Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Na-eme Ka Paradaịs Ime Mmụọ Makwuo Mma
    Ụlọ Nche—2015 | Julaị 15
    • 1, 2. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, gịnị ka “ihe mgbakwasị ụkwụ” nwere ike ịpụta?

      JEHOVA CHINEKE kwuru, sị: “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m.” (Aịza. 66:1) O kwukwara banyere “ihe mgbakwasị ụkwụ” ya, sị: “M ga-emekwa ka ebe m gbakwasịrị ụkwụ dị ebube.” (Aịza. 60:13) Olee otú o si eme ya? Ebe ọ bụ na anyị bi ‘n’ihe mgbakwasị ụkwụ’ Chineke, olee uru ime ya ka ọ maa mma baara anyị?

      2 E wezụga ụwa, Akwụkwọ Nsọ Hibru kpọkwara ụlọ nsọ dị n’Izrel oge ochie “ihe mgbakwasị ụkwụ.” (1 Ihe 28:2; Ọma 132:7) Ụlọ nsọ ahụ dị n’ụwa bụ ebe a na-anọ efe Jehova. N’ihi ya, ọ mara mma n’anya ya. Ụlọ nsọ ahụ mekwara ka ihe mgbakwasị ụkwụ Jehova dị ebube.

      3. Gịnị bụ ụlọ nsọ ihe atụ Chineke, oleekwa mgbe ọ malitere?

      3 Ọ bụghịzi n’ụlọ nsọ nkịtị ka a na-anọ efe Jehova taa. Kama, ọ bụ n’ụlọ nsọ ihe atụ, nke na-enye Jehova otuto karịa ụlọ ọ bụla. Ụlọ nsọ ihe atụ a bụ ndokwa Chineke mere ka ụmụ mmadụ nwee ike ịbụ ndị enyi ya ma na-efe ya. Ọ bụ àjà Jizọs chụrụ na ọrụ nchụàjà ọ na-arụ mere ka o kwe omume. Ndokwa a malitere n’afọ 29, mgbe e mere Jizọs baptizim, teekwa ya mmanụ ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà ụlọ nsọ ihe atụ Jehova.—Hib. 9:11, 12.

      4, 5. (a) Olee otú Abụ Ọma nke 99 si kọwaa ihe na-agụsi ndị na-efe Jehova ike? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

      4 Obi dị anyị ezigbo ụtọ n’ihi ndokwa a Chineke mere. Ọ bụ ya mere anyị ji agwa ndị mmadụ banyere aha Jehova nakwa onyinye na-enweghị atụ o nyere anyị, ya bụ, ihe mgbapụta. Obi dịkwa anyị ụtọ na e nwere ihe karịrị nde ezigbo Ndị Kraịst asatọ ji obi ha niile na-eto Jehova kwa ụbọchị. Anyị adịghị ka ụfọdụ ndị okpukpe bụ́ ndị chere na ọ bụ mgbe ha gara eluigwe ka ha ga-eto Chineke. Kama, anyị niile bụ́ Ndịàmà Jehova ma na anyị kwesịrị ịna-eto ya ugbu a n’ụwa ebe a.

      5 N’ihi ya, anyị na-eṅomi ndị ohu Jehova e kwuru okwu ha n’Abụ Ọma 99:1-3, 5. (Gụọ ya.) Ndị fere Chineke n’oge ochie dị ka Mozis, Erọn, na Samuel ji obi ha niile fee Jehova otú ọ chọrọ. (Ọma 99:6, 7) Taa, tupu ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa esoro Jizọs bụrụ ndị nchụàjà n’eluigwe, ha ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi n’ụlọ nsọ ihe atụ ya dị n’ụwa. Ọtụtụ nde ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ji obi ha niile na-akwado ha. (Jọn 10:16) N’agbanyeghị na olileanya ndị e tere mmanụ na nke ndị so n’atụrụ ọzọ dị iche iche, ha ji otu obi na-efe Jehova n’ụwa a bụ́ ihe mgbakwasị ụkwụ Chineke. Ma, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M na-eji ike m niile akwado ndokwa Jehova mere maka ofufe ya?’

  • Na-eme Ka Paradaịs Ime Mmụọ Makwuo Mma
    Ụlọ Nche—2015 | Julaị 15
    • 7 Tupu afọ 1919 agafee, a matara ndị Jehova họpụtara, bụ́ ndị na-efe ya n’ụlọ nsọ ihe atụ ya. A nụchara ha ka Chineke nwee ike nabatakwuo ozi ha na-ejere ya. (Aịza. 4:2, 3; Mal. 3:1-4) Ihe Pọl onyeozi hụrụ n’ọhụụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ malitere imezu.

      8, 9. Kọwaa ihe atọ “paradaịs” ahụ Pọl hụrụ n’ọhụụ pụtara.

      8 A kọwara ihe Pọl hụrụ n’ọhụụ ná 2 Ndị Kọrịnt 12:1-4. (Gụọ ya.) A kpọrọ ihe Pọl hụrụ n’ọhụụ ahụ ‘mkpughe.’ Ihe ahụ ọ hụrụ bụ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụghị ihe na-eme n’oge ya. Gịnị bụ “paradaịs” ahụ Pọl hụrụ mgbe ‘e bugara ya n’eluigwe nke atọ’? Ọ ga-abụ ma paradaịs nkịtị ma nke ime mmụọ ma nke eluigwe. Ha niile ga-abụcha n’ọdịnihu. O nwere ike ịpụta Paradaịs ga-adị n’ụwa n’ọdịnihu. (Luk 23:43) O nwekwara ike ịpụta paradaịs ime mmụọ ga-ezu ezu n’ụwa ọhụrụ. Ihe ọzọ o nwere ike ịpụta bụ ọnọdụ magburu onwe ya e nwere na “paradaịs Chineke” n’eluigwe.—Mkpu. 2:7.

      9 Gịnịkwanụ mere Pọl ji kwuo na ya ‘nụrụ okwu a na-apụghị iji ọnụ kwuo, nke iwu na-akwadoghị ka mmadụ kwuo’? Ọ bụ n’ihi na oge erubeghị ka a kọwaa ihe ndị dị ebube ọ hụrụ n’ọhụụ ahụ. Ma, taa, Jehova chọrọ ka anyị na-akọrọ ndị ọzọ banyere ihe ọma ndị na-eme ugbu a ná nzukọ ya.

      10. Gịnị mere “paradaịs ime mmụọ” na “ụlọ nsọ ihe atụ” abụghị otu ihe?

      10 Anyị na-ekwukarị banyere “paradaịs ime mmụọ.” Gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara ọnọdụ pụrụ iche nke mere ka anyị na Chineke na ụmụnna anyị dịrị n’udo. Ma, anyị ekwesịghị iche na “paradaịs ime mmụọ” na “ụlọ nsọ ihe atụ” bụ otu ihe. Ụlọ nsọ ihe atụ bụ ndokwa Chineke mere ka ndị mmadụ nwee ike ịna-efe ya. Paradaịs ime mmụọ na-eme ka a mata ndị na-efe Chineke n’eziokwu nakwa ndị na-ejere ya ozi taa n’ụlọ nsọ ihe atụ ya.—Mal. 3:18.

      11. Olee ihe ùgwù anyị nwere taa gbasara paradaịs ime mmụọ?

      11 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na kemgbe afọ 1919, Jehova kwere ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-eme ka paradaịs ime mmụọ ya makwuo mma, sikwuo ike, na-agbasakwa. Ì so arụ ọrụ a magburu onwe ya? Ọ̀ na-eme ka i jiri obi gị niile soro Jehova na-eme ka ‘ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ’ dị ebube?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya