Nwa Amaala Ma Ọ Bụ Onye Ala Ọzọ, Chineke Na-anabata Gị!
“O wee site n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile.”—ỌRỤ 17:26.
1. Ọnọdụ ihe isi ike dị aṅaa dị n’ọtụtụ ebe taa n’ihe banyere ịnabata ndị sitere n’omenala ala ọzọ?
AKỤKỌ sitere n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-egosi na n’ọtụtụ ala, a na-enwe nchegbu na-arị elu banyere ndị ala ọzọ, ndị kwagara ná mba ọzọ, ndị gbatara ọsọ ndụ. Ọtụtụ nde mmadụ na-achọsi ike ịkwapụ site n’Esia, Africa, Europe, na n’akụkụ America dị iche iche. Ma eleghị anya ha na-achọ inweta nnapụta pụọ n’ajọ ọnọdụ ịbụ ogbenye, agha obodo, ma ọ bụ mkpagbu. Ma à na-anabata ha n’ebe ọzọ? Magazin bụ́ Time kwuru, sị: “Ka agbụrụ ndị dị na Europe na-amalite ịgbanwe, mba ụfọdụ na-achọpụta na ha adịghị anabata ọdịnala mba ọzọ dị ka ha cheburu na ha na-eme.” N’ime 18,000,000 ndị gbatara ọsọ ndụ “a na-anabataghị,” Time kwuru, sị: “Ihe ịma aka ha na-ewetara mba ndị guzosiri ike agaghị apụ apụ.”
2, 3. (a) Mmesi obi ike dị aṅaa ka Bible na-enye n’ihe metụtara ịnabata ndị mmadụ? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji rite uru site n’inyocha ihe Akwụkwọ nsọ kwuru banyere omume Chineke mesoro ndị mmadụ?
2 N’agbanyeghị ihe ọ bụla bilitere n’akụkụ nke a, Bible na-egosi na Chineke na-anabata ndị nke mba nile—n’agbanyeghị ma mmadụ ọ̀ bụ onye a mụrụ n’ala ya, onye kwatara akwata, ma ọ bụ onye gbatara ọsọ ndụ. (Ọrụ 10:34, 35) ‘Ma,’ ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị ‘olee otú ị ga-esi kwuo ihe dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị nanị Israel oge ochie dị ka ndị ya, na-agụpụ ndị ọzọ?’
3 Ọ dị mma, ka anyị lee otú Chineke si mesoo ndị oge ochie omume. Anyị pụrụ inyochakwa amụma ụfọdụ ndị metụtara ihe ùgwù ndị dịịrị ndị na-efe ezi ofufe taa. Ịtụleghachi okwu amụma nke a pụrụ iwetakwuru gị nghọta nke ga-agba gị ume. Ọ na-egosikwa ụzọ Chineke ga-esi mesoo ndị “si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile” mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị.—Mkpughe 7:9, 14-17.
‘Mba Nile Ga-agọzi Onwe Ha’
4. Olee otú nsogbu nke inwe mba si malite, ma ihe ndị dị aṅaa ka Chineke mere?
4 Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ndị si n’ezinụlọ Noa kpọmkwem mejupụtara ihe nile a kpọrọ mmadụ, ha nile bụkwa ndị na-efe ezi ofufe. Ma ịdị n’otu ahụ gbanwere n’oge na-adịghị anya. N’oge na-adịghị anya, ndị ụfọdụ, n’ileghara uche Chineke anya, malitere iwu otu ụlọ elu. Nke a dujere n’agbụrụ mmadụ ikewa gaa n’òtù asụsụ dị iche iche nke ghọrọ ndị mmadụ na mba ndị gbasara agbasa. (Jenesis 11:1-9) Ma, ezi ofufe nọgidere n’usoro ọmụmụ ahụ nke dugara n’Abraham. Chineke gọziri Abraham onye kwesịrị ntụkwasị obi ma kwe nkwa na nwa ya ga-aghọ mba dị ukwuu. (Jenesis 12:1-3) Mba ahụ bụ Israel oge ochie.
5. N’ihi gịnị ka anyị nile ga-eji nwee obi ike site n’otú Chineke si mesoo Abraham omume?
5 Otú ọ dị, Jehova adịghị agụpụ ndị na-abụghị ndị Israel, n’ihi na nzube ya gbatịrị imetụta ihe nile a kpọrọ mmadụ. Anyị na-ahụ nke a nke ọma site ná nkwa Chineke kwere Abraham: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) Otú ọ dị, ruo ọtụtụ narị afọ, Chineke mesoro Israel omume n’ụzọ pụrụ iche, na-enye ha ụkpụrụ Iwu obodo, na-eme ndokwa maka ndị nchụàjà ịchụ àjà n’ụlọ nsọ ya, na-enyekwa Ala Nkwa ahụ ebe ha ga-ebi.
6. Olee ụzọ ndokwa Chineke meere Israel ga-esi baara mmadụ nile uru?
6 Iwu Chineke nyere Israel dị mma maka ndị nke mba nile n’ihi na o mere ka ọ pụta ìhè na ụmụ mmadụ bụ ndị mmehie, na-egosi mkpa ọ dị inwe àjà zuru okè iji kpuchie mmehie mmadụ ruo mgbe nile. (Ndị Galetia 3:19; Ndị Hibru 7:26-28; 9:9; 10:1-12) Ma, gịnị na-emesi obi ike na Mkpụrụ Abraham—onye mba nile ga-esite na ya gọzie onwe ha—ga-abịa ma nwee iru eru ndị ahụ? Iwu Israel nyekwara aka n’ebe a. Ọ machibidoro isoro ndị Kenean lụrịta di na nwunye, bụ́ ndị a maara nke ọma maka omume na ememe ndị rụrụ arụ ha na-eme, ndị dị ka omenala nke isu ụmụaka ọkụ ná ndụ. (Levitikọs 18:6-24; 20:2, 3; Deuterọnọmi 12:29-31; 18:9-12) Chineke nyere iwu ka e kpochapụ ha na omume ha nile. Nke a ga-ewetara mmadụ nile, gụnyere ndị ọbịa binyeere ha, abamuru ga-adịru ogologo oge, ebe ọ bụ na ọ ga-arụ ọrụ ime ka usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ ghara ịbụ nke e merụrụ emerụ.—Levitikọs 18:24-28; Deuterọnọmi 7:1-5; 9:5; 20:15-18.
7. Ihe ngosi dị aṅaa n’oge gboo ka e nwere na Chineke na-anabata ndị ọbịa?
7 Ọbụna mgbe Iwu ahụ ka dị irè, mgbe Chineke lekwara Israel anya dị ka ndị pụrụ iche, o gosiri ndị na-abụghị ndị Israel ebere. E gosipụtawo njikere ọ dị ime otú ahụ mgbe Israel zọpụrụ ije pụọ n’agbụ Ijipt ịga n’ala nke aka ya. “Ọtụtụ ndị gwara ọgwa sooro ha rịgoo.” (Ọpụpụ 12:38) Professor C. F. Keil kọwara ndị ahụ dị ka “oké ìgwè nke ndị mba ọzọ . . . ndị gwara ọgwa, ma ọ bụ ìgwè mmadụ nke mba dị iche iche.” (Levitikọs 24:10; Ọnụ Ọgụgụ 11:4) Ma eleghị anya ọtụtụ bụ ndị Ijipt bụ́ ndị nakweere ezi Chineke ahụ.
Nnabata nye Ndị Ala Ọzọ
8. Olee otú ndị Gibeọn si nweta ọnọdụ n’etiti ndị Chineke?
8 Ka Israel na-emezu ihe Chineke nyere n’iwu ikpochapụ mba ndị rụrụ arụ n’Ala Nkwa ahụ, o chebere otu òtù ndị mba ọzọ, bụ́ ndị Gibeọn, ndị bi n’ebe ugwu nke Jerusalem. Ha zigaara Joshua ndị nnọchianya zochiri ụdị ndị ha bụ, na-achọ mmekọrịta udo ma na-enweta ya. Mgbe a chọpụtara aghụghọ ha ghọrọ, Joshua nyere iwu na ndị Gibeọn ga-eje ozi dị ka “ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri banyere nzukọ Israel, banyekwara ebe ịchụàjà Jehova.” (Joshua 9:3-27) Taa ọtụtụ ndị kwagara ná mba ọzọ na-anakwerekwa ọnọdụ ije ozi dị ala iji ghọọ akụkụ nke ndị ọhụrụ.
9. Olee otú ihe nlereanya Rehab na ezinụlọ ya si enye agbamume n’ihe banyere ndị ala ọzọ bi n’Israel?
9 Ọ pụrụ ịgba gị ume ịmara na nnabata nke Chineke abụghị nanị maka òtù dị iche iche nke ndị mba ọzọ n’oge ahụ; a nabatakwara ndị mmadụ n’otu n’otu. Taa mba ụfọdụ na-anabata nanị ndị nkwafete nọ n’ọkwá dị elu, ndị nwere akụ na ụba ha ga-emefu, ma ọ bụ ndị gụrụ oké akwụkwọ. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ebe Jehova nọ, dị ka anyị hụrụ n’otu ihe mere nnọọ tupu okwu ndị Gibeọn ahụ adapụta. Nke a metụtara otu onye Kenean na-anọghị n’ọkwá dị n’elu n’ezie. Bible kpọrọ ya “Rehab, bụ́ nwanyị na-akwa iko.” N’ihi okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ, a zọpụtara ya na ezinụlọ mgbe Jeriko dakpọrọ. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye ala ọzọ, ndị Israel nabatara ya. Ọ bụ ihe nlereanya nke okwukwe nke anyị kwesịrị iṅomi. (Ndị Hibru 11:30, 31, 39, 40; Joshua 2:1-21; 6:1-25) Ọ ghọrọ ọbụna nne ochie nke Mesaịa ahụ.—Matiu 1:5, 16.
10. Nnabata a nabatara ndị ala ọzọ n’Israel dabeere na gịnị?
10 A nabatara ndị na-abụghị ndị Israel n’Ala Nkwa ahụ n’ikwekọ ná mgbalị ha mere ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. A gwara ndị Israel ka ha ghara iso ndị na-adịghị efe Jehova nwee mmekọrịta, karịsịa n’ụzọ okpukpe. (Joshua 23:6, 7, 12, 13; 1 Ndị Eze 11:1-8; Ilu 6:23-28) Ma, ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Israel bi n’ala ha rubere isi n’iwu ndị bụ isi. Ndị ọzọ ghọrọ ọbụna ndị na-eso ụzọ e bere úgwù, Jehova nabatakwara ha n’ụzọ zuru ezu dị ka ndị so n’ọgbakọ ya.—Levitikọs 20:2; 24:22; Ọnụ Ọgụgụ 15:14-16; Ọrụ 8:27.a
11, 12. (a) Olee otú ndị Israel ga-esi mesoo ndị ala ọzọ so ha na-efe ofufe? (b) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji dị mkpa anyị ime nke ọma karị n’ịgbaso ihe nlereanya Jehova?
11 Chineke nyere ndị Israel ntụziaka ka ha ṅomie agwa ya n’ebe onye ala ọzọ na-efe ya ofufe nọ: “Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt.” (Levitikọs 19:33, 34; Deuterọnọmi 1:16; 10:12-19) Nke a na-akụziri anyị otu ihe, ọ bụ ezie na anyị anọghị n’okpuru Iwu ahụ. Ọ dị mfe ịmalite inwe ịkpọasị na ibu iro n’ebe ndị agbụrụ, mba, ma ọ bụ omenala ọzọ nọ. Ya mere, ọ ga-adị mma anyị ịjụ, sị: ‘Ana m agbalị ikpochapụ n’ime onwe m ịkpọasị ndị dị otú ahụ, na-agbaso ihe nlereanya nke Jehova?’
12 Ndị Israel nwere ihe àmà a hụrụ anya nke nnabata Chineke. Eze Solomọn kpere ekpere, sị: “Banyere onye ala ọzọ, nke ọ bụghị ná ndị gị, bụ́ Israel, ka o sitere, ma o siwo n’ala dị anya bịa n’ihi aha gị . . . mgbe ọ ga-abịakwa kpee ekpere n’ebe ụlọ a dị; gị onwe gị nụrụkwa n’eluigwe . . . ka ndị nile nke ụwa wee mara aha gị, ịtụ egwu gị.”—1 Ndị Eze 8:41-43; 2 Ihe Emere 6:32, 33.
13. N’ihi gịnị ka Chineke ji mee ndokwa ịgbanwe mmeso nile ọ na-emeso Israel?
13 Ka Jehova nọgidere na-eji mba Israel na-eme ihe dị ka ndị ya, wee si otú a na-echebe usoro ọmụmụ nke Mesaịa ahụ, Chineke buru amụma banyere mgbanwe ndị dị mkpa. Ná mbụ, mgbe ndị Israel kwetara ịnọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu, Chineke kwuru na ha pụrụ ịbụ ebe bụ isi nke “alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:5, 6) Ma Israel gosipụtara ekwesịghị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ narị afọ. Ya mere Jehova buru amụma na ya gaje inwe ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke a ga-anọ n’ime ya gbaghara ndị mejupụtara “ụlọ Israel” ngahie na mmehie ha. (Jeremaịa 31:33, 34) Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ cheere Mesaịa ahụ ịbịa, bụ́ onye àjà ya ga-ehichapụ mmehie nke ọtụtụ ndị n’ezie.—Aịsaịa 53:5-7, 10-12.
Ndị Israel n’Eluigwe
14. “Israel” ọhụrụ dị aṅaa ka Jehova nabatara, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
14 Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-enyere anyị aka ịghọta ụzọ e si mezuo ihe ndị a nile. Jisọs bụ Mesaịa ahụ, onye ọnwụ ya mezuru Iwu ahụ ma mee ka e nwee ihe mgbakwasị ụkwụ maka mgbaghara mmehie n’ụzọ zuru ezu. Iji nweta abamuru ahụ, ọ dịghị mkpa mmadụ ịbụ onye Juu e bere úgwù n’anụ ahụ. Ee e. Pọl onyeozi dere na n’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, “onye nke bụ onye Juu n’ihe zoro ezo, onye ahụ bụ onye Juu; obibi úgwù bụkwa nke mkpụrụ obi, n’ime mmụọ, ọ bụghị ihe e deworo n’akwụkwọ.” (Ndị Rom 2:28, 29; 7:6) Ndị tinyere okwukwe n’àjà Jisọs nwetara mgbaghara, Chineke nwapụtakwara ha dị ka ‘ndị Juu n’ime mmụọ,’ ndị mejupụtara mba ime mmụọ a kpọrọ “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16.
15. N’ihi gịnị ka mba ebe a mụrụ mmadụ na-ejighị bụrụ isi ihe dị n’ịbụ akụkụ nke Israel ime mmụọ?
15 Ee, ịbụ onye a nabatara n’Israel ime mmụọ adabereghị n’isite n’otu mba ma ọ bụ agbụrụ. Ụfọdụ, dị ka ndị ozi Jisọs, bụ ndị Juu n’anụ ahụ. Ndị ọzọ, dị ka onye ọchịagha ndị Rom ahụ bụ Kọniliọs, bụ ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. (Ọrụ 10:34, 35, 44-48) Pọl kwuru ihe ziri ezi banyere Israel ime mmụọ, sị: ‘Onye Grik na onye Juu, obibi úgwù na ebighị úgwù, onye na-asụ asụsụ ọzọ, onye Sitia, ohu, onye nweere onwe ya apụghị ịdị.’ (Ndị Kọlọsi 3:11) Ndị ahụ e ji mmụọ nsọ Chineke tee mmanụ ghọrọ “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.”—1 Pita 2:9; tụlee Ọpụpụ 19:5, 6.
16, 17. (a) Òkè dị aṅaa ka Israel ime mmụọ nwere na nzube Chineke? (b) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ichebara ndị ahụ na-abụghị Israel nke Chineke echiche?
16 Ọdịnihu dị aṅaa ka Israel ime mmụọ nwere ná nzube Chineke? Jisọs zara, sị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze ya.” (Luk 12:32) Ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị ‘ala ha dị n’eluigwe,’ ga-abụ ndị ga-eso Nwa Atụrụ ahụ bụrụ eze n’ọchịchị Alaeze ya. (Ndị Filipaị 3:20; Jọn 14:2, 3; Mkpughe 5:9, 10) Bible na-egosi na ndị a bụ ndị ‘a kararịị akara site n’ụmụ Israel,’ bụrụkwa ndị “a gbatara n’etiti mmadụ, ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ.” Ọnụ ọgụgụ ha dị 144,000. Otú ọ dị, mgbe o mesịrị ihe ndekọ nke ọnụ ọgụgụ nke a bụ nke a kara akara, Jọn mere ka a mata òtù ọzọ dị iche—“oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.”—Mkpughe 7:4, 9; 14:1-4.
17 Ụfọdụ pụrụ iche, sị: ‘Gịnị banyere ọtụtụ nde ndị na-abụghị akụkụ nke Israel ime mmụọ, dị ka ndị ahụ pụrụ ịgabiga oké mkpagbu ahụ dị ka oké ìgwè mmadụ ahụ? Òkè dị aṅaa ka ha nwere taa n’ihe metụtara mmadụ ole na ole fọdụrụ n’Israel ime mmụọ?’b
Ndị Ala Ọzọ n’Amụma
18. Gịnị dujere ná nlaghachi Israel site ná ndọrọ n’agha nke Babilọn?
18 N’ịlaghachi azụ n’oge ahụ mgbe Israel nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ma ghara ikwesị ntụkwasị obi nye ya, anyị hụrụ na Chineke kpebiri ịhapụ ka ndị Babilọn mee ka Israel tọgbọrọ n’efu. N’afọ 607 T.O.A., a dọọrọ Israel laa n’agha ruo 70 afọ. Mgbe ahụ Chineke gbapụtara mba ahụ. N’okpuru idu ndú nke Onye Ọchịchị bụ Zerubabel, ihe fọdụrụ n’ime Israel anụ ahụ laghachiri n’ala ha. Ndị ọchịchị nke Midia na Peasia, bụ́ ndị kwatuworo Babilọn n’ọkwá ọchịchị, nyeere ọbụna ndị ahụ na-alaghachi n’ala ha aka inweta ihe ndị dị mkpa. Akwụkwọ Aịsaịa buru amụma banyere ihe omume ndị a. (Aịsaịa 1:1-9; 3:1-26; 14:1-5; 44:21-28; 47:1-4) Ezra kọkwaara anyị n’ụzọ zuru ezu akụkọ ihe mere eme banyere nlaghachi ahụ.—Ezra 1:1-11; 2:1, 2.
19. N’ihe metụtara nlaghachi nke Israel, ihe ngosi dị aṅaa nke amụma ka e nwere na ndị ala ọzọ ga-eso na ya?
19 Ma, n’ibu amụma banyere mgbapụta na nlaghachi nke ndị Chineke, Aịsaịa buru amụma nke a na-akpali akpali: “Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.” (Aịsaịa 59:20; 60:3) Nke a pụtara ihe karịrị na a na-anabata ndị ala ọzọ n’otu n’otu, n’ikwekọ n’ekpere Solomọm. Aịsaịa na-arụ aka gaa ná mgbanwe pụrụ iche n’ọnọdụ. “Mba nile” ga-eso ụmụ Israel jee ozi: “Ụmụ ala ọzọ ga-ewukwa mgbidi gị nile, ndị eze ha ga-ejekwara gị ozi: n’ihi na n’iwe m ka m tiworo gị ihe, ma na mgbe ihe gị na-atọ m ụtọ ka m nweworo obi ebere n’ahụ gị.”—Aịsaịa 60:10.
20, 21. (a) Myirịta dị aṅaa ka anyị na-ahụ n’oge a nke yiri nlaghachi Israel site ná ndọrọ gaa n’agba? (b) Olee ụzọ e si tụkwasị ‘ụmụ ndị ikom na ndị inyom’ n’Israel ime mmụọ?
20 N’ọtụtụ akụkụ, Israel ịga na ịlata site ná ndọrọ n’agha nwere ihe o yiri nke mere n’oge a n’ebe Israel ime mmụọ nọ. Tupu Agha Ụwa Mbụ, ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ adịghị emecha ihe kwekọrọ n’uche Chineke; ha jigidere ụfọdụ echiche na omume ndị ha nwetara site na chọọchị nile nke Krisendọm. Mgbe ahụ, n’oge ọgba aghara nke agha ahụ nakwa n’akụkụ ụfọdụ site ná nranye nke ndị ụkọchukwu, a tụrụ ndị na-edu ndú n’etiti ihe ahụ fọdụrụ n’Israel ime mmụọ mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi. Mgbe agha ahụ gasịrị, na 1919 O.A., a tọhapụrụ ndị ahụ e tere mmanụ nọ n’ụlọ mkpọrọ nkịtị ma kwuo na ikpe ọ bụla amaghị ha. Nke a gosipụtara na a tọhapụrụ ndị Chineke site ná ndọta n’agha gaa na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze zuru ụwa ọnụ nke okpukpe ụgha. Ndị ya gara n’ihu iwu na ịnọ na paradaịs ime mmụọ.—Aịsaịa 35:1-7; 65:13, 14.
21 E mere ka nke a pụta ìhè ná nkọwa Aịsaịa pụta ìhè: “Ha nile achịkọtawo onwe ha, ha abịakwutewo gị: ụmụ gị ndị ikom ga-esi n’ebe dị anya bịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ gị. Mgbe ahụ ị ga-ahụ wee nwuo enwu, obi gị ga-atụkwa oké egwu, saa mbara; n’ihi na a ga-echigharikwute gị ihe bara ụba nke oké osimiri, akụ nke mba dị iche iche ga-abịakwute gị.” (Aịsaịa 60:4, 5) N’ime ọtụtụ iri afọ ndị sochiworonụ, ‘ụmụ ndị ikom na ndị inyom’ nọgidere na-abata, na-abụ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ imejupụta ọnọdụ ndị ikpeazụ dị n’Israel ime mmụọ.
22. Olee ụzọ “ndị ala ọzọ” siworo bịa isoro ndị Israel ime mmụọ rụkọọ ọrụ?
22 Gịnị banyere ‘ndị ala ọzọ ndị ga-ewu mgbidi gị’? Nke a emewokwa n’oge anyị a. Ka ọkpụkpọ nke 144,000 na-abịaru ná ngwụsị ya, oké ìgwè mmadụ sitere ná mba nile malitere inubata isoro Israel ime mmụọ na-efe ofufe. Ndị ọhụrụ a nwere olileanya ahụ dabeere na Bible nke ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ paradaịs. Ọ bụ ezie na ebe ha ga-emesị nọrọ n’ihi ije ozi ha n’ikwesị ntụkwasị obi ga-adị iche, ha nwere obi ụtọ inyere ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ aka n’ikwusa ozi ọma banyere Alaeze ahụ.—Matiu 24:14.
23. Ruo ókè hà aṅaa ka “ndị ala ọzọ” nyewooro ndị e tere mmanụ aka?
23 Taa, ihe karịrị 4,000,000 ndị bụ “ndị ala ọzọ,” tinyere ihe fọdụrụ ná ndị ahụ ‘ala ha dị n’eluigwe,’ na-egosipụta nrara ha nye Jehova. Ọtụtụ n’ime ha, ndị ikom na ndị inyom, ndị na-eto eto na ndị agadi, nọ n’ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ. N’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ihe karịrị 66,000 ọgbakọ, ndị ala ọzọ dị otú ahụ na-ebu ibu ọrụ dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Ihe ahụ fọdụrụ na-enwe ọṅụ na nke a, ebe ha na-ahụ mmezu nke okwu Aịsaịa: “Ndị ala ọzọ ga-eguzo na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu, ụmụ ala ọzọ ga-abụkwa ndị ọrụ ubi unu na ndị ọrụ ubi vine unu.”—Aịsaịa 61:5.
24. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee agbamume site n’otú Chineke si mesoo ndị Israel na ndị ọzọ ihe n’oge gara aga?
24 Ya mere n’agbanyeghị ná mba ọ bụla nke ụwa nke ị bụ nwa amaala, onye kwafetere akwafete, ma ọ bụ onye gbatara ọsọ ndụ, i nwere ohere ahụ dị oké mma nke ịghọ onye ala ọzọ n’ụzọ ime mmụọ nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na-eji obi ya nile anabata. Nnabata ya gụnyere ohere nke inwe ihe ùgwù dị iche iche n’ozi ya ma ugbu a ma n’ọdịnihu ebighị ebi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ọdịiche dị n’etiti “onye ọbịa bi ebi,” “onye bi n’ala ọzọ,” “onye ọbịa,” na “onye ala ọzọ,” lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta 1, peji 72-75, 849-851, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Ihe karịrị 10,600,000 bịara ememe ncheta a na-eme kwa afọ nke Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ́ nke Ndịàmà Jehova mere na 1991, ma nanị 8,850 kwuru na ha so n’ihe fọdụrụ nke Israel ime mmụọ.
Ị̀ Rịbara Ihe Ndị a Ama?
◻ Olee otú Chineke si mee ka e nwee olileanya na Ya ga-anabata ndị nke mba nile?
◻ Gịnị na-egosi na ndị na-abụghị ndị pụrụ iche nke Chineke, bụ́ Israel, pụrụ ịbịakwute Ya?
◻ N’amụma, olee ụzọ Chineke si gosi na ndị ala ọzọ ga-esonyere Israel?
◻ Gịnị yiworo nlaghachi Israel site ná ndọrọ n’agha na Babilọn, oleekwa ụzọ “ndị ala ọzọ” siworo sonye na ya.
[Foto dị na peeji nke 9]
Eze Solomọn kpere ekpere banyere ndị ala ọzọ bụ́ ndị ga-abịa ife Jehova