Isi nke Iri Abụọ na Atọ
“Aha Ọhụrụ”
1. Mmesi obi ike dị aṅaa ka e dekọrọ n’Aịsaịa isi 62?
MMESIGHACHI obi ike, nkasi obi, olileanya mweghachi—ọ bụ ihe dị ndị Juu nwere nkụda mmụọ bụ́ ndị nọ na Babilọn mkpa. Ọtụtụ iri afọ agafewo kemgbe e bibiri Jerusalem na ụlọukwu ya. Ihe dị ka kilomita 800 site na Babilọn, Juda tọgbọrọ chakoo, ndị Juu yikwara ka Jehova ò chezọwo ha. Olee ihe pụrụ ime ka ọnọdụ ha ka mma? Ọ bụ nkwa Jehova kwegasịrị na ya ga-akpọlata ha ma kwe ka ha weghachi ofufe dị ọcha. Mgbe ahụ aha ndị na-egosi nnwapụta Chineke ga-anọchi nkọwa ndị dị ka “a hapụrụ ahapụ” na “tọgbọrọ n’efu.” (Aịsaịa 62:4; Zekaraịa 2:12) Nkwa ndị a jupụtara n’isi 62 nke Aịsaịa. Otú ọ dị, dị ka amụma mweghachi ndị ọzọ, isiakwụkwọ a na-atụle isiokwu ndị na-abụghị nanị banyere ntọhapụ nke ndị Juu ná ndọrọ n’agha na Babilọn. Ná mmezu ya bụ́ isi, Aịsaịa isi 62 na-emesi anyị obi ike na nzọpụta nke mba ime mmụọ Jehova, bụ́ “Israel nke Chineke,” bụ nke e ji n’aka.—Ndị Galetia 6:16.
Jehova Agaghị Anọ Jụụ
2. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si meere Zaịọn amara ọzọ?
2 E meriri Babilọn na 539 T.O.A. Ka ọ gasịrị, Eze Saịrọs nke Peasia nyere iwu nke mere ka ndị Juu na-atụ egwu Chineke nwee ike ịlaghachi Jerusalem ma weghachi ofufe Jehova. (Ezra 1:2-4) Na 537 T.O.A., ndị Juu mbụ na-alọtanụ rutere n’ala nna ha. Ọzọkwa, Jehova meere Jerusalem amara, dị ka a na-ahụ ná mmetụta ịhụnanya dị n’okwu amụma ya: “N’ihi Zaịọn m gaghị edebe ọnụ m duu, na n’ihi Jerusalem m gaghị anọ jụụ, ruo mgbe ezi omume ya ga-apụta ìhè dị ka onwu maramara, nzọpụta ya kwa dị ka ọwa nke na-enwu enwu.”—Aịsaịa 62:1.
3. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji mesịa jụ Zaịọn elu ala, ònyekwa nọchiri ya? (b) Ndapụ dị aṅaa weere ọnọdụ, olee mgbekwa, ọ̀ bụkwa n’oge dị aṅaa ka anyị na-ebi n’ime ya ugbu a?
3 Na 537 T.O.A., Jehova mezuru nkwa ya nke bụ́ iweghachi Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem. Ọ zọpụtara ndị bi n’ime ya, ezi omume ha nwupụkwara. Otú ọ dị, ka e mesịrị, ha si n’ofufe dị ọcha kpafuo ọzọ. N’ikpeazụ, ha jụrụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ, n’ikpeazụ Jehova gbahapụkwara ha dị ka mba ọ họọrọ. (Matiu 21:43; 23:38; Jọn 1:9-13) Jehova mere ka a mụọ mba ọhụrụ, bụ́ “Israel nke Chineke.” Mba ọhụrụ a ghọrọ ndị ya pụrụ iche, na narị afọ mbụ kwa, ndị so na ya ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ n’ụwa nile dị n’oge ahụ. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Kọlọsi 1:23) N’ụzọ dị mwute, mgbe ndị ozi nwụsịrị, e nwere ndapụ n’ezi okpukpe. N’ihi ya, ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke si n’ezi ofufe dapụ malitere ịdị, dị ka ọ dị taa na Krisendọm. (Matiu 13:24-30, 36-43; Ọrụ 20:29, 30) Ruo ọtụtụ narị afọ, a gbachiwo Krisendọm nkịtị ka ọ na-ewetara aha Jehova nkọcha dị ukwuu. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, na 1914, “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ” malitere, tinyere mmezu gbara ọkpụrụkpụ nke akụkụ a nke amụma Aịsaịa.—Aịsaịa 61:2.
4, 5. (a) Ole ndị ka Zaịọn na ụmụ ya bụ ihe atụ ha taa? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova siworo jiri Zaịọn mee ka ‘nzọpụta ya dị ka ọwa nke na-enwu enwu’?
4 Taa nkwa Jehova kwere iweghachi Zaịọn emezuwo n’ahụ nzukọ ya nke eluigwe, bụ́ “Jerusalem nke dị n’elu,” nke ụmụ ya, bụ́ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, na-anọchite anya ya n’elu ala. (Ndị Galetia 4:26) Nzukọ eluigwe nke Jehova na-eje ozi dị ka onye inyeaka nke raara onwe ya nye—nke mụ anya, nke na-ahụ n’anya, nke dịkwa uchu. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ mgbe ọ mụrụ Alaeze Mesaịa ahụ na 1914! (Mkpughe 12:1-5) Malite na 1919 karịsịa, ụmụ ya ndị nọ n’elu ala ekwusaworo mba dị iche iche ezi omume na nzọpụta ya. Dị ka Aịsaịa buru n’amụma, ụmụ ndị a emewo ka ìhè nwuo n’ime ọchịchịrị ahụ dị ka ọwa, na-eme ka ìhè ha nwupụta.—Matiu 5:15, 16; Ndị Filipaị 2:15.
5 Jehova nwere oké mmasị n’ebe ndị na-efe ya ofufe nọ, ọ gaghịkwa ezu ike, ma ọ bụ nọrọ jụụ ruo mgbe o mezuworo ihe nile o kwere Zaịọn na ụmụ ya ná nkwa. Ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ tinyere ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ na-ajụkwa idere duu. (Jọn 10:16) N’ezie a na-anụ olu ha ka ha na-egosi ndị mmadụ ụzọ nzọpụta e nwere nanị ya.—Ndị Rom 10:10.
“Aha Ọhụrụ” nke Jehova Nyere
6. Gịnị ka Jehova bu n’uche maka Zaịọn?
6 Gịnị ka Jehova bu n’uche maka Zaịọn, bụ́ “nwanyị” eluigwe ya, nke Jerusalem oge ochie nọchitere anya ya? Ọ na-ekwu, sị: “Mba dị iche iche ga-ahụkwa ezi omume gị, eze nile ga-ahụ nsọpụrụ gị: a ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ nke ọnụ Jehova ga-agụ.” (Aịsaịa 62:2) Ka ndị Israel na-eme ihe n’ezi omume, a na-amanye mba dị iche iche iji oké mmasị na-ele ha. A na-amanye ọbụna ndị eze ikweta na Jehova ji Jerusalem na-eme ihe nakwa na ịchịisi ọ bụla ha na-achị enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere Alaeze Jehova.—Aịsaịa 49:23.
7. Gịnị ka aha ọhụrụ nke Zaịọn na-egosi?
7 Ugbu a Jehova kwadoro ọnọdụ gbanwere agbanwe nke Zaịọn site n’ịgụ ya aha ọhụrụ. Aha ọhụrụ ahụ na-egosi ọnọdụ a gọziri agọzi na ọkwá dị ùgwù nke ụmụ elu ala nke Zaịọn nọ na ya malite na 537 T.O.A.a Ọ na-egosi na Jehova kwetara na Zaịọn bụ nke ya. Taa, obi dị Israel nke Chineke ụtọ nke ukwuu ịbụ ihe na-enye Jehova obi ụtọ n’ụzọ dị otú a, atụrụ ọzọ ahụ sokwa ha na-aṅụrị ọṅụ.
8. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova siworo nye Zaịọn nsọpụrụ?
8 Ebe o nyeworo Zaịọn aha ọhụrụ, Jehova na-ekwe nkwa ugbu a, sị: “Ị ga-aghọkwa okpueze nke ịma mma n’aka Jehova, na ákwà ike n’isi nke alaeze n’ọbụ aka Chineke gị.” (Aịsaịa 62:3) Jehova na-eweli nwunye ihe atụ ya, bụ́ Zaịọn nke eluigwe, elu ka e jiri oké mmasị na-ekiri ya. (Abụ Ọma 48:2; 50:2) Okpueze nke ịma mma na “ákwà ike n’isi nke alaeze” na-egosi na e yikwasịrị ya nsọpụrụ na ikike dị ka uwe. (Zekaraịa 9:16) N’ịnọchite anya Zaịọn nke eluigwe, ma ọ bụ “Jerusalem nke dị n’elu,” Israel nke Chineke bụ ihe kwesịrị ịrịba ama nke sitere n’aka Chineke—ike ya nke o tinyere n’ihe—nke nọ n’ọrụ. (Ndị Galetia 4:26) Site n’enyemaka Jehova, mba ime mmụọ ahụ enwewo ihe ndekọ dị ịrịba ama nke nguzosi ike n’ezi ihe na nraranye. A na-ewusi ọtụtụ nde mmadụ ike, gụnyere ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ, igosipụta okwukwe na ịhụnanya dị ịrịba ama. N’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst, ndị e tere mmanụ, ebe ha nwetaworo ụgwọ ọrụ eluigwe ha dị ebube, ga-abụ ngwá ọrụ n’aka Jehova iji bulie ihe e kere eke nke na-asụ ude gaa ná ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 8:21, 22; Mkpughe 22:2.
‘Ihe Gị Atọwo Jehova Ụtọ’
9. Kọwaa mgbanwe Zaịọn ga-enwe.
9 Ịgụ aha ọhụrụ so ná mgbanwe ahụ na-enye obi ụtọ nke Zaịọn nke eluigwe nwere bụ́ nke ụmụ ya nọ n’elu ala nọchitere anya ya. Anyị na-agụ, sị: “A gaghị agụkwa gị aha Nwanyị a hapụrụ ahapụ ọzọ; a gaghị agụkwa ala gị aha Ala tọgbọrọ n’efu ọzọ: n’ihi na gị ka a ga-akpọ [Ihe Ya Na-atọ M Ụtọ, NW], a ga-akpọkwa ala gị [Onye E Nwe Enwe Dị Ka Nwunye, NW]: n’ihi na ihe gị na-atọ Jehova ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dị ka nwunye.” (Aịsaịa 62:4) Zaịọn elu ala tọgbọrọ n’efu kemgbe e bibiri ya na 607 T.O.A. Otú ọ dị, ihe Jehova kwuru na-emesi ya obi ike banyere mweghachi na mbijupụtaghachi nke ala ya. Zaịọn ahụ nke nwere mgbe e bibiri ya ebibi agakwaghị abụ nwanyị a hapụrụ kpam kpam, ala ya agakwaghị abụ ebe tọgbọrọ n’efu. Mweghachi e weghachiri Jerusalem na 537 T.O.A. pụtara ọnọdụ ọhụrụ nye ya, n’ụzọ dị nnọọ iche n’ọnọdụ ya mbụ nke ịbụ ebe e bibiri ebibi. Jehova kwupụtara na a ga-akpọ Zaịọn “Ihe Ya Na-atọ M Ụtọ,” kpọọkwa ala ya, “Onye E Nwe Enwe Dị Ka Nwunye.”—Aịsaịa 54:1, 5, 6; 66:8; Jeremaịa 23:5-8; 30:17; Ndị Galetia 4:27-31.
10. (a) Olee otú e si mee ka Israel nke Chineke gbanwee? (b) Gịnị bụ “ala” nke Israel nke Chineke?
10 Malite na 1919, Israel nke Chineke nwere mgbanwe yiri nke ahụ. N’oge Agha Ụwa Mbụ, ndị Kraịst e tere mmanụ yiri ka Chineke ọ̀ jụwo ha. Ma, na 1919, e weghachiiri ha ọnọdụ ha nke ịbụ ndị nwere ihu ọma, meekwa ka ụzọ ha si efe ofufe dị ọcha. Nke a nwere mmetụta n’ozizi ha, nzukọ ha, na ọrụ ha. Israel nke Chineke batara ‘n’ala’ ya, bụ́ ógbè ime mmụọ ya, ma ọ bụ ógbè ịrụ ọrụ ya.—Aịsaịa 66:7, 8, 20-22.
11. Olee otú ndị Juu si kpọghara nne ha dị ka nwunye ha?
11 N’imesikwu ọnọdụ ọhụrụ ahụ, nke inwe ihu ọma nke ndị ya ike, Jehova na-ekwu, sị: “Dị ka nwa okorobịa si alụrụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, otú a ka ụmụ gị ndị ikom ga-alụ gị: ọzọ, dị ka obi ụtọ nke onye na-alụ nwunye ọhụrụ nwere n’ahụ nwunye ọhụrụ ya, otú a ka obi ga-atọ Chineke ụtọ n’ahụ gị.” (Aịsaịa 62:5) Olee otú ndị Juu, bụ́ “ụmụ” Zaịọn, pụrụ isi kpọghara nne ha dị ka nwunye ha? N’echiche bụ́ na ụmụ Zaịọn ndị na-alọta alọta, bụ́ ndị a tọhapụrụ site n’ije biri na Babilọn ga-ewere isi obodo ha mbụ ma birighachi n’ime ya. Mgbe nke ahụ mere, Zaịọn agakwaghị abụ ebe tọgbọrọ n’efu kama nke jupụtara n’ụmụ.—Jeremaịa 3:14.
12. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova siworo mee ka o doo anya na ndị Kraịst e tere mmanụ bụ akụkụ nke nzukọ e jikọtara ya na ya n’alụmdi na nwunye? (b) Olee otú mmeso Jehova na-emeso ndị ya si bụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya maka alụmdi na nwunye taa? (Lee igbe dị na peeji nke 342.)
12 N’ụzọ yiri ya, kemgbe 1919 ụmụ nke Zaịọn nke eluigwe ewerewo ala ha, bụ́ ógbè ime mmụọ ha, nke nwere aha amụma bụ́ “Onye E Nwe Enwe Dị Ka Nwunye.” Ọrụ ndị Kraịst ha na-arụ n’ala ahụ emewo ka ọ pụta ìhè na ndị Kraịst a e tere mmanụ bụ “otu ndị maka aha [Jehova].” (Ọrụ 15:14, NW) Ha ịmịpụta mkpụrụ Alaeze ahụ na ịkpọsa aha Jehova emewo ka o doo anya na obi dị Jehova ụtọ n’ebe ndị Kraịst a nọ. O mewo ka o doo anya na ha bụ akụkụ nke nzukọ e jikọtara ya na ya n’ịdị n’otu a na-apụghị igbubi egbubi. Site n’iji mmụọ nsọ tee ndị Kraịst a mmanụ, na-atọhapụ ha ná ndọrọ n’agha ime mmụọ, na iji ha na-ekwusara ihe nile a kpọrọ mmadụ olileanya Alaeze ahụ, Jehova egosipụtawo na ya nwere n’ebe ha nọ ụdị ọṅụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-enwe n’ebe nwunye ọhụrụ ya nọ.—Jeremaịa 32:41.
“Unu Ederela Duu”
13, 14. (a) N’oge ochie, olee otú Jerusalem si ghọọ obodo nke na-enye nchebe? (b) N’oge a, olee otú Zaịọn siworo ghọọ “otuto n’ụwa”?
13 Aha ọhụrụ ahụ nke bụ́ ihe atụ, nke Jehova gụrụ ya na-eme ka ndị ya nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Ha maara na ọ nakweere ha nakwa na ọ bụ ya nwe ha. Ugbu a n’iji ihe atụ dị iche eme ihe, Jehova na-agwa ndị ya okwu dị ka obodo nke nwere mgbidi gburugburu ya: “N’elu mgbidi gị nile, Jerusalem, ka M doworo ndị nche; ogologo ụbọchị nile ehihie na abalị, mgbe nile, ha agaghị edebe ọnụ ha duu: unu ndị na-echetara Jehova ihe, unu ederela duu, unu ekwekwala ka O dere duu, ruo mgbe Ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike, ruokwa mgbe Ọ ga-eme ya ka ọ bụrụ otuto n’ụwa.” (Aịsaịa 62:6, 7) Mgbe o ruru oge nke Jehova mgbe ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi siworo Babilọn lọta, Jerusalem ghọrọ “otuto n’ụwa”—obodo nke nwere mgbidi gburugburu ya, nke na-echebe ndị bi n’ime ya. N’ehihie na n’abalị, ndị nche nọ n’elu mgbidi ndị ahụ na-amụ anya iji hụ na e chebere obodo ahụ nakwa iji zie ụmụ amaala ya ozi ịdọ aka ná ntị.—Nehemaịa 6:15; 7:3; Aịsaịa 52:8.
14 N’oge a, Jehova ejiriwo ndị nche ya e tere mmanụ gosi ndị dị nwayọọ n’obi ụzọ nke nnwere onwe pụọ n’agbụ okpukpe ụgha. A kpọwo ndị a òkù ịbata ná nzukọ ya, bụ́ ebe a na-echebe ha pụọ ná mmetọ ime mmụọ, mmetụta ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, nakwa n’iwe Jehova. (Jeremaịa 33:9; Zefanaịa 3:19) Ọrụ nke òtù onye nche a, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke na-enye nri ime mmụọ “e ji azụ ha n’oge ya,” dị oké mkpa maka nchebe dị otú ahụ. (Matiu 24:45-47) N’iso òtù onye nche ahụ na-arụkọ ọrụ, “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-arụkwa ọrụ dị mkpa n’ime ka Zaịọn bụrụ “otuto n’ụwa.”—Mkpughe 7:9.
15. Olee otú òtù onye nche ahụ na ndị ibe ha si ejere Jehova ozi mgbe nile?
15 Ọrụ nke òtù onye nche ahụ na ndị ibe ha na-arụ ka na-aga n’ihu! A na-ahụ àgwà ha nke iji obi dum na-eje ozi n’ọrụ ịnụ ọkụ n’obi nke ọtụtụ nde mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-arụ, bụ́ ndị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha; ndị ozi afọ ofufo nọ n’ebe obibi Betel dị iche iche nakwa n’ebe dị iche iche Ndịàmà Jehova na-ebi akwụkwọ; ndị ozi ala ọzọ; nakwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nke oge nile, na ndị nke inyeaka, na-akwado. Ọzọkwa, ha na-arụsi ọrụ ike n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ, ileta ndị ọrịa, inyere ndị na-enwe nsogbu ahụ ike aka, na ibugara ndị ọdachi na ihe ọghọm dakwasịrị ihe enyemaka bịara n’ezi oge. Ọtụtụ n’ime ndị a, bụ́ ndị ji onwe ha na-achụ àjà, ọtụtụ mgbe na-eje ozi “ehihe na abalị” n’ụzọ nkịtị!—Mkpughe 7:14, 15.
16. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ohu Jehova na-esighị ‘ekwe ka o dere duu’?
16 A na-agba ndị ohu Jehova ume ịdị na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị, ịdị na-arịọ Chineke “ka e mee ihe [Ọ] na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) A na-agba ha ume, sị: “Unu ekwekwala ka [Jehova] dere duu” ruo mgbe o mezuru ọchịchọ na olileanya e nwere banyere mweghachi nke ezi ofufe. Jisọs mesiri mkpa ọ dị ikpe ekpere mgbe nile ike, na-agba ụmụazụ ya ume ‘ịkpọku Chineke ehihie na abalị.’—Luk 18:1-8.
A Ga-enye Ụgwọ Ọrụ Maka Ijere Chineke Ozi
17, 18. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị bi na Zaịọn pụrụ isi tụọ anya irite uru site ná ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ? (b) Olee otú ndị Jehova taa si erite uru ná ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ?
17 Aha ọhụrụ ahụ Jehova gụrụ ndị ya na-emesi ha obi ike na mgbalị ha abụghị n’efu. “Jehova ewerewo aka nri Ya, werekwa ogwe aka Ya dị ike, ṅụọ iyi, sị, N’ezie M gaghị enyekwa ọka gị ọzọ ịbụrụ ndị iro gị ihe oriri ma ọlị; n’ezie ụmụ ala ọzọ agaghị aṅụkwa mmanya vine ọhụrụ gị, nke ị dọgbuworo onwe gị n’ọrụ banyere ya: kama ndị chịkọtaworo ya ga-eri ya, wee too Jehova; ndị kpokọtaworo ya ga-aṅụkwa ya n’ogige nsọ m nile.” (Aịsaịa 62:8, 9) Aka nri Jehova na ogwe aka ya dị ike bụgasị ihe atụ nke ike na ume ya. (Deuterọnọmi 32:40; Ezikiel 20:5) Ya iji ihe ndị a ṅụọ iyi na-egosi na o kpebisiri ike ịgbanwe otú ihe dị n’ime Zaịọn. Na 607 T.O.A., Jehova kwere ka ndị iro Zaịọn zuo ya ohi ma kwakọrọ ngwongwo ya. (Deuterọnọmi 28:33, 51) Ma ugbu a, ọ bụ nanị ndị o ruuru ga-enweta ihe onwunwe Zaịọn.—Deuterọnọmi 14:22-27.
18 Ná mmezu nke nkwa a n’oge a, ndị Jehova e weghachiri eweghachi na-enwe oké ọganihu ime mmụọ. Ha na-enweta n’ụzọ zuru ezu uru sitere ná ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ—ọnụ ọgụgụ ka elu nke ndị Kraịst bụ́ ndị na-eso ụzọ nakwa ụbara nri ime mmụọ. (Aịsaịa 55:1, 2; 65:14) N’ihi na ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi, Jehova adịghị ekwe ka ndị iro ha gbochie ọganihu ime mmụọ ha ma ọ bụ napụ ha ihe ndị sitere n’ozi ha ji obi ha dum na-eje. Ọ dịghị ọrụ ọ bụla a na-arụ n’ozi Jehova nke bụ́ n’efu.—Malakaị 3:10-12; Ndị Hibru 6:10.
19, 20. (a) Olee otú e si doziere ndị Juu ụzọ ịlaghachi Jerusalem? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo doziere ndị dị nwayọọ n’obi ụzọ n’oge a ịbata ná nzukọ Jehova?
19 Aha ọhụrụ ahụ na-emekwa ka nzukọ Jehova bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ nye ndị nwere obi eziokwu. Ọtụtụ ìgwè mmadụ na-enubata n’ime ya, e ghewekwaara ha ụzọ oghe. Amụma Aịsaịa na-ekwu, sị: “Gabiganụ, gabiganụ n’ọnụ ụzọ ámá nile; dozienụ ụzọ ndị m; tụlienụ, tụlienụ ụzọ a tụliri atụli; tụtụpụnụ nkume; bulienụ ọkọlọtọ n’elu ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 62:10) Na nke mbụ ya, òkù a yiri ka ọ na-ezo aka n’ịgafere ọnụ ụzọ ámá nke obodo dị iche iche nke Babilọn iji laghachi Jerusalem. Ndị ahụ na-alọta gaje ịtụtụpụ nkume n’ụzọ iji mee ka njem ahụ dị mfe karị na ibuli ọkọlọtọ iji gosi ụzọ.—Aịsaịa 11:12.
20 Kemgbe 1919, e dowo ndị Kraịst e tere mmanụ iche maka ije ozi Chineke, ha na-agakwa ije ‘n’Ụzọ nke ịdị nsọ.’ (Aịsaịa 35:8) Ha bụ ndị mbụ gara ije n’okporo ụzọ ime mmụọ ahụ a tụliri atụli si Babilọn Ukwu ahụ pụta. (Aịsaịa 40:3; 48:20) Chineke nyere ha ihe ùgwù nke ibute ụzọ n’ikwusa oké ọrụ ya dị iche iche na n’igosi ndị ọzọ ụzọ isi banye n’ụzọ ahụ a tụliri atụli. Ịtụtụpụ nkume na ya—iwepụsị ihe mkpọbi ụkwụ—bụ n’ụzọ bụ́ isi maka ọdịmma ha. (Aịsaịa 57:14) Ọ dị ha mkpa ịhụ nzube Chineke na izi ihe ya n’ụzọ doro anya. Nkwenkwe ụgha bụ nkume mkpọbi ụkwụ dị n’ụzọ na-eduga ná ndụ, ma Okwu Jehova yiri “òtùtù nke na-etipịa nkume dị elu.” Ndị Kraịst e tere mmanụ ji ya kụrie nkume mkpọbi ụkwụ ndị pụrụ ịkwada ndị chọrọ ijere Jehova ozi.—Jeremaịa 23:29.
21, 22. Olee ọkọlọtọ Jehova guzobewooro ndị na-ahapụ okpukpe ụgha, oleekwa otú anyị si mara?
21 Na 537 T.O.A., Jerusalem ghọrọ ọkọlọtọ nke na-akpọ ndị Juu fọdụrụnụ òkù ịlọta ma wughachi ụlọukwu ahụ. (Aịsaịa 49:22) Na 1919 mgbe a napụtara ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ n’agbụ okpukpe ụgha, ha awagharịghị n’ihi amaghị ebe ha ga-aga. Ha maara ebe ha na-aga, n’ihi na Jehova eguzobeworo ha ọkọlọtọ. Ọkọlọtọ dị aṅaa? Otu ọkọlọtọ ahụ e buru n’amụma n’Aịsaịa 11:10, nke na-agụ, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na mkpọrọgwụ Jesi, [ga-eguzo] ịbụ ọkọlọtọ ndị nile dị iche iche.” Pọl onyeozi ji okwu ndị a mee ihe n’ebe Jisọs nọ. (Ndị Rom 15:8, 12) Ee, ọkọlọtọ ahụ bụ Kraịst Jisọs, bụ́ onye na-achị achị dị ka Eze n’elu Ugwu Zaịọn nke eluigwe!—Ndị Hibru 12:22; Mkpughe 14:1.
22 Ma ndị Kraịst e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ agbakọtawo gburugburu Jisọs Kraịst iji kere òkè n’ofufe nke na-eme ka a dị n’otu nke Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu. Ịchịisi ya ga-ewepụ ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova n’ụta ma gọzie ndị nwere obi eziokwu, ndị si ná mba nile nke ụwa. Nke a ọ́ bụghị ihe mere onye ọ bụla n’ime anyị ga-eji sonye n’iji otuto na-ebuli ya elu?
“Nzọpụta Gị Abịawo”!
23, 24. Olee otú e si ewetara ndị nwere okwukwe na Chineke nzọpụta?
23 Aha ọhụrụ ahụ nke Jehova gụrụ nzukọ ya nke yiri nwunye na-emetụta nzọpụta ebighị ebi nke ụmụ ya. Aịsaịa na-ede, sị: “Lee, Jehova emewo ka a nụrụ ya ruo nsọtụ ụwa, sị, Sịnụ ada Zaịọn, Lee, nzọpụta gị abịawo; lee, ọkwụkwụ ụgwọ Ya dị n’aka Ya, ụgwọ ọrụ Ya dịkwa n’ihu Ya.” (Aịsaịa 62:11) Nzọpụta bịaara ndị Juu mgbe Babilọn dara, ha laghachikwara n’ala nna ha. Ma okwu ndị a na-ezo aka n’ihe ka ukwuu. Ihe Jehova kwuru na-echetara anyị amụma Zekaraịa banyere Jerusalem: “Tegharịa egwú ọṅụ nke ukwuu, gị ada Zaịọn; tie mkpu, gị ada Jerusalem: lee, eze gị na-abịakwute gị: onye ezi omume na onye nwere nzọpụta ka ọ bụ; onye e wedara n’ala, nke na-anọkwasịkwa n’ịnyịnya ibu, ọbụna na nwa ịnyịnya, bụ́ nwa ịnyịnya ibu.”—Zekaraịa 9:9.
24 Afọ atọ na ọkara ka e mesịrị Jisọs baptism n’ime mmiri ma jiri mmụọ Chineke tee ya mmanụ, ọ banyere n’ime Jerusalem ma mee ka ụlọ nsọ ya dị ọcha. (Matiu 21:1-5; Jọn 12:14-16) Taa, Jisọs Kraịst bụ onye na-ewetara ndị nile nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ nzọpụta nke sitere n’aka Jehova. Kemgbe e chiri ya eze na 1914, Jisọs bụkwa Onyeikpe na Onye Mmezu nke Ihe E Kpere n’Ikpe nke Jehova họpụtara. Na 1918, afọ atọ na ọkara mgbe e chisịrị ya eze, o mere ka ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova dị ọcha, bụ́ nke ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ na-anọchite anya ya n’ụwa. (Malakaị 3:1-5) Ya ịbụ onye e welitere dị ka ọkọlọtọ kara mmalite nke oké nchịkọbata nke ndị mmadụ site n’ụwa nile, ná nkwado nke Alaeze Mesaịa ahụ, akara. N’ịgbaso ụkpụrụ nke oge ochie, “nzọpụta” bịaara Israel nke Chineke mgbe a tọhapụrụ ha na Babilọn Ukwu ahụ na 1919. “Ụgwọ ọrụ” ma ọ bụ “ọkwụkwụ ụgwọ” nke na-echere ndị ọrụ owuwe ihe ubi ahụ na-achụ onwe ha n’àjà bụ ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe ma ọ bụ ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ndị nile nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ inwe obi ike na “ndọgbu [ha] na-adọgbu onwe [ha] n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 15:58.
25. Mmesi obi ike dị aṅaa ka e nyere ndị Jehova?
25 Lee atụmanya dị mma dịịrị nzukọ eluigwe nke Jehova, ndị nnọchiteanya ya nọ n’ụwa ebe a, nakwa onye ọ bụla nke so ha na-akpachi anya! (Deuterọnọmi 26:19) Aịsaịa buru amụma, sị: “Ha ga-akpọkwa ha Ndị nsọ ahụ, Ndị Jehova gbapụtaworo: a ga-akpọkwa gị Obodo a chọpụtara achọpụta, Obodo a na-ahapụghị ahapụ.” (Aịsaịa 62:12) N’otu oge, “Jerusalem nke dị n’elu,” nke Israel nke Chineke na-anọchite anya ya, chere na a gbahapụwo ya. Ọ gakwaghị eche otú ahụ ọzọ. Ruo mgbe ebighị ebi ndị Jehova ga-abụ ndị ọ ga na-elekọta ma na-echebe, ndị na-enweta ihu ọma nke ọ nọgidere na-egosi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’amụma Bible “aha ọhụrụ” pụrụ igosi ọkwá ma ọ bụ ihe ùgwù ọhụrụ.—Mkpughe 2:17; 3:12.
Igbe dị na peeji nke 342]
Ihe Nlereanya Magburu Onwe Ya Maka Alụmdi na Nwunye
Mgbe ndị mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ha na-enwe atụmanya ndị nke ha banyere alụmdi na nwunye ahụ. Ma olee ihe Chineke na-atụ anya ha? Ọ bụ ya malitere njikọ alụmdi na nwunye. Gịni bụ ebumnobi ya?
Otu ihe na-egosi echiche Chineke bụ mmekọrịta nke ya na mba Israel. Aịsaịa kọwara mmekọrịta a dị ka alụmdi na nwunye. (Aịsaịa 62:1-5) Rịba ama ihe Jehova Chineke na-emere “nwunye ọhụrụ” ya dị ka “di.” Ọ na-echebe ya ma na-edo ya nsọ. (Aịsaịa 62:6, 7, 12) Ọ na-asọpụrụ ya ma jiri ya kpọrọ ihe. (Aịsaịa 62:3, 8, 9) Ihe ya na-atọkwa ya ụtọ, dị ka aha ọhụrụ ọ gụrụ ya gosiri.—Aịsaịa 62:4, 5, 12.
N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, Pọl kwupụtaghachiri nkọwa ahụ Aịsaịa kọwara mmekọrịta nke dị n’agbata Jehova na Israel mgbe o ji mmekọrịta nke dị n’etiti di na nwunye tụnyere nke dị n’agbata Kraịst na nzukọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ.—Ndị Efesọs 5:21-27.
Pọl gbara ndị Kraịst ume iṅomi mmekọrịta ahụ dị n’agbata Jisọs na nzukọ ya n’alụmdi na nwunye ha. Ọ dịghị ịhụnanya pụrụ ịkarị nke ahụ Jehova gosiri Israel nakwa nke Kraịst gosiri nzukọ ya. Mmekọrịta ndị a bụ́ ihe atụ bụ ihe nlereanya magburu onwe ha maka inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, nke na-enyekwa obi ụtọ, n’etiti ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 5:28-33.
[Foto dị na peeji nke 339]
Jehova ga-akpọ Zaịọn nke eluigwe aha ọhụrụ
[Foto ndị dị na peeji nke 347]
N’oge a, òtù onye nche nke Jehova ederebeghị duu