Ịhụnanya nke Siri Ike Karịa nke Nne
NDỊ nne na-agbahapụ ụmụ ndị ha mụrụ ọhụrụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ndị na-agba n’okpuru ala, n’ụlọ mposi ọha, ma ọ bụ n’okporo ámá ndị na-ekwo ekwo. Mgbe ụfọdụ, ndị na-ekpofu ahịhịa achọtawo ọbụna ụmụ ọhụrụ ndị ike ibe ákwá gwụrụla, n’ime kom kom ndị dị ebe a na-ekpofu ahịhịa. Dị ka O Estado de S. Paulo si kwuo, “ụmụ ọhụrụ ndị a na-agbahapụ n’okporo ámá na-arị elu.” N’ezie, nne ahụ na-eto eto pụrụ ịkwa mmakwaara banyere mkpebi ya n’ikpeazụ. Ma, ọ na-agbahapụ nwa ya, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ime ka nwa ya nwụọ.
Ị pụrụ ịjụ sị, ‘Olee otú onye bụ́ nne pụrụ isi chetụdị echiche ịgbahapụ nwa ya nye ọdịnihu a na-ejighị n’aka?’ Bible na-eji ụdị ọnọdụ ahụ dị mwute eme ihe dị ka okwu myirịta iji gosi otú mmetụta Onye Okike anyị nwere n’ebe ndị ya nọ si pụọ iche nke ukwuu: “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ nwa afọ ya? ee, eleghị anya ndị a ga-echezọ, ma Mụ onwe m agaghị echezọ gị.”—Aịsaịa 49:15.
N’ezie, karịa nne ọ bụla bụ́ mmadụ, Chineke nwere ịhụnanya miri emi n’ebe anyị nọ ma na-egosi mmetụta n’ebe mkpa anyị dị. Ma ị̀ bụ onye na-eto eto ma ọ bụ okenye, n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla ị pụrụ iche ihu, ị nọghị nanị gị. Onye Okike gị na-achọ inyere gị aka, o nwekwara mmasị n’ọdịmma gị. N’ikwu ya dị ka ọbụ abụ ahụ si kwuo, “n’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.”—Abụ Ọma 27:10.
N’ụwa nile, a na-ebipụta magazin Ụlọ Nche na Teta! iji nye ihe ọmụma nke “ezi Chineke,” bụ́ Jehova, na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ́ nke pụrụ iduba ndị ji obi ekele na-anabata ya ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.