-
‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’Ụlọ Nche—2011 | Disemba 1
-
-
Ọ BỤRỤ na a sị gị jiri otu mkpụrụ okwu kọwaa ụdị onye Jehova Chineke bụ, olee okwu ị ga-eji akọwa ya? Ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga, Aịzaya onye amụma hụrụ ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, ọ nụrụ ka ndị mmụọ ozi nọ na-eto Jehova, okwu ha ji na-eto ya gosiri otu n’ime ihe e ji mara Jehova, ya bụ, na ọ dị nsọ. Ihe ahụ Aịzaya hụrụ na ihe ọ nụrụ kwesịrị ime ka anyị tụọ egwu Jehova ma bịarukwuo ya nso. Ka anyị na-eleba anya n’ihe e dere n’Aịzaya 6:1-3, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ na-eme.
-
-
‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’Ụlọ Nche—2011 | Disemba 1
-
-
Aịzaya hụziri ihe o nwere ike ịbụ na mmadụ ọzọ ahụtụbeghị n’ọhụụ. O dere, sị: “Ndị seraf guzo n’elu [Jehova]. Nke ọ bụla nwere nku isii. Ọ na-eji abụọ ekpuchi ihu ya, jiri abụọ na-ekpuchi ụkwụ ya, jirikwa abụọ na-efegharị.” (Amaokwu nke 2) Ndị seraf bụ ndị mmụọ ozi ọkwá ha dị nnọọ elu. Ọ bụ naanị Aịzaya bụ onye kwuru banyere ndị seraf na Baịbụl. Ndị seraf guzo n’ihu Jehova mgbe niile ma dị njikere ime ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka ha mee. Ha ji nku ha kpuchie ihu ha na ụkwụ ha, nke gosiri na ha na-akwanyere Jehova ùgwù ma na-asọpụrụ ya, bụ́ Onye ha nọ n’ihu ya na-eje ozi.
-