Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/15 p. 28
  • Ihe Ilu ahụ Pụtara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ilu ahụ Pụtara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Rịọ Arịrịọ maka Nsutu Ọnụ nke Onye Na-akpọ Asị?
  • Olee Otú Ndị Ezi Omume Si Aba Ụba Mgbe Ndị Na-emebi Iwu Na-ala n’Iyi?
  • Na-eje Ije ‘n’Ụzọ nke Izi Ezi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • ‘Ezi Mmadụ Na-enweta Ihu Ọma Chineke’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ‘Ngọzi Nile Na-adịrị Onye Ezi Omume’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/15 p. 28

Ihe Ilu ahụ Pụtara

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Rịọ Arịrịọ maka Nsutu Ọnụ nke Onye Na-akpọ Asị?

ONYE amamihe ahụ nke mmụọ nsọ na-akpali kwuru, sị: ‘Mmerụahụ nke onye na-ahụ n’anya kpatara bụ ihe kwesịrị ntụkwasị obi, ma nsutu ọnụ nke onye na-akpọ asị bụ ihe a ga-arịọsi ike.’ (Ilu 27:6, NW) Olee ụzọ e kwesịrị isi ghọta okwu ndị a?

Onye hụrụ gị n’anya ga-emerụ gị ahụ n’ụzọ ihe atụ n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ pụrụ inye gị ndụmọdụ site n’ịhụnanya nke obi ya, na-enwekwa olileanya nke imere gị ihe ọma. Ọ dịghị mkpa ka ị rịọsie onye bụ ezi enyi gị arịrịọ ike maka enyemaka dị otú ahụ ma ọ bụ ọbụna maka ịtụ mmehie n’anya mgbe ọ dị gị mkpa. Leekwa nnọọ otú o si bụrụ ihe amamihe ma ọ bụrụ na i jiri amara nara ndụmọdụ ahụ dị mkpa, nkatọ nke na-ewuli elu, ma ọ bụ ịtụ mmehie n’anya nke dị mkpa!

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chọọ ka onye kpọrọ gị asị meere gị ihe ọma, ị ghaghị ịrịọsi ya ike. N’ihi gịnị? N’ihi na asị ọ kpọrọ gị agaghị akpali ya n’ụzọ nkịtị isutụ gị ọnụ. Kama nke ahụ ọ ga-amasị ya imeso gị ihe n’obi ọjọọ. Omume obi ebere ọ bụla ọ pụrụ imere gị bụ nke a ga-enweta n’aka ya nanị site n’ihe isi ike dị ukwuu nakwa ịrịọsi ya arịrịọ ike.

Otu ihe na-akpali mmasị banyere nke a bụ otu n’ime ilu ndị ahụ Jisọs Kraịst tụrụ. O kwuru okwu n’otu mgbe banyere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye nwetara ikpe ziri ezi n’aka otu onyeikpe nke na-adịghị atụ egwu Chineke, nke na-adịghị asọpụrụkwa mmadụ. Olee ụzọ nwanyị ahụ si nweta ihe ọ na-achọ? Onyeikpe ahụ hụrụ na nwanyị ahụ nwetara ntọhapụ ahụ kwesịịrị ya nanị n’ihi na ọ nọgidere na-arịọ ya. Jisọs jiri ihe atụ nke a mee ihe ime ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta mkpa ọ dị ‘na ha aghaghị ikpe ekpere mgbe nile, na ịghara ikwe ka ike gwụ ha.’—Luk 18:1-8.

Olee Otú Ndị Ezi Omume Si Aba Ụba Mgbe Ndị Na-emebi Iwu Na-ala n’Iyi?

Ilu 28:28 na-asị: ‘Mgbe ndị na-emebi iwu na-ebili, mmadụ ezobe onwe ya: ma mgbe ha na-ala n’iyi, ndị ezi omume abaa ụba.’ Olee otú nke a si bụrụ eziokwu?

Ndị na-emebi iwu pụrụ ‘ibili’ n’ike ọchịchị, ma eleghị anya dị ka ndị ọchịchị aka ike. N’oge dị otú ahụ, onye ezi omume na-ezobe onwe ya. Ọ pụrụ ime otú ahụ n’ihi egwu nke mmekpọ ọnụ ha. N’ihi nzube dị aṅaa? Ọ bụ eziokwu na ‘mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’—Eklisiastis 8:9.

Otú ọ dị, mgbe ndị mmebi iwu lara n’iyi, ndị ezi omume ‘na-aba ụba.’ N’ụzọ dị aṅaa? Ma eleghị anya n’ihi na mgbe ahụ, ndị ezi omume na-apụtasị site n’ebe ha zoro wee pụta n’ihu ọha. Otú a, ha na-enwe ihe ịga nke ọma wee yie ka hà amụbawo n’ọnụ ọgụgụ n’ihi na ọ dịkwaghị mkpa ka ha zobe onwe ha. Ya bụrụ na ndị ziri ezi na-achị, ha ga-ata ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ ma kwalite àgwà ezi omume. Nke ahụ pụkwara inwe mmetụta nke ibelata ọnụ ọgụgụ ndị ajọ omume ma mụbaa ndị ezi omume.—Tụlee Ilu 28:12; 29:2.

N’oge na-adịghị anya, ndị ziri ezi ga-ahụ ka ndị na-emebi iwu lara n’iyi pụọ n’ụwa n’ime ‘ụbọchị iwe Jehova’ nke na-abịa ọsọ ọsọ. Ya mere, chọọ ezi omume na ịdị umeala n’obi dị ka ụkpụrụ Chineke si dị, a pụkwara ichebe gị banye n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke, ebe ndị ezi omume ga-aba ụba n’ezie.—Zefanaịa 2:2, 3; 2 Pita 3:11-13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya