya.

14. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa igosi nghọta ma ọ bụrụ na anyị ebinyewo onye Kraịst ibe anyị ego bụ́ onye achụmnta ego ya dara?

14 Ọ dị anyị mkpa igosi nghọta ma ọ bụrụ na anyị ebinyewo onye Kraịst ego maka azụmahịa, o wee bụrụ na ego ahụ efuo, ọ bụ ezie na ọ dịghị omume emeghị ihe n’eziokwu dị na ya. Ọ bụrụ na ọdịda azụmahịa ahụ esighị n’aka onye kwere ekwe ibe anyị bụ́ onye gbaziiri ego ahụ, ànyị pụrụ ikwu na e mejọrọ anyị? Ee e, n’ihi na anyị binyere ego ahụ n’afọ ofufo, ikekwe anyị anọwo na-anata ọmụrụ nwa n’elu ya, ọ dịghịkwa emeghị ihe n’eziokwu werewooro ọnọdụ. Ebe ọ bụ na emeghị ihe n’eziokwu adịghị ya, anyị enweghị ihe ndabere ọ bụla maka ịgba onye mbiri ahụ akwụkwọ. Olee uru dị n’ịgba onye Kraịst ibe anyị na-eme ihe n’eziokwu akwụkwọ bụ́ onye tinyere akwụkwọ maka nrekpọsị ihe onwunwe n’ihi na azụmahịa e nwere ezi ebumnobi maka ya dara?—1 Ndị Kọrint 6:1.

15. Ihe ndị dị aṅaa chọrọ ka a tụlee ha ma ọ bụrụ na a kpọsaa ndakpọ?

15 Ndị na-enwe ọdịda azụmahịa na-achọ ahụ efe mgbe ụfọdụ site n’ịkpọsa ndakpọ. Ebe ọ bụ na ndị Kraịst adịghị elefuru iji ụgwọ anya, ọbụna mgbe a tọhapụsịrị ha n’ụgwọ ụfọdụ n’ụzọ iwu kwadoro, ụfọdụ ejiriwo ezi akọ na uche chee na ha nwere ibu ọrụ nke ịgbalị ịkwụghachi ụgwọ ahụ a kagburu akagbu ma ọ bụrụ na ndị e ji ụgwọ ga-anakwere ịkwụ ụgwọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na onye gbaziiri ego tụfuru ego nwanna ya ma mesịa na-ebi ndụ okomoko? Ma ọ bụ gịnị ma ọ bụrụ na onye mbiri ahụ nwetara ego zuru ezu iji kwụghachi ihe ọ gbaziiri ma leghara ibu ọrụ omume ọ pụrụ inwe n’ebe nwanna ya nọ n’ụzọ ego anya? Mgbe ahụ a ga-enwe obi abụọ banyere iru eru nke onye mbiri ahụ ije ozi n’ọkwá ọrụ n’ọgbakọ.—1 Timoti 3:3, 8; lee Ụlọ Nche nke September 15, 1994, peji nke 30-31.

Gịnị Ma Ọ Bụrụ na E Gwuru Wayo?

16. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ iwere ma ọ bụrụ na o yie ka e gwuru anyị wayo n’achụmnta ego?

16 Nghọta na-enyere anyị aka ịmara na ọ bụghị ego nile e tinyere n’azụmahịa na-eweta uru. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na wayo dị na ya? Wayo bụ “ịkpachara anya na-eji aghụghọ, nrafu, ma ọ bụ ịrọgharị eziokwu na-eme ihe n’ebumnobi nke ịkpali onye ọzọ ịhapụ ihe ya ụfọdụ dị oké ọnụ ahịa ma ọ bụ ịgbahapụ ihe ruuru ya n’ụzọ iwu.” Jisọs Kraịst kwupụtara nzọụkwụ ndị a pụrụ iwere mgbe mmadụ chere na onye ofufe ibe ya egwuwo ya wayo. Dị ka Matiu 18:15-17 si kwuo, Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ: ọ bụrụ na ọ nụrụ olu gị, i ritere nwanna gị n’uru. Ma ọ bụrụ na ọ nụghị, kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ tinyere onwe gị, ka e wee mee okwu ọ bụla e kwuru ka o guzo n’ọnụ ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ; ma ọ bụrụ na ọ ṅaghị ntị, gwa nzukọ m: ma ọ bụrụ na ọ ṅaghịkwa nzukọ m ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.” Ihe atụ nke Jisọs mesịrị nye na-egosi na o bu n’uche ụdị mmehie ndị gụnyere ihe metụtara ego, tinyere wayo.—Matiu 18:23-35.

17, 18. Ọ bụrụ na onye sị na ya bụ onye Kraịst egwuo anyị wayo, olee otú nghọta pụrụ isi chebe anyị?

17 N’ezie, a gaghị enwe ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka iwere nzọụkwụ ndị e depụtara na Matiu 18:15-17 ma ọ bụrụ na e nweghị ihe àmà ma ọ bụ ọbụna ihe na-atụ aro wayo. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na onye sị na ya bụ onye Kraịst gwuru anyị wayo n’ezie? Nghọta pụrụ ichebe anyị pụọ n’ime ihe pụrụ iwetara ọgbakọ aha ọjọọ. Pọl dụrụ ndị Kraịst ibe ya ọdụ ikwe ka e mejọọ ha na ọbụna gwuo ha wayo kama ịkpụga nwanna n’ụlọikpe.—1 Ndị Kọrint 6:7.

18 Ezi ụmụnna nwoke na nwanyị anyị ‘ejupụtaghị n’aghụghọ na ihe jọgburu onwe ya,’ dị ka onye dibịa afa ahụ bụ́ Ba-Jisọs. (Ọrụ 13:6-12) Ya mere ka anyị jiri nghọta mee ihe mgbe ego furu n’atụmatụ azụmahịa nke metụtara ndị kwere ekwe ibe anyị. Ọ bụrụ na anyị na-eche echiche ịgba akwụkwọ, anyị kwesịrị ịtụle mmetụta ọ pụrụ inwe n’ahụ anyị, n’ahụ onye ma ọ bụ ndị ọzọ, n’ahụ ọgbakọ, na n’ahụ ndị nọ n’èzí. Ịchụso nkwụghachi ụgwọ pụrụ iripịa ihe dị ukwuu n’ime oge, ike, na ihe onwunwe anyị ndị ọzọ. Ọ pụrụ ịrụpụta nanị ime ka ndị ọkàikpe na ndị ọkachamara ndị ọzọ baa ọgaranya. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị Kraịst achụwo ihe ùgwù ọchịchị Chineke n’àjà n’ihi itinyebiga onwe ha ókè n’ihe ndị a. Anyị ịbụ ndị a dọpụrụ uche ha n’ụzọ a aghaghị ime Setan obi ụtọ, ma anyị chọrọ ime ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) N’aka nke ọzọ, ịnakwere mfu pụrụ ime ka anyị zere obi mgbu ma chekwaara anyị nakwa ndị okenye oge dị ukwuu. Ọ ga-enye aka ichekwa udo nke ọgbakọ, meekwa ka anyị nwee ike ịnọgide na-ebu ụzọ achọ Alaeze ahụ.

Nghọta na Ime Mkpebi

19. Gịnị ka nghọta ime mmụọ na ekpere pụrụ imere anyị mgbe anyị na-eme mkpebi ndị na-eweta nchekasị?

19 Ime mkpebi ndị metụtara okwu ego ma ọ bụ azụmahịa pụrụ ịdị na-akpata nnọọ nchekasị. Ma nghọta ime mmụọ pụrụ inyere anyị aka ịtụle ihe nile nke ọma ma mee mkpebi ndị amamihe dị na ha. Ọzọkwa, iji ekpere na-adabere na Jehova pụrụ inye anyị “udo nke Chineke.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ bụ ịdị jụụ na ịdị n’udo nke na-esite ná mmekọrịta onwe onye chiri anya n’ebe Jehova nọ apụta. N’ezie, udo dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe nguzozi mgbe mkpebi ndị siri ike na-eche anyị ihu.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime n’ihe metụtara okwu achụmnta ego na ọgbakọ?

20 Ka ọ bụrụ mkpebisi ike anyị ịghara ikwe ka esemokwu azụmahịa kpasasịa udo anyị ma ọ bụ nke ọgbakọ. Ọ dị anyị mkpa icheta na ọgbakọ ndị Kraịst na-arụ ọrụ iji nyere anyị aka n’ụzọ ime mmụọ, ọ bụghị ije ozi dị ka ebe nchụso azụmahịa. N’oge nile, ihe metụtara azụmahịa kwesịrị ka e debe ya iche pụọ n’ihe omume ọgbakọ. Ọ dị anyị mkpa iji nghọta na nlezianya na-eme ihe mgbe anyị na-etinye aka n’atụmatụ azụmahịa. Ka anyị jigidekwa echiche ziri ezi banyere ihe ndị dị otú ahụ, buru ụzọ na-achọ ọdịmma nke Alaeze. Ọ bụrụ na atụmatụ azụmahịa nke metụtara ndị ofufe ibe anyị adaa, ka anyị chọọ ihe kasị mma maka ndị nile o metụtara.

21. Olee otú anyị pụrụ isi jiri nghọta mee ihe ma mee ihe kwekọrọ ná Ndị Filipaị 1:9-11?

21 Kama inwe nchegbu gabigara ókè banyere okwu ego na ihe ndị ọzọ na-adịchaghị mkpa, ka anyị nile wezụga obi anyị inwe nghọta, kpee ekpere maka nduzi Chineke, ma nọgide buru ụzọ na-achọ ọdịmma Alaeze. N’ikwekọ n’ekpere Pọl, ‘ka ịhụnanya anyị babigakwa ókè n’ime mmazu na nghọta nile ka unu wee nwaa ihe ha na ibe ha dị iche ghara ịsụ ndị ọzọ ngọngọ’ ma ọ bụ onwe anyị. Ugbu a Kraịst bụ́ Eze nọ n’ocheeze eluigwe ya, ka anyị gosi nghọta ime mmụọ n’akụkụ ọ bụla nke ndụ. ‘Ka anyị jupụtakwa ná mkpụrụ nke ezi omume, nke sitere n’aka Jisọs Kraịst, n’ebube na otuto nke Chineke anyị,’ bụ́ Eze Onyenwe anyị Jehova.—Ndị Filipaị 1:9-11.

Olee Otú Ị Ga-ezi Zaa?

◻ Gịnị bụ nghọta?

◻ N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa pụrụ iche igosi nghọta banyere mmekọrịta azụmahịa n’etiti ndị Kraịst?

◻ Olee otú nghọta pụrụ isi nyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị echee na onye kwere ekwe ibe anyị egwuwo anyị wayo?

◻ Òkè dị aṅaa ka nghọta kwesịrị ikere n’ime mkpebi?

[Foto dị na peeji nke 18]

Nghọta ga-enyere anyị aka itinye ndụmọdụ Jisọs ịnọgide buru ụzọ na-achọ Alaeze ahụ n’ọrụ

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Dee nkwekọrịta achụmnta ego n’akwụkwọ mgbe nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya