Isi nke Iri Abụọ na Asaa
Jehova Agọzie Ofufe Dị Ọcha
1. Isiokwu dịgasị aṅaa ka e mere ka ha pụta ìhè n’isiakwụkwọ ikpeazụ nke Aịsaịa, ajụjụ dịgasịkwa aṅaa ka a zara?
N’ISIAKWỤKWỌ ikpeazụ nke Aịsaịa, e mere ka ụfọdụ n’ime isiokwu bụ́ isi nke akwụkwọ amụma a bịa ná njedebe dị ịrịba ama, a zakwara ọtụtụ ajụjụ dị mkpa. Ụfọdụ n’ime isiokwu e mere ka ha pụta ìhè bụ ịdị elu nke Jehova, asị ọ kpọrọ omume ihu abụọ, mkpebi ya siri ike inye ndị ajọ omume ntaramahụhụ, na ịhụnanya na nchegbu ya maka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọzọkwa, a zara ajụjụ ndị na-esonụ: Olee ihe na-eme ka ezi ofufe dị iche n’ofufe ụgha? Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Jehova ga-enye ndị ihu abụọ nkwụghachi ụgwọ bụ́ ndị na-eme dị ka a ga-asị na ha dị nsọ ka ha nọ na-emegbu ndị Chineke? Oleekwa otú Jehova ga-esi gọzie ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya?
Isi Ihe Dị Mkpa n’Ezi Ofufe
2. Nkwupụta okwu dị aṅaa ka Jehova mere banyere ịdị ebube ya, gịnịkwa ka nkwupụta okwu a na-apụtaghị?
2 Iji malite, amụma ahụ na-emesi ịdị ebube nke Jehova ike: “Otú a ka Jehova sịrị, Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m: aha ụlọ gịnị ka unu ga-ewuru m? ma ọ bụ aha ebe gịnị ga-abụ ebe izu ike m?” (Aịsaịa 66:1) Ụfọdụ ndị kwenyere na onye amụma ahụ na-akụda ndị Juu mmụọ ka ha ghara iwughachi ụlọukwu Jehova mgbe e weghachiri mba ahụ n’ala nna ya. Ọ bụghị otú ahụ; Jehova n’onwe ya ga-enye iwu ka e wughachi ụlọukwu ahụ. (Ezra 1:1-6; Aịsaịa 60:13; Hagaị 1:7, 8) Gịnịzi ka akụkụ ihe odide a pụtara?
3. Gịnị mere o ji daba adaba na a kọwara ụwa dị ka “ihe mgbakwasị ụkwụ” Jehova?
3 Nke mbụ, anyị nwere ike ịdị na-eche ihe mere e ji kọwaa ụwa dị ka “ihe mgbakwasị ụkwụ” Jehova. Nke a abụghị okwu mkparị. N’ime ọtụtụ ijeri ihe ndị dị na mbara igwe, ọ bụ nanị ụwa ka e nyere aha a pụrụ iche. Ruo mgbe ebighị ebi mbara ala anyị ga-apụ iche, n’ihi na ọ bụ n’ebe a ka Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya kwụrụ ihe mgbapụta ahụ, ọ bụkwa n’ebe a ka Jehova ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta site n’Alaeze Mesaịa ahụ. Lee ka o si daba adaba na a kpọrọ ụwa ihe mgbakwasị ụkwụ Jehova! Eze pụrụ iji ihe mgbakwasị ụkwụ dị otú ahụ rịgoro n’ocheeze ya dị elu, jirizie ya mere ihe mgbakwasị ụkwụ.
4. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji kwe mee ụlọ ọ bụla dị n’ụwa ịbụ ebe izu ike Jehova Chineke? (b) Gịnị ka nkebi ahịrịokwu bụ́ “ihe nile ndị a,” pụtara, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ikwubi banyere ofufe Jehova?
4 N’ezie, eze agaghị ebi n’elu ihe mgbakwasị ụkwụ ya, Jehova agaghịkwa ebi n’elu ụwa a. Leenụ, ọbụna eluigwe nkịtị sara mbara agaghị aba ya! Ma ya fọdụzie ụlọ nkịtị dị n’ụwa ịba Jehova ka o wee bụrụ ụlọ obibi ya n’ụzọ nkịtị. (1 Ndị Eze 8:27) Ocheeze Jehova na ebe izu ike ya dị n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, nke bụ́ echiche dị n’okwu bụ́ “eluigwe” dị ka e si jiri ya mee ihe n’Aịsaịa 66:1. Amaokwu na-esonụ na-eme ka nke ahụ doo anya nke ọma: “Ihe nile ndị a ka aka m meworo, ihe ndị a nile ewee dị, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” (Aịsaịa 66:2a) Were anya nke uche lee Jehova ka ọ na-atụ aka ‘n’ihe nile ndị a’—ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa. (Aịsaịa 40:26; Mkpughe 10:6) Dị ka Onye Okike Ukwu nke eluigwe na ala, o kwesịrị inwe ihe karịrị nanị ụlọ nkịtị a raara nye ya. O kwesịrị ka e nye ya ihe karịrị nanị ụdị ofufe mmezu iwu.
5. Olee otú anyị si egosi na ‘e wedara anyị ala tigbuokwa mmụọ anyị etigbu’?
5 Ụdị ofufe dị aṅaa kwesịrị Eze Eluigwe na Ala? Ya onwe na-agwa anyị, sị: “Onye a ka M ga-elegide, ọbụna onye e wedara n’ala nke e tigbukwara mmụọ ya etigbu, onye na-amakwa jijiji n’okwu m.” (Aịsaịa 66:2b) Ee, ezi ọnọdụ obi nke onye na-efe ofufe dị oké mkpa n’ofufe dị ọcha. (Mkpughe 4:11) Onye na-efe Jehova aghaghị ịbụ onye “e wedara n’ala nke e tigbukwara mmụọ ya etigbu.” Nke a ọ̀ pụtara na Jehova chọrọ ka anyị ghara ịdị na-enwe obi ụtọ? Ee e, ọ bụ “Chineke onye obi ụtọ,” ọ chọkwara ka ndị na-efe ya ofufe na-aṅụrịkwa ọṅụ. (1 Timoti 1:11, NW; Ndị Filipaị 4:4) Otú ọ dị, anyị nile na-emehie ọtụtụ ugboro, anyị ekwesịghịkwa ile mmehie anyị anya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ. Anyị kwesịrị ịbụ ndị ha ‘na-eweda ala,’ ndị ọ na-ewute na anyị adịghị eru ụkpụrụ ezi omume Jehova. (Abụ Ọma 51:17) Ọ dị mkpa ka anyị gosipụta na “e tigbukwara mmụọ [anyị] etigbu” site n’ichegharị, ịlụso omume ime mmehie anyị ọgụ, na ikpegara Jehova ekpere maka mgbaghara.—Luk 11:4; 1 Jọn 1:8-10.
6. N’echiche dị aṅaa ka ezi ndị na-efe ofufe kwesịrị ịdị ‘na-ama jijiji n’okwu Chineke’?
6 Ọzọkwa, Jehova na-achọ ndị ‘na-ama jijiji n’okwu ya.’ Nke a ọ̀ pụtara na ọ chọrọ ka anyị na-ama jijiji n’ihi ụjọ mgbe ọ bụla anyị na-agụ ihe ndị o kwuru? Ee e, kama nke ahụ, ọ chọrọ ka anyị nwee egwu nsọpụrụ maka ihe o kwuru. Anyị ji obi eziokwu na-achọ ndụmọdụ ya, jiri ya na-eduzi ihe nile anyị na-eme ná ndụ. (Abụ Ọma 119:105) Anyị pụkwara ‘ịma jijiji’ n’echiche bụ́ na anyị na-atụ ụjọ inupụrụ Chineke isi, iji ọdịnala ụmụ mmadụ metọọ eziokwu ya, ma ọ bụ ejighị ya kpọrọ ihe. Àgwà ịdị umeala n’obi dị otú ahụ dị oké mkpa n’ofufe dị ọcha—ma, n’ụzọ dị mwute ọ dị ụkọ n’ụwa nke taa.
Jehova Kpọrọ Ofufe Ihu Abụọ Asị
7, 8. Olee otú Jehova si ele ofufe mmezu iwu nke ndị okpukpe nwere omume ihu abụọ na-efe ya anya?
7 Ka Aịsaịa nọ na-atụgharị uche n’ebe ndị ya na ha dịkọrọ ndụ nọ, ọ maara nke ọma na ọ bụ mmadụ ole na ole nwere ụdị àgwà Jehova chọrọ n’aka ndị na-efe ya ofufe. N’ihi nke a, Jerusalem nke si n’ezi ofufe dapụ kwesịrị inweta ikpe ahụ ga-abịakwasị ya. Rịba ama otú Jehova si were ofufe a na-efe n’ime ya: “Onye na-egbu ehi dị ka onye na-etigbu mmadụ; onye ji nwa atụrụ achụ dị ka onye na-agbaji olu nkịta; onye na-esure àjà nsure ọkụ, bụ́ onyinye ịnata ihu ọma, dị ka onye na-esure ọbara ezì; onye na-esure frankincense ka ọ bụrụ ihe ncheta dị ka onye na-agọzi ajọ ihe: ee, ndị ahụ ahọpụtawo ụzọ nile nke aka ha, ọ bụkwa ihe arụ nile ha na-atọ mkpụrụ obi ha ụtọ.”—Aịsaịa 66:3.
8 Okwu ndị a na-echetara anyị ihe Jehova kwuru bụ́ ndị e dekọrọ n’isi mbụ nke Aịsaịa. N’ebe ahụ, Jehova gwara ndị ya na-enupụ isi na ọ bụghị nanị na ofufe mmezu iwu ha adịghị atọ ya ụtọ kamakwa na o mere n’ezie ka iwe ezi omume ya dịkwuo ọkụ n’ihi na ndị ahụ na-efe ya ofufe dị ihu abụọ. (Aịsaịa 1:11-17) N’otu aka ahụ, Jehova jizi onyinye ha tụnyere mpụ ndị jọgburu onwe ha. Ha ịchụ oké ehi nke furu oké ego n’àjà agaghị eme ka obi Jehova jụrụ dịkwa ka ha igbu mmadụ na-agaghị eme ka obi ya jụrụ! E ji àjà ndị ọzọ tụnyere ịchụ nkịta ma ọ bụ ezì n’àjà, bụ́ anụmanụ ndị na-adịghị ọcha n’Iwu Mosis, ndị na-ekwesịghịkwa ekwesị n’ezie iji chụọ àjà. (Levitikọs 11:7, 27) Jehova ọ̀ ga-agbachi nkịtị n’omume ihu abụọ okpukpe dị otú ahụ ghara inye ntaramahụhụ maka ya?
9. Olee otú ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Juu siworo meghachi omume n’ihe ncheta si n’aka Jehova bịa site n’ọnụ Aịsaịa, oleekwa ihe na-aghaghị isi na ya pụta?
9 Ugbu a Jehova na-ekwu, sị: “Mụ onwe m ga-ahọpụtakwa ịchị ọchị nile ha, meekwa ka ihe ụjọ nile ha bịakwasị ha; n’ihi na M kpọrọ òkù, ma ọ dịghị onye na-aza; ekwuru m okwu, ma ha anụghị: ha wee mee ihe jọrọ njọ n’anya m, ọ bụkwa ihe ahụ nke na-atọghị m ụtọ ka ha họpụtara.” (Aịsaịa 66:4) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Aịsaịa nwere ike iji nkwenye sitere n’obi kwuo ihe ndị a. Ruo ọtụtụ afọ ọ nọwo na-abụ ngwá ọrụ Jehova, ‘na-akpọ òkù,’ ‘na-ekwukwa okwu’ gwa ndị Ya. Onye amụma ahụ maara nke ọma na, n’ozuzu ha, ọ dịghị onye na-ege ntị. N’ihi na ha anọgidewo na-eme ihe ọjọọ, ha aghaghị inweta nkwụghachi ụgwọ ya. N’ezie Jehova ga-ahọrọ ntaramahụhụ ọ ga-enye ha ma mee ka ihe ndị na-emenye ụjọ bịakwasị ndị ya si n’ezi ofufe dapụ.
10. Gịnị ka mmeso Jehova mesoro Juda na-agwa anyị banyere otú o si ele Krisendọm anya?
10 N’otu aka ahụ, Krisendọm nke oge a emewokwa ihe ndị Jehova na-enweghị mmasị na ha. Ikpere arụsị jupụtara na chọọchị ya dị iche iche, a na-anọ n’elu ikpo okwu ya na-ebuli nkà ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị elu, ọchịchọ ọ na-achọkwa ike ọchịchị emewo ka ọ na-emikpukwu onwe ya ná mmekọrịta ịkwa iko ime mmụọ nke ya na mba dị iche iche nke ụwa. (Mak 7:13; Mkpughe 18:4, 5, 9) Dị ka ọ dị banyere Jerusalem oge ochie, nkwụghachi ụgwọ kwesịrị ekwesị nke Krisendọm—“ihe ụjọ”—na-abịakwasị ya n’ụzọ a na-apụghị igbochi egbochi. Otu n’ime ihe ndị mere a na-aghaghị iji nye ya ntaramahụhụ bụ ụzọ o siworo mesoo ndị Chineke.
11. (a) Gịnị na-eme ka mmehie nke ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ n’oge Aịsaịa dịkwuo njọ? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ na-achụpụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ‘n’ihi aha Chineke’?
11 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Nụrụnụ okwu Jehova, unu ndị na-ama jijiji n’okwu Ya: Ụmụnne unu ndị na-akpọ unu asị, ndị na-achụpụ unu n’ihi aha m, asịwo, Ka a sọpụrụ Jehova, ka anyị wee lekwasị ọṅụ unu anya: ma ihere ga-eme ndị ahụ.” (Aịsaịa 66:5) “Ụmụnne” Aịsaịa, ụmụ amaala ibe ya, nwere ibu ọrụ Chineke nyere ha nke ịnọchite anya Jehova Chineke na ido onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ya. Mmehie ha nke emeghị otú ahụ dị oké njọ n’ezie. Ma ihe so mee ka mmehie ha dịkwuo njọ bụ na ha kpọrọ ndị ikom kwesịrị ntụkwasị ma dị umeala n’obi, dị ka Aịsaịa, asị. Ndị a si n’ezi ofufe dapụ kpọrọ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi asị ma na-achụpụ ha n’ihi na ndị a na-anọchite anya Jehova Chineke n’eziokwu. N’echiche dị otú ahụ, a na-achụpụ ha ‘n’ihi aha Chineke.’ N’otu oge ahụkwa, ndị ohu Jehova ndị a bụ́ ndị nwere omume ihu abụọ na-ekwu na ha na-anọchite ya, na-ekwu okwu okpukpe ndị dị ka “Ka a sọpụrụ Jehova,” iji gosi na ha ji okpukpe kpọrọ ihe.a
12. Gịnị bụ ihe atụ ụfọdụ nke ịkpagbu ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi site n’aka ndị ihu abụọ bụ́ ndị okpukpe?
12 Asị okpukpe ụgha kpọrọ ndị na-arapagidesi ike n’ofufe dị ọcha abụghị ihe ọhụrụ. Ọ bụkwu mmezu nke Jenesis 3:15, bụ́ nke buru amụma banyere iro ga-adịte aka n’etiti mkpụrụ Setan na Mkpụrụ nke nwanyị Chineke. Jisọs gwara ụmụazụ ya e tere mmanụ na narị afọ mbụ na ha onwe ha kwa ga-ata ahụhu site n’aka ụmụ amaala ibe ha—nchụpụ n’ụlọ nzukọ na mkpagbu ọbụna ruo n’ọnụ ọnwụ. (Jọn 16:2) Gịnịkwa banyere oge a? Ná mmalite nke “mgbe ikpeazụ,” ndị Chineke hụrụ na mkpagbu yiri ya dị n’ihu. (2 Timoti 3:1) Laa azụ na 1914, Ụlọ Nche hotara ihe e kwuru n’Aịsaịa 66:5, na-ekwu, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mkpagbu nile bịakwasịworo ndị Chineke abịawo site n’aka ndị na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst.” Isiokwu ahụ kwukwara, sị: “Anyị amaghị ma hà ga-emeru ya n’isi n’oge a—igbu anyị n’ụzọ mmekọrịta ọha na eze, igbu nzukọ anyị, ikekwe igbu anyị n’anụ ahụ.” Lee ka okwu ndị ahụ si mesịa bụrụ eziokwu! Oge na-adịghị anya ka e bipụtasịrị ya, mkpagbu nke ndị ụkọchukwu kpasuru ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’oge Agha Ụwa Mbụ. Ma e menyere Krisendọm ihere, dị ka e buru n’amụma. N’ụzọ dị aṅaa?
Mweghachi Dị Ngwa, nke Bịakwara na Mberede
13. Ná mmezu ya mbụ, gịnị bụ “olu mkpọtụ na-esite n’obodo”?
13 Aịsaịa buru amụma, sị: “Gee ntị, olu mkpọtụ na-esite n’obodo, olu na-esite n’ụlọukwu Chineke, bụ́ olu Jehova Onye na-akwụghachi ndị iro Ya mmeso ha.” (Aịsaịa 66:6) Ná mmezu mbụ nke okwu ndị a, ‘obodo’ ahụ bụ Jerusalem, bụ́ ebe ụlọukwu Jehova dị. “Olu mkpọtụ” na-egosi mkpu agha, bụ́ nke a nụrụ n’obodo ahụ mgbe usuu ndị agha Babilọn na-eme mwakpo wakporo ya na 607 T.O.A. Otú ọ dị, gịnị banyere mmezu nke oge a?
14. (a) Gịnị ka Malakaị buru n’amụma banyere Jehova ịbịa n’ụlọukwu Ya? (b) Dị ka amụma Ezikiel si kwuo, gịnị mere mgbe Jehova bịara n’ụlọukwu ya? (ch) Olee mgbe Jehova na Jisọs nyochara ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, oleekwa otú o si metụta ndị na-ekwu na ha na-anọchite anya ofufe dị ọcha?
14 Ihe ndị a e kwuru n’Aịsaịa kwekọrọ n’okwu amụma abụọ ọzọ, otu nke e dekọrọ n’Ezikiel 43:4, 6-9, na nke ọzọ e dekọrọ na Malakaị 3:1-5. Ma Ezikiel ma Malakaị buru amụma banyere oge mgbe Jehova Chineke ga-abịa n’ụlọukwu ya. Amụma Malakaị na-egosi na Jehova ga-abịa inyocha ụlọ ofufe ya na ịrụ ọrụ dị ka Onye Nnụcha ọla, na-ajụ ndị na-adịghị anọchite anya ya nke ọma. Ọhụụ Ezikiel na-akọwa Jehova dị ka onye bara n’ụlọukwu ahụ ma nye iwu ka e wepụsịa omume rụrụ arụ na ikpere arụsị nile.b Ná mmezu nke amụma ndị a n’oge a, e nwere ihe dị mkpa mere n’ụzọ ime mmụọ na 1918 n’ihe metụtara ofufe Jehova. Dị ka ihe àmà na-egosi, Jehova na Jisọs nyochara ndị nile na-ekwu na ha na-anọchite anya ofufe dị ọcha. Nnyocha ahụ dugara n’ịgbahapụ Krisendọm rụrụ arụ kpam kpam. Nye ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ, nnyocha ahụ pụtara mkpirikpi oge nke nnụcha, nke mweghachi ime mmụọ dị ngwa sochiri na 1919.—1 Pita 4:17.
15. Ịmụ nwa dị aṅaa ka e buru n’amụma, oleekwa otú e si mezuo nke a na 537 T.O.A.?
15 A kọwara mweghachi a n’ụzọ dabara adaba n’amaokwu ndị na-esonụ nke Aịsaịa: “Tutu ime emee ya, ọ mụrụ nwa; tutu ihe mgbu nke dịịrị ya abịa, ọ mụpụtara nwa nwoke. Ònye nụworo ihe dị ka nke a? ònye hụworo ihe dị ka ndị a? Ime ala [ọ̀] ga-eme ya n’otu ụbọchị? à ga-amụ mba n’otu mgbe? n’ihi na ime mere Zaịọn, ọ mụkwara ụmụ ya.” (Aịsaịa 66:7, 8) Okwu ndị a nwere mmezu mbụ ya na-akpali akpali nye ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri na Babilọn. A kọwara Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem, ọzọ, dị ka nwanyị na-amụ nwa, ma lee ụdị ịmụ nwa pụrụ iche ọ bụ! O mere nnọọ ngwa ngwa nakwa na mberede, nke na o mere tupu ihe mgbu ịmụ nwa amalite! Nke a bụ nkọwa dabara nnọọ adaba. Mmụghachi nke ndị Chineke dị ka mba dị nnọọ iche na 537 T.O.A. mere nnọọ ngwa ngwa nakwa na mberede nke na o yiri ka ọ bụ ọrụ ebube. Leenụ, o were nanị ọnwa ole na ole malite n’oge Saịrọs tọhapụrụ ndị Juu ná ndọrọ n’agha ruo mgbe ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi laghachiri n’ala nna ha! Lee ka o si dị iche n’ihe omume ndị dugara n’ọmụmụ mbụ nke mba Israel! Na 537 T.O.A., ọ dịghị mkpa ịrịọwa eze na-ekweghị ekwe arịrịọ maka nnwere onwe, ọ dịghị mkpa ịgbapụ site n’aka usuu ndị agha nwere obi ọjọọ, ọ dịghị mkpa ịnọ n’ọzara ruo afọ 40.
16. Ná mmezu nke oge a nke Aịsaịa 66:7, 8, gịnị ka Zaịọn na-ese onyinyo ya, oleekwa otú e siworo mụghachi ụmụ ya?
16 Ná mmezu ya nke oge a, Zaịọn na-anọchite anya “nwanyị” eluigwe nke Jehova, bụ́ nzukọ eluigwe ya nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara. Na 1919 “nwanyị” a ṅụrịrị ọṅụ ịhụ ka a mụrụ ụmụ ya e tere mmanụ n’elu ala dị ka ndị a haziri ahazi, otu “mba.” Mmụghachi ahụ weere ọnọdụ ngwa ngwa nakwa na mberede.c Nanị n’ime ọnwa ole na ole, ndị ahụ e tere mmanụ dị ka otu ìgwè si n’ọnọdụ arụghị ọrụ nke yiri ọnwụ gaa na nke ịrụsị ọrụ ike ‘n’ala’ ha, bụ́ ógbè ịrụ ọrụ ime mmụọ nke Chineke nyere ha. (Mkpughe 11:8-12) Ka ọ na-erule n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1919, ha mara ọkwa ọbụna banyere mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ ga na-akwado Ụlọ Nche. Akwụkwọ ọhụrụ ahụ, nke a kpọrọ The Golden Age (bụ́ Teta! ugbu a), bụ ihe àmà na-egosi na e nyere ndị Chineke ume ọhụrụ, haziekwa ha ọzọ maka ije ozi.
17. Olee otú Jehova si mesie ndị ya obi ike na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi ya imezu nzube ya banyere Israel ime mmụọ?
17 Ọ dịghị ike dị n’eluigwe na ala nke pụrụ igbochi mmụghachi ime mmụọ a. Amaokwu na-esonụ kwupụtara nke a n’ụzọ doro anya, sị: “Mụ onwe m [m̀] ga-eme ka nwa ruo ọmụmụ, ghara ime ka a mụọ ya? ka Jehova sịrị: ma ọ bụ Mụ onwe m nke na-eme ka a mụọ, M̀ ga-emechi akpa nwa? ka Chineke gị sịrị.” (Aịsaịa 66:9) Dị nnọọ ka usoro ịmụ nwa bụ ihe a na-apụghị izere ezere ozugbo ọ malitere, otú a ka mmụghachi nke Israel ime mmụọ dị ozugbo ọ malitere. N’eziokwu, e nwere mmegide, a ga-enwekwa mmegide ka ukwuu n’ọdịnihu ma eleghị anya. Ma ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịkwụsị ihe ọ malitere, ọ dịghịkwa eme ya! Otú ọ dị, olee otú Jehova si emeso ndị ya o nyere ume ọhụrụ?
Nlekọta Ịhụnanya nke Jehova
18, 19. (a) Ihe atụ dị aṅaa na-emetụ n’ahụ ka Jehova ji mee ihe, oleekwa otú o si emetụta ndị ya e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ? (b) Olee otú ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ taa siworo rite uru n’iji ịhụnanya na-enye ihe oriri na nlekọta?
18 Amaokwu anọ na-esonụ nyere nkọwa na-emetụ n’ahụ banyere nlekọta ịhụnanya nke Jehova. Nke mbụ, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Soronụ Jerusalem ṅụrịa, tegharịakwanụ egwú ọṅụ n’ihi ya, unu ndị nile na-ahụ ya n’anya: ka obi tọọ unu ụtọ n’ebe ọ nọ site n’obi ụtọ, unu ndị nile na-eru újú banyere ya: ka unu wee ṅụjuo ara nkasi obi ya nile afọ; ka unu wee mịpụta ara, njubiga ókè nke nsọpụrụ ya ewee tọọ unu ụtọ.” (Aịsaịa 66:10, 11) Jehova ji ihe atụ nke nwanyị na-enye nwa ọhụrụ ya ara mee ihe n’ebe a. Mgbe agụụ malitere ịgụ nwa ọhụrụ, ọ na-anọgide na-ebe ákwá. Ma mgbe e kutere ya nso n’ebe ara nne ya dị ka ọ ṅụọ, iru újú ya na-aghọ afọ ojuju obi ụtọ. N’otu aka ahụ, a ga-eme ka ihe fọdụrụ ná ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi nọ na Babilọn si n’ọnọdụ iru újú gaa ngwa ngwa na nke obi ụtọ na inwe afọ ojuju mgbe oge ntọhapụ na mweghachi ruru. Ha ga-aṅụrị ọṅụ. A ga-eweghachi ebube Jerusalem ebe a ga-ewughachi ma birighachi n’ime ya. N’aka nke ọzọ, ebube obodo ahụ ga-agụnye ndị kwesịrị ntụkwasị obi bi n’ime ya. Ọzọkwa, a ga-esite n’aka ndị nchụàjà na-arụsi ọrụ ike nye ha nri n’ụzọ ime mmụọ.—Ezikiel 44:15, 23.
