Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Soro Jehova Na-akpachi Anya
    Ụlọ Nche—2000 | Jenụwarị 15
    • Eze ahụ maara ihe gara n’ihu, na-sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.”—Ilu 3:5, 6.

  • Soro Jehova Na-akpachi Anya
    Ụlọ Nche—2000 | Jenụwarị 15
    • Olee otú anyị pụrụ isi ‘mara Jehova n’ụzọ anyị nile’? Ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ na-asị: “M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Abụ Ọma 77:12) Ebe ọ bụ na a pụghị ịhụ Chineke anya, ịtụgharị uche n’oké ọrụ ya nakwa ná mmeso ọ na-emeso ndị ya dị mkpa iji soro ya na-akpachi anya.

      Ekpere bụkwa ụzọ dị mkpa isi mara Jehova. Eze Devid nọgidere na-akpọku Jehova “ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 86:3) Devid ji ogologo abalị nile kpee ekpere mgbe mgbe, dị ka mgbe ọ gbagara n’ọzara. (Abụ Ọma 63:6, 7) “Na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime Mmụọ Nsọ,” ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ. (Ndị Efesọs 6:18) Ugboro ole ka anyị na-ekpe ekpere? Ọ̀ na-atọ anyị ụtọ isoro Chineke na-enwe nkwurịta okwu sitere n’ezi obi? Mgbe ọnọdụ ndị siri ike chere anyị ihu, ànyị na-arịọ ya maka enyemaka? Ànyị na-eji ekpere achọ nduzi ya tupu anyị ana-eme mkpebi ndị dị mkpa? Ekpere anyị ji ezi obi na-ekpegara Jehova na-eme ka ọ hụ anyị n’anya. Anyị nwekwara obi ike na ọ ga-anụ ekpere anyị ma ‘mee ka okporo ụzọ anyị nile zie ezi.’

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya