Isi nke Abụọ
Otu Nna na Ụmụ Ya Na-enupụ Isi
1, 2. Kọwaa otú Jehova siworo nwee ụmụ na-enupụ isi.
Ọ NA-ENYE ụmụ ya ihe ndị na-akpa ha, dị ka nna ma ọ bụ nne ọ bụla na-ahụ n’anya na-eme. Ruo ọtụtụ afọ ọ hụrụ na ha na-eriju afọ, na-eyi uwe, ma nwee ebe obibi. Mgbe ọ dị mkpa, ọ na-adọ ha aka ná ntị. Ma ntaramahụhụ ọ na-enye ha adịghị agafe ókè; ọ na-enye ya mgbe nile “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jeremaịa 30:11, NW) Mgbe ahụ, anyị pụrụ iche nnọọ n’echiche ụdị mwute nna a na-ahụ n’anya nwere mgbe o kwuru, sị: “Ụmụ ka M meworo ka ha topụta, emewokwa m ka ha dị elu, ma ụmụ ahụ ejehiewo megide m.”—Aịsaịa 1:2b.
2 Ụmụ nnupụisi ahụ e zoro aka n’ebe ha nọ n’ebe a bụ ndị Juda, nna ahụ iwe ji bụkwa Jehova Chineke. Lee ihe mwute ọ bụ! Jehova enyewo ndị Juda ihe oriri ma bulie ha elu n’etiti mba nile. O mesịrị chetara ha site n’ọnụ Ezikiel onye amụma, sị: “M wee yiwe gị uwe a kpara nke ọma, yiwe gị akpụkpọ seal n’ụkwụ, chịrị ezi ákwà ọcha kee gị n’úkwù, gbokwasị gị nkịsị.” (Ezikiel 16:10) Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Juda enweghị ekele maka ihe Jehova meere ha. Kama nke ahụ, ha nupụrụ isi, ma ọ bụ jehie.
3. N’ihi gịnị ka Jehova ji kpọkuo eluigwe na ala ka ha bụrụ ndị akaebe banyere njehie nke Juda?
3 N’inwe ezi ihe kpatara ya, Jehova malitere okwu a banyere ụmụ ya na-enupụ isi site n’ikwu, sị: “Nụrụnụ, eluigwe, gị ụwa, ṅaakwa ntị, n’ihi na Jehova ekwuwo okwu.” (Aịsaịa 1:2a) Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, eluigwe na ụwa nụrụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, mgbe e nyere ụmụ Israel ịdọ aka ná ntị ndị doro anya banyere ihe ndị ga-esi n’inupụ isi pụta. Mosis kwuru, sị: “Emewo m ka eluigwe na ụwa gbagide unu àmà taa, na unu ga-alapụsị n’iyi ngwa ngwa n’ala ahụ nke unu na-agabiga Jọdan ịba n’ebe ahụ inweta ya.” (Deuterọnọmi 4:26) Ugbu a n’oge Aịsaịa, Jehova kpọkuru eluigwe a na-adịghị ahụ anya na ụwa a na-ahụ anya ịbụ ndị akaebe banyere njehie nke Juda.
4. Olee otú Jehova kpebiri isi kọwaara Juda onwe ya?
4 Otú ọnọdụ ahụ jọruru ná njọ chọrọ ka a kpọọ okwu aha kpọmkwem. Otú ọ dị, ọbụna n’ọnọdụ ndị a dị oké njọ, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama—ma na-akpali akpali—na Jehova kọwaara Juda onwe ya dị ka nna na-ahụ n’anya kama ịbụ nanị onye nwe ha, onye zụtara ha. Ya bụ, Jehova na-arịọ ndị ya ka ha lee okwu ahụ anya otú nna nke nọ ná mwute n’ihi ụmụ ya na-eme isi ike ga-esi lee ya anya. Ma eleghị anya ụfọdụ ndị nne na nna nọ na Juda pụrụ ọbụna ịghọta nsogbu ahụ n’onwe ha, ihe atụ ahụ metụkwara ha n’ahụ. Ka o sina dị, Jehova na-aga ikwupụta ihe o nwere megide Juda.
Anụ Ọhịa Efu Maara Ihe Karị
5. N’adịghị ka ndị Israel, n’ụzọ dị aṅaa ka oké ehi na ịnyịnya ibu si egosi echiche nke ikwesị ntụkwasị obi?
5 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova sịrị: “Ehi maara onye nwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe ọzụzụ anụ nke onye nwe ya: ma Israel amaghị, ndị m atụkwasịghị uche.” (Aịsaịa 1:3)a Ehi na ịnyịnya ibu bụ anụmanụ ndị e ji arụ ọrụ, nke ndị bi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa maara nke ọma. N’ezie, ndị Juda agaghị agọ na ọbụna ụmụ anụmanụ a na-amaghị ihe na-egosipụta na ha nwere echiche nke ikwesị ntụkwasị obi, na ha maara nke ọma na ọ dị onye nwe ha. Banyere nke a, tụlee ihe otu onye na-eme nchọpụta banyere Bible hụrụ mgbe a rụsịrị ọrụ ụbọchị n’otu obodo dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa: “Ozugbo ìgwè anụ ahụ rutewere mgbidi ahụ nso ha malitere ịgbasa. Oké ehi nke ọ bụla maara kpọmkwem onye nwe ya, na ụzọ ụlọ ya, ọtụtụ ụzọ ahụ dị warara ma gbagọọ agbagọ agbagwojughịkwa ha anya ma ọlị. Ma ịnyịnya ibu ahụ gaara nnọọ tinye isi n’ọnụ ụzọ, banye ‘n’ebe ọzụzụ anụ nke onye nwe ya.’”
6. Olee otú ndị Juda siworo ghara ịtụkwasị uche n’ihe?
6 Ebe o doro anya na a na-ahụkarị ụdị ihe ahụ n’oge Aịsaịa, isi ihe dị n’ozi Jehova doro anya: Ọ bụrụ na ọbụna anụmanụ efu maara onye nwe ya na ebe ọzụzụ ya, olee ihe ngọpụ ndị Juda nwere maka ịhapụ Jehova? N’eziokwu, ha “atụkwasịghị uche.” O yiri ka a ga-asị na ha amaghị eziokwu ahụ bụ́ na ọganihu na ịdị adị ha kpọmkwem dabeere n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ n’ezie ihe àmà nke inwe obi ebere na Jehova ka na-ezo aka n’ebe ndị Juda nọ dị ka “ndị m”!
7. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka ndokwa dị iche iche nke Jehova?
7 Anyị ekwesịtụghị ime omume n’ụzọ atụkwasịghị uche site n’egosighị ekele maka ihe nile Jehova mewooro anyị! Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iṅomi ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, onye sịrị: “M ga-eji obi m nile kelee Jehova; m ga-akọkwa akụkọ oké ọrụ Gị nile.” (Abụ Ọma 9:1) Ịnọgide na-enweta ihe ọmụma banyere Jehova ga-agba anyị ume n’akụkụ a, n’ihi na Bible na-ekwu na “ihe ọmụma nke Onye Nsọ bụkwa nghọta.” (Ilu 9:10) Ịtụgharị uche kwa ụbọchị ná ngọzi dị iche iche nke Jehova ga-enyere anyị aka ịbụ ndị na-enwe ekele ma ghara ileghara Nna anyị nke eluigwe anya. (Ndị Kọlọsi 3:15) “Onye na-achụ ekele dị ka àjà na-asọpụrụ m,” ka Jehova kwuru, “ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”—Abụ Ọma 50:23.
Mkparị Na-awụ Ibobo n’Ahụ Nye “Onye Nsọ nke Israel”
8. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ ndị Juda “mba na-ejehie ejehie”?
8 Aịsaịa gara n’ihu n’ozi ya site n’ịgwa mba Juda okwu ndị siri ike: “Ahụhụ ga-adịrị mba mmehie, ndị ajọ omume na-anyịgbu, mkpụrụ nke bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ụmụ nke na-ebibi onwe ha: ha ahapụwo Jehova, ha elelịwo Onye Nsọ nke Israel, ha aghọwo ndị ala ọzọ, laghachi azụ.” (Aịsaịa 1:4) A pụrụ ịnọ na-eme ajọ omume ruo n’ókè nke na ha ga-eyi ibu dị oké arọ. N’oge Abraham, Jehova kọwara mmehie Sọdọm na Gọmọra dị ka nke “dị arọ nke ukwuu.” (Jenesis 18:20) Ihe yiri nke ahụ apụtawo ìhè ugbu a n’etiti ndị Juda, n’ihi na Aịsaịa na-ekwu na “ajọ omume na-anyịgbu” ha. Tụkwasị na nke ahụ, ọ kpọrọ ha “mkpụrụ nke bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ụmụ nke na-ebibi onwe ha.” Ee, ndị Juda yiri ụmụaka isi ike. Ha ‘alaghachiwo azụ,’ ma ọ bụ dị ka New Revised Standard Version si tinye ya, ha “akpafuwo kpam kpam” site n’ebe Nna ha nọ.
9. Gịnị ka nkebi ahịrịokwu bụ́ “Onye Nsọ nke Israel” pụtara?
9 Site n’omume nnupụisi ha, ndị Juda na-egosi oké enweghị nkwanye ùgwù maka “Onye Nsọ nke Israel.” Gịnị ka ahịrịokwu a, nke pụtara ugboro 25 n’akwụkwọ Aịsaịa, pụtara? Ịdị nsọ pụtara erughị unyi na ịdị ọcha. Jehova dị nsọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. (Mkpughe 4:8) A na-echetara ụmụ Israel eziokwu a mgbe ọ bụla ha hụrụ okwu ndị ahụ e dekwasịrị n’elu mbadamba ihe ọlaedo dị n’ákwà nkụkụ isi nke onyeisi nchụàjà: “Ihe nsọ Jehova nwere.” (Ọpụpụ 39:30) Ya mere, site n’izo aka n’ebe Jehova nọ dị ka “Onye Nsọ nke Israel,” Aịsaịa na-emesi ókè mmehie Juda dịruru ná njọ ike. Leenụ, ndị nnupụisi a na-emebi kpọmkwem iwu ahụ e nyere ndị nna nna ha: “Unu ga-edokwa onwe unu nsọ, wee dị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị”!—Levitikọs 11:44.
10. Olee otú anyị pụrụ isi zere egosighị nkwanye ùgwù maka “Onye Nsọ nke Israel”?
10 Ndị Kraịst taa aghaghị ime ihe nile ha pụrụ ime iji zere ịgbaso ihe nlereanya Juda setịpụrụ nke akwanyereghị “Onye Nsọ nke Israel” ùgwù. Ha aghaghị iṅomi ịdị nsọ Jehova. (1 Pita 1:15, 16) Ọ dịkwa ha mkpa ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị.’ (Abụ Ọma 97:10) Ụdị omume ndị ahụ na-adịghị ọcha dị ka mmekọahụ rụrụ arụ, ikpere arụsị, izu ohi, na ịṅụbiga mmanya ókè pụrụ imetọ ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere e ji achụpụ ndị jụrụ ịkwụsị ime ihe ndị a, n’ọgbakọ. N’ikpeazụ, ndị na-eme omume na-adịghị ọcha n’enweghị nchegharị agaghị eso nweta ngọzi dị iche iche nke ọchịchị Alaeze Chineke. N’ezie, omume ọjọọ nile dị otú ahụ bụ mkparị na-awụ ibobo n’ahụ nye “Onye Nsọ nke Israel.”—Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 5:6-11; 6:9, 10.
Ha Na-arịa Ọrịa Malite n’Isi Ruo n’Ụkwụ
11, 12. (a) Kọwaa ọnọdụ ọjọọ Juda nọ na ya. (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji meere Juda ebere?
11 Aịsaịa gbalịziri iso ndị Juda tụgharịa uche site n’ịkọwapụtara ha na ha na-arịa ọrịa. Ọ sịrị: “N’ihi gịnị ka a ga na-eti unu ihe ruo ugbu a, na unu na-ewezụga onwe unu karị?” Ya bụ, Aịsaịa na-ajụ ha, sị: ‘Ọ̀ bụ na ahụhụ nke unu tara ezubeghị? Gịnị mere unu ji na-akpatakwuru onwe unu nsogbu site n’ịnọgide na-enupụ isi?’ Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Isi nile ọ bụla na-arịa ọrịa, ahụ adịghịkwa obi nile ọ bụla ike. Site n’ọbọ ụkwụ wee ruo isi ọ dịghị izu okè dị n’ime ya.” (Aịsaịa 1:5, 6a) Juda nọ n’ọnọdụ na-asọ oyi, n’ọrịa—ọrịa ime mmụọ malite n’isi ruo n’ọbọ ụkwụ. Ọ bụ nchọpụta dị njọ n’ezie!
12 Ànyị kwesịrị imere Juda ebere? Ọ dịghị ma ọlị! Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ a dọrọ mba Israel dum aka ná ntị dị ka o kwesịrị banyere ntaramahụhụ ha ga-enweta maka nnupụisi. Ná mkpirikpi, a gwara ha, sị: “Jehova ga-ewere ihe ofifi ọjọọ, nke a na-apụghị ime ka ahụ gị dị mma na ya, tie gị n’ikpere ụkwụ gị abụọ na n’ogwe ụkwụ gị abụọ, site n’ọbọ ụkwụ gị wee ruo opu n’isi gị.” (Deuterọnọmi 28:35) N’ụzọ ihe atụ, Juda na-enweta ugbu a ihe ndị a si n’ụzọ ikwesi olu ike ya pụta. Ihe ndị a nile agaraghị eme ma a sị nnọọ na ndị Juda rubeere Jehova isi.
13, 14. (a) Olee mmerụ ahụ ndị e merụworo Juda? (b) Ahụhụ dị iche iche Juda tara hà mere ka ọ tụgharịa uche n’omume nnupụisi ya?
13 Aịsaịa gara n’ihu ịkọwa ọnọdụ dị imere ebere nke Juda nọ na ya: “Ogbugbu mma, na itirụ ahụ, na ọnyá e tipụtara ọhụrụ: a pịkọtaghị ha, e kechighịkwa ha, e jighịkwa mmanụ mee ka ha dị nro.” (Aịsaịa 1:6b) N’ebe a onye amụma ahụ na-ezo aka n’ụdị mmerụ ahụ atọ: ogbugbu mma (ọnyá, dị ka ndị e ji ọpịa ma ọ bụ mma menye), itirụ ahụ (ebe ndị fụrụ afụ n’ihi iti ihe), na ọnyá e tipụtara ọhụrụ (ọnyá ghere oghe, ndị e menyere ọhụrụ bụ́ ndị yiri ka ha agaghị ala ala). Echiche ọ na-enye bụ nke nwoke a taworo ahụhụ nke ukwuu n’ụzọ nile a pụrụ ichetụ n’echiche, n’enweghị akụkụ ahụ ya na-enweghị mmerụ ahụ. Juda nọ n’ọnọdụ dị njọ n’ezie.
14 Ọnọdụ ọjọọ Juda nọ na ya ọ̀ kpaliri ya ịlaghachikwute Jehova? Ee e! Juda yiri onye nnupụisi ahụ a kọwara n’Ilu 29:1: “Onye a na-abara mba ọtụtụ mgbe ma ọ na-ekwesi olu ya ike, n’otu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ dịghịkwa ngwọta dị.” Mba ahụ yiri ka a pụghị ịgwọta ya agwọta. Dị ka Aịsaịa si kwuo ya, ọnyá ya bụ nke “a [na-apịkọtaghị], e kechighịkwa ha, e jighịkwa mmanụ mee ka ha dị nro.”b N’otu echiche, Juda yiri ọnyá ghere oghe, nke a na-ekechighị ekechi, nke na-abasa abasa.
15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi chebe onwe anyị pụọ n’ọrịa ime mmụọ?
15 Site n’ịmụta ihe n’ihe mere Juda, anyị aghaghị ịnọ na nche megide ọrịa ime mmụọ. Dị ka ọrịa nkịtị, ọ pụrụ ịrịa onye ọ bụla n’ime anyị. E kwuwerị, olee onye n’ime anyị nke na-adịghị enwe ọchịchọ anụ ahụ? Anyaukwu na ọchịchọ maka ihe ụtọ gabigara ókè pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ n’ime obi anyị. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịzụ onwe anyị ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị ma na-arapara ezi ihe n’ahụ.’ (Ndị Rom 12:9) Ọ dịkwa anyị mkpa ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ Chineke ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. (Ndị Galetia 5:22, 23) Site n’ime otú ahụ, anyị ga-ezere ọnọdụ ahụ nyere Juda nsogbu—ịnọ n’ọrịa ime mmụọ malite n’isi ruo n’ọbọ ụkwụ.
Ala Tọgbọrọ n’Efu
16. (a) Olee otú Aịsaịa si kọwaa ọnọdụ mbara ala Juda? (b) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji na-ekwu na o yiri ka e kwuru ihe ndị a n’oge ọchịchị Ehaz, ma olee otú anyị pụrụ isi ghọta ha?
16 Aịsaịa hapụziri ntụnyere ọ na-eme n’ụzọ nkà mmụta ọgwụ wee chee ihu n’ọnọdụ mbara ala Juda. Dị ka a ga-asị na ọ na-ele ala dị larịị nke agha kpara aka ọjọọ anya, ọ sịrị: “Ala unu bụ ebe tọgbọrọ n’efu; obodo unu, e surewo ha n’ọkụ; ala ubi unu, n’ihu unu ka ndị ala ọzọ na-eri ya, ọ bụkwa ebe tọgbọrọ n’efu, dị ka nkwatu ndị ala ọzọ.” (Aịsaịa 1:7) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na ọ bụ ezie na okwu ndị a dị ná mmalite nke akwụkwọ Aịsaịa, ọ pụrụ ịbụ na e kwuru ha mgbe onye amụma ahụ rụmitụworo ọrụ ya, ikekwe n’oge ọchịchị nke ajọ Eze Ehaz. Ha na-ekwu na e nwere oké ọganihu n’oge ọchịchị Ụzaịa nke na ọ dịghị ihe ga-akpata ụdị nkọwa ahụ na-adịghị mma. N’eziokwu, a pụghị ikwu kpọmkwem ma à chịkọtara akwụkwọ Aịsaịa n’usoro oge ha ji mee. Otú ọ dị, ihe ndị Aịsaịa kwuru banyere ịtọgbọrọ n’efu bụ amụma ma eleghị anya. N’ikwu ihe ahụ e dere n’elu, o yikarịrị ka Aịsaịa o ji ụzọ ide ihe e ji mee ihe n’ebe ọzọ n’ime Bible na-eme ihe—ịkọwa ihe ga-eme n’ọdịnihu dị ka a ga-asị na o meelarị, si otú a na-emesi ike ojiji e ji mmezu nke otu amụma n’aka.—Tụlee Mkpughe 11:15.
17. N’ihi gịnị ka nkọwa amụma ahụ banyere ntọgbọrọ n’efu na-ekwesịghị iji bụụrụ ndị Juda ihe ijuanya?
17 Ka o sina dị, nkọwa ahụ ọ kọwara ntọgbọrọ n’efu nke Juda n’ụzọ amụma ekwesịghị ịbụrụ ndị a dị isi ike ma na-enupụ isi ihe ijuanya. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Jehova dọrọ ha aka ná ntị banyere ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha enupụ isi. O kwuru, sị: “Mụ onwe m ga-emekwa ala unu ka ọ tọgbọrọ n’efu: ibobo ya ga-anwụkwa ndị iro unu n’ahụ, bụ́ ndị bi n’ime ya. Unu ka M ga-efesakwa n’etiti mba nile, M ga-amịpụkwa mma agha chụọ unu n’azụ: ala unu ga-abụkwa ebe tọgbọrọ n’efu, obodo unu nile ga-abụkwa mkpọmkpọ ebe.”—Levitikọs 26:32, 33; 1 Ndị Eze 9:6-8.
18-20. Olee mgbe e mezuru ihe e kwuru n’Aịsaịa 1:7, 8, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si ‘mee ka mmadụ ole na ole fọdụ’ n’oge a?
18 O yiri ka e mezuru ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 1:7, 8 n’oge ndị Asiria mere mwakpo ndị kpatara mbibi nke Israel na oké mbibi na ịta ahụhụ na Juda. (2 Ndị Eze 17:5, 18; 18:11, 13; 2 Ihe E Mere 29:8, 9) Otú ọ dị, e kpochapụghị Juda kpam kpam. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ada Zaịọn fọdụrụ dị ka ụlọ ntu n’ubi vine, dị ka ụlọ ọnọdụ abalị n’ubi cucumber, dị ka obodo nke ndị iro ya na-eche nche.”—Aịsaịa 1:8.
19 N’agbanyeghị mbibi ahụ nile, a ga-ahapụ “ada Zaịọn,” bụ́ Jerusalem, ka ọ dịrị. Ma ọ ga-eyi ihe a pụrụ imebi ngwa ngwa—dị ka nkịkara ụlọ dị n’ubi vine ma ọ bụ dị ka ụlọ ntu onye nche bụ́ nke dị n’ubi cucumber. Ka ọ na-agbada Osimiri Naịl, e chetaara otu ọkà mmụta nke narị afọ nke 19 ihe Aịsaịa kwuru, mgbe ọ hụrụ ụlọ ntu ndị yiri ha, bụ́ ndị ọ kọwara dị ka “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị ogige a gbara megide ikuku si n’ebe ugwu.” Na Juda, mgbe e wesịrị ihe ubi, a na-ahapụ ụlọ ntu ndị a ka ha dakasịa. Ma, n’agbanyeghị otú Jerusalem pụrụ iyiru ihe na-esighị ike n’anya usuu ndị agha Asiria ahụ na-emeri emeri, ọ ga-alanarị.
20 Aịsaịa mechiri okwu amụma a: “Ọ bụrụ na Jehova nke usuu nile nke ndị agha emeghị mmadụ ole na ole nke fọdụrụ ka ha fọdụrụ anyị, anyị ga-adịworị ka Sọdọm, anyị ga-eyiworị Gọmọra.” (Aịsaịa 1:9)c Jehova ga-emesịa nyere Juda aka iguzo megide ike ndị Asiria. N’adịghị ka Sọdọm na Gọmọra, a gaghị ekpochapụ Juda. Ọ ga-adịgide.
21. Mgbe Babilọn bibisịrị Jerusalem, n’ihi gịnị ka Jehova ji ‘mee ka mmadụ ole na ole fọdụ’?
21 Ihe karịrị 100 afọ ka e mesịrị, e yiri Juda egwu ọzọ. Ndị ahụ amụtabeghị ihe site n’ịdọ aka ná ntị e si n’aka ndị Asiria nye ha. “Ha wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ.” N’ihi ya, “ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.” (2 Ihe E Mere 36:16) Eze Babilọn bụ́ Nebukadneza meriri Juda, nke ugbu a, ọ dịghị ihe fọdụrụnụ “dị ka ụlọ ntu n’ubi vine.” E bibiri ọbụna Jerusalem. (2 Ihe E Mere 36:17-21) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ‘mere ka mmadụ ole na ole fọdụ.’ Ọ bụ ezie na Juda nọrọ afọ 70 n’ala ọzọ, Jehova hụrụ na mba ahụ dịgidere, karịsịakwa eriri Devid, bụ́ nke ga-ewepụta Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa.
22, 23. Na narị afọ mbụ, n’ihi gịnị ka Jehova ji ‘mee ka mmadụ ole na ole fọdụ’?
22 Na narị afọ mbụ, ndị Israel nwere nsogbu ikpeazụ ha dị ka ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ. Mgbe Jisọs kọwara onwe ya dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, mba ahụ jụrụ ya, n’ihi ya kwa, Jehova jụrụ ha. (Matiu 21:43; 23:37-39; Jọn 1:11) Ọ̀ bụ n’ebe a ka Jehova kwụsịrị inwe mba pụrụ iche n’elu ala? Ee e. Pọl onyeozi gosiri na Aịsaịa 1:9 nwere mmezu ọzọ. Ka ọ na-ehota ihe site ná nsụgharị Septuagint, o dere, sị: “Dị ka Aịsaịa buru ụzọ kwuo, Ọ bụrụ na Onyenwe usuu nile nke ndị agha [ahapụghịrị] anyị otu mkpụrụ, Anyị ga-adịworị ka Sọdọm, a ga-emeworị anyị ka anyị yie Gọmọra.”—Ndị Rom 9:29.
23 Na nke ugbu a ndị lanarịrịnụ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere okwukwe na Jisọs Kraịst. Ndị a bụ, nke mbụ, ndị Juu kwere ekwe. Ka e mesịrị ndị Jentaịl kwere ekwe sonyeere ha. Ha nile mejupụtara Israel ọhụrụ, bụ́ “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 2:29) “Mkpụrụ” a lanarịrị mbibi nke usoro ihe ndị Juu na 70 O.A. N’ezie, anyị na “Israel nke Chineke” ka nọ taa. Ọtụtụ nde ndị kwere ekwe sitere ná mba dị iche iche, bụ́ ndị mejupụtara “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” esonyeworo ya ugbu a.—Mkpughe 7:9.
24. Gịnị ka mmadụ nile kwesịrị ịrịba ama ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịlanarị nsogbu kasịnụ ga-abịakwasị ihe a kpọrọ mmadụ?
24 N’isi nso ụwa a ga-eche agha Amagedọn ihu. (Mkpughe 16:14, 16) Ọ bụ ezie na nke a ga-abụ nsogbu karịrị mwakpo nke ndị Asiria ma ọ bụ ndị Babilọn wakporo Juda, nke karịrị ọbụna mbibi ndị Rom bibiri Judia na 70 O.A., a ga-enwe ndị ga-alanarị. (Mkpughe 7:14) Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa na mmadụ nile jiri nlezianya chebara ihe ndị Aịsaịa gwara Juda echiche! Ha rụpụtara nzọpụta nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi laa azụ n’oge ahụ. Ha pụkwara ịrụpụta nzọpụta nye ndị kwere ekwe taa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ebe a, “Israel” na-ezo aka n’alaeze ebo abụọ nke Juda.
b Okwu Aịsaịa na-egosi otú e si agwọ ọrịa n’oge ya. Onye na-eme nnyocha banyere Bible bụ́ E. H. Plumptre na-ekwu, sị: “‘Imechi’ ma ọ bụ ‘ịpị’ ọnyá na-agba abụ bụ usoro a nwalere na mbụ iji wepụsịa abụ na-esi ísì; mgbe ahụ, dị ka ọ dị n’ọnọdụ Hezekaịa (isi nke xxxviii. 21), a na-eji ihe e siri n’ọkụ ‘kechie’ ya, jirizie mmanụ ma ọ bụ ihe otite na-ekpo ekpo, ikekwe dị ka ọ dị na Luk x. 34, mmanụ na mmanya, hichaa ọnyá ahụ.”
c Akwụkwọ bụ́ Commentary on the Old Testament, nke C. F. Keil na F. Delitzsch dere, na-ekwu, sị: “Ihe onye amụma ahụ na-ekwu kwụsịrị n’ebe a. Eziokwu ahụ bụ́ na e kewara ya ụzọ abụọ n’ebe a, bụ nke e gosiri n’ihe odide ahụ site n’oghere a hapụrụ n’agbata amaokwu nke 9 na nke 10. Ụzọ a nke isi mee ka akụkụ buru ibu karị ma ọ bụ nke dị nta karị dị iche, site n’ịhapụ oghere ma ọ bụ site n’ịkwụsị ahịrịokwu ahụ n’ụzọ, emeela ochie karịa iji kpọm a na-etinye n’ụdaume nakwa akara ụda eme ihe, ọ dabekwaara n’omume kasị nọtee aka.”
[Foto dị na peeji nke 20]
N’adịghị ka Sọdọm na Gọmọra, Juda agaghị anọ ruo mgbe ebighị n’enweghị onye bi na ya