Chineke Ọ̀ Na-arụ Ọrụ n’Ụzọ Ndị “Gbagọrọ Agbagọ”?
“DEUS ESCREVE CERTO POR LINHAS TORTAS” (“CHINEKE NA-EDE IHE n’ụzọ ziri ezi n’ahịrị ndị gbagọrọ agbagọ”) bụ okwu a na-ekwu na Brazil. Ọ na-enye echiche na Chineke na-eme ihe ziri ezi mgbe dum ma mgbe ụfọdụ n’ụzọ na-eyi ka ọ gbagọrọ agbagọ n’anya mmadụ. Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ nwụrụ n’uju nke ndụ ya, ọtụtụ ndị na-asị, ‘Chineke kpọgara ya n’eluigwe.’ Ọ bụrụ na mmadụ enwee nkwarụ ma ọ bụ chee ọdachi ihu, ụfọdụ na-asị, ‘Ọ bụ uche Chineke.’ Ebe ọ bụ na a na-ata Chineke ụta maka ọnwụ, nsogbu anụ ahụ, na ihe ndị ọzọ na-akpata iru újú, okwu ndị dị otú ahụ na-enye nnọọ echiche na Chineke ‘na-ede ihe n’ụzọ gbagọrọ agbagọ,’ na ọ na-eme ihe n’ụzọ mmadụ na-apụghị ịghọta.
Gịnị mere ọtụtụ ndị okpukpe ji kwere na ọ bụ Chineke na-akpata ọnwụ na ihe isi ike? Nkwenkwe ndị a na-adaberekarị ná nghọtahie e nwere banyere akụkụ Bible ụfọdụ ndị dịsasịrị adịsasị. Ka anyị lebatụ anya n’ole na ole n’ime ha.
● “Ònye na-eme mmadụ ka ọ bụrụ onye ogbi, ma ọ bụ onye ntị chiri, ma ọ bụ onye na-ahụ ụzọ, ma ọ bụ onye ìsì? Ọ́ bụghị Mụ onwe m, bụ́ Jehova?”—Ọpụpụ 4:11.
Nke a ọ̀ pụtara na a ga-ata Chineke ụta maka ndị nile nwere ụdị nkwarụ dị iche iche? Ee e. Nke a agaghị ekwekọ n’àgwà Chineke. Bible na-agwa anyị, sị: “Ihe nile ọ bụla Chineke kere dị mma.” (1 Timoti 4:4) A gaghị ata ya ụta ma ọ bụrụ na a mụrụ mmadụ dị ka onye ìsì, onye ogbi, ma ọ bụ onye ntị chiri. Ọ bụ nanị ihe dị mma ka ọ chọrọ ka ihe o kere eke nweta, n’ihi na ọ bụ Isi Iyi nke “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.”—Jemes 1:17.
Ọ bụ nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụụrụ Chineke isi site ná nhọrọ ha mere ma tụfuo izu okè ha nakwa ikike ha nwere ịmụta ụmụ zuru okè. (Jenesis 3:1-6, 16, 19; Job 14:4) Ka ụmụ ha lụrụ di na nwunye ma mụta ụmụ, ezughị okè ka ukwuu, gụnyere nkwarụ, malitere ịpụta ìhè n’etiti ụmụ mmadụ. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Jehova Chineke kpatara nke a, o kwewo ka ọ na-eme. N’ihi ya, ọ pụrụ ikwu banyere onwe ya dị ka onye “na-eme” mmadụ ka ọ bụrụ onye ogbi, onye ntị chiri, na onye ìsì.
● “Ihe nke gbagọrọ agbagọ, a pụghị ime ka ọ dịzie.”—Eklisiastis 1:15.
Ọ̀ bụ Chineke mere ka ihe gbagọọ agbagọ? O doro anya na ọ bụghị ya. Eklisiastis 7:29 na-asị: “Chineke mere mmadụ ka o zie ezie; ma ha onwe ha achọpụtawo ọtụtụ ihe e chepụtara.” Akwụkwọ bụ́ Contemporary English Version si otú a chịkọta amaokwu a: “Anyị zichara nnọọ ezi mgbe Chineke kere anyị, ma ugbu a anyị nwere uche gbagọrọ agbagọ.” Kama ịnọgide n’ụkpụrụ ezi omume Chineke, n’akụkụ ka ukwuu, ndị ikom na ndị inyom ejiriwo ọchịchọ ha họrọ ịgbaso ụkpụrụ, atụmatụ, ma ọ bụ ụzọ nke aka ha—na-ewetara onwe ha mmerụ ahụ.—1 Timoti 2:14.
Ọzọkwa, dị ka Pọl onyeozi rịbara ama, n’ihi mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ, “e doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu.” (Ndị Rom 8:20) ‘A pụghịkwa ime ka ọnọdụ a dịzie’ site ná mgbalị ụmụ mmadụ. Nanị site ná ntinye aka Chineke ka a ga-ewepụ ihe mgbagọ na ihe efu nile dị n’ihe omume nke ụwa.
● “Lee ọrụ Chineke: n’ihi na ònye pụrụ ime ka ọ dịzie, bụ́ ihe O meworo ka ọ gbagọọ?”—Eklisiastis 7:13.
N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Eze Solomọn na-ajụ, sị: ‘Ònye n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ime ka ntụpọ na ezughị okè nke Chineke kwere ka ọ dịrị, dịzie?’ Ọ dịghị onye ọ bụ, n’ihi na ọ dị ihe mere Jehova Chineke ji kwere ka ihe ndị a na-eme.
Ya mere, Solomọn na-atụ aro, sị: “N’ụbọchị ọ dị mma gị nọọ n’ọdịmma, ma n’ụbọchị ọ dị njọ lee anya: ọbụna otu na nso ibe ya ka Chineke meworo ha, ka mmadụ wee ghara ịchọpụta ihe ọ bụla nke ga-adị mgbe ọ gasịrị.” (Eklisiastis 7:14) Mmadụ kwesịrị inwe ekele maka ụbọchị ihe dị mma ma gosi ekele ya site n’ime ihe ọma. O kwesịrị ile ụbọchị ọma anya dị ka onyinye sitere n’aka Chineke. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ụbọchị ahụ eweta ọdachi? Mmadụ ga-eme nke ọma ‘ile anya,’ ya bụ, ịmata, na Chineke ekwewo ka ọdachi ahụ mee. N’ihi gịnị ka o jiworo mee otú ahụ? Solomọn na-asị: “Ka mmadụ wee ghara ịchọpụta ihe ọ bụla nke ga-adị mgbe ọ gasịrị.” Gịnị ka nke a pụtara?
Eziokwu bụ́ na Chineke na-ekwe ka anyị nwee ma ọṅụ ma nsogbu na-echetara anyị na anyị apụghị ikwu ihe ọdịnihu ga-eweta. Ọdachi pụrụ ịdakwasị ma onye ezi omume ma onye ajọ omume. Ọ dịghị onye a gụpụrụ. Nke a kwesịrị ime ka anyị ghọta mkpa ọ dị ịdabere, ọ bụghị n’onwe anyị, kama n’ebe Chineke nọ, na-echeta na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịghọta ihe ụfọdụ ugbu a, anyị pụrụ ijide n’aka na mgbe ihe nile mezuworo, ihe Chineke kweworo ka o mee ga-abaworo ndị nile o metụtara uru.
Ihe ọ bụla o kwere ka ọ na-eme agaghị ewetara ndị obi ha ziri ezi mmerụ ahụ ebighị ebi ma ọlị. Pita onyeozi mere ka nke a doo anya mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ahụhụ na-adakwasị ndị kwere ekwe ibe ya n’oge ya, sị: “Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n’ebube ebighị ebi Ya n’ime Kraịst, mgbe unu hụworo ahụhụ nwa oge, Ya onwe ya ga-eme ka unu zuo okè, meekwa ka unu guzosie ike, meekwa ka unu dị ike, tọọkwa unu ntọala.”—1 Pita 5:10.
Oge Ime Ka Ihe Guzozie
Jehova na-enye anyị ume iji tachie obi n’ọnwụnwa ndị anyị na-enwe ugbu a. Ọ na-ekwekwa nkwa ime “ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5) Ee, ọ bụ nzube ya na Alaeze eluigwe ya ga-eweghachiri ndị nwere nkwarụ ahụ ike n’isi nso, hụkwa maka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. Ọchịchị ahụ ga-ewepụkwa onye ahụ nke ụzọ ya gbagọrọ agbagọ n’ezie—Setan bụ́ Ekwensu. (Jọn 5:28, 29; Ndị Rom 16:20; 1 Ndị Kọrint 15:26; 2 Pita 3:13) Lee ngọzi ọ ga-abụrụ ndị na-atụ egwu Chineke n’ụwa nile mgbe oge Chineke maka ime ka ihe guzozie ruru!
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 28]
Mgbe Job Na-anụ Maka Mfu Ya/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications