Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ezi Omume Epuo na Zaịọn
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
    • 17. (a) Gịnị ka a ga-akpọ ndị so n’Israel nke Chineke? (b) Olee nanị àjà a chọrọ maka mgbaghara nke mmehie?

      17 Olee banyere Israel nke Chineke? Jehova na-agwa ha site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “A ga-akpọ unu onwe unu ndị nchụàjà nke Jehova: ndị na-ejere Chineke anyị ozi ka a ga-asị na unu bụ: akụ̀ nke mba dị iche iche ka unu ga-eri, ọ bụkwa ná nsọpụrụ ha ka unu ga-anya isi.” (Aịsaịa 61:6) N’Israel oge ochie, Jehova mere ka e nwee ndị nchụàjà sitere n’ebo Livaị ịchụ àjà maka ndị Israel ibe ha nakwa ndị nchụàjà ahụ n’onwe ha. Otú ọ dị, na 33 O.A., Jehova kwụsịrị iji ndị nchụàjà sitere n’ebo Livaị eme ihe ma guzobe ndokwa ka mma. Ọ nakweere ndụ zuru okè nke Jisọs dị ka àjà maka mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ. Kemgbe ahụ, ọ dịghị àjà ọzọ a chọrọ. Àjà Jisọs dị irè ruo oge nile.—Jọn 14:6; Ndị Kọlọsi 2:13, 14; Ndị Hibru 9:11-14, 24.

      18. Ụdị ndị nchụàjà dị aṅaa ka Israel nke Chineke ghọrọ, gịnịkwa bụ ọrụ e nyere ha?

      18 Mgbe ahụ, olee otú ndị so n’Israel nke Chineke si bụrụ “ndị nchụàjà nke Jehova”? Ka ọ na-edegara ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ akwụkwọ, Pita onyeozi sịrị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Ya mere, dị ka otu ìgwè, ndị Kraịst e tere mmanụ bụ òtù ndị nchụàjà, ndị nwere ọrụ a kapịrị ọnụ: ịgwa mba nile banyere ebube Jehova. Ha gaje ịbụ ndị àmà ya. (Aịsaịa 43:10-12) Eri mgbe ikpeazụ a, ndị Kraịst e tere mmanụ ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ a dị oké mkpa. N’ihi ya, ọtụtụ nde mmadụ so ha ugbu a na-arụ ọrụ ịgba àmà banyere Alaeze Jehova.

      19. Ozi dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enwe ihe ùgwù ije?

      19 Ọzọkwa, ndị so n’Israel nke Chineke nwere atụmanya nke ije ozi dị ka ndị nchụàjà n’ụzọ ọzọ. Mgbe ha nwụrụ, a na-akpọlite ha n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ nke ndị bụ́ mmụọ n’eluigwe. Ha ga-eje ozi n’ebe ahụ, ọ bụghị nanị dị ka ndị ha na Jisọs ga-eso chịa n’Alaeze ya, kamakwa dị ka ndị nchụàjà nke Chineke. (Mkpughe 5:10; 20:6) N’ihi ya, ha ga-enwe ihe ùgwù nke iji abamuru ndị sitere n’àjà mgbapụta Jisọs mee ihe maka ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’ụwa. N’ọhụụ Jọn onyeozi, nke e dekọrọ ná Mkpughe isi 22, a kọwara ha ọzọ dị ka “osisi.” A hụrụ “osisi” 144,000 ahụ dum n’eluigwe, ha na-amị “ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:1, 2) Lee ije ozi nchụàjà magburu onwe ya nke ahụ bụ!

  • Ezi Omume Epuo na Zaịọn
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
    • a Aịsaịa 61:5 pụrụ inweworị mmezu n’oge ochie, ebe ọ bụ na ndị na-abụghị ndị Juu sonyeere ndị Juu n’anụ ahụ mgbe ha na-alaghachi Jerusalem, ma eleghịkwa anya, nye aka n’iweghachi ala ahụ n’ọnọdụ ya. (Ezra 2:43-58) Otú ọ dị, malite n’amaokwu nke 6 amụma ahụ yiri ka ọ na-emetụta nanị Israel nke Chineke.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya