Isi nke Atọ
“Ka Anyị Dozie Okwu”
1, 2. Ole ndị ka Jehova ji ndị ọchịchị na ndị obodo Jerusalem na Juda tụnyere, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji zie ezie?
NDỊ bi na Jerusalem pụrụ ịchọ igosi na ihe ha na-eme ziri ezi mgbe ha nụrụ okwu nkatọ ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 1:1-9. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-enwe mmasị iji nganga zoo aka n’àjà nile ha na-achụrụ Jehova. Otú ọ dị, amaokwu nke 10 ruo nke 15 kọwara nzaghachi na-emenye ihere nke Jehova nyere banyere ụdị omume ahụ. Ọ malitere site n’ikwu, sị: “Nụrụnụ okwu Jehova, unu ndị ikpe Sọdọm; ṅaanụ ntị n’iwu Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.”—Aịsaịa 1:10.
2 E bibiri Sọdọm na Gọmọra ọ bụghị nanị n’ihi omume mmekọahụ ha rụrụ arụ kamakwa n’ihi omume obi ịta mmiri, nke ịdị mpako ha. (Jenesis 18:20, 21; 19:4, 5, 23-25; Ezikiel 16:49, 50) Ọ ghaghị ịwụ ndị na-ege Aịsaịa ntị akpata oyi n’ahụ ịnụ ka e ji ha atụnyere ndị bi n’obodo ndị ahụ a bụrụ ọnụ.a Ma Jehova na-ahụ ndị ya otú ha dị n’ezie, Aịsaịa emeghịkwa ka ozi Chineke dị nro iji mee ka ‘ntị kọọ ha ọkọ.’—2 Timoti 4:3.
3. Gịnị ka Jehova bu n’obi mgbe ọ sịrị na “afọ ejuwo” ya n’àjà ndị ahụ na-achụrụ ya, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị otú a?
3 Rịba ama ihe bụ echiche Jehova banyere ofufe mmezu iwu ndị ya na-efe ya. “Jehova na-asị, N’ihi gịnị ka unu na-achụrụ m ọtụtụ àjà unu? afọ ejuwo m n’àjà nsure ọkụ nile e ji ebule chụọ, na abụba ụmụ ehi e mere ka ha maa abụba; ọzọ, ọbara oké ehi na nke ụmụ atụrụ na nke mkpi atọghị m ụtọ.” (Aịsaịa 1:11) Ndị ahụ echefuwo na Jehova adịghị adabere n’àjà ha. (Abụ Ọma 50:8-13) Ọ dịghị ihe ọ bụla ụmụ mmadụ pụrụ inye ya nke dị ya mkpa. Ya mere ọ bụrụ na ndị ahụ echee na ha na-emere Jehova ihe ọma site n’ịchụrụ ya àjà ndị ha na-achụ n’ejighị obi ha nile, ha hiere ụzọ. Jehova ji okwu ihe atụ siri ike mee ihe. A pụkwara ịsụgharị okwu bụ́ “afọ ejuwo m” ịbụ “ọ gbụwo m” ma ọ bụ “erijuwo m afọ.” Ị̀ maara otú ọ na-adị iriju nnọọ nri afọ nke na ịhụ ya anya ọzọ na-asọ oyi? Otú ahụ ka àjà ndị ahụ dị Jehova—ọ sọrọ ya nnọọ oyi!
4. Olee otú Aịsaịa 1:12 si kpughee enweghị isi nke ojije ndị ahụ na-eje n’ụlọukwu dị na Jerusalem?
4 Jehova gara n’ihu, sị: “Mgbe unu na-abịa ka a hụ unu n’ihu m, ònye chọworo nke a n’aka unu, ka unu zọtọọ ogige m nile?” (Aịsaịa 1:12) Ọ́ bụghị iwu Jehova nyere n’onwe ya kwuru ka ndị ahụ ‘na-abịa ka ha wee hụ ihu ya,’ ya bụ, ịbịa n’ụlọukwu ya dị na Jerusalem? (Ọpụpụ 34:23, 24) Ee, ma ha na-abịa n’ebe ahụ nanị iji mezuo iwu, nanị iji mezuo ihe ofufe dị ọcha chọrọ, n’enweghị ezi nzube obi. Nye Jehova, ojije ha na-eje n’ogige ya ọtụtụ ugboro bụ nanị ‘nzọtọ,’ n’enweghị ihe ọ bụla ọ na-arụpụta ma e wezụga ịzọsi ala ebe ahụ ike.
5. Gịnị bụ ụfọdụ omume ife ofufe nke ndị Juu mere, n’ihi gịnịkwa ka ihe ndị a jiworo ghọọrọ Jehova “ibu dị arọ”?
5 Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji kwuo okwu ugbu a ọbụna n’olu siri ike karị! “Unu ebubatakwala onyinye ịnata ihu ọma ọzọ nke bụ ihe efu; ihe nsure ọkụ nke na-esi ísì ụtọ, ihe arụ ka ọ bụụrụ m; ọnwa ọhụrụ na ụbọchị izu ike, ịkpọ mkpọkọta,—apụghị m ịnagide ajọ omume [ike ndị mmụọ ọjọọ na mkpọkọta dị nsọ NW]. Ọnwa ọhụrụ nile unu na mgbe nile unu a kara aka, mkpụrụ obi m akpọwo ha asị: ha aghọwo ibu dị arọ n’ahụ m, ike iburu ha agwụwo m.” (Aịsaịa 1:13, 14) Onyinye ịnata ihu ọma, ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, Ụbọchị Izu Ike, na mkpọkọta dị nsọ socha n’Iwu Chineke nyere Israel. Banyere “ọnwa ọhụrụ,” nanị ihe Iwu ahụ kwuru bụ ka a na-eme ememe ya, ma e jiriwo nwayọọ nwayọọ gbakwụnye ọdịnala ndị dị mma na ya. (Ọnụ Ọgụgụ 10:10; 28:11) A na-ewere ọnwa ọhụrụ dị ka a na-ewere ụbọchị izu ike a na-edebe kwa ọnwa, mgbe ndị ahụ na-agaghị arụ ọrụ, kama nke ahụ zukọta maka ịnara ntụziaka site n’aka ndị amụma na ndị nchụàjà. (2 Ndị Eze 4:23; Ezikiel 46:3; Emọs 8:5) Ememe ndị dị otú ahụ adịghị njọ. Ihe bụ́ nsogbu bụ ime ha nanị iji mee ngosi. Ọzọkwa, ndị Juu na-agwakọta kpọmkwem “ike ndị mmụọ ọjọọ,” nke bụ́ omume mgbaasị, na ndebe ha na-edebe Iwu Chineke n’ụzọ mmezu iwu.b N’ihi ya, ofufe ha na-efe Jehova bụ “ibu dị arọ” nye ya.
6. N’echiche dị aṅaa ka ‘ike gwụworo’ Jehova?
6 Otú ọ dị, olee otú ‘ike ga-esi agwụ’ Jehova? E kwuwerị, ọ ‘bara ụba n’ike. Ọ dịghị ada mbà, ike adịghị agwụkwa Ya.’ (Aịsaịa 40:26, 28) Jehova ji okwu ihe atụ ndị doro anya eme ihe iji mee ka anyị nwee ike ịghọta echiche ya. Ì butụwo ibu dị arọ ruo nnọọ ogologo oge nke na ike gwụruru gị n’ọkpụkpụ, ị chọọkwa nnọọ ịtụhapụ ya? Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Jehova banyere omume iji ihu abụọ na-efe ofufe nke ndị ya.
7. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo kwụsị ịṅa ntị n’ekpere ndị ya?
7 Ugbu a, Jehova kwuru okwu banyere akụkụ ofufe nke kasị mie emie na nke kasị dịịrị onwe onye. “Mgbe unu na-agbasa ọbọ aka unu abụọ, M ga-ezonahụ unu anya m abụọ: ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, M gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịsaịa 1:15) Ịgbasa ọbọ aka, ịgbatị aka ma chee ọbọ aka ihu n’elu, bụ omume ịrịọ arịrịọ. Nye Jehova, ịnọ otú a aghọwo ihe na-enweghị isi, n’ihi na aka ndị a jupụtara n’ọbara. Ime ihe ike jupụtara n’ala ahụ. Imegbu ndị na-adịghị ike juru ebe nile. Ndị dị otú ahụ bụ́ ndị nwere omume obi ọjọọ, ndị na-achọ nanị ọdịmma nke ha ikpegara Jehova ekpere na ịrịọ ka a gọzie ha bụ ihe arụ. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji sị, “M gaghị adị na-anụ”!
8. Olee ihe ọjọọ Krisendọm na-eme taa, oleekwa otú ụfọdụ ndị Kraịst si adaba n’ọnyà dị otú ahụ?
8 N’oge anyị, Krisendọm n’otu aka ahụ enwetabeghị ihu ọma Chineke site n’ekpere na-enweghị isi ha na-ekpeghachi ugboro ugboro na “ọrụ” okpukpe ha ndị ọzọ. (Matiu 7:21-23) Ọ dị oké mkpa ka anyị ghara ịdaba n’otu ọnyà ahụ. Mgbe ụfọdụ, onye Kraịst na-adaba n’omume ime mmehie dị oké njọ, mgbe ahụ na-eche na ọ bụrụ nnọọ na o zochie ihe ọ na-eme ma mụbaa ihe ọ na-eme n’ọgbakọ ndị Kraịst, ọrụ ya ga-ekpuchi mmehie ya n’ụzọ ụfọdụ. Ụdị ọrụ mmezu iwu ndị dị otú ahụ adịghị amasị Jehova. E nwere nanị otu ọgwụ maka ọrịa ime mmụọ, dị ka amaokwu ndị na-esonụ nke Aịsaịa na-egosi.
Ọgwụ Maka Ọrịa Ime Mmụọ
9, 10. Ruo n’ókè ha aṅaa ka ịdị ọcha dịruru mkpa n’ofufe anyị na-efe Jehova?
9 Jehova, bụ́ Chineke ọmịiko, jizi olu dị nwayọọ, nke na-adọrọ adọrọ karị, kwuo okwu. “Saanụ ahụ, meenụ onwe unu ka unu dị ọcha; wezụganụ ihe ọjọọ nke omume unu nile n’ihu anya m abụọ; hapụnụ ime ihe ọjọọ: mụtanụ ime ezi ihe; chọọnụ ikpe ziri ezi, meenụ ka onye na-eme ihe ike gazie agazie, kpeenụ nwa mgbei ikpe ziri ezi, kpeenụ ọnụ nwanyị di ya nwụrụ.” (Aịsaịa 1:16, 17) N’ebe a anyị na-ahụ iwu, ma ọ bụ ihe itoolu a na-aghaghị ime. Anọ ndị mbụ bụ ihe ndị a ga-ewepụ ewepụ n’echiche bụ́ na ha metụtara iwepụ mmehie; ise ndị ikpeazụ bụ ihe ndị a ga-eme eme bụ́ ndị na-eduga n’inweta ngọzi Jehova.
10 Ịsa ahụ na ịdị ọcha anọwo mgbe nile na-abụ akụkụ dị mkpa n’ofufe dị ọcha. (Ọpụpụ 19:10, 11; 30:20; 2 Ndị Kọrint 7:1) Ma Jehova chọrọ ka ịdị ọcha ahụ bamikwuo ime, ruo n’obi nke ndị na-efe ya. Nke kasị mkpa bụ ịdị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ, nke a bụkwa ihe Jehova na-ezo aka na ya. Iwu abụọ ndị mbụ dị n’amaokwu nke 16 abụghị nanị nkwughachi okwu efu. Otu onye ọkà mmụta n’ụtọ asụsụ Hibru na-atụ aro na nke mbụ, bụ́ “saanụ ahụ,” na-ezo aka ná nsacha nke mbụ, ebe nke abụọ, bụ́ “meenụ onwe unu ka unu dị ọcha,” na-ezo aka ná mgbalị na-aga n’ihu iji nọgide na-adị ọcha.
11. Iji lụsoo mmehie ọgụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime, gịnịkwa ka anyị na-agatụghị eme?
11 Anyị apụghị izonahụ Jehova ihe ọ bụla. (Job 34:22; Ilu 15:3; Ndị Hibru 4:13) Ya mere iwu ahụ o nyere bụ́ “Wezụganụ ihe ọjọọ nke omume unu nile n’ihu anya m abụọ” pụrụ nanị ịpụta otu ihe—ịkwụsị ime ihe ọjọọ. Nke ahụ pụtara anwaghị anwa kpuchie mmehie ndị dị oké njọ, n’ihi na ime otú ahụ bụ mmehie n’onwe ya. Ilu 28:13 na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya: ma onye na-ekwupụta ha, nke na-ahapụkwa ha, a ga-enwe obi ebere n’ahụ ya.”
12. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ‘ịmụta ime ezi ihe’? (b) Olee otú ndị okenye karịsịa pụrụ isi tinye n’ọrụ ntụziaka bụ́ “chọọnụ ezi ikpe” na “meenụ ka onye na-eme ihe ike gazie agazie”?
12 E nwere ọtụtụ ihe a ga-amụta site n’ihe ndị Jehova nyere iwu ka e mee n’amaokwu nke 17 n’Aịsaịa isi 1. Rịba ama na ọ sịghị nanị ‘kpee ikpe ziri ezi’ kama “mụtanụ ime ezi ihe.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ọ na-achọ ọmụmụ nke Okwu Chineke n’onwe anyị iji ghọta ihe bụ ezi ihe n’anya Chineke na ịchọ ime ya. Ọzọ, Jehova asịghị nanị “kpee ikpe ziri ezi” kama “chọọnụ ikpe ziri ezi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ọ dị ọbụna ndị okenye nwere ahụmahụ mkpa inyocha Okwu Chineke nke ọma iji chọpụta ụzọ ziri ezi a ga-agbaso n’okwu ụfọdụ tara akpụ. Ọ bụkwa ibu ọrụ ha ‘ime ka onye na-eme ihe ike gazie agazie,’ dị ka Jehova nyeziri n’iwu. Ntụzi ndị a dị mkpa nye ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ taa, n’ihi na ha chọrọ ichebe ìgwè atụrụ ahụ pụọ n’aka “agụ jọgburu onwe ha.”—Ọrụ 20:28-30.
13. Olee otú anyị pụrụ isi tinye iwu banyere nwa mgbei na nwanyị di ya nwụrụ n’ọrụ taa?
13 Iwu abụọ ndị ikpeazụ metụtara ụfọdụ n’ime ndị ọ dị mfe karị imegbu n’etiti ndị Chineke—ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ. Ụwa dị nnọọ njikere iji ndị dị otú ahụ mee ihe maka uru onwe ha; nke a agaghị adị otú a ma ọlị n’etiti ndị Chineke. Ndị okenye na-ahụ n’anya ‘na-ekpe ikpe ziri ezi’ maka ụmụ mgbei nọ n’ọgbakọ, na-enyere ha aka inweta ikpe ziri ezi na nchebe n’ime ụwa nke na-achọ iji ha mee ihe maka uru onwe ya na imetọ ha. Ndị okenye ‘na-ekpe ọnụ’ nwanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ, dị ka okwu Hibru ahụ pụkwara ịpụta, “na-eme mgbalị” n’ihi ya. N’ezie, ndị Kraịst nile kwesịrị ịbụ ebe mgbaba, isi iyi nke nkasi obi, na ikpe ziri ezi nye ndị nọ ná mkpa n’etiti anyị n’ihi na ha dị oké ọnụ ahịa nye Jehova.—Maịka 6:8; Jemes 1:27.
14. Olee ozi dị mma dị n’Aịsaịa 1:16, 17?
14 Lee ozi doro anya, nke dị mma, Jehova na-ezipụ site n’iwu itoolu a! Mgbe ụfọdụ ndị mere mmehie na-agwa onwe ha na ha agaghị emeli ihe ziri ezi. Ụdị echiche ndị ahụ na-akụda mmụọ mmadụ. Ọzọkwa, ha ezighị ezi. Jehova maara—ọ chọkwara ka anyị mara—na site n’enyemaka Ya, onye mmehie ọ bụla pụrụ ịkwụsị omume mmehie ya, chigharịa, ma mee ihe ziri ezi kama ime ihe ọjọọ.
Arịrịọ Ọmịiko, nke Ziri Ezi
15. Olee otú e si aghọtahie nkebi ahịrịokwu bụ́ “ka anyị dozie okwu n’etiti anyị” mgbe ụfọdụ, gịnịkwa ka ọ pụtara n’ezie?
15 Olu Jehova ji kwuo okwu dịwanyere ọbụna nwayọọ ma gosikwuo ọmịiko ugbu a. “Bịanụ, ka anyị [dozie okwu n’etiti anyị, NW], bụ ihe Jehova na-asị: ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha; ọ bụrụ na ha achaa uhie uhie dị ka ogho uhie, ọ bụ dị ka ajị́ ọcha ka ha ga-adị.” (Aịsaịa 1:18) A na-aghọtahiekarị ọkpụkpọ òkù ahụ e ji malite amaokwu a mara mma. Dị ka ihe atụ, Igbo Bible nke Union Version na-ekwu, sị, “Ka anyị rụrịta ụka”—dị ka a ga-asị na ma ya ma ha aghaghị ikweta ịhapụ ihe ụfọdụ iji kwekọrịta. Ọ bụghị otú ahụ! A pụghị ịta Jehova ụta ma ọlị, ma ya fọdụzie ná mmeso o mesoro ndị a na-enupụ isi, ndị dị ihu abụọ. (Deuterọnọmi 32:4, 5) Amaokwu ahụ adịghị ekwu banyere mkparịta ụka dị n’agbata mmadụ abụọ ha nhata, kama banyere nnọkọ ime udo. O yiri ka a ga-asị na Jehova na-ama Israel aka ịbịa ka e kpee ya n’ụlọikpe.
16, 17. Ànyị si aṅaa mara na Jehova dị njikere ịgbaghara ọbụna mmehie ndị dị oké njọ?
16 Nke ahụ pụrụ ịbụ echiche na-emenye ụjọ, ma Jehova bụ Onyeikpe kasị dị ebere ma nwee ọmịiko. Ókè ọ na-agbagharu mmehie enweghị oyiri. (Abụ Ọma 86:5) Nanị ya pụrụ iwere mmehie ndị Israel ndị dị ka “uwe uhie” ma sụchaa ha, mee ka ha dị ‘ọcha dị ka snow.’ Ọ dịghị mgbalị mmadụ, ọ dịghị ụdị ọrụ okpukpe ọ bụla, àjà, ma ọ bụ ekpere nke pụrụ ihichapụ ntụpọ nke mmehie. Ọ bụ nanị mgbaghara Jehova pụrụ ịsapụ mmehie. Chineke na-agbaghara mmehie otú ahụ dabere n’ihe ndị o kwuru, bụ́ ndị gụnyere ezi nchegharị, nke si n’ala ala obi.
17 Eziokwu a dị oké mkpa nke na Jehova kwughachiri ya n’ụdị uri—mmehie ndị dị ka “ogho uhie” ga-adị ka ajị́ ọcha ọhụrụ, nke a na-etejighị eteji. Jehova chọrọ ka anyị mara na ya bụ Onye Na-agbaghara mmehie n’ezie, ọbụna ndị dị oké njọ, ma ọ bụrụhaala na ọ hụ na anyị echegharịwo n’ezie. Ọ dị mma ka ndị ọ na-esiri ike ikweta na nke a bụ eziokwu banyere ha tụlee ihe atụ ndị dị ka nke Manase. O mere mmehie ndị jọgburu onwe ha—ruo ọtụtụ afọ. Ma, o chegharịrị, a gbaghakwaara ya. (2 Ihe E Mere 33:9-16) Jehova chọrọ ka anyị nile, gụnyere ndị meworo mmehie ndị dị oké njọ, mara na oge agafebeghị ka anyị na ya “dozie okwu.”
18. Olee nhọrọ Jehova chere n’ihu ndị ya na-enupụ isi?
18 Jehova na-echetara ndị ya na ha aghaghị ime nhọrọ. “Ọ bụrụ na unu ekwe, wee nụ, ezi ihe nke ala unu ka unu ga-eri: ma ọ bụrụ na unu ajụ, wee nupụ isi, mma agha ga-erichapụ unu: n’ihi na ọnụ Jehova ekwuwo.” (Aịsaịa 1:19, 20) N’ebe a Jehova na-ekwusi okwu ike banyere omume, o jikwa okwu ihe atụ ọzọ doro anya mesie okwu ya ike. Nhọrọ ndị Juda nwere bụ nke a: Iri ihe ma ọ bụ ịbụ ndị e richapụrụ. Ọ bụrụ na ha enwee omume nke ikwe nụ ma rubere Jehova isi, ha ga-eri ezi ihe nke ala ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha anọgide n’omume nnupụisi ha, a ga-erichapụ ha—site ná mma agha nke ndị iro ha! Ọ fọrọ nke nta ka o yie ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche na ndị mmadụ ga-ahọrọ mma agha nke ndị iro ha kama ịhọrọ ebere na ụbara ihe nke Chineke na-agbaghara mmehie na-enye. Ka o sina dị, nke ahụ bụ ihe mere Jerusalem, dị ka amaokwu ndị na-esonụ nke Aịsaịa na-egosi.
Abụ Ákwá n’Ihi Obodo A Hụrụ n’Anya
19, 20. (a) Olee otú Jehova si kwupụta mmetụta nke mgbahapụ o nwere? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ‘ezi omume si anọrịị ọnọdụ abalị n’ime Jerusalem’?
19 N’Aịsaịa 1:21-23, anyị na-ahụ ókè ajọ omume Jerusalem ruru ugbu a. Aịsaịa maliteziri uri sitere n’ike mmụọ nsọ n’ụdị abụ ákwá, ma ọ bụ ákwá arịrị. “Ò sikwara aṅaa ghọọ nwanyị na-akwa iko, bụ́ obodo ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? obodo ahụ nke jupụtara n’ikpe ziri ezi! ezi omume na-anọrịị ọnọdụ abalị n’ime ya, ma ugbu a ndị ogbu mmadụ.”—Aịsaịa 1:21.
20 Lee ka obodo ahụ, bụ́ Jerusalem, siworo daa! N’ịbụ nke nwere mgbe ọ bụ nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ ghọwo nwanyị na-akwa iko ugbu a. Olee ụzọ ka mma a pụrụ isi kọwaa mmetụta nke mgbahapụ na mmechuihu Jehova nwere? “Ezi omume na-anọrịị ọnọdụ abalị” n’obodo a. Olee mgbe? Ọbụna tupu Israel amalite ịdị, laa azụ n’oge Abraham, a kpọrọ obodo a Selem. Otu nwoke nke bụ́ eze, bụrụkwa onye nchụàjà chịrị ya. Aha ya, bụ́ Melkizedek, pụtara “Eze nke ezi omume,” ihe àmà gosikwara na o kwesịrị ya nnọọ. (Ndị Hibru 7:2; Jenesis 14:18-20) Ihe dị ka 1,000 afọ mgbe Melkizedek nwụsịrị, Jerusalem ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu, n’oge ọbụbụeze Devid na Solomọn. “Ezi omume na-anọrịị ọnọdụ abalị n’ime ya,” karịsịa mgbe ndị eze na-achị ya setịpụụrụ ndị ahụ ihe nlereanya ha ga-eṅomi site n’ije ije n’ụzọ Jehova. Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’oge Aịsaịa, oge ndị dị otú ahụ bụ ihe a na-echeta echeta.
21, 22. Gịnị ka afụrụ ụzụ na biya a gwagburu agwagbu na-anọchite anya ya, n’ihi gịnịkwa ka nkọwa ahụ ji kwesị ndị ndú Juda?
21 O yiri ka ndị ndú nke ndị ahụ hà so kpata akụkụ buru ibu nke nsogbu ahụ. Aịsaịa gara n’ihu n’ịkwa ákwá arịrị ya: “Ọlaọcha gị aghọwo afụrụ ụzụ; ihe ọṅụṅụ ọma gị, a gwawo ya mmiri nke ukwuu. Ndị isi gị na-ewezụga onwe ha n’ebe M nọ, ha bụkwa ndị e jikọtara ha na ndị ohi; onye ọ bụla n’ime ha na-ahụ iri ngo n’anya, na-agbasokwa ihe nkwụghachi: ọ dịghị nwa mgbei ha na-ekpe ikpe ziri ezi, okwu ikpe nke nwanyị di ya nwụrụ adịghị abịakwutekwa ha.” (Aịsaịa 1:22, 23) Ihe atụ abụọ doro anya ndị sochiri onwe ha doziri ọnọdụ maka ihe ga-esochirịrị. Ọkpụ ụzụ nke nọ na-afụ eko ya na-ekochapụ afụrụ ụzụ n’ọlaọcha gbazere agbaze. Ndị isi na ndị ikpe nke Israel yiri afụrụ ụzụ, ọ bụghị ọlaọcha. Ọ dị mkpa ka e kochapụ ha. Ha abaghị uru dịkwa ka biya e jiri mmiri gwagbuo, nke na-adịkwaghị ụtọ, na-abaghị uru. Nanị ihe e kwesịrị ime ihe ọṅụṅụ dị otú ahụ bụ ịkwafu ya!
22 Amaokwu nke 23 na-egosi ihe mere nkọwa dị otú ahụ ji kwesị ndị ndú ahụ. Iwu Mosis buliri ndị Chineke elu, debe ha iche pụọ ná mba ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, o mere otú ahụ site n’inye iwu ka e chebe ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ. (Ọpụpụ 22:22-24) Ma n’oge Aịsaịa, nwa mgbei enwekebeghị olileanya na ikpe ọ bụla ga-alara ya. A bịa n’ihe banyere nwanyị di ya nwụrụ, ọ dịghịdị onye ga-aṅa ntị ná mkpesa ya, ma ya fọdụzie imechitewere ya mgbalị. Ee e, uche ndị ikpe na ndị ndú a dịbiga ókè n’ịchọ ọdịmma nke ha—ịchọ iri ngo, ịchụso onyinye, na ịbụ ndị na-akwado ndị ohi, dị ka ihe àmà gosiri na-echebe ndị omempụ ma na-agbachi ndị ha mesoro ya nkịtị ka ha na-ata ahụhụ. Nke ka njọ, ha “na-ewezụga onwe ha,” ma ọ bụ na-ekwesi olu ike n’ụzọ mmehie ha. Lee ọnọdụ dị mwute nke ahụ bụ!
Jehova Ga-anụcha Ndị Ya
23. Mmetụta dị aṅaa ka Jehova na-egosipụta n’ebe ndị iro ya nọ?
23 Jehova agaghị agbachi nkịtị n’ụdị iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị otú ahụ. Aịsaịa gara n’ihu na-ekwu, sị: “N’ihi nke a, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Onye dị ike nke Israel, pụta,) Aa, M [ga-enwere onwe m pụọ n’aka, NW] ndị na-emegide m, M ga-abọkwara Onwe m ọ́bọ̀ n’ahụ ndị iro m.” (Aịsaịa 1:24) N’ebe a e nyere Jehova aha atọ, na-emesi ike ịbụ onyenwenụ ọ bụ n’ụzọ ziri ezi na ike ya dị ukwuu. Mkpu ahụ bụ́ “Aa” ma eleghị anya na-egosi na ugbu a a gwakọtara ebere Jehova na mkpebisi ike ya ime ihe n’ihi iwe ya. N’ezie e nwere ihe kpatara nke a.
24. Usoro nnụcha dị aṅaa ka Jehova bu n’obi maka ndị ya?
24 Ndị nke Jehova emewo onwe ha ndị iro ya. N’ụzọ nile ha kwesịrị ịnata ịbọ ọ́bọ̀ Chineke. Jehova “ga-enwere onwe” ya, ma ọ bụ wezụga ha n’ebe ya onwe ya nọ. Nke a ọ̀ pụtara ikpochapụ ndị ahụ a kpọkwasịrị aha ya kpam kpam? Ee e, n’ihi na Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “M ga-emekwa ka aka m bịaghachi n’ahụ gị, M ga-anụchapụkwa afụrụ ụzụ gị, dị ka e ji akanwụ mee, M ga-ewezụgakwa ihe nile gwara agwa n’ime gị.” (Aịsaịa 1:25) Jehova jizi usoro nnụcha ihe mee ihe dị ka ihe atụ. Onye nnụcha ihe n’oge ochie na-etinyekarị ya akanwụ iji wepụ afụrụ ụzụ n’ọla ahụ dị oké ọnụ ahịa. N’otu ụzọ ahụ, Jehova, bụ́ onye na-adịghị ele ndị ya anya dị ka ndị ọjọọ kpam kpam, ‘ga-adọ ha aka ná ntị ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.’ Ọ ga-ewezụga n’etiti ha nanị “ihe nile gwara agwa”—ndị isi ike, ndị ajọ mmadụ, bụ́ ndị jụrụ ịmụta ihe ma rube isi.c (Jeremaịa 46:28, NW) N’iji okwu ndị a mee ihe, Aịsaịa nwere ihe ùgwù nke idetu akụkọ ihe mere eme tupu ha emee.
25. (a) Olee otú Jehova si nụchaa ndị ya na 607 T.O.A.? (b) Olee mgbe Jehova nụchara ndị ya n’oge a?
25 Jehova nụchara ndị ya n’ezie, wezụga afụrụ ụzụ bụ́ ndị ndú rụrụ arụ na ndị nnupụisi ndị ọzọ. Na 607 T.O.A., ogologo oge mgbe Aịsaịa nwụsịrị, e bibiri Jerusalem ma kpụrụ ndị bi n’ime ya pụọ ka ha gaa biri na Babilọn ruo afọ 70. N’ụzọ ụfọdụ nke a yitewere ihe Chineke mere ọtụtụ afọ ka e mesịrị. Amụma ahụ dị na Malakaị 3:1-5, bụ́ nke e deturu ogologo oge mgbe ije biri na Babilọn gasịrị, gosiri na Chineke ga-arụ ọrụ nnụcha ọzọ. O zoro aka n’oge mgbe Jehova Chineke ga-abịa n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya, ya na “Onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ Jisọs Kraịst. Ihe àmà gosiri na nke a mere mgbe Agha Ụwa Mbụ kwụsịrị. Jehova nyochara ndị nile na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst, na-ekewapụta ndị bụ ya n’eziokwu pụọ na ndị nke ụgha. Gịnị si na ya pụta?
26-28. (a) Gịnị bụ mmezu mbụ nke Aịsaịa 1:26? (b) Olee otú e siworo mezuo amụma a n’oge anyị? (ch) Olee otú amụma a pụrụ isi baara ndị okenye uru taa?
26 Jehova na-aza ya: “M ga-emekwa ka ndị ikpe gị laghachi dị ka na mbụ, M ga-emekwa ka ndị na-adụ gị ọdụ laghachi dị ka ná mmalite: e mesịa a ga-akpọ gị Obodo ezi omume, obodo nke kwesịrị ntụkwasị obi. A ga-eji ikpe gbapụta Zaịọn, a ga-ejikwa ezi omume gbapụta ndị ya na-alọta.” (Aịsaịa 1:26, 27) Jerusalem oge ochie hụrụ mmezu mbụ nke amụma a. Mgbe ndị e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ laghachisịrị n’obodo ha ha hụrụ n’anya na 537 T.O.A., e nweghachikwara ndị ikpe na ndị ndụmọdụ kwesịrị ntụkwasị obi dị ka ọ dị n’oge gara aga. Ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa, onye nchụàjà bụ́ Joshua, odeakwụkwọ bụ́ Ezra, na onye ọchịchị bụ́ Zerubabel, ha nile jere ozi iji chịkwaa ma duzie ihe fọdụrụnụ na-alọtanụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ije ije n’ụzọ Chineke. Otú ọ dị, ọbụna mmezu ka mkpa weere ọnọdụ na narị afọ nke 20.
27 Na 1919, ndị Jehova n’oge a si n’oge ule pụta. A napụtara ha n’ịbụ ohu ime mmụọ nye Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ọdịiche dị n’agbata ndị ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị ụkọchukwu si n’ezi ofufe dapụ nke Krisendọm bịara doo anya. Ọzọkwa Chineke gọziri ndị ya, ‘na-eme ka ndị ikpe na ndị ndụmọdụ laghachitere ha’—ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị na-adụ ndị Chineke ọdụ dị ka Okwu ya si dị ọ bụghị dị ka ọdịnala ụmụ mmadụ si dị. Taa n’etiti “ìgwè atụrụ nta” ahụ na-adalata adalata na ọtụtụ nde na-amụba amụba nke “atụrụ ọzọ” ahụ bụ́ ndị ibe ha, e nwere ọtụtụ puku ndị ikom dị otú ahụ.—Luk 12:32; Jọn 10:16; Aịsaịa 32:1, 2; 60:17; 61:3, 4.
28 Ndị okenye na-eburu n’uche na ha na-arụ ọrụ mgbe ụfọdụ dị ka “ndị ikpe” n’ọgbakọ iji mee ka ọ nọgide na-adị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ na iji gbazie ndị mmehie. Ihe dị ha mkpa nke ukwuu bụ ime ihe n’ụzọ nke Chineke, na-eṅomi echiche ikpe ziri ezi ya dị ebere, nke guzoziri eguzozi. Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọtụtụ okwu, ha na-eje ozi dị ka ‘ndị na-adụ ọdụ.’ N’ezie, nke a dị nnọọ iche n’ịbụ ndị isi ma ọ bụ ndị ọchịchị aka ike, ha na-agbalịsikwa ike ịghara ime mgbe ọ bụla ka o yie ka ha ‘na-eme ndị bụ ihe nketa Chineke dị ka ha bụ ndị nwe ha.’—1 Pita 5:3.
29, 30. (a) Gịnị ka Jehova kwupụtara maka ndị na-ajụ irite uru n’usoro nnụcha ahụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka “ihere” osisi na ubi ha ga-eme ndị ahụ?
29 Olee banyere “afụrụ ụzụ” ahụ e kwuru okwu ya n’amụma Aịsaịa? Gịnị ga-eme ndị jụrụ irite uru n’usoro nnụcha nke Chineke? Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ma ntipịa nke ndị na-emebi iwu na ndị mmehie ga-adị n’otu, a ga-emekwa ka ndị na-ahapụ Jehova gwụsịa. N’ihi na ha ga-eme ihere osisi terebinth nile nke unu chọsiworo ike, unu ga-enwekwa ihu ihere site n’ubi nile a gbara ogige nke unu họpụtaworo.” (Aịsaịa 1:28, 29) Ndị nupụrụ isi ma mehie megide Jehova, leghara ozi ịdọ aka ná ntị nke ndị amụma ya anya ruo mgbe oge gafeworo, ‘tipịara’ n’ezie ma “gwụsịa.” Nke a mere na 607 T.O.A. Otú ọ dị, gịnị ka aka ndị a e zoro n’ebe osisi na ubi dị pụtara?
30 Ndị Juda nwere nsogbu na-adịghị ala ala n’ihe banyere ikpere arụsị. Ha na-ejikarị osisi, ubi, na ebe ndị a kụrụ osisi eme omume ha ndị rụrụ arụ. Dị ka ihe atụ, ndị na-efe Beal na nwunye ya, bụ́ Ashtọret, kwenyere na chi abụọ ahụ na-anwụ, e liekwa ha, n’ọkọchị. Iji mee ka ha teta ma nwee mmekọahụ, na-eme ka ala ahụ mee nri, ndị ahụ na-ekpere arụsị na-ezukọta maka inwe mmekọahụ rụrụ arụ n’okpuru osisi ndị “dị nsọ” n’ebe ndị a kụrụ osisi ma ọ bụ n’ubi. Mgbe mmiri ozuzo malitere, ala malitekwa ime nri, ha na-eto chi ụgha ndị ahụ; ndị ahụ na-ekpere arụsị na-ekwenyesi ike na nkwenkwe ụgha ha. Ma mgbe Jehova mere ka e bibie ndị nnupụisi ahụ na-ekpere arụsị, ọ dịghị chi arụsị chebere ha. “Ihere” osisi na ubi ndị a na-adịghị ike mere ndị nnupụisi ahụ.
31. Gịnị ga-adakwasị ndị ahụ na-ekpere arụsị bụ́ nke dị njọ karịa ihere?
31 Otú ọ dị, ndị Juda na-ekpere arụsị na-aga izute ihe dị njọ karịa ihere. N’ịgbanwe ihe atụ ahụ, Jehova jizi onye ahụ na-ekpere arụsị n’onwe ya tụnyere osisi. “N’ihi na unu ga-adị ka osisi terebinth nke akwụkwọ ya na-akpọnwụ akpọnwụ, na dị ka ubi a gbara ogige nke na-enweghị mmiri.” (Aịsaịa 1:30) N’oge okpomọkụ, nke kpọrọ nkụ, nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ihe atụ a dabara adaba. Ọ dịghị osisi ma ọ bụ ubi pụrụ ịdịte ndụ aka ma ọ́ dịghị enweta mmiri mgbe nile. N’ịbụ nke kpọnwụrụ akpọnwụ, ọ dị mfe karịsịa ihe ọkụkụ dị otú ahụ ịgba ọkụ. N’ihi ya, ihe atụ ahụ dị n’amaokwu nke 31 dabara nnọọ adaba.
32. (a) Ònye bụ ‘nwoke ahụ dị ike’ e zoro aka na ya n’amaokwu nke 31? (b) N’echiche dị aṅaa ka ọ ga-aghọ “eriri nzuzu,” olee “icheku ọkụ” ga-amụnye ya ọkụ, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?
32 “[Nwoke dị ike, NW] ga-aghọkwa eriri nzuzu, ọrụ ya ga-aghọkwa icheku ọkụ; ha abụọ ga-erekwa ọkụ n’otu, ọ dịghịkwa onye na-emenyụ ha.” (Aịsaịa 1:31) Ònye bụ ‘nwoke a dị ike’? Okwu Hibru ahụ na-enye echiche nke ike na akụ̀ na ụba. Ma eleghị anya ọ na-ezo aka n’onye ihe na-agara nke ọma, nke nwere obi ike, bụ́ onye na-ejeso chi ụgha dị iche iche. N’oge Aịsaịa, dị ka ọ dị n’oge anyị, e nwere ọtụtụ ndị ikom jụrụ Jehova na ofufe ya dị ọcha. Ụfọdụ yiri ọbụna ka ha na-enwe ihe ịga nke ọma. Ma, Jehova na-adọ aka ná ntị na ndị ikom dị otú ahụ ga-adị ka “eriri nzuzu,” okpotokpo ụdọ ahịhịa ndị na-adịghị ike ma kpọọ nkụ nke na ha na-adọbisị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ozugbo ọkụ bịara ha nso. (Ndị Ikpe 16:8, 9) Ihe onye na-ekpere arụsị na-arụpụta—ma ọ̀ bụ chi arụsị ya, akụ̀ na ụba ya, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọ na-efe ofufe n’ọnọdụ Jehova—ga-adị ka “icheku ọkụ.” Ma icheku ọkụ ma eriri ga-erepịa, ree kpam kpam n’ime ọkụ nke na-enweghị onye pụrụ imenyụ ya. Ọ dịghị ike dị n’eluigwe na ụwa nke pụrụ ịgbanwe ikpe zuru okè nke Jehova.
33. (a) Olee otú ịdọ aka ná ntị Chineke banyere ikpe na-abịanụ sikwa egosi ebere ya? (b) Ohere dị aṅaa ka Jehova na-enye ihe a kpọrọ mmadụ ugbu a, oleekwa otú nke a si emetụta onye ọ bụla n’ime anyị?
33 Ozi ikpeazụ a ò kwekọrọ n’ozi obi ebere na nke mgbaghara mmehie dị n’amaokwu nke 18? Kpọmkwem! Jehova mere ka e detuo ịdọ aka ná ntị ndị dị otú ahụ na ka ndị ohu ya kpọsaa ya n’ihi na ọ dị ebere. E kwuwerị, “O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ọ bụ ihe ùgwù ezi onye Kraịst ọ bụla nwere taa ịkpọsara ihe a kpọrọ mmadụ ozi ịdọ aka ná ntị Chineke ka ndị nwere nchegharị nwee ike irite uru ná mgbaghara obiọma ya ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Lee ka o si bụrụ obiọma n’akụkụ Jehova inye ihe a kpọrọ mmadụ ohere iso ya “dozie okwu” tupu oge agafee!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka akụkọ ọdịnala oge ochie nke ndị Juu si dị, ajọ Eze Manase mere ka e gbuo Aịsaịa, kwọwaa ya. (Tụlee Ndị Hibru 11:37.) Otu akwụkwọ na-ekwu na iji maa ya ikpe ọnwụ a, otu onye amụma ụgha boro Aịsaịa ebubo na-esonụ: “Ọ kpọwo Jerusalem Sọdọm, ndị isi Juda na Jerusalem ka o kwupụtawokwara (ịbụ) ndị Gọmọra.”
b A na-asụgharịkwa okwu Hibru maka “ike ndị mmụọ ọjọọ” (NW) ịbụ “ihe ọjọọ,” “ihe si n’aka ndị mmụọ ọjọọ,” na “nke hiere ụzọ.” Dị ka Theological Dictionary of the Old Testament si kwuo, ndị amụma bụ́ ndị Hibru jiri okwu ahụ mee ihe iji katọọ “ihe ọjọọ nke iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-akpata.”
c Okwu bụ́ “M ga-emekwa ka aka m bịaghachi n’ahụ gị” pụtara na Jehova ga-agbanwe site n’ịkwado ndị ya gaa n’inye ha ahụhụ.