Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ime Ka A Mata Ụdị Onye Ozi Bụ nke Ọma Ya
    Ụlọ Nche—1997 | Mee 1
    • 7, 8. Ozi dị aṅaa sitere n’ike mmụọ nsọ ka Aịsaịa nwere maka Babilọn, gịnịkwa ka okwu ya pụtara?

      7 A gaje ime ka Juda na Jerusalem tọgbọrọ n’efu, n’enweghị mmadụ ga-ebi na ha, ruo afọ 70. Otú ọ dị, Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa na Ezikiel na a ga-ewughachi obodo ahụ, a ga-ebikwa n’ala ahụ kpọmkwem n’oge o buworo n’amụma! Nke a bụ amụma dị ịtụnanya. N’ihi gịnị? N’ihi na a ma Babilọn ama dị ka ndị na-adịghị atọhapụ ndị mkpọrọ ya ma ọlị. (Aịsaịa 14:4, 15-17) Ya mere ònye nwere ike ịtọhapụ ndị a a dọọrọ n’agha? Ònye pụrụ imeri Babilọn dị ike, tinyere mgbidi ukwu na usoro nchebe nke osimiri ya nyere? Jehova Pụrụ Ime Ihe Nile pụrụ ime ya! O kwukwara na ya ga-eme ya, sị: “Abụ m . . . Onye ahụ Nke na-asị ogbu mmiri [ya bụ, nchebe nke mmiri na-enye obodo ahụ], Takọọ; osimiri gị nile ka M ga-emekwa ka ha tachasịa: Onye ahụ Nke na-ekwu okwu banyere Saịrọs, sị, Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka ọ ga-emezukwa: ọbụna n’ikwu okwu banyere Jerusalem, sị, A ga-ewu ya; na n’ịsị ụlọ ukwu Chineke, A ga-atọ ntọala gị.”—Aịsaịa 44:25, 27, 28.

      8 Cheedị banyere nke ahụ! Osimiri Yufretis, bụ́ ihe mgbochi siri ike nye ndị mmadụ, yiri otu ntapụ mmiri n’elu ebe dị oké ọkụ nye Jehova. Fịam, ihe mgbochi ahụ ga-apụ n’anya! Babilọn ga-ada. N’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị ka afọ 150 tupu ọmụmụ Saịrọs onye Peasia, Jehova mere ka Aịsaịa buo amụma banyere mmeri eze a ga-emeri Babilọn na ntọhapụ nke ndị Juu a dọọrọ n’agha site na ya inye ikike ka ha lọta iji wughachi Jerusalem na ụlọ nsọ ya.

  • Ime Ka A Mata Ụdị Onye Ozi Bụ nke Ọma Ya
    Ụlọ Nche—1997 | Mee 1
    • 11. N’ihi gịnị ka ndị bi na Babilọn ji chee na ha nọ ná nchebe?

      11 N’oge Saịrọs wakwasịrị Babilọn, ụmụ amaala ya chere na egwu adịghị, na ha nọ nnọọ ná nchebe. Ekpé dị omimi ma saa mbara nke na-enye nchebe, nke Osimiri Yufretis mere, gbara obodo ha gburugburu. N’ebe osimiri ahụ gafere n’obodo ahụ, e nwere ebe ụgbọ mmiri na-akwụsị n’ogologo ụsọ osimiri ahụ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Iji kewapụ ya n’obodo ahụ, Nebukadneza wuru ihe ọ kpọrọ “mgbidi ukwu, nke dị ka ugwu, bụ ihe a [na-apụghị] iwepụ ewepụ . . . Elu ya ka [o] weliri nke ukwuu.”a Mgbidi a nwere ọnụ ụzọ ámá ndị nwere akatamkpo ibo ọnụ ụzọ ọla. Iji banye ha, mmadụ aghaghị ịrịgo site n’isi isi nke osimiri ahụ. Ka a sịkwa ihe mere na ndị mkpọrọ Babilọn enweghị olileanya nke ịbụ ndị a tọhapụrụ mgbe ọ bụla!

      12, 13. Olee otú okwu Jehova kwuru site n’ọnụ onye ozi ya bụ́ Aịsaịa si mezuo mgbe Babilọn dara n’aka Saịrọs?

      12 Ma ọ bụghị ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha bụ́ ndị nwere okwukwe na Jehova! Ha nwere olileanya na-egbukepụ egbukepụ. Site ná ndị amụma ya, Chineke ekwewo nkwa ịtọhapụ ha. Olee otú Chineke si mezuo nkwa ya? Saịrọs nyere ndị agha ya iwu ichigharị Osimiri Yufretis ihu gaa n’ebe dị ọtụtụ kilomita n’ebe ugwu nke Babilọn. N’ụzọ dị otú ahụ, a gbanwere isi nchebe nke obodo ahụ ịghọ ala osimiri fọrọ nke nta ka ọ takọọ atakọ. N’abalị oké mgbanwe ahụ, ndị ahụ nọ n’oriri oké mkpọtụ nke aṅụrụma na Babilọn ji akpachapụghị anya hapụ ibo ọnụ ụzọ abụọ ahụ dị n’ọnụ mmiri nke Yufretis ka ha ghere oghe. Jehova etirisighị ibo ọnụ ụzọ ọla ahụ n’ụzọ nkịtị; o gbutughịkwa ihe ntụchi ígwè ndị ahụ nke mechiri ha, ma ụzọ iji nkà eme ihe ya dị ebube ịhapụ ha ka ha ghere oghe ma ghara ịkpọchi ha nwere otu mmetụta ahụ. Mgbidi nile nke Babilọn abaghị uru. Ọ dịghị ndị agha Saịrọs mkpa ịrịfe ha iji banye n’ime. Jehova bu Saịrọs ụzọ jee, na-ewepụ “mkputamkpu ebe nile,” ee, ihe mgbochi nile. A nwapụtara Aịsaịa ịbụ ezi onye ozi Chineke.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya