-
Isi Ihe Ndị Sitere n’Abụ nke AbụỤlọ Nche—2006 | Nọvemba 15
-
-
2:7; 3:5. Nwa agbọghọ ahụ si n’ime obodo enweghị mmasị ọ bụla ịlụ Solomọn. Ọ gbakwara ụmụ agbọghọ na-arụ n’obí eze iyi ka ha ghara ịnwa ime ka ya hụ onye ọ bụla ọzọ na-abụghị nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ n’anya. Ọ bụghị onye ọ bụla mmadụ hụrụ ka ọ ga-enwe mmasị ịlụ, o kwesịkwanụghị ịdị otú ahụ. Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nke na-achọ ịlụ kwesịrị ịchọ nanị ohu Jehova nke kwesịrị ntụkwasị obi.—1 Ndị Kọrint 7:39.
-