Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 1/1 p. 18-23
  • Iso Onye Okike Anyị Dị Ebube Na-azụ Atụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iso Onye Okike Anyị Dị Ebube Na-azụ Atụrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye So Jehova Na-azụ Atụrụ
  • Ịnụ Ụtọ “Udo nke Chineke”
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ nọ n’Okpuru Na-ebute Ụzọ!
  • Ọzụzụ Atụrụ n’Ụzọ Ọchịchị Chineke
  • Na-erubere Ndị Na-azụ Atụrụ Jehova Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Iji Ịdị Nro Na-azụ Atụrụ Jehova Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ọzụzụ Atụrụ, ‘Meenụ Ka Obi Unu Dị Obodobo’!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 1/1 p. 18-23

Iso Onye Okike Anyị Dị Ebube Na-azụ Atụrụ

“Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m. Ọ na-eweghachi mkpụrụ obi m: ọ na-edu m n’ụzọ nile nke ezi omume n’ihi aha ya.—ABỤ ỌMA 23:​1, 3.

1. Ume ndụ ịhụnanya dị aṅaa ka Jehova na-enye?

ABỤ ỌMA nke 23, “abụ ọma Devid,” ewetaworo ọtụtụ mkpụrụ obi ndị ike gwụrụ ume ndụ. Ọ gbawo ha ume inwe obi ike e kwupụtara n’amaokwu nke 6: “Nanị ịdịmma na ebere ga-agbaso m ụbọchị nile nke ndụ m: m ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị nile.” Nke ahụ ọ̀ bụ ọchịchọ gị, ibi mgbe nile n’ụlọ nke ofufe Jehova, soro ndị ya a na-achịkọbata ugbu a site ná mba nile nke ụwa dịrị n’otu? “Onye na-azụ mkpụrụ obi unu dị ka a na-azụ atụrụ, onye na-elekọtakwa ha anya,” bụ́ Onye Okike anyị Dị Ebube, Jehova Chineke, ga-enyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ ahụ.​—⁠1 Pita 2:25.

2, 3. (a) Olee otú Jehova si eji ịhụnanya na-azụ ndị ya dị ka atụrụ? (b) Olee otú “ìgwè atụrụ” Jehova siworo mụbaa n’ụzọ dị ịrịba ama?

2 Onye Okike nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” bụkwa Onye Nhazi na Onye Nlekọta Kasị Elu nke ọgbakọ ndị Kraịst, ‘ezinụlọ Chineke.’ (2 Pita 3:13; 1 Timoti 3:15) O nwere mmasị miri emi n’ịzụ ndị ya dị ka atụrụ, dị ka Aịsaịa 40:​10, 11 na-ekwu n’ụzọ doro anya: “Lee, Onyenwe anyị Jehova ga-abịa dị ka onye dị ike, ogwe aka ya ga na-achịkwara ya: lee, ọkwụkwụ ụgwọ ya dị n’aka ya, ụgwọ ọrụ ya dịkwa n’ihu ya. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya, n’ogwe aka ya ka ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi ya ka ọ ga-ekuru ha, ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.”

3 N’ụzọ a gbasapụrụ agbasapụ, “ìgwè atụrụ” nke a gụnyere ndị gaworo ije n’eziokwu ndị Kraịst ruo ogologo oge na “ụmụ atụrụ” ndị a chịkọtaworo n’oge ndị na-adịbeghị anya gara aga​—⁠dị ka ọnụ ọgụgụ ndị buru ibu a na-eme baptism ugbu a n’Africa na n’Ọwụwa Anyanwụ Europe. Ogwe aka Jehova siri ike, nke na-enye nchebe, na-achịkọta ha n’obi ya. Ọ bụ ezie na ha adịwo ka atụrụ ndị kpafuru akpafu, ugbu a ha abatawo ná mmekọrịta chiri anya nke ha na Chineke na Onye Ọzụzụ Atụrụ ha na-ahụ n’anya.

Onye So Jehova Na-azụ Atụrụ

4, 5. (a) Ònye bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ, oleekwa otú amụma si zoo aka n’ebe ọ nọ? (b) Ọrụ nkewa dị aṅaa ka Jisọs na-elekọta, na-arụpụtakwa ihe dị aṅaa pụtara ìhè?

4 Ka ọ na-eje ozi n’aka nri Nna ya n’eluigwe, “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, na-enyekwa “atụrụ” ahụ nlekọta ọmịiko. O nyere ndụ ya iji wetara nke mbụ “ìgwè atụrụ nta” nke ndị e tere mmanụ na e mesịakwa, taa, oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ, abamuru. (Luk 12:32; Jọn 10:​14, 16) Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ bụ́ Jehova Chineke, na-agwa atụrụ ndị a dum okwu, sị: “Lee, mụ, ọbụna mụ onwe m, ga-ekpekwa ikpe . . . n’etiti anụ na anụ. M ga-emekwa ka otu onye ọzụzụ atụrụ biliere ha, ọ ga-azụkwa ha, ọbụna ohu m, bụ́ Devid; ya onwe ya ga-azụ ha, ya onwe ya ga-abụkwara ha onye ọzụzụ atụrụ. Mụ onwe m, bụ́ Jehova, ga-abụkwara ha Chineke, ohu m, bụ́ Devid, ga-abụkwa onye isi n’etiti ha; mụ onwe m, bụ Jehova ekwuwo okwu.”​—⁠Ezikiel 34:​20-⁠24.

5 Okwu ahụ bụ “ohu m, bụ́ Devid” na-atụ aka n’ụzọ amụma n’ebe Kraịst Jisọs nọ, “mkpụrụ” ahụ nke na-eketa ocheeze Devid. (Abụ Ọma 89:​35, 36) N’ụbọchị a nke ikpe mba nile ikpe, Onye so Jehova Na-azụ Atụrụ bụrụkwa Eze, bụ́ Kraịst Jisọs, Nwa Devid, na-anọgide na-ekewapụta “atụrụ” nke ihe a kpọrọ mmadụ site ná ndị na-azọrọ na ha bụ “atụrụ” ma ha bụ “ewu” n’ezie. (Matiu 25:​31-⁠33) E welitekwara “otu onye ọzụzụ atụrụ” nke a inye atụrụ ahụ nri. Lee aha mmezu dị ebube nke amụma nke a nke anyị na-ahụ taa! Ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekwu banyere ime ka ihe a kpọrọ mmadụ dị n’otu site n’otu ndokwa ụwa ọhụrụ, otu Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ na-eme n’ezie ka atụrụ nke mba nile dị n’otu site n’ọrụ ịgba àmà n’ọtụtụ asụsụ dị ka nke ọ bụ nanị nzukọ Chineke dị n’elu ụwa pụrụ ịnwa itinye aka na ya.

6, 7. Olee otú “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” siworo hụ na a na-enye atụrụ ahụ ‘nri n’oge ya’?

6 Ka ozi Alaeze ahụ nọgidere na-agbasa n’ókèala ndị ọhụrụ, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke ndị Kraịst e tere mmanụ, dị ka otu Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ nyere ya ọrụ, na-ahụ na e mere ndokwa ọ bụla izipụ ‘nri n’oge ya.’ (Matiu 24:45) Ọtụtụ n’ime 33 alaka ụlọ ọrụ ndị na-ebi akwụkwọ nke Watch Tower Society gburugburu ụwa na-ewelitekwu ọrụ ha iji mejuo ọchịchọ na-arị elu maka akwụkwọ ọgụgụ na magazin ndị na-akọwa Bible bụ́ ndị ka mma.

7 Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji meziwanye ọdịdị nke nsụgharị n’ihe dị ka 200 asụsụ na ịmalite nsụgharị n’asụsụ ndị ọzọ dị mkpa iji jezuo ubi dum nke ụwa. Nke a bụ ná nkwado nke ọrụ Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya n’Ọrụ Ndị Ozi 1:8: “Unu ga-anata ike, mgbe mmụọ nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Ọzọkwa, New World Translation of the Holy Scriptures, nke e biworo n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ụfọdụ n’asụsụ 14 bụ nke a na-asụgharị ugbu a gaa n’asụsụ 16 ndị ọzọ nke Europe, Africa, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.

Ịnụ Ụtọ “Udo nke Chineke”

8. Olee otú e siworo gọzie atụrụ ahụ n’ụwa site n’ọgbụgba ndụ nke udo nke Jehova sowooro ha gbaa?

8 Site n’otu Onye Ọzụzụ Atụrụ Ya, bụ́ Kraịst Jisọs, Jehova so atụrụ ya a na-enye nri nke ọma na-agba “ọgbụgba ndụ udo.” (Aịsaịa 54:10) Site n’igosipụta okwukwe n’ọbara Jisọs a wụfuru, a na-enyere atụrụ ahụ aka ịga ije n’ìhè ahụ. (1 Jọn 1:7) Ha na-anụ ụtọ nke ‘udo nke Chineke nke kachasị uche nile na nke na-echekwa obi na echiche uche ha nche site na Kraịst Jisọs.’ (Ndị Filipaị 4:7) Dị ka Ezikiel 34:​25-⁠28 gara n’ihu ịkọwa, Jehova na-eduru atụrụ ya gaa na paradaịs ime mmụọ, ọnọdụ obi ụtọ nke ịnọ ná ntụkwasị obi, ọganihu na-enye ume ndụ, na ịmịpụta mkpụrụ. Onye Ọzụzụ Atụrụ nke a na-ahụ n’anya na-ekwu banyere atụrụ ya, sị: “Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Jehova, mgbe m tijiworo mkpọrọ nile nke yoke ha, napụta ha n’aka ndị mere ha ka ha fee ha ofufe. Ha agaghị abụkwara mba nile ihe nlụta n’agha ọzọ, . . . ma ha ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.”

9. Ohere ndị dị aṅaa ka e meghewooro ndị Chineke site ‘n’itijisị mkpọrọ nile’?

9 Ka ọ dị ugbu a, n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ mba enwewo ahụmahụ nke itijisị “mkpọrọ nile nke yoke ha.” Ha nweere onwe ha ime nkwusa dị ka ha na-emebeghị mgbe ọ bụla ọzọ. Ka anyị nile kwa, n’ala ọ bụla, jiri ọnọdụ enweghị onye na-akpata ịma jijiji nke Jehova na-enye mee ihe nke ọma ka anyị na-aga n’ihu ịrụzu ọrụ ahụ. Lee aha obi ike Jehova na-enye anyị ka anyị na-eru nso oge mkpagbu kasị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta!​—⁠Daniel 12:1; Matiu 24:​21, 22.

10. Ònye ka Jehova wepụtaworo iji nyere Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, aka, oleekwa otú Pọl onyeozi siri gwa ụfọdụ n’ime ndị a okwu?

10 Ná nkwadebe maka ụbọchị ahụ nke ọnụma megide ndị ọjọọ, Jehova emewo ka e nwee ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru inyere Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, Kraịst Jisọs, aka n’ilekọta ìgwè atụrụ ahụ. A kọwara ndị a ná Mkpughe 1:16 dị ka ọnụ ọgụgụ zuru ezu bụ́ “kpakpando asaa” n’aka nri Jisọs. Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi gwara ìgwè nnọchianya nke ndị ọzụzụ atụrụ a nọ n’okpuru okwu, sị: “Na-ezenụ onwe unu na ìgwè atụrụ nta nile, nke mmụọ nsọ mere unu ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya, ka unu na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ, nke o ji ọbara nke [“Ọkpara,” NW] ya zụtara onwe ya.” (Ọrụ 20:28) Taa, e nwere ọtụtụ iri puku ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru na-eje ozi na 69,558 ọgbakọ gburugburu ụwa.

Ndị Ọzụzụ Atụrụ nọ n’Okpuru Na-ebute Ụzọ!

11. Olee otú ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ siworo nwee ihe ịga nke ọma n’ibute ụzọ n’ókèala ndị a na-ejezu ozi na ha mgbe mgbe?

11 N’ebe dị iche iche ndị ọzụzụ atụrụ a aghaghị ibute ụzọ n’ókèala ndị a rụzuworo ọrụ na ha ugboro ugboro ná mgbe ikpeazụ ndị a. Olee otú ha ga-esi mee ka ịnụ ọkụ n’obi nke ìgwè atụrụ ahụ dịrị elu? Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-arụ nnọọ ọrụ kwesịrị ịja mma, otu ụzọ ha siwokwara nwee ihe ịga nke ọma bụ site n’ịkpali ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka na nke oge nile. Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ n’onwe ha na-ekere òkè n’ozi a, ọbụnakwa ndị nkwusa na-enweghị ike ime otú ahụ egosipụtawo mmụọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, na-eji ọṅụ nke na-enye aka imeri enweghị mmasị n’ókèala ha na-eje ozi. (Abụ Ọma 100:2; 104:33, 34; Ndị Filipaị 4:​4, 5) Otú a, ka ihe ọjọọ na adịchaghị n’usoro na-erikpu ụwa, a na-akpọte ọtụtụ ndị yiri atụrụ gaa n’olileanya Alaeze ahụ.​—⁠Matiu 12:​18, 21; Ndị Rom 15:12.

12. Nsogbu dị aṅaa siri ike ka e nwere n’ubi ndị na-eto ngwa ngwa, oleekwa otú e si ahụ maka ndị a mgbe ụfọdụ?

12 Nsogbu ọzọ bụ na ọtụtụ mgbe a dịghị enwe ndị ọzụzụ atụrụ ruru eru zuru ezu ilekọta ìgwè atụrụ ahụ. N’ebe e nwere uto dị ngwa ngwa, dị ka n’Ọwụwa Anyanwụ Europe, e nwere ọtụtụ ọgbakọ ọhụrụ na-enweghị okenye ọ bụla a họpụtara ahọpụta ma ọlị. Atụrụ ahụ dị njikere na-ebu ibu ọrụ ahụ, ma ha enweghị nnọọ ahụmahụ, a chọkwara enyemaka iji zụọ atụrụ ahụ na-enubata n’ọgbakọ dị iche iche. N’ala ndị dị ka Brazil, Mexico, na Zaire, ebe uto dị nnọọ oké ngwa, a ghaghị iji Ndịàmà ka dị nnọọ ọhụrụ mee ihe n’ịhazi ozi ahụ na ịzụ ndị ọhụrụ ndị ọzọ. Ndị ọsụ ụzọ na-enye aka n’ụzọ mara mma, akụkụ a bụkwa nke ụmụnna ndị nwanyị pụrụ ịzụ ụmụnna ndị nwanyị ọhụrụ na ya. Jehova site ná mmụọ ya, na-agọzi ihe ndị a na-arụpụta. A nọgidere na-enwe mmụba.​—⁠Aịsaịa 54:​2, 3.

13. (a) Ebe owuwe ihe ubi ahụ buru ibu nke ukwuu, maka gịnị ka Ndịàmà nile kwesịrị ikpe ekpere? (b) Olee otú e si zaa ekpere nile nke ndị Chineke tupu na mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ?

13 N’ala ebe ndị e guzobeworo ọrụ nkwusa ahụ nke ọma, n’ala ebe ndị a ka wepụrụ ihe mgbochi ọhụrụ, na n’ókèala ndị a ka meghepụrụ ọhụrụ, okwu Jisọs ndị dị na Matiu 9:​37, 38 ka dị irè: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye Nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka o zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi ya.” Ọ dị anyị mkpa ikpekwa ekpere ka Jehova kpọlitekwuo ndị ọzụzụ atụrụ. O gosipụtawo na ya nwere ike ime nke a. Tupu na mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, ndị ọchịchị o kwuchaa ọgwụ yiri ndị Asiria obi ọjọọ nwara ikpochapụ Ndịàmà Jehova. Ma n’aziza nye ekpere ha, Jehova nụchara nzukọ ha, na-eme ya ka ọ bụrụ nke ọchịchị Chineke n’ezie, wee nyekwa “ndị ọzụzụ atụrụ” dị mkpa.a Nke a kwekọrọ n’amụma ahụ bụ́: “Mgbe Asiria ga-abata n’ala anyị, mgbe ọ ga-azọkwa ụkwụ n’ụlọ elu nile anyị, anyị ga-emekwa ka ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi mmadụ asatọ bilie imegide ya”​—⁠ọbụna ọnụ ọgụgụ ndị okenye raara onwe ha nye karịa ole a chọrọ inye nduzi.​—⁠Maịka 5:5.

14. Mkpa dị aṅaa doro anya ka e nwere ná nzukọ a, ọ̀ bụkwa agbamume dị aṅaa ka a na-enye ụmụnna ndị nwoke?

14 E nwere mkpa pụtara ìhè ka Ndịàmà nile raara onwe ha nye mee ihe iru eru maka ihe ùgwù ndị ọzọ. (1 Timoti 3:1) Ọnọdụ dịnụ dị ngwa. Ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-eru ọsọ ọsọ. Habakuk 2:3 na-asị: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: . . . ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” Ụmụnna, ùnu pụrụ ime ihe iji ruo eru maka ihe ùgwù ndị ọzọ n’ọrụ ịzụ atụrụ nke a​—⁠tupu ọgwụgwụ ahụ abịa?​—⁠Taịtọs 1:​6-⁠9.