19 E jikwa nri bara ụba gọzie Israel ime mmụọ mgbe e weghachisịrị ya na 1919. Kemgbe ahụ nri ime mmụọ nke na-esite n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” anọgidewo na-eru n’akwụsịghị akwụsị. (Matiu 24:45-47) N’ezie ugbu a bụ oge ngụgụ obi na ọṅụ nye ihe fọdụrụ e tere mmanụ. Ma e nwewo ngọzi ndị ọzọ.
20. Olee otú e siworo jiri “iyi nke na-erubiga ókè” gọzie Jerusalem, ma n’oge ochie ma n’oge a?
20 Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, Lee, M na-esetịru ya udo dị ka osimiri, na nsọpụrụ nke mba dị iche iche dị ka iyi nke na-erubiga ókè, unu ga-amịpụta n’ime ha; n’akụkụ ka a ga-ekuru unu, ọ bụkwa n’ikpere ka a ga-atụgharị unu.” (Aịsaịa 66:12) N’ebe a e jikọtara nkọwa nke inye nlekọta nakwa nkọwa nke ngọzi bara ụba ndị na-erunụ—“osimiri” na “iyi nke na-erubiga ókè.” A ga-eji ọ bụghị nanị udo bara ụba sitere n’aka Jehova gọzie Jerusalem kamakwa “nsọpụrụ nke mba dị iche iche,” bụ́ nke na-erugara ma na-agọzi ndị Chineke. Nke a pụtara na ndị nke mba dị iche iche ga-enute n’ebe ndị Jehova nọ. (Hagaị 2:7) Ná mmezu ya nke oge ochie, ọtụtụ mmadụ ndị si ná mba dị iche iche rapaara n’ezie n’ebe Israel nọ, ghọọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu. Otú ọ dị, mmezu ka nnọọ ukwuu ewerewo ọnọdụ n’oge anyị mgbe “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta”—n’eziokwu, iyi na-erubiga ókè nke ụmụ mmadụ—raparawooro n’ahụ ihe fọdụrụ ná ndị Juu ime mmụọ.—Mkpughe 7:9; Zekaraịa 8:23.
21. N’iji okwu ndị na-adọrọ mmasị eme ihe, ụdị nkasi obi dị aṅaa ka e buru amụma ya?
21 Aịsaịa 66:12 kwukwara banyere ngosipụta nke ịhụnanya nne—ịtụgharị nwatakịrị n’ikpere na ikuru ya n’akụkụ. N’amaokwu na-esonụ, e kwupụtara echiche yiri ya ma n’ụzọ na-adọrọ mmasị a gbanwere ụzọ e si lee ya anya. “Dị ka [nwoke, NW] nke nne ya na-akasi obi, otú a ka Mụ onwe m ga-akasi unu obi; ọ bụkwa n’ime Jerusalem ka a ga-akasi unu obi.” (Aịsaịa 66:13) Nwatakịrị ahụ bụ “nwoke” ugbu a, onye toruworo ogo mmadụ. Ma nne ya ka nwere ọchịchọ ịkasi ya obi n’oge ihe isi ike.
22. Olee otú Jehova si gosi ịdị nro na ịdị ike nke ịhụnanya ya?
22 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Jehova nyere ihe atụ na-egosi ịdị ike na ịdị nro nke ịhụnanya ya n’ebe ndị ya nọ. Ọbụna ịhụnanya kasị sie ike nke nne bụ ngosipụta dị ntakịrị nke ịhụnanya miri emi Jehova nwere n’ebe ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ. (Aịsaịa 49:15) Lee ka o si dị oké mkpa na ndị Kraịst nile na-egosipụta àgwà a nke Nna ha bi n’eluigwe! Pọl onyeozi gosipụtara ya, wee si otú a setịpụrụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst ezi ihe nlereanya. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7) Jisọs kwuru na ịhụnanya ụmụnna bụ isi ihe a ga-eji mata ụmụazụ ya.—Jọn 13:34, 35.
23. Kọwaa ọnọdụ obi ụtọ nke ndị Jehova e weghachiri eweghachi.
23 Jehova na-egosipụta ịhụnanya ya site n’ọrụ. Ya mere, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Unu ga-ahụkwa ya, o wee tọọ obi unu ụtọ, ọkpụkpụ nile unu ga-ejupụta ná ndụ dị ka ahịhịa ndụ: a ga-amata aka Jehova n’ebe ndị ohu Ya nọ, Ọ ga-ewesakwa ndị iro Ya iwe.” (Aịsaịa 66:14) Otu ọkà n’ụtọ asụsụ Hibru na-ekwu na okwu bụ́ “unu ga-ahụkwa ya” na-egosi na n’ebe ọ bụla ndị Juu ahụ na-alọta alọta lere anya n’ala ha e weghachiri eweghachi, “ha ga-ahụ ọṅụ ugbu a.” N’ezie ha ga-etegharị egwú ọṅụ, nwee obi ụtọ a na-apụghị iji ọnụ kọwaa na e weghachiwo ha n’ala nna ha ha hụrụ n’anya. Ha ga-enwe ume ọhụrụ, dị ka a ga-asị na ọkpụkpụ ha na-esighachi ike, nwee ume ọhụrụ dị ka ahịhịa n’oge opupu ihe ubi. Mmadụ nile ga-ama na ọnọdụ a na-enye obi ụtọ esiteghị ná mgbalị ọ bụla nke mmadụ, kama o sitere ‘n’aka Jehova.’
24. (a) Gịnị ka ị na-ekwubi mgbe ị na-atụle ihe omume ndị metụtara ndị Jehova taa? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike?
24 Ị̀ na-ahụ aka Jehova nọ n’ọrụ n’etiti ndị ya taa? Ọ dịghị mmadụ pụrụ imeworị ka e weghachi ofufe dị ọcha. Ọ dịghị mmadụ a pụrụ ichetụ n’echiche nke pụrụ ime ka ọtụtụ nde ndị a na-achọsi ike sitere ná mba nile sonyere ihe ahụ fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ala ime mmụọ ha. Nanị Jehova Chineke pụrụ ime ụdị ihe ndị ahụ. Ngosipụta ndị a nke ịhụnanya Jehova bụ ihe ndị mere anyị ga-eji nwee ọṅụ miri emi. Ka ọ ghara ịdị mgbe anyị na-agaghị eji ịhụnanya ya kpọrọ ihe. Ka anyị nọgide ‘na-ama jijiji n’okwu ya.’ Ka anyị kpebisie ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible na inweta obi ụtọ n’ijere Jehova ozi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Taa ọtụtụ ndị n’ime Krisendọm na-ajụ iji aha aka nke Jehova eme ihe, ọbụna wepụ ya n’ọtụtụ nsụgharị Bible. Ụfọdụ na-achị ndị Chineke ọchị maka iji aha aka ya na-eme ihe. Ma, ọtụtụ n’ime ndị a na-eji okwu bụ́ “Halelujaa,” nke pụtara “Toonụ Jaa” eme ihe n’ụzọ igosi na ha ji okpukpe kpọrọ ihe.
b Okwu bụ́ “ozu nile nke ndị eze ha,” nke e ji mee ihe n’Ezikiel 43:7, 9, na-ezo aka n’arụsị. Ndị ndú Jerusalem na ndị obodo, bụ́ ndị na-enupụ isi, ejiriwo arụsị metọọ ụlọukwu Chineke, n’ihi ya kwa, jiri ha mere eze.
c Ịmụ nwa e buru amụma ya n’ebe a na nke ahụ a kọwara ná Mkpughe 12:1, 2, 5 abụghị otu ihe ahụ. N’isiakwụkwọ ahụ nke Mkpughe, ‘Ọkpara ahụ, bụ́ nwa nwoke’ na-ese onyinyo Alaeze Mesaịa, nke malitere ịrụ ọrụ na 1914. Otú ọ dị, “nwanyị” ahụ e hotara n’amụma abụọ ahụ bụ otu ihe ahụ.
[Foto dị na peeji nke 395]
“Ihe nile ndị a ka aka m meworo”
[Foto dị na peeji nke 402]
Jehova ga-eme ka “nsọpụrụ nke mba dị iche iche” ruoro Zaịọn