Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 12/15 p. 8-10
  • Ha ‘Zụtara Eziokwu’!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha ‘Zụtara Eziokwu’!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Nkụzi Bible Dọtara Ya
  • Ịnwapụtara Onwe Onye Eziokwu 
  • Okpukpe Ụgha Kụdara Ya Mmụọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 12/15 p. 8-10

Ha ‘Zụtara Eziokwu’!

“ZỤTA eziokwu, erekwala ya.” (Ilu 23:23) Otú a ka onye amamihe ahụ bụ Solomọn gbara ume ka e mee. Ọ bụ ezie na a pụrụ ikwu nke a banyere eziokwu dum, ọ dị otú ahụ karịsịa mgbe a bịara n’eziokwu a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Eziokwu dị otú ahụ pụrụ iduba ná ndụ agwụghị agwụ! (Jọn 17:3, 17) Ma, rịba ama na a dịghị enweta eziokwu dị otú ahụ n’efu. Mmadụ aghaghị ịdị njikere ‘ịzụta’ ya, ya bụ, ịchụ ihe n’àjà iji nweta ya. (Tụlee Matiu 13:45, 46.) N’ozuzu, ndị mmadụ adịghị njikere ime otú ahụ. Ma n’ọtụtụ ala, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ nwere obi ike na-azụta eziokwu Bible—ọtụtụ mgbe ná mfu onwe onye dị ukwuu.

Were, dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova nọ ná mba Ọdịda Anyanwụ Africa bụ́ Ghana. Na June 1989, e nwere ihe karịrị mmadụ 34,000 n’ala ahụ ndị nabataworo eziokwu Bible ma jiri ịnụ ọkụ n’obi soro ndị ọzọ na-ekerịta ya. Mgbe ahụ e nwere mgbochi iwu n’ọrụ nkwusa ihu ọha. Otú o sina dị, ndị nwere obi eziokwu nọgidere ‘na-azụta eziokwu’—n’agbanyeghị ihe mgbochi iwu dị iche iche. Mgbochi ahụ gwụsịrị n’October 31, 1991, ka ọ na-erulekwa etiti 1995, nanị afọ atọ na ọkara mgbe e wepụsịrị ihe mgbochi ndị ahụ, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike na Ghana amụbawo ruo 46,104! N’afọ a kwa ọnụ ọgụgụ ahụ etoola ruo ihe karịrị 52,800.

Gịnị dọrọworo ndị mmadụ gaa n’eziokwu nke Okwu Chineke? Olee àjà ọ dịworo ụfọdụ ndị mkpa ịchụ iji “zụta eziokwu”? N’azịza ya, ka anyị lee ahụmahụ ndị Kraịst atọ bụ́ ndị Ghana.

Nkụzi Bible Dọtara Ya

Ka anyị buru ụzọ tụlee otu nwanyị ka banyere n’afọ ndị 20 ya. Nna ya bụ pastọ, n’agbanyeghị nke ahụ ọ họọrọ ịhapụ okpukpe nna ya. Gịnị kpatara ya? Ịhụnanya ya maka eziokwu.

Ọ kọwara n’otu oge: “Ndịàmà na-abịabu n’ụlọ anyị ka ha na-eme nleta ụlọ n’ụlọ ha. Mgbe m sosịrị ha nwee nkwurịta okwu ole na ole, aghọtara m na ihe ha na-akụzi nwere ezi ndabere na Bible. Ewelitere m ajụjụ n’isiokwu ndị dị ka Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na karịsịa iji okwukwe agwọ ọrịa. Ekwenyesiri m ike na ozizi ndị a sitere na Bible. Ma Ndịàmà ahụ nyeere m aka ịhụ na ọ dịghị otú ahụ.”—Maka ihe ngosipụta nke ihe bụ echiche Bible n’isiokwu ndị dị otú ahụ, biko lee Mak 13:32; Ndị Rom 6:23; Ọrụ 10:40; na 1 Ndị Kọrint 13:8-10.

Nwa agbọghọ ahụ kwukwasịrị: “Ma, e nwere mmegide siri ike site n’ezinụlọ m, karịsịa nna m. O chere na a na-eduhie m. Otú ọ dị, amaara m na ihe m na-amụta n’aka Ndịàmà Jehova bụ eziokwu. Anwara m ime ka nna m mata na ihe ndị a sitere na Bible, ma ọ jụrụ ige ntị. N’eziokwu, mmegide ahụ siwanyere ike.

“Ma, enweghị m nkụda obi. Amaara m na ọ bụ nanị ezi ihe ọmụma na-eduba ná ndụ agwụghị agwụ n’ime Paradaịs, ekpebisikwara m ike ijigide ya. Mgbe Ndịàmà e nwere n’ebe a nụrụ banyere nsogbu ndị m na-eche ihu, ha jiri ịhụnanya nyere m aka, na-agba m ume, na-enyekwa m ihe ụfọdụ dị mkpa. Nke a mere ka m ghọta mkpa nke okwu Jisọs a na-achọta na Jọn 13:35: ‘Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.’ Nkwenye m na Ndịàmà Jehova na-ekpe ezi okpukpe miwanyere emi. N’ikpeazụ, mgbe nne na nna m hụrụ na agbanwewo m ndụ m ịka mma, ha nwere mmasị n’ihe ha hụrụ, omume ha n’ebe m nọ gbanwekwara—nke na nna m rịọrọ Ndịàmà ka ha mụwara deede m Bible!”

Ịnwapụtara Onwe Onye Eziokwu 

‘Ịzụta eziokwu’ bụkwa ihe ịma aka nye ụfọdụ ndị na-eto eto ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà zụliteworo. Ụfọdụ ndị ntorobịa adịghị achọ iji eziokwu Bible kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ha adaa n’ime ka eziokwu ndị dị otú ahụ bụrụ nke ha, okwukwe ha na-adawa mbà, ọ naghị aba ime. (Tụlee Matiu 13:20, 21.) Nathaniel, bụ́ nwoke onye Ghana gbara afọ 30 na ụma, na-akọ otú o si “zụta eziokwu” mgbe ọ ka bụ onye na-eto eto.

“Ndị mụrụ m kụziiri m Bible site n’oge m bụ nwa ọhụrụ,” ka ọ na-echeta. “Ka m na-etolite, esonyeere m ha n’ọrụ nkwusa, ma ekpebibeghị m n’ezie ịghọ Onyeàmà. Ka oge na-aga, aghọtara m na ọ dị m mkpa ịchọpụta ihe n’onwe m.

“Mbụ, aghaghị m ikwenye na Bible, ọ bụghị akwụkwọ dị nsọ ọ bụla ọzọ nke okpukpe, bụ Okwu Chineke. Site n’ọmụmụ ihe onwe onye, amụtara m na ọ bụ ya bụ nanị akwụkwọ dị nsọ nke nwere ọtụtụ amụma doro anya ndị e mezuru n’ụzọ zuru ezu. Amụtakwara m na Bible nwere ọtụtụ eziokwu sayensị—dị ka ihe atụ, na ụwa kokwasị n’elu ‘ihe na-abụghị ihe.’ (Job 26:7) E dere okwu ndị a ọtụtụ puku afọ tupu ndị ọkà mmụta sayensị amata banyere ụwa mbara igwe anyị. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ inye ụmụ mmadụ ike ide ihe ndị dị otú ahụ!a

“Ọzọ, achọrọ m ịchọpụta òtù okpukpe na-akụzi ma na-eme eziokwu ndị a kụziri na Bible. Ihe ka ọtụtụ n’okpukpe na-akụzi ọkụ ala mmụọ, Atọ n’Ime Otu, na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-alanarị ọnwụ. Ma ozizi ndị a adịghị m ka ihe ezi uche dị na ha. Echere m, sị: Ọ́ gaghị abụ ajọ nna ga-abịagide aka nwa ya n’ime ite mmiri na-agbọ agbọ dị ka ntaramahụhụ? Mgbe ahụ, olee otú Chineke nke ịhụnanya ga-esi tinye ụmụ ya n’ime hel na-ere ọkụ ma hapụ ka ha na-ata ahụhụ? Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova na-akụzi ihe kwekọrọ n’akụkụ Bible ndị dị ka Ndị Rom 6:23, nke na-asị: ‘Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ’—ọ bụghị hel na-ere ọkụ. Nke a yiri ihe ezi uche dị na ya nye m.

“Ahụkwara m na Ndịàmà Jehova na-achọ n’aka ndị òtù ha nile ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, nakwa na ha na-achụpụ ndị nọgidere ná mmehie n’enweghị nchegharị. N’ihi ihe ndị a nile, ekwubiri m na Ndịàmà Jehova nwere eziokwu, emekwara m mkpebi onwe onye ịghọ otu n’ime ha. Arụsiri m ọrụ ike iji ruo eruo maka baptism dị ka Onyeàmà.”—1 Ndị Kọrint 5:11-13.

Ahụmahụ Nathaniel bụ nnọọ ihe atụ na-egosi na ọbụna ndị ntorobịa nne na nna bụ́ ndị Kraịst zụlitere aghaghị ‘ịzụta eziokwu.’ Ha ekwesịghị nanị ịdị na-aga nzukọ ọgbakọ n’efu. Dị ka ndị Beria oge ochie, ha kwesịrị ‘ịdị na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a dị otú a.’ (Ọrụ 17:11) Nke a na-ewe oge na mgbalị, ma ọ pụrụ ịrụpụta okwukwe na nkwenye siri ike.—Tụlee Ndị Efesọs 3:17-19.

Okpukpe Ụgha Kụdara Ya Mmụọ

Otu nwoke onye Ghana aha ya bụ Godwin fọrọ nke nta ka ọ gbaa afọ 70 mgbe ọ hapụrụ Chọọchị Presbyterian na Òtù Nzuzo Mason. “E nwere ihe ndị na-eme na chọọchị ndị na-adịghị m mma,” ka Godwin na-ekwu. “Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ esemokwu, ha ka na-agakwa n’ihu. Mgbe ụfọdụ ndị uwe ojii aghaghị ịbịa iji weghachi udo na ịdị n’usoro! Echeghị m na nke a kwesịrị ekwesị maka ụmụazụ Kraịst. Mgbe ahụ nsogbu bilitere n’etiti mụ na onye Presbyterian ibe m. Otu ụlọikpe ọha na eze gere okwu ikpe ahụ ma maa nwoke nke ọzọ ikpe. Otú ọ dị, onye ụkọchukwu nke chọọchị ahụ dụnyeere nwoke a úkwù n’ụzọ na-ezighị ezi ma nwaa ịkatọ m n’ihu ọgbakọ ahụ nile! Agwara m ya ihe bụ uche m ma pụọ na chọọchị ahụ—n’alaghachikwaghị ọzọ.

“Oge ụfọdụ gafere, Ndịàmà Jehova wee bịa n’ụlọ m. Na mbụ, egere m ntị nanị n’ihi na achọghị m ịchụ ndị na-ekwu banyere Chineke. Ma amalitere m ịhụ na n’agbanyeghị na abụwo m onye Presbyterian ruo ọtụtụ iri afọ, e nwere ọtụtụ ihe ndị m na-amaghị banyere Bible. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị mgbe m matara na Bible na-enye olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala.b Mgbe m malitekwara ije nzukọ Ndịàmà Jehova, àgwà, karịsịakwa uwe na ejiji ndị ntorobịa nọ n’etiti ha, dọọrọ mmasị m nke ukwuu. Nke a bụ ndị na-ebi ndụ kwekọrọ nnọọ n’ụkpụrụ Bible!”

Ma, ‘ịzụta eziokwu’ chọrọ ya n’aka ime mgbanwe ụfọdụ siri ike ná ndụ ya. Godwin na-echeta, sị: “Abụbu m onye Òtù Nzuzo Mason. Ọ bụkwa ezie na a maara ya dị ka òtù ụmụnna na-enyere ndị so na ya aka, ana m edebe ememe okpukpe ndị gụnyere iji okpokoro isi na ọkpụkpụ eme ihe na ịkpọku ndị mmụọ. E kwenyere na ndị mmụọ a na-enyere ndị na-eso ha emekọrịta ihe aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ.

“Ọmụmụ ihe m nyeere m aka ịhụ na Jehova Chineke kpọrọ ntinye aka ọ bụla ná mgbaasị asị n’ihi na ọ pụrụ iwebata mmadụ n’okpuru ike Setan na ndị ajọ mmụọ ya.c M̀ ga-anọgide dị ka onye Òtù Nzuzo Mason ya na ihe omimi ya nile, ka m̀ ga-akwụsị ma mee ihe na-atọ Jehova ụtọ? Ahọọrọ m nke ikpeazụ a. Emebiri m ngwongwo Freemason nile m nwere, ọbụna uwe m na-ejibu aga nzukọ Òtù Nzuzo. Enwere m ahụmahụ eziokwu nke nkwa Jisọs mgbe ọ sịrị, ‘Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu’! (Jọn 8:32) Ugbu a eji m obi ụtọ na-esoro ndị ọzọ ekerịta ihe ndị m mụtaworo. Enweghị m ịkwa ụta ọ bụla.”

N’otu aka ahụ ọtụtụ puku ndị nwere obi eziokwu achụwo àjà dị ukwuu iji “zụta eziokwu.” Dị ka ndị Kraịst atọ ahụ e kwuru okwu ha ebe a, ha enweghị ịkwa ụta ọ bụla banyere mgbanwe ndị ha mere. Eziokwu Bible enyewo ha “ntọala ọma nye oge gaje ịbịa, ka ha wee jide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:19) Ndụ ahụ “nke bụ ndụ n’ezie” na ngọzi nile so ya pụrụ ịbụ nke gị ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụ na ị ‘ga-azụta eziokwu.’

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Dị ka ihe atụ, lee Abụ Ọma 37:9-11, 29.

c Lee Deuterọnọmi 18:10-12 na Ndị Galetia 5:19-21.

[Foto dị na peeji nke 9]

Nathaniel

[Foto dị na peeji nke 9]

Godwin

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya