Isi nke Iri na otu
“Atụkwasịla Obi n’Ahụ Ndị A Maara Aha Ha”
1, 2. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa sitere n’ike mmụọ nsọ ka ndị Juu na-aṅaghị ntị na ya, gịnịkwa si n’ime ya pụta? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji jụọ, sị: ‘Olee ebe akwụkwọ nkewa dị?’
“ATỤKWASỊLA obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. . . . Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya: Onye meworo eluigwe na ụwa.” (Abụ Ọma 146:3-6) A sị nnọọ na ndị Juu bi n’oge Aịsaịa ga-eme ihe ọbụ abụ ahụ dụrụ n’ọdụ! A sị nnọọ na ha ga-atụkwasị obi, ọ bụghị n’Ijipt ma ọ bụ ná mba ọ bụla ọzọ na-ekpere arụsị, kama na “Chineke nke Jekọb”! Mgbe ahụ, mgbe ndị iro Juda bịakwasịrị ya, Jehova ga-eme ihe iji chebe ya. Otú ọ dị, Juda ajụwo ichigharịkwuru Jehova maka enyemaka. N’ihi ya, Jehova ga-ekwe ka e bibie Jerusalem nakwa ka a dọrọ ndị bi na Juda n’agha gaa Babilọn.
2 Juda enweghị onye ọ ga-ata ụta ma ọ́ bụghị onwe ya. Ọ pụghị ikwu n’ụzọ ziri ezi na mbibi ya bịara n’ihi na Jehova mesoro ya omume n’ụzọ aghụghọ ma ọ bụ na o legharawo ọgbụgba ndụ ya na mba ahụ anya. Onye Okike abụghị onye na-emebi ọgbụgba ndụ. (Jeremaịa 31:32; Daniel 9:27; Mkpughe 15:4) Iji mesie eziokwu a ike, Jehova jụrụ ndị Juu, sị: “Olee ebe akwụkwọ nkewa nke nne unu dị, bụ́ nke M ji chụpụ ya?” (Aịsaịa 50:1a) N’Iwu Mosis, nwoke gbara nwunye ya alụkwaghịm aghaghị inye ya akwụkwọ nkewa. O nweziiri onwe ya ịghọ nke nwoke ọzọ. (Deuterọnọmi 24:1, 2) N’ụzọ ihe atụ, Jehova enyewo alaeze ya na Juda bụ nwanne, bụ́ Israel, akwụkwọ nkewa dị otú ahụ, ma o nyebeghị Juda.a Ọ ka bụ “di nwe” ya. (Jeremaịa 3:8, 14) N’ezie, Juda enwereghị onwe ya isoro mba ndị na-ekpere arụsị na-emekọrịta ihe. Mmekọrịta ya na Jehova ga-adịgide “ruo mgbe Shaịlo [Mesaịa ahụ] ga-abịa.”—Jenesis 49:10.
3. N’ihi gịnị ka Jehova ji ‘ree’ ndị ya?
3 Jehova na-ajụkwa Juda, sị: “Ònye n’ime ndị M naara ego n’ọmụrụ nwa ka M reworo unu n’aka ya?” (Aịsaịa 50:1b) A gaghị eziga ndị Juu ná ndọrọ n’agha na Babilọn iji kwụọ ụgwọ ọ pụrụ ịbụ na Jehova ji. Jehova adịghị ka onye Israel dara ogbenye nke na-aghaghị iresi onye o ji ụgwọ ụmụ ya iji kwụọ ụgwọ o ji. (Ọpụpụ 21:7) Kama nke ahụ, Jehova na-ezo aka n’isi ihe mere a ga-eji mee ka ndị ya bụrụ ohu, sị: “Lee, ọ bụ n’ihi ajọ omume nile nke unu ka e rere unu, ọ bụkwa n’ihi njehie nile nke unu ka a chụpụrụ nne unu.” (Aịsaịa 50:1ch) Ọ bụ ndị Juu bụ ndị gbahapụworo Jehova; ọ gbahapụbeghị ha.
4, 5. Olee otú Jehova si egosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe ndị ya nọ, ma olee otú Juda si zaghachi?
4 Ajụjụ Jehova jụziri na-eme ka ịhụnanya o nwere n’ebe ndị ya nọ pụta ìhè n’ụzọ doro anya: “Gịnị mere onye ọ bụla adịghị mgbe M bịara? gịnị mere onye ọzịza adịghị mgbe M kpọrọ òkù?” (Aịsaịa 50:2a) Site n’ọnụ ndị ohu ya bụ́ ndị amụma, Jehova abatawo n’ụlọ ndị ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ịrịọ ha ka ha jiri obi ha nile laghachikwute ya. Ma ha azaghị ya. Ndị Juu họọrọ ịdabere n’ebe ụmụ mmadụ nọ maka enyemaka, ọbụna na-echigharịkwuru Ijipt mgbe ụfọdụ.—Aịsaịa 30:2; 31:1-3; Jeremaịa 37:5-7.
5 Ijipt ọ̀ bụ onye nzọpụta a pụrụ ịtụkwasị obi karịa Jehova? O doro anya na ndị Juu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi echezọwo ihe omume ndị merenụ tupu a mụọ mba ha ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. Jehova na-ajụ ha, sị: “Ọ̀ bụ na aka m [dịkarịrị] mkpụmkpụ ma ọlị ịgbapụta? ma ọ bụ ọ́ dịghị ike dị n’ime m ịnapụta? Lee, n’ịbasi mba ike m ana m eme ka oké osimiri tasịa, ana m eme osimiri ka ha ghọọ ọzara: azụ̀ ha na-esi ísì, n’ihi na mmiri adịghị, wee nwụọ n’akpịrị ịkpọ nkụ. Eji m iji nji yikwasị eluigwe dị ka uwe, ọ bụkwa ákwà mkpe ka M na-eme ka ọ bụrụ ihe mgbokwasị ha.”—Aịsaịa 50:2b, 3.
6, 7. Olee otú Jehova si gosipụta ike nzọpụta ya n’agbanyeghị iyi egwu nke ndị Ijipt?
6 Na 1513 T.O.A., Ijipt bụ onye mmegbu—ọ bụghị onye mgbapụta ahụ a na-ele anya ya—nke ndị Chineke. Ndị Israel bụ ndị ohu n’ala ahụ na-ekpere arụsị. Ma Jehova gbapụtara ha, leekwa mgbapụta na-enye ọṅụ nke ahụ bụ! O bu ụzọ tie ala ahụ Ihe Otiti Iri. Mgbe ihe otiti nke iri ahụ kpatara oké mbibi gasịrị, Fero nke Ijipt gwasiri ndị Israel ike ka ha si ná mba ahụ pụọ. (Ọpụpụ 7:14–12:31) Otú ọ dị, ngwa ngwa ha mesịrị otú ahụ, Fero gbanwere obi ya. Ọ chịkọtara usuu ndị agha ya ma gawa ịmanye ndị Israel ịlaghachi n’Ijipt. (Ọpụpụ 14:5-9) N’inwe usuu ndị agha Ijipt n’azụ ha na Oké Osimiri Uhie n’ihu ha, ndị Israel tọrọ atọ! Ma Jehova nọ ya ịlụrụ ha agha.
7 Jehova kwụsịrị ndị Ijipt ịga n’ihu site n’itinye ogidi igwe ojii n’etiti ha na ndị Israel. N’akụkụ ogidi igwe ojii ahụ ebe ndị Ijipt nọ, ọchịchịrị gbara; n’akụkụ ebe ndị Israel nọ, ìhè dị. (Ọpụpụ 14:20) Mgbe ahụ, ebe e gbochiworo usuu ndị agha Ijipt, Jehova “wee were ifufe Ihu anyanwụ dị ike mee ka oké osimiri ahụ jee n’azụ n’abalị ahụ nile, O wee mee oké osimiri ahụ ka ọ bụrụ ala akọrọ.” (Ọpụpụ 14:21) Ozugbo e kewara mmiri ahụ, ndị ahụ nile—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụ ntakịrị—gafeliri Oké Osimiri Uhie ahụ n’enweghị nsogbu. Mgbe ndị ya gateworo aka ruo n’ikperé mmiri dị n’ofe nke ọzọ, Jehova wepụrụ igwe ojii ahụ. N’ịchụsosi ha ike, ndị Ijipt mabanyere n’ala mmiri ahụ. Mgbe ndị ya nọzi n’ikperé nke ọzọ nke mmiri ahụ n’enweghị nsogbu, Jehova tọhapụrụ mmiri ahụ, wee gbagbuo Fero na usuu ndị agha ya na mmiri. Jehova si otú a lụọrọ ndị ya agha. Lee ihe agbamume nke ahụ bụụrụ ndị Kraịst taa!—Ọpụpụ 14:23-28.
8. N’ihi ileghara ịdọ aka ná ntị dịgasị aṅaa anya ka ndị bi na Juda ji jee biri n’ala ọzọ n’ikpeazụ?
8 Ka ọ na-erule n’oge Aịsaịa, narị afọ asaa agafeela kemgbe Chineke nwesịrị mmeri ahụ. Juda bụ mba kwụụrụ onwe ya ugbu a. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eso ndị ọchịchị ala ọzọ, dị ka Asiria na Ijipt, enwe nkwekọrịta mba na mba. Ma a pụghị ịtụkwasị ndị ndú nke mba ndị a na-ekpere arụsị obi. Mgbe nile, ha ga-ebute ọdịmma onwe ha ụzọ tupu ọgbụgba ndụ ọ bụla ha na Juda gbara. N’ikwu okwu n’aha Jehova, ndị amụma dọrọ ndị ahụ aka ná ntị ka ha ghara ịtụkwasị ụmụ mmadụ dị otú ahụ obi, ma ihe ndị amụma ahụ kwuru abaghị ha ntị. N’ikpeazụ, a ga-eme ka ndị Juu jee biri na Babilọn ije nọọ afọ 70 n’ịbụ ohu. (Jeremaịa 25:11) Otú ọ dị, Jehova agaghị echezọ ndị ya, ọ gaghịkwa ajụ ha ruo mgbe ebighị ebi. N’oge a kara aka, ọ ga-echeta ha, ọ ga-emeghekwara ha ụzọ ịlaghachi n’ala nna ha iji weghachi ofufe dị ọcha. N’ihi nzube dị aṅaa? Iji kwadebe maka ọbịbịa nke Shaịlo, bụ́ onye ga-enwe ịṅa ntị nke ndị nile!
Shaịlo Abịa
9. Ònye bụ Shaịlo, ụdị onye ozizi dịkwa aṅaa ka ọ bụ?
9 Ọtụtụ narị afọ gafere. “Oge ahụ zuru,” onye ahụkwa a na-akpọ Shaịlo, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bịara n’ụwa. (Ndị Galetia 4:4; Ndị Hibru 1:1, 2) Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova ahọpụtawo onye ya na ya kasị nwee mmekọrịta chiri anya ịbụ Ọnụ Na-ekwuchitere ya nye ndị Juu na-egosi otú Jehova hụruru ndị ya n’anya. Ụdị onye na-ekwuchite ọnụ dị aṅaa ka Jisọs ghọrọ? Ụdị nke kasịnụ! Jisọs abụghị nanị onye na-ekwuchite ọnụ, ọ bụ onye ozizi—Onye Ọkà Ozizi. Nke ahụ abụghị ihe ijuanya, n’ihi na o nwere Onye Ozizi bụ́ ịgba—Jehova Chineke n’onwe ya. (Jọn 5:30; 6:45; 7:15, 16, 46; 8:26) Ihe Jisọs kwuru n’ụzọ amụma site n’ọnụ Aịsaịa kwadoro nke a: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta, ka m wee mara iwere okwu kwagide onye dara mbà: Ọ na-akpọte ntị m kwa ụtụtụ, Ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị mmụta.”—Aịsaịa 50:4.b
10. Olee otú Jisọs si egosipụta ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị Ya nọ, mmeghachi omume dịkwa aṅaa ka Jisọs nwetara?
10 Tupu ya abịa n’ụwa, Jisọs na-anọ n’akụkụ Nna ya arụ ọrụ n’eluigwe. A kọwara mmekọrịta ịhụnanya nke dị n’agbata Nna na Nwa ahụ n’ụzọ uri n’Ilu 8:30, sị: “Anọkwa m n’akụkụ [Jehova], dị ka onye ọkà, . . . na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile.” Ịṅa Nna ya ntị wetaara Jisọs ọṅụ dị ukwuu. O nwere ụdị ịhụnanya Nna ya nwere “n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Ilu 8:31) Mgbe ọ bịara n’ụwa, Jisọs ji “okwu kwagide onye dara mbà.” Ọ malitere ozi ya site n’ịgụ otu akụkụ ihe odide na-enye nkasi obi site n’amụma Aịsaịa: “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị n’ahụ m, n’ihi na O tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, . . . izipụ ndị e tihịaworo ahụ ka ha laa.” (Luk 4:18; Aịsaịa 61:1) Ozi ọma nye ndị ogbenye! Ume ọhụrụ nye ndị ike gwụrụ! Lee ọṅụ ịma ọkwa ahụ kwesịrị iwetara ndị ahụ! Ụfọdụ ṅụrịrị ọṅụ—ma ọ bụghị mmadụ nile. N’ikpeazụ, ọtụtụ jụrụ ịnakwere iru eru Jisọs dị ka onye Jehova ziri ihe.
11. Olee ndị na-anyara yoke Jisọs, gịnịkwa ka ha na-enweta?
11 Otú ọ dị, ụfọdụ chọrọ ịnụkwu. Ha ji obi ụtọ zaa òkù ịhụnanya Jisọs kpọrọ: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.” (Matiu 11:28, 29) Ndị ikom ghọrọ ndị ozi ya so ná ndị bịara Jisọs nso. Ha maara na ịnyara yoke Jisọs pụtara ha ịrụsi ọrụ ike. Ọrụ a na-agụnye, tinyere ihe ndị ọzọ, ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ruo n’ebe nile ụwa sọtụrụ. (Matiu 24:14) Ka ndị ozi ahụ na ndị ọzọ na-eso ụzọ tinyere onwe ha n’ọrụ a, ha hụrụ na ọ na-enye mkpụrụ obi ha ume ọhụrụ n’ezie. Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na-arụ otu ọrụ ahụ taa, ikerekwa òkè na ya na-ewetara ha ọṅụ yiri nke ahụ.
Ọ Dịghị Enupụ Isi
12. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jisọs si egosipụta nrubeisi ya nye Nna ya nke eluigwe?
12 Ọ dịghị mgbe Jisọs chezọrọ nzube o ji bịa n’ụwa—ime uche Chineke. E buru amụma banyere otú o si ele ihe anya, sị: “Onyenwe anyị Jehova emegheworo m ntị m, ma Mụ onwe m [enupụghị] isi, alaghachighị m azụ.” (Aịsaịa 50:5) Jisọs na-erubere Chineke isi mgbe nile. N’ezie, o kwuru ọbụna, sị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme.” (Jọn 5:19) N’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, ma eleghị anya Jisọs so Nna ya rụkọọ ọrụ ruo ọtụtụ nde, ọbụna ijeri, afọ. Mgbe ọ bịasịrị n’ụwa, ọ nọgidere na-agbaso ntụziaka Jehova. Lee ka o si kwesị ekwesị karị na anyị, bụ́ ụmụazụ na-ezughị okè nke Kraịst, na-elezi anya ime ihe Jehova na-atụzi!
13. Gịnị na-echere Jisọs, ma olee otú o si gosi na ya nwere obi ike?
13 Ụfọdụ n’ime ndị jụrụ Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya kpagburu ya, e bukwara nke a n’amụma: “Azụ m ka m nyere ndị oti ihe, ntị m abụọ ka m nyere ndị na-ekwopụ afụ ọnụ: ezopụghị m ihu m n’ọnọdụ ihere a na-etinye m na ọbụbụ ọnụ.” (Aịsaịa 50:6) Dị ka amụma ahụ si kwuo, Mesaịa ahụ ga-enweta ahụ ụfụ na mweda n’ala site n’aka ndị mmegide. Jisọs maara nke a. Ọ makwaara otú mkpagbu a ga-eru. Ma, ka oge ọ ga-anọ n’elu ala na-abịa ná njedebe, ọ tụghị egwu ọ bụla. N’inwe mkpebi siri ike ka ọmụ́, ọ gawara Jerusalem, bụ́ ebe ndụ ya dị ka mmadụ ga-abịa ná njedebe. Ka ha nọ n’ụzọ na-aga, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lee, anyị na-arịgoro Jerusalem; a ga-ararakwa Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ; ha ga-amakwa Ya ikpe ọnwụ, rara Ya nye n’aka ndị mba ọzọ: ha ga-emekwa Ya ihe ọchị, bụsa Ya ọnụ mmiri, pịa Ya ihe, gbuo Ya: Ọ ga-esikwa n’ọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” (Mak 10:33, 34) Ọ bụ ndị ikom kwesịrị ịma nke a na-akọ—ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, ga-akpali mmeso ọjọọ a nile.
14, 15. Olee otú e si mezuo ihe Aịsaịa kwuru na a ga-eti Jisọs ihe ma wedaa ya n’ala?
14 N’abalị nke Nisan 14, 33 O.A., Jisọs nọ n’ogige Getsemane ya na ụfọdụ n’ime ụmụazụ ya. Ọ nọ na-ekpe ekpere. Na mberede, ìgwè na-eme ihe ike bịara kpụrụ ya. Ma egwu atụghị ya. Ọ maara na Jehova nọnyeere ya. Jisọs mesiri ndị ozi ya egwu ji obi ike na ọ bụrụ na ya chọrọ, ya pụrụ ịrịọ Nna ya ka o zite ihe karịrị legion iri na abụọ nke ndị mmụọ ozi iji napụta ya, ma o kwukwasịrị: “Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ ga-esikwa aṅaa mezuo?”—Matiu 26:36, 47, 53, 54.
15 Ihe nile e buru n’amụma banyere ikpe a ga-ekpe Mesaịa ahụ na ọnwụ ya mezuru. Mgbe Sanhedrin ahụ kpesịrị ya ikpe aghụghọ, Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye kwuru ka a pịa ya ihe, kpere Jisọs ikpe. Ndị agha Rom ‘weere amị na-eti ya n’isi, na-abụsakwa Ya ọnụ mmiri.’ E si otú a mezuo ihe Aịsaịa kwuru. (Mak 14:65; 15:19; Matiu 26:67, 68) Ọ bụ ezie na Bible ekwughị na e kwopụrụ ụfọdụ afụ ọnụ Jisọs n’ụzọ nkịtị—omume na-egosi oké nlelị—ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a mere, dị nnọọ ka Aịsaịa buru n’amụma.c—Nehemaịa 13:25.
16. N’agbanyeghị nrụgide kpụ ọkụ n’ọnụ, gịnị bụ àgwà Jisọs, n’ihi gịnịkwa ka ihere na-ejighị mee ya?
16 Mgbe Jisọs guzo n’ihu Paịlet, ọ rịọghị ka e debe ya ndụ kama ọ gbachiri nkịtị n’ụzọ dị ùgwù, ebe ọ maara na ya aghaghị ịnwụ ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe onye ọchịchị Rom ahụ kọwapụtara na ya nwere ikike ịma Jisọs ikpe ọnwụ ma ọ bụ ịtọhapụ ya, Jisọs zara ya n’atụghị egwu, sị: “Ị gaghị enwe ike ọ bụla imegide m, ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya rịị.” (Jọn 19:11) Ndị agha Paịlet mesoro Jisọs mmesọ jọgburu onwe ya, ma ha emenyelighị ya ihere. N’ihi gịnị ka ihere ga-eji mee ya? A dịghị ata ya ahụhụ n’ụzọ ziri ezi n’ihi njehie ọ bụla. Kama nke ahụ, a na-akpagbu ya n’ihi ezi omume. N’akụkụ a, e mezuru okwu amụma Aịsaịa kwukwuru: “Onyenwe anyị Jehova na-enyere m aka; n’ihi nke a e tinyeghị m n’ọnọdụ ihere: n’ihi nke a ka m cheworo ihu m dị ka ọmụ́, amakwaara m na ihere agaghị eme m.”—Aịsaịa 50:7.
17. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova siworo na-akwado Jisọs n’oge nile ọ na-eje ozi ya?
17 Obi ike Jisọs sitere ná ntụkwasị obi zuru ezu o nwere n’ebe Jehova nọ. Akparamàgwà ya na-egosipụta na o kwenyezuru n’ihe Aịsaịa kwuru: “Onye na-agụ m n’onye ezi omume dị nso: ọ̀ bụ onye mụ na ya ga-ekpe? ka anyị guzo ọtọ n’otu: ònye bụ onye ahụ nwere okwu ikpe ikwugide m? ya bịakwute m nso. Lee, Onyenwe anyị Jehova ga-enyere m aka: ònye bụ onye ahụ ga-ama m ikpe? lee, ha nile ga-aka nká dị ka uwe; nla ga-erichapụ ha.” (Aịsaịa 50:8, 9) Ụbọchị e mere Jisọs baptism, Jehova kwupụtara na ọ bụ onye ezi omume dị ka nwa ime mmụọ nke Chineke. N’ezie, a nụrụ olu Chineke n’oge ahụ ka ọ na-ekwu, sị: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma.” (Matiu 3:17) Ka ndụ ya n’elu ala na-abịaru ná njedebe, ka Jisọs gbunyere ikpere n’ala na-ekpe ekpere n’ogige Getsemane, otu ‘mmụọ ozi si n’eluigwe bịa, na-enye Ya ike.’ (Luk 22:41-43) Ya mere Jisọs maara na Nna ya kwadoro ụzọ ndụ ya. Ọkpara Chineke a zuru okè emeghị mmehie ọ bụla. (1 Pita 2:22) Ndị iro ya boro ya ebubo ụgha nke ịbụ onye na-emebi Ụbọchị Izu Ike, onye aṅụrụma, na onye mmụọ ọjọọ ji, ma ụgha ha emechughị Jisọs ihu. Chineke nọnyeere ya, ya mere, ònye pụrụ imegide ya?—Luk 7:34; Jọn 5:18; 7:20; Ndị Rom 8:31; Ndị Hibru 12:3.
18, 19. Ahụmahụ dịgasị aṅaa yiri ndị nke Jisọs nwere ka ndị Kraịst e tere mmanụ nweworo?
18 Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” (Jọn 15:20) N’oge na-adịghị anya, ihe ndị merenụ gosiri na nke a bụ eziokwu. Na Pentikọst 33 O.A., mmụọ nsọ bịakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị ntụkwasị obi, ọgbakọ ndị Kraịst malitekwara ịdị. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, ndị ndú okpukpe nwara igbochi ọrụ nkwusa nke ndị ikom na ndị inyom a kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị e jikọtara ha na Jisọs ugbu a dị ka akụkụ nke “mkpụrụ Abraham,” dookwa ha dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke. (Ndị Galetia 3:26, 29; 4:5, 6) Malite na narị afọ mbụ ruo ugbu a, ndị Kraịst e tere mmanụ, ka ha na-ewere nguzo siri ike maka ezi omume, aghaghị ịgbaso mgbasa akụkọ ụgha na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ndị sitere n’aka ndị iro Jisọs mgba.
19 Ma, ha na-echeta ihe na-agba ume Jisọs kwuru: “Ngọzi na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa unu ụtọ nke ukwuu: n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:11, 12) N’ihi ya, ọbụna n’okpuru mwakpo ndị kasị njọ, ndị Kraịst e tere mmanụ nọgidere na-enwe obi ike. Ihe ọ sọkwara ndị na-emegide ha kwuo, ha maara na Chineke agụwo ha ná ndị ezi omume. N’anya ya, ha bụ “ndị a na-apụghịkwa ịta ụta, ndị a na-apụghịkwa ibo ebubo.”—Ndị Kọlọsi 1:21, 22.
20. (a) Olee ndị na-akwado ndị Kraịst e tere mmanụ, ahụmahụ dị aṅaa ka ha nwewokwara? (b) Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ siri bịa nwee ire nke ndị mmụta?
20 N’oge a, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-akwado ndị Kraịst e tere mmanụ. Ndị a kwa na-ewere nguzo ha maka ezi omume. N’ihi ya, ha esorowo ụmụnna ha e tere mmanụ takọọ ahụhụ, ha ‘asawokwa uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.’ Jehova agụwo ha ná ndị ezi omume n’olileanya nke ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ.’ (Mkpughe 7:9, 14, 15; Jọn 10:16; Jemes 2:23) Ọ bụrụgodị na ndị na-emegide ha eyie ka ha siri ike ugbu a, amụma Aịsaịa na-ekwu na n’oge nke Chineke, ndị mmegide ahụ ga-adị ka uwe nla riri, nke dị mma nanị ka a chịfuo ya. Ka ọ dịgodị, ma ndị Kraịst e tere mmanụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ na-anọgidesi ike site n’ikpechi ekpere anya, ịmụ Okwu Chineke, na ịga nzukọ maka ofufe. N’ụzọ dị otú ahụ, Jehova na-ezi ha ihe, ha na-amụtakwa iji ire nke ndị mmụta na-ekwu okwu.
Tụkwasị Obi n’Aha Jehova
21. (a) Olee ndị bụ ndị na-eje ije n’ìhè, gịnịkwa ga-abịara ha? (b) Gịnị na-eme ndị na-eje ije n’ọchịchịrị?
21 Ugbu a, rịba ama ọdịiche pụtara ìhè e nwere: “Ònye n’etiti unu bụ onye na-atụ egwu Jehova, na-ege ntị n’olu ohu Ya? onye nke jeworo ije n’ọchịchịrị, nke ọ dịghị onwunwu ọkụ o nwere, ya tụkwasị obi n’aha Jehova, dabere Chineke ya.” (Aịsaịa 50:10) Ndị na-ege ntị n’olu Ohu Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, na-ejegharị n’ìhè ahụ. (Jọn 3:21) Ọ bụghị nanị na ha na-eji aha Chineke bụ́ Jehova eme ihe, kamakwa ha na-atụkwasị obi n’onye na-aza aha ahụ. Ọ bụrụgodị na ọ dị mgbe ha jere ije n’ọchịchịrị, ha adịghị atụ mmadụ egwu ugbu a. Ha na-adabere n’ebe Chineke nọ. Otú ọ dị, ndị nọgidere na-eje ije n’ọchịchịrị bụ ndị egwu mmadụ ji. Nke ahụ bụ ihe mere Pọntiọs Paịlet. Ọ bụ ezie na ọ maara na aka Jisọs dị ọcha n’ebubo ụgha ndị e boworo ya, egwu gbochiri onye ọchịchị Rom ahụ ịtọhapụ Jisọs. Ndị agha Rom gburu Ọkpara Chineke, ma Jehova mere ka o si n’ọnwụ bilie ma kpuwe ya nsọpụrụ na otuto dị ka okpueze. Gịnị banyere Paịlet? Dị ka onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus si kọọ, nanị afọ anọ mgbe Jisọs nwụsịrị, onye ọzọ nọchiri Paịlet dị ka onye ọchịchị Rom, e nyekwara ya iwu ka ọ laghachi Rom iji zara ọnụ ya n’ebubo ndị e boro ya nke ime mmehie ndị dị oké njọ. Gịnị banyere ndị Juu mere ka e gbuo Jisọs? Ihe na-erughị iri afọ anọ ka e mesịrị, usuu ndị agha Rom bibiri Jerusalem, meekwa ka e gbuo ndị bi n’ime ya ma ọ bụ kpụrụ ha gaa n’ịbụ ohu. Ọ dịghị ezigbo ihe ga-abịara ndị họọrọ ọchịchịrị!—Jọn 3:19.
22. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ oké nzuzu ịdabere n’ebe ụmụ mmadụ nọ maka nzọpụta?
22 Ịdabere n’ebe ndị mmadụ nọ maka nzọpụta bụ oké nzuzu. Amụma Aịsaịa na-akọwa ihe mere o ji bụrụ ya: “Lee, unu nile ndị na-amụnye ọkụ, ndị ji akụ́ na-ere ọkụ eke onwe unu n’úkwù dị ka ihe okike: jegharịanụ n’ire ọkụ unu, na n’etiti akụ́ nile na-ere ọkụ unu fụnwuworo. Ihe a esitewo n’aka m dịrị unu; n’ihe mwute ka unu ga-edina ala.” (Aịsaịa 50:11) Ndị ndú bụ́ mmadụ na-abịa ma na-ala. Onye nwere ikike ndọrọ pụrụ ịdọta mmasị ndị mmadụ ruo nwa oge. Ma ihe ọbụna onye kasị nwee obi eziokwu pụrụ ịrụzu dị ntakịrị. Kama isunye oké ọkụ na-ere ere, dị ka ndị na-akwado ya na-atụ anya ya, ọ pụrụ ịfụnwu nanị ‘icheku ọkụ’ ole na ole, bụ́ nke na-enye ìhè na okpomọkụ dị ntakịrị ma na-anyụ n’oge na-adịghị anya. N’aka nke ọzọ, ndị na-atụkwasị obi na Shaịlo, bụ́ Mesaịa ahụ Chineke kwere ná nkwa, adịghị mgbe ha ga-enwe mmechu ihu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’amaokwu atọ ndị mbụ nke Aịsaịa isi 50, Jehova kọwara mba Juda n’ozuzu ya dị ka nwunye ya nakwa ndị bi n’ime ya n’otu n’otu dị ka ụmụ ya.
b Malite n’amaokwu nke 4 ruo ná ngwụsị nke isiakwụkwọ ahụ, o yiri ka onye dere ya ọ na-ekwu banyere onwe ya. Ọ pụrụ ịbụ na Aịsaịa nwetara ụfọdụ n’ime ule ndị ahụ o hotara n’amaokwu ndị a. Otú ọ dị, n’echiche kasị zuo ezuo, amụma ahụ mezuru n’ebe Jisọs Kraịst nọ.
c N’ụzọ na-adọrọ mmasị, na Septuagint, Aịsaịa 50:6 na-agụ, sị: “Enyere m azụ m maka iti ihe, nyekwa nti m maka ịkụ ihe.”
[Foto dị na peeji nke 155]
Ndị Juu na-adabere n’ebe ndị ọchịchị bụ́ mmadụ nọ kama ịdabere n’ebe Jehova nọ
[Foto dị na peeji nke 156, 157]
N’Oké Osimiri Uhie ahụ, Jehova chebere ndị ya site n’itinye ogidi igwe ojii n’etiti ha na ndị Ijipt