Ọzụzụ Atụrụ n’Ụzọ Ọchịchị Chineke

15. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Jehova si eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke?

15 Iji kere òkè n’ụzọ zuru ezu ná mgbasawanye nke nzukọ Jehova, ọ dị ndị ya mkpa inwe ọdịdị ile anya nke ọchịchị Chineke. Olee otú ha pụrụ isi rụzuo nke a? Ọ dị mma, gịnị ka okwu ahụ bụ “n’ụzọ ọchịchị Chineke” pụtara? Akwụkwọ Webster’s New Twentieth Century Dictionary na-akọwa “ọchịchị Chineke” dị ka “ịchị mba site n’aka Chineke.” Ọ bụ n’echiche nke a ka “mba dị nsọ” nke ndị Jehova bụ nke ọchịchị Chineke. (1 Pita 2:9; Aịsaịa 33:22) Dị ka ndị òtù nke mba ọchịchị Chineke ahụ ma ọ bụ ndị na-esonyere ya, ezi ndị Kraịst aghaghị ibi ndụ ma jee ozi ná nrubeisi nye Okwu Chineke na ụkpụrụ ya nile.

16. N’ụzọ bụ isi, olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke?

16 Pọl onyeozi kọwara n’ụzọ doro anya otú ndị Kraịst kwesịrị isi na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke. Nke mbụ, ọ sịrị na ha ‘kwesịrị iyikwasị mmadụ ọhụrụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ A ghaghị ịkpụzi ọdịdị onye Kraịst ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke dị ka e setịpụrụ ha n’Okwu ya. Ọ ghaghị ịdị na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova na nye iwu Ya nile. Mgbe o nyesịrị ihe atụ otú a pụrụ isi mee nke a, Pọl gbara ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 4:24–5:⁠1) Dị ka ụmụ na-erube isi, anyị aghaghị iṅomi Chineke. Nke ahụ bụ ezi ọchịchị Chineke nọ n’ọrụ, na-egosi na ọ bụ Chineke na-achị anyị n’ezie!​—⁠Leekwa Ndị Kọlọsi 3:​10, 12-⁠14.

17, 18. (a) Àgwà dị aṅaa pụtara ìhè nke Chineke ka ndị Kraịst na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke na-eṅomi? (b) N’okwu ya ọ gwara Mosis, olee otú Jehova si mesie àgwà Ya bụ isi ike, ma ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Ọ gbakwụnyere?

17 Gịnị bụ àgwà bụ isi nke Chineke nke anyị kwesịrị iṅomi? Jọn onyeozi na-aza na 1 Jọn 4:8 mgbe ọ sịrị: “Chineke bụ ịhụnanya.” Amaokwu asatọ n’ihu, n’amaokwu nke 16, o kwughachiri ụkpụrụ a dị oké mkpa: “Chineke bụ ịhụnanya; onye na-anọgidekwa n’ịhụnanya, n’ime Chineke ka ọ na-anọgide, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.” Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, bụ́ Jehova, bụ ịhụnanya n’onwe ya. Ndị ọzụzụ atụrụ nke ọchịchị Chineke na-eṅomi ya site n’igosi ịhụnanya dị omimi maka atụrụ Jehova.​—⁠Tụlee 1 Jọn 3:16, 18; 4:7-⁠11.

18 Oké Onye Ọchịchị Chineke ahụ kpugheere Mosis onwe ya dị ka “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị; ọ na-ewere ajọ omume nke ndị bụ nna leta ụmụ ha, letakwa ụmụ ụmụ, leta ụmụ ụmụ nke atọ, letakwa nke anọ.” (Ọpụpụ 34:​6, 7) Jehova si otú a mesie akụkụ dị iche iche nke àgwà bụ isi nke ọchịchị Chineke ya, bụ́ ịhụnanya, ike, ka ọ na-adọsi aka ná ntị ike na ya ga-enye ntaramahụhụ maka njehie mgbe ọ dịrị mkpa.

19. N’ụzọ dị iche n’ebe ndị Farisii nọ, olee otú ndị ọzụzụ atụrụ bụ ndị Kraịst kwesịrị isi mee ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke?

19 Maka ndị nwere ọnọdụ ibu ọrụ ná nzukọ, gịnị ka ime ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke pụtara? Jisọs kwuru banyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke ụbọchị ya, sị: “Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu, tụkwasị ha n’ubu mmadụ; ma ha onwe ha achọghị iji otu mkpịsị aka ha wezụga ha.” (Matiu 23:4) Lee ka o si bụrụ ihe mmegbu na nke enweghị ịhụnanya! Ezi ọchịchị Chineke, ma ọ bụ ịchịisi Chineke, na-achọ ka a zụọ ìgwè atụrụ ahụ site n’itinye ụkpụrụ ịhụnanya nile nke Bible n’ọrụ, ọ bụghị site n’ibogbu atụrụ ahụ usoro iwu na-adịghị agwụ agwụ bụ́ ndị mmadụ mebere. (Tụlee Matiu 15:​1-⁠9.) N’otu oge ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ nke ọchịchị Chineke aghaghị iṅomi Chineke site n’ịtụkwasị n’ịhụnanya ha nkwụsi ike maka ijigide ịdị ọcha nke ọgbakọ.​—⁠Tụlee Ndị Rom 2:11; 1 Pita 1:17.

20. Ndokwa nhazi dị aṅaa ka ndị ọzụzụ atụrụ na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke mataworo?

20 Ezi ndị ọzụzụ atụrụ maara na n’oge mgbe ikpeazụ ndị a, Jisọs ahọpụtawo ohu ya kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche n’elu ihe nile o nwere nakwa na mmụọ nsọ eduziwo ohu a n’ịhọpụta ndị okenye maka ịzụ atụrụ ndị ahụ. (Matiu 24:​3, 47; Ọrụ 20:28) Ya mere, ime ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke gụnyere inwe nkwanye ùgwù miri emi maka ohu a, maka ndokwa nile nke nhazi nke ohu ahụ guzobeworo, nakwa maka ndokwa inwe ndị okenye n’ime ọgbakọ.​—⁠Ndị Hibru 13:​7, 17.

21. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru?

21 Jisọs n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya ọma, na-elegara Jehova na Okwu Ya anya mgbe nile maka nduzi. Ọ sịrị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m: dị ka m na-anụ m na-ekpe: ikpe m zikwara ezi; n’ihi na etughị m ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe onye zitere m na-achọ.” (Jọn 5:30) Ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwesịrị ịzụlite àgwà obi umeala yiri nke ahụ. Ọ bụrụ na onye okenye na-elegara Okwu Chineke anya mgbe nile maka nduzi, dị ka Jisọs mere, mgbe ahụ ọ na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke n’ezie.​—⁠Matiu 4:​1-⁠11; Jọn 6:38.

22. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ nile kwesịrị isi gbalịsie ike ime ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke? (b) Ọkpụkpọ òkù obi ọma dị aṅaa ka Jisọs na-akpọ atụrụ ahụ?

22 Ndị ikom e mere baptism, meenụ ihe iji ruo eru maka ihe ùgwù dị iche iche n’ime ọgbakọ! Unu nile bụ atụrụ a hụrụ n’anya, zubesienụ ike ime ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke, na-eṅomi Chineke na Kraịst n’igosipụta ịhụnanya! Ka ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ahụ kwa ṅụrịa ọṅụ n’ihi na ha anarawo ọkpụkpọ òkù Jisọs, bụ́: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”​—⁠Matiu 11:​28-⁠30.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Lee isiokwu ndị a kpọrọ “Nhazi,” ná mbipụta Ụlọ Nche [Bekee] ndị nke June 1 na 15, 1938.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Gịnị bụ “ìgwè atụrụ” Jehova, ole ndị kwa ka ọ gụnyere?

◻ Olee otú Jisọs si mee ihe dị ka “onye ọzụzụ atụrụ ọma” na narị afọ mbụ, nakwa taa?

◻ Òkè bụ isi dị aṅaa ka ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru na-ekere n’ilekọta ìgwè atụrụ ahụ?

◻ Gịnị bụ isi ihe okwu ahụ bụ “ọchịchị Chineke” pụtara?

◻ Olee otú onye Kraịst​—⁠karịsịa onye ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru​—⁠kwesịrị isi mee ihe iji bụrụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke?

[Foto dị na peeji nke 20]

Dị ka onye ọzụzụ atụrụ nyefere onwe ya n’ọrụ, Jehova na-elekọta ìgwè atụrụ ya

[Foto dị na peeji nke 23]

Iṅomi àgwà ịhụnanya nke Jehova Chineke bụ ọchịchị Chineke nọ n’ọrụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya