Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 8/15 p. 8-9
  • Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Kasị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Kasị Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nụrụ Ụtọ Ndụ
  • ‘Cheta Onye Kere Gị’
  • Ịṅụrị Ọṅụ ná Nká
  • “Ọrụ Mmadụ Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndụ Gị—gịnị Bụ Nzube ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Cheta Onye Okike Ukwu Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Eklisiastis
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 8/15 p. 8-9

Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Kasị Mma

N NA ahụ nọ n’ime ụlọ, n’elu àkwà, na-anwụ n’ihi ọrịa cancer. Nwa ya nwoke nọ n’ụlọ ọrụ, na-ehicha ngwá ọrụ ndị nna ya na-eji akwa nkà. Ka o ji ngwá ọrụ ndị ahụ n’aka, o chere echiche banyere ihe ndị dị ịtụnanya nna ya jiworo ha mepụta. Ọ bụ ezie na ụlọ ọrụ ahụ dịdebere ụlọ ha, ọ maara na ọ dịghị mgbe ọ bụla nna ya ga-abata ebe ahụ ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ọ ga-ejide ngwá ọrụ ndị ahụ bụ́ ndị o nwere nnọọ nkà n’iji arụ ọrụ. Oge ahụ agafewo.

Nwa ya nwoke ahụ chere echiche banyere akụkụ akwụkwọ nsọ dị n’Eklisiastis 9:10: “Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW (ili)], ebe gị onwe gị na-ala.” Ọ maara akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ nke ọma. O jiriwo ya mee ihe ọtụtụ ugbo mgbe ọ na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible bụ́ na ọnwụ bụ ọnọdụ nke arụghị ọrụ. Ugbu a ịdị ike nke okwu Solomọn metụrụ ya n’obi—anyị kwesịrị ibi ndụ na-eju afọ ma ṅụrịa ọṅụ n’ụbọchị anyị mgbe anyị nwere ike n’ihi na oge ga-abịa mgbe anyị na-enwekwaghị ike ime otú ahụ.

Nụrụ Ụtọ Ndụ

N’akwụkwọ Eklisiastis nile, Eze Solomọn maara ihe na-agba ndị na-agụ akwụkwọ ya ume ịchọta obi ụtọ ná ndụ. Dị ka ihe atụ, isi nke 3, na-ekwu, sị: “Amawo m na ọ dịghị ezi ihe dịịrị [ndị mmadụ] ma ọ bụghị ka mmadụ ṅụrịa ọṅụ, meekwa ezi ihe n’ogologo ndụ ya. Ọzọkwa, mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.”—Eklisiastis 3:12, 13.

Chineke nyere Solomọn ike mmụọ nsọ ikwughachi echiche a: “Lee, ihe nke mụ onwe m hụworo na ọ bụ ezi ihe nke mara mma bụ ka mmadụ rie ihe, ka ọ ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ka ọ hụkwa ezi ihe n’ime ndọgbu ya nile nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ya n’okpuru anyanwụ, ọnụ ọgụgụ ụbọchị ndụ ya nke Chineke nyeworo ya: n’ihi na nke a bụ òkè ya.”—Eklisiastis 5:18.

N’otu aka ahụ, ọ na-agba ndị na-eto eto ume, sị: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa [ma ọ bụ, agbọghọbịa] ị bụ, jeekwa ije n’ụzọ nile nke obi gị, na n’ọhụhụ ụzọ nke anya gị abụọ.” (Eklisiastis 11:9a) Lee otú o si dị mma ịnụrụ ụtọ nke ikike na ume nke ntorobịa n’ụzọ zuru ezu!—Ilu 20:29.

‘Cheta Onye Kere Gị’

N’ezie, Solomọn adịghị ekwu na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchụso ihe nile pụrụ ịdọrọ obi ma ọ bụ anya anyị. (Tụlee 1 Jọn 2:16.) Nke a pụtara ìhè site n’ihe sochirinụ o dere: “Ma mara na n’ihi ihe ndị a nile [nchụso ndị pụrụ imeju ọchịchọ gị] Chineke ga-eme ka ị baa n’ikpe.” (Eklisiastis 11:9b) N’agbanyeghị afọ ndụ anyị, anyị kwesịrị icheta na Chineke na-ahụ ihe anyị ji ndụ anyị na-eme, ọ ga-ekpekwa anyị ikpe dị ka ha si dị.

Lee ihe nzuzu ọ bụ iche na anyị pụrụ ibi ndụ nanị maka onwe anyị ma na-eyigharị ịsọpụrụ Chineke ruo mgbe anyị mere agadi! Ndụ anyị pụrụ ịbịa ná njedebe mgbe ọ bụla. Ọbụna ọ bụrụ na o meghị otú ahụ, ijere Chineke ozi adịghị aka mfe n’agadi. N’ịmata eziokwu a, Solomọn dere, sị: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị, na mgbe afọ aka-abịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ.”—Eklisiastis 12:1.

Ịka nká na-akpa mmadụ aka ọjọọ. N’okwu ihe atụ, Solomọn kọwaziri mmetụta nke oge nká. Aka na ogwe aka na-ama jijiji, ụkwụ esikwaghị ike, eze afọdụkwa ole na ole. Agịrị isi achaa awọ ma na-adapụsị. Ụra emikwaghị emi nke na ube nnụnụ pụrụ ime ka mmadụ teta. Ikike ịmata ihe—ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, inwe mmetụta, ịnụ isisi, na ịnụ ụtọ—ha nile ebelata. Ahụ na-esikwaghị ike na-eduga n’egwu nke ịda ada na “ihe ụjọ” ndị ọzọ n’okporo ụzọ ọha na eze. N’ikpeazụ onye ahụ anwụọ.—Eklisiastis 12:2-7.

Nká na-akpata ihe ọjọọ karịsịa nye ndị daworo ‘n’icheta Onye kere ha’ n’oge ntorọbịa ha. N’ihi imefusị oge ndụ ya, onye dị otú ahụ ‘enwetaghị ihe ụtọ’ n’agadi. Ibi ndụ asọpụrụghị Chineke pụrụ itinye ihe ná nsogbu na ihe mgbu nke oge nká. (Ilu 5:3-11) N’ụzọ dị mwute, mgbe ha na-elepụ anya n’ihu, ndị dị otú ahụ adịghị ahụ ọdịnihu ọ bụla karịa ili.

Ịṅụrị Ọṅụ ná Nká

Nke a apụtaghị na ndị agadi apụghị ịnụ ụtọ ndụ. Na Bible, e jikọtakwara “ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ” na ngọzi Chineke. (Ilu 3:1, 2) Jehova gwara enyi ya bụ́ Abraham, sị: “Ma gị onwe gị . . . , a ga-eli gị n’ezi isi awọ.” (Jenesis 15:15) N’agbanyeghị ahụ erughị ala ndị a na-enwe ná nká, Abraham chọtara udo na ahụ dị jụụ n’oge agadi ya, na-eji afọ ojuju eleghachi anya azụ ná ndụ a raara nye Jehova. O jikwa okwukwe tụọ anya “obodo ahụ nke nwere ntọala,” bụ́ Alaeze Chineke. (Ndị Hibru 11:10) N’ihi ya, ọ nwụrụ ‘n’agadi, ndụ ya jukwara ya afọ.’—Jenesis 25:8.

Ya mere, Solomọn gbara ume, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa n’ime ha nile.” (Eklisiastis 11:8) Ma anyị bụ ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị agadi, e jikọtara ezi ọṅụ na mmekọrịta anyị na Chineke.

Ka nwa okorobịa ahụ nọ n’ụlọ ọrụ ahụ na-ewepụ ngwá ọrụ ikpeazụ nke nna ya, o chere echiche banyere ihe ndị a. O chere banyere ndị nile ọ maara bụ́ ndị gbalịrị iji ndụ ha mee ihe kasị mma ma bụrụ ndị na-enwetaghị obi ụtọ n’ihi na ha na Onye Okike ha enweghị mmekọrịta. Lee otú o si yie ihe dabara adaba na mgbe o nyesịrị agbamume ịṅụrị ọṅụ n’oge ndụ mmadụ, Solomọn chịkọtara okwu ahụ n’okwu ndị a: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile”!—Eklisiastis 12:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya