Ije Ozi Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke
“Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke . . . onye na-eme ka a nụrụ okwu udo.”—AỊSAỊA 52:7.
1, 2. (a) Dị ka e buru n’amụma n’Aịsaịa 52:7, ozi ọma dị aṅaa ka a ga-ezisa? (b) Gịnị ka okwu amụma Aịsaịa pụtara n’ebe ndị Israel oge ochie nọ?
E NWERE ozi ọma a ga-akpọsa! Ọ bụ ozi udo—ezigbo udo. Ọ bụ ozi nzọpụta nke metụtara Alaeze Chineke. N’ogologo oge gara aga, Aịsaịa onye amụma dere banyere ya, e chebewokwara anyị okwu ya n’Aịsaịa 52:7, ebe anyị na-agụ, sị: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo, onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe, onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta; onye na-asị Zaịọn, Chineke gị bụ eze!”
2 Jehova nyere onye amụma ya bụ́ Aịsaịa mmụọ nsọ ide ozi ahụ maka abamuru nke Israel oge ochie na maka abamuru anyị taa. Gịnị ka ọ pụtara? N’oge Aịsaịa dere okwu ndị ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ndị Asiria adọrọworị alaeze ebe ugwu nke Israel laa n’agha. E mesịa, a ga-adọrọ ndị bi na Juda, bụ́ alaeze ebe ndịda, n’agha laa Babilọn. Ndị ahụ bụ oge nke obi mgbawa na ọgba aghara ná mba ahụ n’ihi na ndị ahụ erubeghịrị Jehova isi, ya mere ha na Chineke adịghị n’udo. Dị ka Jehova gwara ha, àgwà mmehie ha na-akpata nkewa n’etiti ha na Chineke ha. (Aịsaịa 42:24; 59:2-4) Ma, site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova buru amụma na n’oge a kara aka ọnụ ụzọ ámá nke Babilọn ga-emeghepụ. Ndị Chineke ga-enwere onwe ha ịlaghachi n’ala nke aka ha, n’ebe ahụ iwughachi ụlọ nsọ Jehova. A ga-eweghachi Zaịọn, a ga-ejikwa ofufe ezi Chineke ahụ gaa n’ihu ọzọ na Jerusalem.—Aịsaịa 44:28; 52:1, 2.
3. Olee otú nkwa mweghachi maka Israel si bụrụkwa amụma nke udo?
3 Nkwa a nke mgbapụta bụkwa amụma nke udo. Ịbụ ndị e weghachiri n’ala ahụ nke Jehova nyeworo ndị Israel ga-abụ ihe àmà nke ebere Chineke na nke nchegharị ha. Ọ ga-egosi na ha na Chineke dịrị n’udo.—Aịsaịa 14:1; 48:17, 18.
“Chineke Gị Bụ Eze!”
4. (a) N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na 537 T.O.A. na ‘Jehova bụ eze’? (b) Olee otú Jehova si gbanwegharịa ihe maka abamuru nke ndị ya n’afọ ndị sochirinụ?
4 Mgbe Jehova nyere mgbapụta nke a na 537 T.O.A., ọ ga-ekwesị ekwesị ịmara Zaịọn ọkwa ahụ, sị: “Chineke gị bụ eze!” N’eziokwu, Jehova bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” (Mkpughe 15:3, NW) Ma mgbapụta a nke ndị ya bụ ngosipụta ọhụrụ nke ọbụbụeze ya. O gosiri n’ụzọ dị ịrịba ama ọkaaka nke ike na ịchịisi ya n’elu alaeze ukwu mmadụ nke kasị ike ruo n’oge ahụ. (Jeremaịa 51:56, 57) Dị ka ihe si n’ọrụ nke mmụọ Jehova pụta, e mebiri atụmatụ nzuzo ndị ọzọ megide ndị ya. (Esta 9:24, 25) Ugboro ugboro, Jehova tinyere aka n’ụzọ dị iche iche iji mee ka ndị eze Midia na Peasia jikọta aka n’imezu uche nke onwe ya kasịnụ. (Zekaraịa 4:6) E dekọrọ ihe omume ndị dị egwu merenụ n’ụbọchị ndị ahụ maka anyị n’akwụkwọ Bible ndị bụ́ Ezra, Nehemaịa, Esta, Hagaị, na Zekaraịa. Leekwa ka o si bụrụ ihe na-ewusi okwukwe ike ịtụleghachi ha!
5. Ihe omume ndị dị aṅaa dị mkpa ka e zoro aka na ha n’Aịsaịa 52:13–53:12?
5 Otú ọ dị, ihe mere na 537 T.O.A. na mgbe ọ gasịrị bụ nanị mmalite. N’isochi amụma nke mweghachi ahụ ozugbo n’isi nke 52, Aịsaịa dere banyere ọbịbịa nke Mesaịa. (Aịsaịa 52:13–53:12) Site n’aka Mesaịa ahụ, onye e mesịrị mata dị ka Jisọs Kraịst, Jehova ga-enye ozi nke mgbapụta na udo nke nwere ihe ọ pụtara ọbụna karịa ihe mere na 537 T.O.A.
Onye Ozi Udo Kasị Ukwuu nke Jehova
6. Ònye bụ onye ozi udo kasị ukwuu nke Jehova, ọrụ dịkwa aṅaa ka ọ sị na o mezuru n’ebe ya nọ?
6 Jisọs Kraịst bụ onye ozi udo kasị ukwuu nke Jehova. Ọ bụ Okwu Chineke, Ọnụ Na-ekwuru Jehova n’onwe ya. (Jọn 1:14) N’ikwekọ na nke a, oge ụfọdụ mgbe e mesịrị ya baptism n’Osimiri Jọdan, Jisọs guzo n’ime ụlọ nzukọ dị na Nazaret ma gụpụta ọrụ ya n’olu dara ụda site n’Aịsaịa isi nke 61. Ọrụ ahụ mere ka o doo anya na ihe e zigara ya ikwusa gụnyere “ọhịha” na “ịhụ ụzọ,” tinyekwara ohere nke ịbụ ndị Jehova nabatara. Ma, Jisọs mere ihe karịrị ịkpọsa ozi nke udo. Chineke ezitewokwa ya iji nye ihe ndabere maka udo na-adịgide adịgide.—Luk 4:16-21.
7. Gịnị si n’udo n’ebe Chineke nọ apụta, bụ́ nke a na-eme ka o kwe omume site na Jisọs Kraịst?
7 N’oge ọmụmụ Jisọs, ndị mmụọ ozi egosiwo ndị ọzụzụ atụrụ onwe ha na nso Betlehem, na-eto Chineke ma na-asị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị ihe ha dị Ya ezi mma.” (Luk 2:8, 13, 14, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, a ga-enwe udo maka ndị ihe ha dị Chineke ezi mma n’ihi na ha gosipụtara okwukwe ná ndokwa ọ na-eme site n’Ọkpara ya. Gịnị ka nke ahụ ga-apụta? Ọ ga-apụta na n’agbanyeghị na a mụrụ ụmụ mmadụ ná mmehie, ha pụrụ inweta nguzo dị ọcha n’ebe Chineke nọ, mmekọrịta a nwapụtara n’ebe ọ nọ. (Ndị Rom 5:1) Ha pụrụ inwe ịdị jụụ, udo nke dị n’ime, nke na-agaghị ekwe omume n’ụzọ ọ bụla ọzọ. N’oge Chineke kara aka, a ga-enwe ọhịha site ná mmetụta nile nke mmehie e ketara n’aka Adam, gụnyere ọrịa na ọnwụ. Ndị mmadụ agakwaghị abụ ndị ìsì ma ọ bụ ndị ntị chiri ma ọ bụ ndị ngwụrọ. A ga-ewepụ adịghị ike na-akụda mmụọ na nsogbu uche ndị na-etiwa obi n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ọ ga-ekwe omume ịdị ndụ n’izu okè ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsaịa 33:24; Matiu 9:35; Jọn 3:16.
8. Ole ndị ka a na-enye udo nke Chineke?
8 Ole ndị ka a na-enye udo nke Chineke? A na-enye ya ndị nile na-egosipụta okwukwe na Jisọs Kraịst. Pọl onyeozi dere na ‘ọ bụ ihe dị Chineke ezi mma ka O wee site na Kraịst mee ka Ya onwe ya na ihe nile dị n’otu, site n’iji ọbara Jisọs nke a wụsịrị [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW] mee ka Ya onwe ya na mmadụ nile dị n’udo.’ Onyeozi ahụ kwukwasịrị na ịdịghachi n’otu nke a ga-agụnye “ihe dị n’eluigwe”—ya bụ, ndị ga-abụ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa n’eluigwe. Ọ ga-agụnyekwa “ihe dị n’elu ụwa”—ya bụ, ndị ga-enwe ihu ọma nke inwe ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe e weghachiri ya n’ọnọdụ Paradaịs zuru ezu. (Ndị Kọlọsi 1:19, 20) N’ihi ha irite uru site n’ọnụ ahịa nke àjà Jisọs na n’ihi nrubeisi ha sitere n’obi nye Chineke, ndị a nile pụrụ iso Chineke nwee ọbụbụenyi na-ekpo ọkụ.—Tụlee Jemes 2:22, 23.
9. (a) Udo n’ebe Chineke nọ na-emetụta mmekọrịta ndị ọzọ dị aṅaa? (b) Iji nwee udo na-adịgide adịgide n’ebe nile, ikike dị aṅaa ka Jehova nyefere Ọkpara ya?
9 Lee ka iso Chineke dị n’udo dị otú ahụ si dị mkpa! Ọ bụrụ na e nweghị udo n’ebe Chineke nọ, a pụghị inwe ezi udo ma ọ bụ nke na-adịgide adịgide ná mmekọrịta ọ bụla ọzọ. Udo n’ebe Jehova nọ bụ ntọala nke ezi udo n’elu ụwa. (Aịsaịa 57:19-21) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Jisọs Kraịst bụ Onyeisi Udo. (Aịsaịa 9:6) Jehova enyewokwa onye a nke a pụrụ isite na ya mee ka mmadụ na Chineke dịghachi n’otu ikike ịchịisi. (Daniel 7:13, 14) Banyekwara ihe ga-esi n’ịchịisi Jisọs dị ka onyeisi n’elu ihe a kpọrọ mmadụ pụta, Jehova na-ekwe nkwa, sị: ‘Ọ dịghị ọgwụgwụ nke udo Ya ga-agwụ.’—Aịsaịa 9:7; Abụ Ọma 72:7.
10. Olee otú Jisọs si setịpụ ihe nlereanya n’ịkpọsa ozi udo nke Chineke?
10 Ozi udo nke Chineke dị ihe nile a kpọrọ mmadụ mkpa. Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya ịnụ ọkụ n’obi n’onwe ya n’ikwusa ya. O mere otú ahụ n’ógbè ụlọ nsọ dị na Jerusalem, n’akụkụ ugwu, n’okporo ụzọ, gwa nwanyị onye Sameria n’akụkụ olulu mmiri, na n’ebe obibi ndị mmadụ. N’ebe ọ bụla ndị mmadụ nọ, Jisọs wepụtara ohere ikwusa banyere udo na Alaeze Chineke.—Matiu 4:18, 19; 5:1, 2; 9:9; 26:55; Mak 6:34; Luk 19:1-10; Jọn 4:5-26.
Ndị E Nyere Ọzụzụ Ịga Ije na Nzọụkwụ Kraịst
11. Maka ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ?
11 Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikwusa ozi udo nke Chineke. Dị nnọọ ka Jisọs bụ “Onyeàmà ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi” nke Jehova, ha ghọtara na ha nwekwara ibu ọrụ nke ịgba àmà. (Mkpughe 3:14; Aịsaịa 43:10-12) Ha legaara Kraịst anya dị ka Onye Ndú ha.
12. Olee otú Pọl si gosi ịdị mkpa nke ọrụ nkwusa ahụ?
12 Pọl onyeozi tụgharịrị uche n’ịdị mkpa nke ọrụ nkwusa ahụ, na-asị: “Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ na-asị, Onye ọ bụla nke kwere na Ya, a gaghị eme ka ihere mee ya.” Ya bụ, ọ dịghị onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na Jisọs Kraịst dị ka Onye Ndú nke nzọpụta Jehova nke ihere ga-eme. Nzụlite ebo mmadụ agaghịkwa eme ka ọ ghara iru eru, n’ihi na Pọl gbakwụnyere, sị: “Ọ dịghị ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Grik: n’ihi na otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onyenwe ọha mmadụ, bụrụkwa Onye nwere akụ̀ hie nne inye ndị nile na-akpọku Ya: n’ihi na, Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” (Ndị Rom 10:11-13) Ma olee otú ndị mmadụ ga-esi mụta banyere ohere ahụ?
13. Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ga-anụrụ ozi ọma ahụ, oleekwa otú ndị Kraịst narị afọ mbụ si zaghachi ná mkpa ahụ?
13 Pọl tụlere mkpa ahụ site n’ịjụ ajụjụ ndị ohu Jehova ọ bụla ga-eme nke ọma iche echiche banyere ha. Onyeozi ahụ jụrụ, sị: “Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha aka-ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha aka-anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị? ma hà ga-esi aṅaa kwusaa, ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?” (Ndị Rom 10:14, 15) Ihe ndekọ Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ na-agba akaebe doro anya na ndị ikom na ndị inyom, nwata na okenye, nakweere ihe nlereanya nke Kraịst na ndị ozi ya setịpụrụ. Ha ghọrọ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma ahụ. N’iṅomi Jisọs, ha kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ebe ọ bụla ha pụrụ ịhụ ha. N’ọchịchọ nke ahapụghị onye ọ bụla, ha jiri ozi ha gaa n’ihu ma n’ebe nzukọ ọha mmadụ ma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.—Ọrụ 17:17; 20:20.
14. Olee otú o si bụrụ eziokwu na “ụkwụ” nke ndị na-ekwusa ozi ọma ‘mara mma’?
14 N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile ji obiọma nabata ndị Kraịst na-eme nkwusa. Ka o sina dị, nhota Pọl nke sitere n’Aịsaịa 52:7 bụ eziokwu. Mgbe ọ jụsịrị ajụjụ bụ, “Hà ga-esi aṅaa kwusaa ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?” ọ gbakwụnyere, sị: “Dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Lee ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!” Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị adịghị eche na ụkwụ anyị bụ ihe mara mma. Ya mere, gịnịzi ka nke a pụtara? N’ụzọ nkịtị ọ bụ ụkwụ na-ebugharị mmadụ ka ọ na-aga ime nkwusa gwa ndị ọzọ. Ụkwụ dị otú ahụ na-anọchite anya onye ahụ n’ezie. Anyị pụkwara iji n’aka na nye ọtụtụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ site n’ọnụ ndị ozi na site n’ọnụ ndị ọzọ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst nke narị afọ mbụ, ndị Kraịst oge mbụ a bụ n’ezie ihe mara mma ile anya. (Ọrụ 16:13-15) Karịa nke ahụ, ha dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.
15, 16. (a) Olee ụzọ ndị Kraịst oge mbụ si gosi na ha bụ ndị ozi nke udo n’ezie? (b) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ije ozi anyị n’otu ụzọ ahụ ndị Kraịst narị afọ mbụ mere?
15 Ụmụazụ Jisọs ji ozi udo, ha zikwara ya n’ụzọ udo. Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka ndị a: “Ma ụlọ ọ bụla unu ga-aba n’ime ya, burunụ ụzọ sị, Udo dịrị ụlọ a. Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-anọkwasị ya: ma ọ bụrụ na onye udo anọghị ya, udo unu ga-alaghachiri unu ọzọ.” (Luk 10:5, 6) Sha·lohmʹ, ma ọ bụ “udo,” bụ ekele ọdịnala ndị Juu. Ma, ntụziaka Jisọs nyere gụnyere ọtụtụ ihe karịrị nke a. Dị ka “ndị ụkọ n’ọnọdụ Kraịst,” ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ gbara ndị mmadụ ume, sị: “Meenụ ka unu na Chineke dị n’udo.” (2 Ndị Kọrint 5:20) N’ikwekọ ná ntụziaka Jisọs, ha gwara ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke na ihe ọ pụrụ ịpụtara ha dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu. Ndị gere ntị nwetara ngọzi; ndị jụrụ ozi ahụ enwetaghị uru ọ bụla.
16 Ndịàmà Jehova na-eje ozi ha n’otu ụzọ ahụ taa. Ozi ọma ha na-ewegara ndị mmadụ abụghị nke ha; ọ bụ nke Onye ahụ zigara ha. Ọrụ ha bụ izi ya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ anabata ya, ha na-edebe onwe ha n’ọnọdụ inweta ngọzi ndị dị ebube. Ọ bụrụ na ha ajụ ya, ha na-ajụ udo n’ebe Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst nọ.—Luk 10:16.
Inwe Udo n’Ime Ụwa Na-agba Aghara
17. Ọbụna mgbe ndị mkparị chere anyị ihu, olee otú anyị kwesịrị isi mee omume, n’ihi gịnịkwa?
17 N’agbanyeghị ihe bụ mmeghachi omume ndị mmadụ, ọ dị ndị ohu Jehova mkpa iburu n’obi na ha bụ ndị ozi nke udo Chineke. Ndị ụwa pụrụ ịrụ ụka kpụ ọkụ n’ọnụ ma gosipụta iwe site n’ikwu okwu ndị na-egbu mmụọ ma ọ bụ site n’ịgwa ndị kpasuru ha iwe okwu mkparị. Ikekwe ụfọdụ n’ime anyị mere nke ahụ n’oge gara aga. Ma, ọ bụrụ na anyị eyikwasịwo mmadụ ọhụrụ ahụ, n’abụghịkwa akụkụ nke ụwa ugbu a, anyị agaghị eṅomi ụzọ ha. (Ndị Efesọs 4:23, 24, 31; Jemes 1:19, 20) N’agbanyeghị otú ndị ọzọ si eme omume, anyị ga-etinye ndụmọdụ a n’ọrụ: “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.”—Ndị Rom 12:18.
18. Olee otú anyị kwesịrị isi zaghachi ma ọ bụrụ na onye isi obodo emesoo anyị n’aka ike, n’ihi gịnịkwa?
18 Mgbe ụfọdụ ozi anyị pụrụ ịkpọta anyị n’ihu ndị isi obodo. N’igosipụta ikike ha, ha pụrụ ‘ịjụ anyị ajụjụ’ maka nkọwa n’ihe mere anyị ji eme ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe mere anyị ji ezere itinye aka n’ihe omume ụfọdụ. Ha pụrụ ịchọ ịmata ihe mere anyị ji ekwusa ozi ahụ anyị na-ekwusa—nke na-ekpughe okpukpe ụgha na nke na-akọ banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Nkwanye ùgwù anyị maka ihe nlereanya Kraịst setịpụrụ ga-akwali anyị igosipụta ịdị nwayọọ na egwu. (1 Pita 2:23; 3:15) Mgbe mgbe, ndị isi dị otú ahụ na-anọ ná nrụgide sitere n’aka ndị ụkọchukwu ma ọ bụ ma eleghị anya site n’aka ndị ọkwá ha ka nke ha. Azịza dị nwayọọ pụrụ inyere ha aka ịghọta na ọrụ anyị abụghị ihe ize ndụ nye ha ma ọ bụ nye udo nke obodo. Nzaghachi dị otú ahụ na-akwalite mmụọ nke nkwanye ùgwù, imekọ ihe ọnụ, na udo n’ime ndị nabatara ya.—Taịtọs 3:1, 2.
19. N’ihe omume ndị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-adịghị etinye aka ma ọlị?
19 A maara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile dị ka ndị aka ha na-adịghị n’esemokwu nke ụwa. Ha adịghị etinye aka n’agha ụwa na-alụ n’ihi agbụrụ, okpukpe, ma ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:14) N’ihi na Okwu Chineke na-agwa anyị ka anyị ‘doo onwe anyị n’okpuru ndị na-achị isi n’elu,’ anyị agaghị echedị n’echiche ikere òkè n’ihe omume nke ọgba aghara ìgwè mmadụ iji mee mkpesa megide ụkpụrụ ndị ọchịchị. (Ndị Rom 13:1) Ọ dịbeghị mgbe Ndịàmà Jehova sonyeere usoro ihe omume ọ bụla nzube ya bụ ịkwatu ọchịchị. N’ihi ụkpụrụ ndị Jehova setịpụụrụ ndị ohu ya bụ́ ndị Kraịst, ha ikere òkè ná mwụfu ọbara ma ọ bụ n’ụdị ọ bụla nke ime ihe ike adịghị abata n’uche! Ọ bụghị nanị na ezi ndị Kraịst na-ekwu banyere udo; ha na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha na-ekwusa.
20. Banyere udo, ihe ndekọ dị aṅaa ka Babilọn Ukwu ahụ nweworo?
20 N’ụzọ dị iche n’ebe ezi ndị Kraịst nọ, ndị na-anọchite anya òtù okpukpe dị iche iche nke Krisendọm egosibeghị onwe ha ịbụ ndị ozi nke udo. Okpukpe nile nke Babilọn Ukwu ahụ—chọọchị Krisendọm nakwa okpukpe ndị na-abụghị ndị Kraịst—akwadowo, nakwere, ma bute ụzọ n’ezie n’agha nke mba dị iche iche. Ha akpalitewo mkpagbu, ọbụna ogbugbu, nke ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ihi ya, banyere Babilọn Ukwu ahụ, Mkpughe 18:24 na-ekwu, sị: “N’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.”
21. Olee otú ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu si emeghachi omume mgbe ha na-ahụ ọdịiche dị n’àgwà ndị Jehova na nke ndị na-ekpe okpukpe ụgha?
21 N’adịghị ka okpukpe nile nke Krisendọm na ihe fọdụrụ na Babilọn Ukwu ahụ, ezi okpukpe bụ ikike dị mma, nke na-eme ka a dị n’otu. Nye ezi ụmụazụ ya, Jisọs Kraịst sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Nke ahụ bụ ịhụnanya nke na-agabiga ókè nke mba, ọha na eze, ọnọdụ akụ̀ na ụba, na agbụrụ, nke na-ekewa ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ ugbu a. N’ịbụ ndị hụworo nke a, ọtụtụ nde ndị mmadụ n’ụwa nile na-agwa ndị ohu Jehova e tere mmanụ, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zekaraịa 8:23.
22. Olee otú anyị si ele ọrụ ịgba àmà dị mkpa na a ka ga-arụ ya anya?
22 Dị ka ndị Jehova, anyị na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ihe a rụzuworo, ma a rụchabeghị ọrụ ahụ. Mgbe ọ kụsịrị mkpụrụ ma lekọta ubi ya, onye ọrụ ugbo adịghị akwụsị. Ọ na-anọgide na-arụ ọrụ, karịsịa n’oge owuwe ihe ubi na-akpụ ọkụ n’ọnụ. Oge owuwe ihe ubi na-achọ mgbalị siri ike, nke a nọgidere na-etinye. Ugbu a kwa e nwere owuwe ihe ubi ka ukwuu nke ndị na-efe ezi Chineke ofufe karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ugbu a bụ oge ịṅụrị ọṅụ. (Aịsaịa 9:3) N’ezie, anyị na-ezute mmegide na enweghị mmasị. Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, anyị nwere ike ịdị na-agbalị ịnagide nrịanrịa ndị dị oké njọ, ọnọdụ ndị siri ike n’ezinụlọ, ma ọ bụ ihe isi ike akụ̀ na ụba. Ma ịhụnanya maka Jehova na-akwali anyị ịtachi obi. Ozi Chineke nyefeworo anyị n’aka bụ ihe dị ndị mmadụ mkpa ịnụ. Ọ bụ ozi nke udo. N’ezie, ọ bụ ozi nke Jisọs n’onwe ya kwusara—ozi ọma nke Alaeze Chineke.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Mmezu dị aṅaa ka Aịsaịa 52:7 nwere n’ahụ Israel oge ochie?
◻ Olee otú Jisọs si gosi na ya bụ onye ozi udo kasị ukwuu?
◻ Olee otú Pọl onyeozi si jikọta Aịsaịa 52:7 n’ọrụ ndị Kraịst na-ekere òkè na ya?
◻ Gịnị ka ịbụ ndị ozi nke udo n’ụbọchị anyị na-agụnye?
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Dị ka Jisọs, Ndịàmà Jehova bụ ndị ozi nke udo Chineke
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ndịàmà Jehova na-anọgide na-adị n’udo n’agbanyeghị otú ndị mmadụ si emeghachi omume n’ozi Alaeze ahụ