-
Ị Ga-abụli Enyi JehovaNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
6. Ihe Jehova na-emere ndị enyi ya
Jehova na-enyere ndị enyi ya aka idi nsogbu dị iche iche. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú Jehova si nyere nwaanyị anyị lere na vidio a aka ka obi kwụsị ịna-ajọ ya njọ?
Gụọnụ Aịzaya 41:10, 13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jehova kwere nkwa na ọ ga-emere ndị enyi ya niile?
Ì chere na Jehova ga-abụli ezigbo Enyi mmadụ? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
Ezigbo enyi na-enyere enyi ya aka. Jehova ga-enyekwara gị aka
-
-
Olee Otú Ị Ga-esi Na-ekwusa Ozi Ọma?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
3. Jehova ga-enyere gị aka
E nwere ụfọdụ ndị ikwusa ozi ọma na-agụ agụụ, ma otú ndị mmadụ ga-esi na-ele ha anya na ihe ndị mmadụ nwere ike ime na-atụ ha ụjọ.
Ụjọ ọ̀ na-atụ gị ịgwa ndị ọzọ gbasara ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl? Gịnị mere ụjọ ji atụ gị, ma ọ bụ gịnị mere ụjọ anaghị atụ gị?
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú nwa okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị a bụ́ Ndịàmà Jehova si kwụsị ịtụ ụjọ ikwusa ozi ọma?
Gụọnụ Aịzaya 41:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ekpere ga-esi nyere gị aka ma ụjọ ikwusa ozi ọma tụwa gị?
Ị̀ ma ihe a?
E nwere mgbe ọtụtụ ndị bụ́ Ndịàmà Jehova ugbu a chere na ha agaghị ezili ndị ọzọ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, Sergey na-ele onwe ya anya ka onye na-abaghị uru, n’ihi ya, ịgwa ndị ọzọ okwu na-esiri ya ike. Ma, ọ bịara mụwa Baịbụl. Ọ sịrị: “M malitere ịgwa ndị ọzọ ihe ndị m na-amụta n’agbanyeghị na ụjọ na-atụ m. O juru m anya na ịkọrọ ndị ọzọ ihe m na-amụta na Baịbụl mere ka ịgwa ndị ọzọ okwu kwụsị ịna-esiri m ike. O mekwara ka ihe ọhụrụ ndị ahụ m na-amụta bamikwuo m n’obi.”
-
-
Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
6. Nabata aka Jehova na-enyere anyị
Jehova ga-enyere gị aka ịna-eme ihe dị ya mma. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Na vidio a anyị lere, gịnị mere na onye ahụ Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl emeghị baptizim ozugbo?
Olee ihe ọ mụtara nke nyeere ya aka ịnabata aka Jehova na-enyere ya?
Gụọnụ Aịzaya 41:10, 13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ike na ị ga-emezuli nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị?
-