Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke” n’Ụzọ Unu Si Eji Ike Eme Ihe
    Bịaruo Jehova Nso
    • 10. (a) Chineke enyewo ndị nne na nna ikike dị aṅaa? (b) Gịnị ka okwu bụ́ “ọzụzụ” pụtara, oleekwa otú e kwesịrị isi na-enye ya? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

      10 Ndị nne na nna nwekwara ikike Chineke nyere ha. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Na Bible, okwu ahụ bụ́ “ọzụzụ” pụrụ ịpụta “nzụlite, ntụziaka.” Ọzụzụ dị ụmụaka mkpa; ha na-eme nke ọma mgbe e nyere ha ụkpụrụ nduzi ndị doro anya ma gwa ha kpọmkwem ihe ndị ha nwere ike ime na ndị ha na-agaghị eme. Bible na-ejikọta ọzụzụ ma ọ bụ ntụziaka dị otú ahụ, na ịhụnanya. (Ilu 13:24) N’ihi ya, e kwesịtụghị iji “mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị” mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi—n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ anụ ahụ́.a (Ilu 22:15; 29:15) Ọzụzụ nke sibigara ike ókè ma ọ bụ nke e ji aka ike na-enye n’ụzọ na-egositụghị ịhụnanya bụ iji ikike e nyere ndị nne na nna na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ pụkwara igbu mmụọ nwatakịrị. (Ndị Kọlọsi 3:21) N’aka nke ọzọ, ọzụzụ ziri ezi, bụ́ nke a na-enye n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-eme ka ụmụaka ghọta na ndị mụrụ ha hụrụ ha n’anya ma na-enwe nchegbu banyere ụdị mmadụ ha na-aghọ.

  • “Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke” n’Ụzọ Unu Si Eji Ike Eme Ihe
    Bịaruo Jehova Nso
    • a N’oge Bible, okwu Hibru maka “mkpanaka” pụtara osisi ma ọ bụ mkpara, dị ka nke onye ọzụzụ atụrụ na-eji eduzi atụrụ ya. (Abụ Ọma 23:4) N’ụzọ yiri nke ahụ, “mkpanaka” nke ikike nne na nna nwere na-enye echiche nduzi ịhụnanya, ọ bụghị nke ntaramahụhụ e ji aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ na-enye.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya