Mkpịsị Ugodi nke Mmụta Dị Mma
N’OGE na-adịbeghị anya, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times dere otu akụkọ ihu peji banyere Latoya, onye gbara afọ 16 nke nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu. O kwuru na ọ dị afọ 11 mgbe nna ya malitere iti ya ihe na imetọ ya n’ụzọ mmekọahụ. Nne ya, onye ji ọgwụ ọjọọ eme ihe, esiwo n’ezinụlọ ahụ pụọ. “Ebe obibi,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ, “bụ ụlọ obibi a gbahapụrụ agbahapụ, nke na-enweghị ụlọ mposi, ma ọ bụ nke nwere ọnụ ụlọ ebe ọ na-atụ egwu ihi ụra n’ime ya.” Otú ọ dị, Latoya pụrụ iche. N’agbanyeghị ihe ndị a nile, ná mmalite afọ a, Latoya bụ onye isi nke Òtù Ndị Na-eme nke Ọma n’ụlọ akwụkwọ dị elu ya, ma nọgide na-enwe nkezi akara B n’ihe ọmụmụ nke ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma.
Gịnị pụrụ inyere nwatakịrị sitere n’ọbụna gburugburu ebe obibi dị njọ ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ? Ọtụtụ mgbe, mkpịsị ugodi nke mmụta dị mma bụ inwe onye toruworo ogo mmadụ na-enye nlekọta—karịsịa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ mụrụ nwatakịrị ahụ—onye na-enye nkwado ma tinye aka n’ụzọ dị omimi ná mmụta nwatakịrị ahụ. Otu nwa akwụkwọ nọ n’afọ ikpeazụ ya n’ụlọ akwụkwọ dị elu chere na nke a dị oké mkpa nke na a kpaliri ya ikwu, sị: “Ọ bụ nanị site ná nkwado ndị mụrụ ụmụ ka ụmụaka pụrụ ịnọgide na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ.”
Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nkụzi kwetara. Otu onye nkụzi na New York City zọọrọ, sị: “Nye nwa akwụkwọ ọ bụla nke na-eme nke ọma, nke gụsịkwara akwụkwọ n’usoro agụmakwụkwọ—ha dịkwa ọtụtụ—e nwere nne ma ọ bụ nna nke na-enye nkwado mgbe nile.”
Nkwado Onye Mụrụ Ụmụ, Mkpịsị Ugodi Dị Mkpa
Akwụkwọ bụ́ Reader’s Digest n’afọ gara aga nyochara ajụjụ ahụ bụ́, “N’ihi gịnị ka ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ji eme nke ọma karịa ndị ọzọ?” Otu n’ime nkwubi okwu bụ na “ezinụlọ kwụsiri ike na-eme ka ụmụaka dị nkọ n’ụlọ akwụkwọ.” Ndị nne na nna nke ezinụlọ ndị dị otú ahụ na-enye ụmụ ha nchebara echiche ịhụnanya ma na-enyekwa ha ụkpụrụ na ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ekwesị. Ma otu nna sịrị: “Ị pụghị inye nduzi kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ị maghị ihe na-eme n’ụlọ akwụkwọ.”
Otu ụzọ isi chọpụta bụ ime nleta. Otu nne na-eme nleta dere, sị: “Mgbe m na-agafe na paseji ụlọ akwụkwọ nwa m nwanyị, m na-anụ okwu na-adịghị ọcha na nke rụrụ arụ. Ụmụaka n’ebe nile na-adịda aka ma na-esutụ ọnụ n’ụzọ na-akpali mmekọahụ—ọ bụrụ na ọ bụ ihe nkiri, a ga-akpọ ya nke X [nke ndị na-erughị afọ 17 na-ekwesịghị ikiri].” Nleta ndị dị otú ahụ pụrụ inyere gị aka ịmata otú o siri siere ụmụaka ike taa inweta mmụta dị mma, tinyere ịdị ndụ omume dị ọcha.
N’ụzọ dị mkpa, akwụkwọ bụ́ The American Teacher 1994 sịrị: “O yikarịrị ka ụmụ akwụkwọ ndị e mesoworo ihe ike ga-ekwu na ndị mụrụ ha adịghị eso ụlọ akwụkwọ enwe nkwurịta okwu mgbe nile, dị ka mmadụ isoro ndị nkụzi ezukọ, nzukọ ndị mụrụ ụmụ ma ọ bụ nzukọ ìgwè, ma ọ bụ ileta ụlọ akwụkwọ.”
Otu nne nwere nchegbu kpughere ihe ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa ime. “Jee ebe ahụ!” ka o kwuru. “Mee ka ndị na-elekọta ụlọ akwụkwọ mara na i nwere mmasị n’ihe nwa gị na-amụ. Ana m eleta ụlọ akwụkwọ mgbe mgbe ma na-esonyere ha na klas.” Onye ọzọ bụ nne mesiri ike ịdị mkpa ọ dị ịbụ ọnụ na-ekwuchitere nwatakịrị. Ọ kọwara, sị: “Ụmụ m jere n’ọfis ịgwa onye ndụmọdụ okwu, e leghakwaara ha anya kpam kpam. Mgbe nwa m kpọtara m n’ụbọchị na-eso ya, ha gbalịsiri ike inyere mụ aka—na nwa m.”
Nne a nke mụrụ ụmụ okoro anọ mesikwara ike mkpa ọ dị igosi mmasị n’ihe omume ụlọ akwụkwọ ndị na-emetụta kpọmkwem mmụta nwa gị. “Jee n’ụbọchị a na-eme nleta n’ụlọ akwụkwọ, n’ihe ngosi sayensị—ihe ọ bụla ụmụ gị pụrụ ịdị na-eme nke a na-akpọ ndị mụrụ ụmụ òkù ka ha bịa,” ka o kwuru. “Nke a na-enye gị ohere izute ndị nkụzi ụmụ gị. Ọ dị ha mkpa ịmata na ị na-ele mmụta nwa gị anya dị ka akụkụ dị oké mkpa nke ndụ ya. Mgbe ndị nkụzi matara nke a, ha na-achọkarị itinye oge na mgbalị ka ukwuu n’ebe nwa gị nọ.”
Isoro Ndị Nkụzi Na-arụkọ Ọrụ
Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ iche na ha nwere ihe ndị ka mkpa ime n’uhuruchi mgbe ụlọ akwụkwọ dokwara oge ndị pụrụ iche maka ndị mụrụ ụmụ isoro ndị nkụzi nọkọọ. Ma, n’ezie, gịnị dị mkpa karịa iwepụta onwe gị nye ndị na-agbalị inyere ụmụ gị aka inweta mmụta dị mma? Nrụkọ ọrụ dị mma n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ndị nkụzi dị mkpa!
Na Russia e nwere ndokwa mara mma iji kwalite nrụkọ ọrụ nke ndị mụrụ ụmụ na ndị nkụzi. A na-edebanye ihe omume nile nke ụlọ akwụkwọ n’ime ihe a na-akpọ Dnievnik—ihe ndekọ kwa ụbọchị nke a na-ejikọta ya na kalenda. Nwa akwụkwọ aghaghị iweta Dnievnik ya bịa na klas nke ọ bụla, ma nye ya onye nkụzi mgbe ọ jụrụ maka ya. Ụmụ akwụkwọ aghaghịkwa igosi ndị mụrụ ha Dnievnik ahụ, bụ́ ndị a na-agwa ka ha bịanye aka na ya kwa izu. Dị ka Victor Lobachov, onye Moscow nke bụ nna ụmụaka na-aga akwụkwọ, siri kwuo na “ihe ọmụma a na-enyere ndị mụrụ ụmụ aka ịmata nke ọma banyere ihe omume na akara nke ụmụ ha.”
Otú ọ dị, ndị nkụzi taa na-emekarị mkpesa na ndị mụrụ ụmụ adịghị enwe mmasị ná mmụta nke ụmụ ha. Otu onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ dị elu na United States sịrị na ọ dị mgbe ya zigaara ndị mụrụ ụmụ 63 akwụkwọ ozi, na-agwa ha banyere emezighị emezi nke ụmụ ha n’agụmakwụkwọ. Nanị ndị nne ma ọ bụ nna atọ zaghachiri site n’ịkpọtụrụ ya!
N’ezie, nke ahụ dị mwute! Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị itinye aka n’ụzọ miri emi ná mmụta nke nwa ha, nke bụ ibu ọrụ ha bụ isi. Otu onye ọkà nkụzi kwuru okwu ahụ n’ụzọ ziri ezi mgbe ọ sịrị: “Nzube bụ́ isi nke mmụta akwụkwọ bụ iji kwadoo ndị mụrụ ụmụ n’ịzụlite ndị ntorobịa a pụrụ ịtụkwasị obi.”
N’ihi ya, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ibute ụzọ n’ịmata ndị nkụzi ụmụ ha. Dị ka otu nne si kwuo, “ọ dị ndị nkụzi mkpa inwere onwe ha ịkpọ gị òkù mgbe ọ bụla.” Ndị mụrụ ụmụ kwesịkwara ịnabata—ọbụna ịgba—ndị nkụzi ume ikwu okwu banyere ụmụ ha n’ezoghị ọnụ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịjụ ajụjụ ndị kwụrụ kwem dị ka: Ị̀ na-enwe nsogbu ọ bụla n’ebe nwa m nọ? Ọ̀ na-akwanyere mmadụ ùgwù? Ọ̀ na-anọ ya na klas nile? Ọ̀ na-abịarutekwa tupu oge eruo?
Gịnị ma ọ bụrụ na onye nkụzi ekwuo ihe na-adịghị mma banyere nwa gị? Echela na ọ bụ ụgha. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị ntorobịa nwere ọdịdị nke ibi ndụ nwere nkwanye ùgwù n’ebe obibi ma ọ bụ n’ebe ofufe ha na-ebi nnọọ ụdị ndụ abụọ. Ya mere jiri nkwanye ùgwù ṅaa onye nkụzi ahụ ntị, nyochaakwa ihe ọ na-ekwu nke ọma.
Mgbe Nwa Gị Lọtara Ụlọ
Olee otú ọ na-adịkarị gị dị ka onye mụrụ nwa, mgbe i si ọrụ lọta ụlọ? Ònye nrụgide ji aka? Ònye nwere nkụda mmụọ? Nwa gị pụrụ ọbụna inwe mmetụta ka njọ mgbe o si ụlọ akwụkwọ lọta ụlọ. Ya mere otu nna gbara ume, sị: “Mee ka ịlọta ụlọ bụrụ ihe dị mma ime. Ọ pụrụ ịbụ na ha enwewo ụbọchị siri oké ike.”
Mgbe o kwere mee, ọ bụ nnọọ ihe dị mma nye nne ma ọ bụ nna ịnọ n’ụlọ mgbe nwatakịrị lọtara. Dị ka otu nne rịbara ama, “ụmụaka apụghị ịgwa gị ihe na-emenụ ma ọ bụrụ na ị nọghị n’ebe ahụ iso ha kwurịta okwu. Ya mere, ana m eme ezi mgbalị ịnọ ya mgbe ụmụaka lọtara ụlọ.” Ọ dị onye mụrụ nwa mkpa ịmara ọ bụghị nanị ihe nwa ya na-eme kamakwa echiche na mmetụta ya. Ịchọpụta nke a na-achọ oge dị ukwuu, mgbalị, na nchọpụta dị nro. (Ilu 20:5) Inwe nkwurịta okwu kwa ụbọchị dị mkpa.
Otu onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ praịmarị na New York City sịrị: “N’ime ụbọchị ọ bụla, ọ pụrụ ịbụ na e nyefewo nwa gị ụkpụrụ dị iche iche nke usoro agụmakwụkwọ na-agba aghara.” Ya mere ọ gbara ume, sị: “Mụrụ anya n’ihe a na-azụlite n’ime obi nwa gị. Were nwayọọ, n’agbanyeghị otú ike pụrụ ịgwụru gị, ime ka o kwuo okwu ma jiri ụkpụrụ ndị dị mma dochie ndị ọ bụla jọrọ njọ.”—Ilu 1:5.
N’otu aka ahụ, otu onye nweworo ahụmahụ n’ịkụzi n’ụlọ akwụkwọ dị elu dụrụ ọdụ, sị: “Kama nanị ịjụ ihe mere n’ụlọ akwụkwọ, ọ ga-aba uru ịjụ ajụjụ ndị kwụrụ kwem ma doo anya banyere ụbọchị ahụ na ihe omume ya dị iche iche. Ọ dịghị mkpa ime nke a n’ụzọ siri ike ma ọ bụ nke inwe oké ọchịchọ ịmata ihe, kama n’isoro nwatakịrị ahụ nwee mkparịta ụka.”
Richard W. Riley, odeakwụkwọ nke mmụta na United States, gbara ume, sị: “Gwa ụmụ gị okwu kpọmkwem, karịsịa ụmụ gị ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, banyere ihe ize ndụ nke ọgwụ ọjọọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na ụkpụrụ ndị ị chọrọ ka ụmụ gị nwee. Nkwurịta okwu onwe onye dị otú ahụ, n’agbanyeghị otú ha pụrụ isi mee ka ahụ ghara iru gị ala, pụrụ ịzọpụta ndụ ha.”
Onye mụrụ nwa, karịsịa onye nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst, ekwesịghị mgbe ọ bụla inye echiche nke na ya ji ọrụ n’aka gabiga ókè ige ụmụ ya ntị. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye nsogbu ịnụ ihe ha na-ekwu, mee ka ha mata site n’ọdịdị ihu na àgwà gị na i nwere mmasị na ha na-agwa gị okwu n’enweghị ihe mgbochi. Otu nwa akwụkwọ dụrụ ọdụ, sị: “Akụjala mgbe nwa gị na-ekwu banyere ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mmekọahụ n’ụlọ akwụkwọ.”
N’ihi ndakpọ ná ndụ ezinụlọ, e nwere ọtụtụ ndị taa a pụrụ izo aka n’ebe ha nọ dị ka “ụmụ mgbei.” (Job 24:3; 29:12; Abụ Ọma 146:9) N’ime ọgbakọ ndị Kraịst, a na-enwekarị onye pụrụ inyere onye na-eto eto chọrọ enyemaka aka. Ị̀ bụ onye pụrụ inye aka?
Kwalite Ọmụmụ Ihe na Ibu Ọrụ
Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị na-eto eto adịghị etinye uche ha n’ọrụ ụlọ akwụkwọ dị ka Latoya, onye a kpọtụrụ aha ná mmalite. Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nwere mkpa agbamume dị ukwuu iji mụọ ihe. Banyere ụmụ nke ya, onye bụbu onye isi nke ụlọ akwụkwọ New York City bụ́ Joseph Fernandez sịrị: “Anyị guzobere oge ndị a na-aghaghị iji mụọ ihe n’ụlọ. Anyị zụtara akwụkwọ, gbaa ume ịga n’ọbá akwụkwọ, ma mee ka ịbịa na ikere òkè bụrụ ihe ndị na-ebute ụzọ.”
Onye ọzọ na-elekọta ụlọ akwụkwọ sịrị: “Ọ dị anyị mkpa iji akwụkwọ na akụkọ gbaa ụmụ anyị gburugburu dị ka anyị si jiri telivishọn, ihe nkiri, vidio na ụlọ ahịa gbaa ha gburugburu ugbu a.” Mgbe ụmụaka na-eme ihe omume ụlọ akwụkwọ ha n’ụlọ, ndị mụrụ ụmụ pụrụ inwe ike ime ndokwa ịnọrọ nso na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye ma ọ bụ na-agụ ihe. Ụmụ gị pụrụ isi otú ahụ hụ na i ji mmụta kpọrọ ihe.
N’ọtụtụ ebe obibi telivishọn bụ ihe ịma aka kasị ukwuu nye ịmụ ihe. “Ka ha na-erule afọ 18,” ka otu onye ọkà nkụzi kwuru, “ndị na-eto eto etinyewo 11,000 hour n’ụlọ akwụkwọ na 22,000 n’ikiri telivishọn.” Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ibelata nkiri ụmụ ha na-ekiri TV, ma eleghị anya na-ekiri ya nanị site n’oge ruo n’oge n’onwe ha. Ọzọkwa, mikpuonụ onwe unu n’isoro ụmụ unu na-amụ ihe. Gụkọọ ihe ọnụ. Dokwaa oge kwa ụbọchị iji tụlee ihe omume ụlọ akwụkwọ n’ụlọ.
N’ụlọ akwụkwọ ụmụ gị ga-anata ọtụtụ ihe omume ịkwadebe. Hà ga-arụzu ihe ndị a? Ma eleghị anya ha pụrụ ma ọ bụrụ na ị kụziworo ha ịhụ maka ibu ọrụ dị iche iche n’ụlọ. Otu ụzọ isi mee nke a bụ ikenye ha ọrụ a na-arụ n’ụlọ kwa ụbọchị. Mgbe ahụ chọọ ka ha rụzuo ndị a dị ka otu usoro ihe omume kpọmkwem si dị. N’eziokwu, ọzụzụ dị otú ahụ ga-ewe mgbalị buru ibu n’ebe ị nọ, ma ọ ga-akụziri ụmụ gị echiche nke ibu ọrụ nke dị ha mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ụlọ akwụkwọ na mgbe oge na-aga ná ndụ.
Nwa Akwụkwọ Itinye Uche n’Ihe, Mkpịsị Ugodi Dị Mkpa
Onye ndụmọdụ nduzi bụ́ Arthur Kirson kọwapụtara mkpịsị ugodi ọzọ nke mmụta dị mma mgbe o kwuru banyere Latoya ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite, sị: “Mgbe mbụ m zutere ya bụ mgbe otu n’ime ihe omume ndị gbara ọkpụrụkpụ mesịworo n’ụlọ. N’ebe a ka nwatakịrị a na-anọdụ ala na-enwe mmerụ ahụ n’ihu [n’ihi ihe a sịrị na nna ya tiri ya]. Nanị ihe m hụtụworo ya ka ọ na-echegbu onwe ya banyere ya bụ ọrụ ụlọ akwụkwọ ya.”
Ee, mkpịsị ugodi dị mkpa nye mmụta dị mma bụ nwatakịrị itinye uche siri ike n’ịmụta ihe. Otu ntorobịa na New York City kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ taa, ọ dabeere kpam kpam n’ụmụ akwụkwọ ahụ ịzụlite mkpali onwe onye na ọzụzụ iji wee rite uru.”
Dị ka ihe atụ, otu onye nkụzi gwara otu nne na-echegbu onwe ya banyere mmụta nwa ya, sị: “Enyela onwe gị nsogbu, Oriakụ Smith. Justin maara ihe nke ukwuu, ọ gaghị adị ya mkpa ịmụta otú e si asụpe okwu. Odeakwụkwọ ga-emere ya nke ahụ.” N’agbanyeghị otú nwatakịrị maruru ihe, ịmụta nkà ịgụ na ide ihe nke ọma—tinyere edemede doro anya, ide ihe a pụrụ ịgụ, na ịsụpe okwu nke ọma—dị mkpa.
N’ụzọ na-awụ akpata oyi, ụfọdụ ndị ọkà nkụzi emeghị mkpesa mgbe onye ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ a ma ama bụ́ Carl Rogers zọọrọ, sị: “Ọ dịghị onye kwesịrị ịgbalị mgbe ọ bụla ịmụ ihe ọ bụla nke ọ na-ahụghị dị ka ihe bara uru.” Gịnị dị njọ n’okwu a? Dị ka o kwesịrị ịpụta ìhè, ọtụtụ mgbe nwatakịrị apụghị ibu ụzọ mata abamuru dị n’ihu nke ihe a gwara ya ka ọ mụọ. N’ọtụtụ ọnọdụ a dịghị amata abamuru ya ruo mgbe e mesịrị ná ndụ. N’ụzọ doro anya, nwatakịrị taa nwere mkpa nke itinye uche onwe onye n’ihe iji nweta mmụta dị mma!
Cindy, onye dị afọ 14 nke nọ n’ogo agụmakwụkwọ nke itoolu, bụ ezi ihe nlereanya nke onye ntorobịa na-egosipụta ụdị nraranye dị otú ahụ. Ọ kọwara, sị: “M na-anọrọ mgbe a gbasasịrị akwụkwọ ma gwa ndị nkụzi okwu, gbalịakwa ịmata ha. M na-agbalị ịmata ihe ha chọrọ n’aka ụmụ akwụkwọ ha.” Ọ na-aṅakwa ntị na klas ma na-enyekwa ihe omume ụlọ akwụkwọ ọ ga-arụ n’ụlọ ọnọdụ nke mbụ. Mgbe ha na-aṅa ntị na klas ma ọ bụ mgbe ha na-agụ ihe, ụmụ akwụkwọ na-enwe ihe ịga nke ọma na-eme ka ọ mara ha ahụ iji pensil na akwụkwọ n’aka ka ha nwee ike idetu ihe nke ọma.
Ihe ọzọ dịkwa mkpa iji nweta mmụta dị mma bụ nraranye iji zere ndị enyi ọjọọ. Cindy kọrọ, sị: “Ana m achọ mgbe nile onye nwere omume ọma. Dị ka ihe atụ, m ga-ajụ ụmụ akwụkwọ ibe m ihe ha chere banyere onye na onye dị otú ahụ ji ọgwụ ọjọọ eme ihe ma ọ bụ inwe mmekọahụ aghara aghara. Ọ bụrụ na ha ekwuo ihe dị ka, ‘Gịnị dị njọ na ya?’ m na-amata na ha abụghị ezi ndị enyi. Ma ọ bụrụ na mmadụ egosipụta ezi ịkpọasị n’ebe àgwà dị otú ahụ dị, ma kwuo na ya chọrọ ịdị iche, mgbe ahụ m ga-ahọrọ ya ịbụ onye m ga-anọdebe n’oge nri ehihie.”
E nwere n’ezie ọtụtụ ihe ịma aka n’inweta mmụta dị mma taa. Ma mmụta dị otú ahụ kwere omume ma ọ bụrụ na ma ụmụ akwụkwọ ma ndị mụrụ ụmụ ji mkpịsị ugodi ndị ahụ mee ihe. Ọzọ anyị ga-atụle ndokwa ọzọ nke pụrụ inyere gị aka n’ụzọ dị ukwuu n’inweta mmụta dị mma.
[Igbe dị na peeji nke 19]
Nzụtọ Ka Ọ̀ Bụ Inye Ahụhụ n’Ịhụnanya?
Bible na-adọ aka ná ntị na ịzụtọ ụmụaka na-eduje n’ọdachi. (Ilu 29:21) Ná nkwenyere, Albert Shanker, onye isi nke Òtù Ndị Nkụzi n’America, sịrị: “E nwere ndị mụrụ ụmụ na-eche na ha na-eme ihe nile ziri ezi maka ụmụ ha ma ọ bụrụ na ha emee ihe nile n’ụzọ ụmụaka chọrọ ka ha mee ya. Anyị matakwara na nke ahụ ezighị ezi.”
Ọbụna ọtụtụ ndị na-eto eto matara na nzụtọ dị otú ahụ ezighị ezi. Ná mmalite afọ gara aga, otu akwụkwọ akụkọ Massachusetts kọrọ, sị: “Nnyocha e mere banyere 1572 ụmụ akwụkwọ ndị nọ n’ogo agụmakwụkwọ nke isii ruo iri na abụọ n’Ọdịda Anyanwụ Springfield chọpụtara na ‘nleghara anya ndị mụrụ ụmụ,’ ọ bụghịkwa nrụgide ndị ọgbọ bụ mmetụta kasị pụta ìhè n’ihe banyere ịṅụ ọgwụ ọjọọ na mmanya na-aba n’anya n’etiti ụmụaka nọ n’ìgwè afọ ndụ a.”
Ịzụtọ ndị na-eto eto n’ụzọ dị otú ahụ etinyewokwa ihe ná mgbasa nke inwe mmekọahụ aghara aghara. N’ezie, dị ka Bible na-ekwu, ịghara inye ahụhụ na-eduje ná mmechuihu ezinụlọ.—Ilu 29:15.
[Igbe dị na peeji nke 22]
Ihe Ndị Mụrụ Ụmụ Pụrụ Ime
✔ Mata ụlọ akwụkwọ nwa gị, nzube ya, na omume ya n’ebe ụkpụrụ na nkweta ndị i nwere dị.
✔ Mata ndị nkụzi nwa gị nke ọma, gbalịakwa iwulite mmekọrịta ọrụ dị mma n’ebe ha nọ.
✔ Gosi mmasị dị omimi n’ihe omume ụlọ akwụkwọ nke nwa gị na-eme n’ụlọ. Soro ya na-agụ ihe mgbe mgbe.
✔ Chịkwaa ihe nwa gị na-ekiri na TV na ókè ọ na-ekiri ya.
✔ Leruo àgwà iri nri nwa gị anya. Nri ratụ ratụ pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’ikike o nwere ịtụkwasị uche n’ihe.
✔ Jide n’aka na nwa gị na-ehi ụra nke ọma. Ụmụaka ike gwụrụ adịghị amụta ihe nke ọma.
✔ Gbalịa inyere nwa gị aka ịhọrọ ezi ndị enyi.
✔ Bụrụ enyi kasị mma nke nwa gị. Ndị enyi nile tozuru okè ọ pụrụ inweta dị ya mkpa.
Ihe Ụmụaka Pụrụ Ime
✔ Site n’enyemaka ndị mụrụ gị, tụpụta ihe mgbaru ọsọ mmụta na ụzọ isi ruo ha. Soro ndị nkụzi gị tụlee ihe mgbaru ọsọ ndị a.
✔ Site n’enyemaka ndị nkụzi na ndị mụrụ gị, jiri nlezianya họrọ ngalaba mmụta gị. Ngalaba mmụta ndị dị mfe a pụrụ isi na ha họrọ abụchaghị ndị kasị mma.
✔ Gbalịa iwulite mmekọrịta dị mma n’ebe ndị nkụzi gị nọ. Chọpụta ihe ha chọrọ n’aka gị. Soro ha tụlee ọganihu na nsogbu gị.
✔ Na-aṅa ntị nke ọma na klas. Abụla onye a dọbara n’àgwà nke ịkpaghasị ihe.
✔ Jiri amamihe họrọ ndị enyi gị. Ha pụrụ inyere gị aka ma ọ bụ gbochie ọganihu gị n’ụlọ akwụkwọ.
✔ Mee ihe omume ụlọ akwụkwọ n’ụlọ na ihe omume gị nke ọma ruo n’ókè ị pụrụ ime ha. Nye ha oge dị mma. Rịọ ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye ọzọ toruworo ogo mmadụ nke tozuru okè maka enyemaka ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa.
[Foto dị na peeji nke 20]
Jiri ùgwù ṅaa ntị ma ọ bụrụ na onye nkụzi emee mkpesa maka nwa gị
[Foto dị na peeji nke 21]
Jụọ nwa gị kwa ụbọchị banyere ụlọ akwụkwọ