Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 28 p. 403-415
  • Ìhè nke Dịịrị Mba Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ìhè nke Dịịrị Mba Nile
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova ‘Abaa n’Ikpe’
  • ‘Ha Ga-ahụ Ebube M’
  • Iwetara ‘Jehova Onyinye’
  • Nchịkọta ahụ Agaa n’Ihu
  • Njedebe Ikpeazụ nke Ndị Iro Chineke
  • Nṅụrị Ọṅụ Nye Ndị Na-aga Ije n’Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Jehova Agọzie Ofufe Dị Ọcha
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ezi Ofufe Agbasaa n’Ụwa Nile
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Nzọpụta Nye Ndị Na-ahọrọ Ìhè Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 28 p. 403-415

Isi nke Iri Abụọ na Asatọ

Ìhè nke Dịịrị Mba Nile

Aịsaịa 66:15-24

1, 2. N’ihi gịnị ka ìhè ji dị mkpa, ụdị ọchịchịrị dịkwa aṅaa na-ekpuchi ụwa taa?

JEHOVA bụ Isi Iyi nke ìhè, “Onye na-enye anyanwụ ka ọ bụrụ ìhè n’ehihie, na ụkpụrụ nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha bụrụ ìhè n’abalị.” (Jeremaịa 31:35) Dabere na nke a nanị, e kwesịrị ịmata ya dị ka Isi Iyi nke ndụ, ebe ọ bụ na ìhè bụ ndụ. A sị na okpomọkụ na ìhè nke sitere n’anyanwụ adịghị achakwasị ụwa mgbe nile, ndụ dị ka anyị si mara ya agaraghị adị. Ụwa anyị ga-abụ ebe a na-apụghị ibi ebi.

2 N’ihi ya, ọ na-akpatara anyị oké nchegbu na Jehova, n’ilepụ anya n’oge anyị, buru amụma banyere oge ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè. Site n’ike mmụọ nsọ, Aịsaịa dere, sị: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 60:2) N’ezie, okwu ndị a na-ezo aka n’ọchịchịrị ime mmụọ, ọ bụghị ọchịchịrị nkịtị, ma e kwesịghị ileda ịdị mkpa ha anya. Ndụ na-emesịa ghọọ ihe na-agaghị ekwe omume nye ndị na-enweghị ìhè ime mmụọ, dị nnọọ ka ọ na-adịrị ndị e gbochiri inweta ìhè anyanwụ.

3. N’oge ndị a dị njọ, olee ebe anyị pụrụ ịga iji nweta ìhè?

3 N’oge ndị a dị njọ, anyị apụghị ileghara ìhè ime mmụọ nke Jehova na-enye anyị anya. Ọ dị oké mkpa na anyị na-elegara Okwu Chineke anya ịmụkwasị ìhè n’okporo ụzọ anyị, ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị ma o kwe mee. (Abụ Ọma 119:105) Nzukọ ndị Kraịst na-enye anyị ohere ịgbarịta ibe anyị ume na ịnọgide ‘n’okporo ụzọ ndị ezi omume.’ (Ilu 4:18; Ndị Hibru 10:23-25) Ume anyị na-enweta site n’iji ịdị uchu na-amụ Bible na mkpakọrịta na-ewuli elu nke ndị Kraịst na-enyere anyị aka izere ịbụ ndị oge ọjọọ nke “mgbe ikpeazụ” a rikpuru, bụ́ nke ga-abịa ná njedebe n’oké ‘ụbọchị nke iwe Jehova.’ (2 Timoti 3:1; Zefanaịa 2:3) Ụbọchị ahụ ji ọsọ na-abịa! Ọ ghaghị ịbịa dịkwa ka ụbọchị yiri ya si bịakwasị ndị bi na Jerusalem oge ochie.

Jehova ‘Abaa n’Ikpe’

4, 5. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si bịakwasị Jerusalem? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwubie na ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dịtụ ntakịrị ga-alanarị mbibi nke Jerusalem na 607 T.O.A.? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

4 N’amaokwu ndị ikpeazụ nke amụma na-akpali akpali nke Aịsaịa, Jehova kọwara n’ụzọ doro anya ihe omume ndị ga-eduga n’ụbọchị iwe ya. Anyị na-agụ, sị: “Jehova ga-eji ọkụ bịa, ụgbọala Ya nile ga-adịkwa ka oké ifufe; iji ọnụma nyeghachi iwe Ya, na iji ire ọkụ nyeghachi ịbasi mba ike Ya. N’ihi na ọkụ ka Jehova ga-eji soro anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, jee ikpe, Ọ ga-ejikwa mma agha Ya: ndị Jehova gbuworo ga-aba ụba.”—Aịsaịa 66:15, 16.

5 Okwu ahụ kwesịrị inyere ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ aka ịmata otú ọnọdụ ha dịruru ná njọ. Oge na-abịa mgbe ndị Babilọn, dị ka ndị Jehova ga-eji mezuo ihe o kpere n’ikpe, ga-abịakwasị Jerusalem, ụgbọ ịnyịnya ha ga na-abọli uzuzu dị ka oké ifufe. Lee ihe na-emenye ụjọ ọ ga-abụ ịhụ ya! Jehova ga-eji ndị mwakpo ahụ mezuo ikpe ya dị ọkụ megide “anụ ahụ nile” na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ ndị Juu. Ọ ga-adị ka Jehova n’onwe ya ọ nọ na-alụrụ ndị ya ọgụ. A gaghị eme ka “ọnụma” ya laghachi azụ. Ọtụtụ ndị Juu ga-anwụ dị ka “ndị Jehova gbuworo.” Na 607 T.O.A., amụma a mezuru.a

6. Omume dịgasị aṅaa na-asọ oyi na-ewere ọnọdụ n’ime Juda?

6 Jehova ò ziri ezi n’isoro ndị ya ‘jee ikpe’? N’ezie o ziri ezi! Ọtụtụ ugboro ka anyị nọ na-atụle akwụkwọ Aịsaịa, anyị ahụwo na ndị Juu, ọ bụ ezie na e weere ya na ha raara onwe ha nye Jehova, abamiwo n’ofufe ụgha—Jehova na-ahụkwa ihe ha na-eme. Anyị na-ahụ nke a ọzọ n’ihe ndị na-esonụ e kwuru n’amụma ahụ: “Ndị na-edo onwe ha nsọ ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha ịba n’ubi nile a gbara ogige, n’azụ otu onye dị n’etiti, ndị na-eri anụ ezì, na ihe arụ ahụ, na òké; n’otu ka ha ga-agwụsị, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” (Aịsaịa 66:17) Ndị Juu ahụ hà ‘na-edo onwe ha nsọ, na-emekwa onwe ha ka ha dị ọcha’ iji dozie onwe ha maka ofufe dị ọcha? Ọ dịghị ma ọlị. Kama nke ahụ, ha na-etinye aka n’ememe ido ọcha nke ndị ọgọ mmụọ n’ubi ndị pụrụ iche. E mesịa, ha na-eji anyaukwu rie anụ ezì na anụ ndị ọzọ e weere ná ndị na-adịghị ọcha n’Iwu Mosis.—Levitikọs 11:7, 21-23.

7. Olee otú Krisendọm si yie Juda na-ekpere arụsị?

7 Lee ọnọdụ na-asọ oyi ọ bụ nye mba nke ya na nanị otu ezi Chineke ahụ nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ! Ma tụlee nke a: Ọnọdụ yiri ya nke na-asọ oyi dịkwa taa n’okpukpe dị iche iche nke Krisendọm. N’otu aka ahụ, ndị a na-ekwu na ha na-ejere Chineke ozi, ọtụtụ n’ime ndị ndú ha na-emekwa ka hà ji okpukpe kpọrọ ihe. Ma, ha ji ozizi na ọdịnala ndị ọgọ mmụọ na-emetọ onwe ha, na-egosi na ha nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ. Lee ka ọchịchịrị ahụ si dị ukwuu!—Matiu 6:23; Jọn 3:19, 20.

‘Ha Ga-ahụ Ebube M’

8. (a) Gịnị ga-adakwasị ma Juda ma Krisendọm? (b) N’echiche dị aṅaa ka mba dị iche iche ‘ga-ahụ ebube Jehova’?

8 Jehova ọ̀ na-ahụ omume na ozizi ndị na-asọ oyi nke Krisendọm? Gụọ ihe ndị na-esonụ Jehova kwuru, dị ka Aịsaịa si dekọọ ha, ma lee ihe ị ga-ekwubi: “Amaara m ọrụ nile ha na echiche nile ha: mgbe na-abịa ijikọta mba nile na asụsụ nile; ha ga-abịakwa, hụ ebube m.” (Aịsaịa 66:18) Jehova maara, ọ dịkwa njikere ikpe ọ bụghị nanị ọrụ kamakwa echiche nke ndị na-ekwu na ha bụ ndị ohu ya ikpe. Juda na-ekwu na ya kwere na Jehova, ma ọrụ ikpere arụsị ya na omume ndị ọgọ mmụọ ya, na-emegide nzọrọ ahụ. N’efu ka ụmụ amaala ya “na-edo onwe ha ọcha” dị ka usoro ndị ọgọ mmụọ si dị. A ga-ebibi mba ahụ, mgbe nke ahụ mekwara, ndị agbata obi ya na-ekpere arụsị ga-ahụzu ya. Ndị a ‘ga-ahụ ebube Jehova’ n’ụdị na ha ga-ahụ ihe omume ndị ahụ, a manyekwa ha ikweta na ihe Jehova kwuru emezuwo. Olee otú ihe a nile si emetụta Krisendọm? Mgbe a ga-ebibi ya, a ga-amanye ọtụtụ n’ime ndị enyi ya mbụ na ndị ya na ha na-azụkọ ahịa iguzoro na-ele nanị n’anya ka ihe Jehova kwuru na-emezu.—Jeremaịa 25:31-33; Mkpughe 17:15-18; 18:9-19.

9. Ozi ọma dị aṅaa ka Jehova na-akpọsa?

9 Mbibi Jerusalem na 607 T.O.A. ọ̀ pụtara na Jehova agakwaghị enwe ndị àmà n’ụwa? Ee e. Ndị a ma ama bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, dị ka Daniel na ndị enyi ya atọ, ga-anọgide na-ejere Jehova ozi ọbụna dị ka ndị e mere ka ha jee biri na Babilọn. (Daniel 1:6, 7) Ee, ogologo usoro nke ndị àmà Jehova kwesịrị ntụkwasi obi ga-adịgide, mgbe afọ 70 ahụ gwụsịkwara, ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi ga-ahapụ Babilọn laghachi Juda iji weghachi ofufe dị ọcha n’ebe ahụ. Nke ahụ bụ ihe Jehova zoziri aka na ya: “M ga-edokwa ihe ịrịba ama n’etiti ha, sikwa n’etiti ha ziga ndị gbapụtara agbapụta ka ha jekwuru mba nile, bụ́ Tashish, na Pul, na Lud, ndị na-adọ ụta, jekwuru Tubal na Jevan, jekwuru àgwàetiti nile dị anya, ndị na-anụghị ihe banyere m, ndị na-ahụghịkwa ebube m: ha ga-egosi ebube m n’etiti mba nile.”—Aịsaịa 66:19.

10. (a) N’echiche dị aṅaa ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi a tọhapụrụ na Babilọn ga-abụ ihe ịrịba ama? (b) Olee ndị taa bụ ihe ịrịba ama?

10 Ìgwè ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị laghachiri Jerusalem na 537 T.O.A. ga-abụ ihe ịrịba ama na-atụ n’anya, ihe àmà nke na-egosi na Jehova agbapụtawo ndị ya. Ònye ga-arọworị nrọ na otu ụbọchị, ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha ga-enwere onwe ha ife ofufe dị ọcha n’ụlọukwu Jehova? N’ụzọ yiri ya, na narị afọ mbụ, ndị bụ́ ‘ihe ịrịba ama na ihe ebube’ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị, ndị dị nwayọọ n’obi chọrọ ijere Jehova ozi, nutere n’ebe ha nọ. (Aịsaịa 8:18; Ndị Hibru 2:13) Taa, ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị na-eme nke ọma n’ala ha e weghachiri eweghachi, bụ ihe ịrịba ama na-atụ n’anya n’ụwa. (Aịsaịa 66:8) Ha bụ ihe àmà dị ndụ nke ike nke mmụọ Jehova, na-adọta ndị dị nwayọọ n’obi, ndị obi ha na-akpali ha ijere Jehova ozi.

11. (a) Mgbe mweghachi ahụ gasịrị, olee otú ndị mba ọzọ ga-esi nụ banyere Jehova? (b) Olee otú Zekaraịa 8:23 si mezuo na mbụ?

11 Otú ọ dị, olee otú ndị mba ọzọ, ndị na-anụbeghị akụkọ banyere Jehova ga-esi bịa mara ya mgbe mweghachi ahụ weere ọnọdụ na 537 T.O.A. gasịrị? Ọ bụghị ndị Juu nile kwesịrị ntụkwasị obi ga-alagachi Jerusalem mgbe ndọrọ n’agha gaa Babilọn bịara ná njedebe. Ụfọdụ ndị, dị ka Daniel, ga-anọgide na Babilọn. Ndị ọzọ ga-agbasasị n’akụkụ anọ nke ụwa. Ka ọ na-erule na narị afọ nke ise T.O.A., e nwere ndị Juu bi n’Alaeze Ukwu Peasia dum. (Esta 1:1; 3:8) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ n’ime ha kọọrọ ndị agbata obi ha bụ́ ndị ọgọ mmụọ banyere Jehova, n’ihi na ọtụtụ ndị sitere ná mba ndị ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu. Dị ka ihe àmà na-egosi, ọ bụ ihe mere n’ihe banyere ọnaozi Etiopia ahụ, bụ́ onye, onye na-eso ụzọ Kraịst bụ́ Filip kwusaara ozi ọma na narị afọ mbụ. (Ọrụ 8:26-40) Ihe a nile weere ọnọdụ dị ka mmezu mbụ nke ihe Zekaraịa onye amụma kwuru, sị: “Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) N’ezie, Jehova zipụrụ ìhè ná mba dị iche iche!—Abụ Ọma 43:3.

Iwetara ‘Jehova Onyinye’

12, 13. N’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi kpọta “ụmụnne” na Jerusalem malite na 537 T.O.A.?

12 Mgbe e wughachisịrị Jerusalem, ndị Juu bụ́ ndị gbasara gaa n’ebe ndị dị anya site n’ala nna ha ga-ewere obodo ahụ na usoro ndị nchụàjà ya e weghachiri eweghachi dị ka ebe bụ́ isi maka ofufe dị ọcha. Ọtụtụ n’ime ha ga-eme ogologo njem iji gaa ememe ndị a na-enwe kwa afọ n’ebe ahụ. N’ike mmụọ nsọ, Aịsaịa dere, sị: “Ha ga-emekwa ụmụnne unu nile ka ha si ná mba nile bịa ịbụ onyinye ịnata ihu ọma e nyere Jehova, n’elu ịnyịnya, na n’ụgbọala, na n’ụgbọala nwere ihe ọkpụkpụ, na n’elu ịnyịnya mule, na n’elu anụ dị ngwa, ruo ugwu nsọ m, bụ́ Jerusalem, ka Jehova sịrị, dị ka ụmụ Israel si ewebata onyinye ịnata ihu ọma ha n’ụlọ Jehova n’ihe dị ọcha. Ọ bụkwa ụfọdụ n’ime ha ka M ga-ewere ịbụ ndị nchụàjà na ịbụ ndị Livaị.”—Aịsaịa 66:20, 21.

13 Ụfọdụ n’ime ‘ụmụnne ahụ si ná mba nile,’ nọ n’ụbọchị Pentikọst mgbe a wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ Jisọs mmụọ nsọ. Ihe ndekọ ahụ na-agụ, sị: “Ndị Juu ụfọdụ bi na Jerusalem, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị si ná mba nile dị n’okpuru eluigwe bịa.” (Ọrụ 2:5) Ha bịara Jerusalem ife ofufe dị ka omenala ndị Juu si dị, ma mgbe ha nụrụ ozi ọma banyere Jisọs Kraịst, ọtụtụ n’ime ha nwere okwukwe na ya, e meekwa ha baptism.

14, 15. (a) Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ si chịkọtakwuo “ụmụnne” ime mmụọ ha mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, oleekwa otú e si wetara Jehova ndị a dị ka ‘onyinye n’ihe dị ọcha’? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si ‘were ụfọdụ ịbụ ndị nchụàjà’? (ch) Olee ndị bụ ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ ndị so chịkọta ụmụnne ime mmụọ ha? (Lee igbe dị na peeji a.)

14 Amụma a ò nwere mmezu nke oge a? N’ezie o nwere. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, ndị ohu Jehova e tere mmanụ ghọtara site n’Akwụkwọ Nsọ na e guzobewo Alaeze Chineke n’eluigwe na 1914. Site n’iji nlezianya mụọ Bible, ha mụtara na a gaje ịchịkọta ndị nketa ndị ọzọ nke Alaeze ahụ, ma ọ bụ “ụmụnne.” Ndị ozi na-adịghị atụ ụjọ gara “n’ebe ụwa sọtụrụ,” jiri ụdị ụzọ dị iche iche e ji eme njem, na-achọgharị ndị gaje iso n’ihe fọdụrụ e tere mmanụ, ndị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha si na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm pụta. Mgbe a chọtara ndị a, e webatara ha dị ka onyinye nye Jehova.—Ọrụ 1:8.

15 Ndị ahụ e tere mmanụ a chịkọtara ná mmalite atụghị anya na Jehova ga-anakwere ha otú ha dị tupu ha amata eziokwu Bible. Ha mere ihe iji sachapụ n’etiti onwe ha mmerụ ime mmụọ nile na nke omume ka e wee nwee ike inye ha dị ka ‘onyinye n’ihe dị ọcha,’ ma ọ bụ dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya, “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, bụ́ nke a na-emerụghị” nye Kraịst. (2 Ndị Kọrint 11:2) Tụkwasị n’ịjụ ozizi ndị na-ezighị ezi, ndị ahụ e tere mmanụ mụtara ụzọ isi nọpụ iche kpam kpam n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. Na 1931, mgbe e meworo ka ndị ohu ya dị ọcha ruo n’ókè kwesịrị ekwesị, Jehova ji obiọma nye ha ihe ùgwù nke ịza aha ya dị ka Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10-12) Otú ọ dị, n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si ‘were ụfọdụ ịbụ ndị nchụàjà’? Dị ka otu ìgwè, ndị a e tere mmanụ ghọrọ ndị so ‘n’òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ,’ na-achụrụ Chineke àjà otuto.—1 Pita 2:9; Aịsaịa 54:1; Ndị Hibru 13:15.

Nchịkọta ahụ Agaa n’Ihu

16, 17. Olee ndị bụ “mkpụrụ unu” mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị?

16 Ọnụ ọgụgụ nke “òtù ndị nchụàjà” ahụ n’ozuzu ya bụ 144,000, ka oge na-agakwa, a chịkọtazuru ha. (Mkpughe 7:1-8; 14:1) Ọrụ nchịkọta ahụ ọ̀ kwụsịrị n’ebe ahụ? Ee e. Amụma Aịsaịa gara n’ihu: “Dị ka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke Mụ onwe m na-eme, ga na-eguzo n’ihu m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), otú a ka mkpụrụ unu na aha unu ga-eguzo.” (Aịsaịa 66:22) Ná mmezu mbụ nke okwu ndị ahụ, ndị Juu, ndị si ná ndọrọ n’agha na Babilọn lọta ga-amalite ịmụ ụmụ. N’ụzọ dị otú a, a ga-eme ka ndị Juu fọdụrụ e weghachiri eweghachi, bụ́ “ụwa ọhụrụ,” n’okpuru ọchịchị ọhụrụ nke ndị Juu, bụ́ “eluigwe ọhụrụ,” guzosie ike. Otú ọ dị, amụma ahụ enwewo mmezu kasị dị ịrịba ama n’oge anyị.

17 “Mkpụrụ” nke mba ụmụnna ime mmụọ ahụ mụpụtara bụ “oké ìgwè mmadụ,” ndị nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ha si “ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” ha na-eguzokwa “n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ.” Ndị a ‘asawo uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.’ (Mkpughe 7:9-14; 22:17) Taa “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-esi n’ọchịchịrị ime mmụọ na-aga n’ìhè nke Jehova na-enye. Ha na-enwe okwukwe na Jisọs Kraịst, dịkwa ka ụmụnne ha ndị ikom na ndị inyom e tere mmanụ, ha na-agbalịsi ike ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ na n’omume. Dị ka otu ìgwè ha anọgidewo na-eje ozi ná nduzi Kraịst, ha ‘ga-eguzokwa’ ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 37:11, 29.

18. (a) Olee otú ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ siworo mee omume dị ka ụmụnne ha e tere mmanụ? (b) Olee otú ndị e tere mmanụ na ndị ibe ha si efe Jehova “site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ”?

18 Ndị ikom na ndị inyom a na-arụsi ọrụ ike ndị nwere olileanya elu ala, maara na ọ bụ ezie na ọ dị oké mkpa ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ na n’omume, ime ihe na-atọ Jehova ụtọ na-agụnye ihe karịrị nke ahụ. Ọrụ nchịkọta ahụ na-aga n’ihu, ha chọkwara ikere òkè na ya. Akwụkwọ Mkpughe buru amụma banyere ha, sị: “Ha nọ n’ihu ocheeze Chineke; ha na-efekwa Ya ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya.” (Mkpughe 7:15) Okwu ndị ahụ na-echetara anyị amaokwu na-esote nke ikpeazụ n’amụma Aịsaịa: “Ọ ga-erukwa, na site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ, anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịa ịkpọ isiala n’ihu m, ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 66:23) Nke a na-eme taa. “Site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ”—ya bụ, oge nile, n’izu nile nke ọnwa ọ bụla—ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ibe ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, na-ezukọta ife Jehova. Ha na-eme nke a, gụnyere ihe ndị ọzọ, site n’ịga nzukọ ndị Kraịst na ikere òkè n’ozi ihu ọha. Ì so ná ndị ‘na-abịa akpọ isiala n’ihu Jehova’ mgbe nile? Ime nke a na-ewetara ndị Jehova ọṅụ dị ukwuu, ndị sokwa n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-atụ anya oge ahụ mgbe “anụ ahụ nile”—ụmụ mmadụ nile dị ndụ—ga-efe Jehova “site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ,” ruo mgbe nile ebighị ebi.

Njedebe Ikpeazụ nke Ndị Iro Chineke

19, 20. Gịnị ka e ji Gehena eme n’oge Bible, gịnịkwa ka ọ bụ ihe atụ ya?

19 Ọ fọdụrụ otu amaokwu n’ọmụmụ anyị na-amụ amụma Aịsaịa. Akwụkwọ ahụ ji okwu ndị a mechie: “Ha ga-apụkwa, lekwasị ozu nile nke ndị na-ejehie ejehie megide m: n’ihi na ikpuru ha agaghị anwụ, ọkụ ha agaghị anyụkwa; ha ga-abụkwara anụ ahụ nile ihe ịsọ oyi.” (Aịsaịa 66:24) Ma eleghị anya Jisọs Kraịst bu amụma a n’uche mgbe ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ime ka ndụ ha dị mfe na ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụkwa na anya gị emee gị ka ị ma n’ọnyà, tụpụ ya: ọ dị gị mma ịba n’alaeze Chineke na-enwe otu anya, karịa inwe anya abụọ a tụba gị [na Gehena, NW]; ebe ikpuru nke na-eri ha na-adịghị anwụ, ọkụ anyụghịkwa anyụ.”—Mak 9:47, 48; Matiu 5:29, 30; 6:33.

20 Olee ebe bụ ebe a a na-akpọ Gehena? Ọtụtụ narị afọ gara aga, ọkà mmụta bụ́ onye Juu bụ́ David Kimhi dere, sị: “Ọ bụ ebe . . . dị n’akụkụ Jerusalem, ọ bụkwa ebe na-asọ oyi, ha na-atụbakwa ihe ndị na-adịghị ọcha na ozu n’ebe ahụ. Ọkụ na-enwukwa n’ebe ahụ oge nile irepịa ihe ndị na-adịghị ọcha na ọkpụkpụ nke ozu ndị ahụ. N’ihi ya, a na-akpọ ikpe ga-abịakwasị ndị ajọ omume Gehinnom n’ụzọ ihe atụ.” Ọ bụrụ na, dị ka ọkà mmụta a bụ́ onye Juu na-ekwu, na e ji Gehena mere ebe mkpofu ahịhịa nakwa ebe a na-atụba ozu nke ndị e weere na ha ekwesịghị ili eli, ọkụ ga-abụ ụzọ dị mma isi rechapụ ihe mkpofu dị otú ahụ. Ihe ọkụ ahụ na-erepịaghị, ikpuru ga-eripịa ya. Lee nkọwa dabara adaba ọ bụ banyere njedebe ikpeazụ nke ndị iro Chineke nile!b

21. Akwụkwọ Aịsaịa mechiri n’ụzọ dị mma nye ole ndị, n’ihi gịnịkwa?

21 Site n’izo aka n’ozu, ọkụ, na ikpuru, ọ́ bụghị eziokwu na amụma na-akpali akpali nke Aịsaịa mechiri n’ụzọ na-emenye ụjọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị iro obi kpọrọ nkụ nke Chineke ga-eche otú ahụ. Ma nye ndị enyi Chineke, otú Aịsaịa si kọwaa mbibi ebighị ebi nke ndị ajọ omume bụ nnọọ ihe na-agba ume. Mmesi obi ike a bụ́ na ndị iro ha agakwaghị emeri ha ọzọ dị ndị Jehova mkpa. A ga-ebibi ndị iro ahụ, bụ́ ndị kpatawooro ndị na-efe Chineke oké nhụsianya, ndị wetawokwaara aha ya oké nkọcha, ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ “mkpagbu agaghị ebili nke ugboro abụọ.”—Nehum 1:9.

22, 23. (a) Kọwaa ụzọ ụfọdụ i siworo rite uru site n’ọmụmụ nke akwụkwọ Aịsaịa. (b) Ebe ị mụworo akwụkwọ Aịsaịa, gịnị bụ mkpebi gị, gịnịkwa ka ị na-atụ anya ya?

22 Ka anyị na-abịa ná njedebe nke ọmụmụ anyị na-amụ akwụkwọ Aịsaịa, anyị na-aghọta na akwụkwọ a nke Bible abụghị nanị akụkọ mgbe ochie. Kama nke ahụ, o nwere ozi maka anyị taa. Mgbe anyị tụgharịrị uche n’oge ọjọọ Aịsaịa biri ndụ na ya, anyị pụrụ ịhụ otú oge ahụ na oge anyị si yie. Ọgba aghara ọchịchị, omume ihu abụọ nke okpukpe, nrụrụ aka n’ikpe, na mmegbu nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi na ndị ogbenye bụ ihe e ji mara oge Aịsaịa, ọ bụkwa ihe e ji mara oge anyị. Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ nke isii T.O.A. aghaghị inweworị ekele maka amụma Aịsaịa, a na-akasikwa anyị obi taa ka anyị na-amụ ya.

23 N’oge ndị a dị oké egwu mgbe ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, mgbe oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche, anyị nile nwere ekele miri emi na Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa, enyewo ihe nile a kpọrọ mmadụ ìhè! Ìhè ime mmụọ ahụ pụtara n’ezie ndụ ebighị ebi nye ndị nile ji obi ha nile nakwere ya, n’agbanyeghị mba ma ọ bụ agbụrụ ha si. (Ọrụ 10:34, 35) Mgbe ahụ, ka anyị nọgide na-eje ije n’ìhè nke Okwu Chineke, na-agụ ya kwa ụbọchị, na-atụgharị uche na ya, jirikwa ozi ya kpọrọ ihe. Nke a ga-ewetara anyị ngọzi ebighị ebi, wetakwara aha Jehova nke dị nsọ otuto!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Banyere otú ọnọdụ dị mgbe ndị Babilọn merisịrị Jerusalem, Jeremaịa 52:15 kwuru banyere “ụfọdụ n’ime ndị Israel na-enweghị ike, na ndị Israel fọdụrụ, bụ́ ndị fọdụrụ n’obodo.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’ikwu okwu banyere nke a, Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peeji nke 415, na-ekwu, sị: “Okwu bụ́ ‘ndị fọdụrụ n’obodo’ yiri ka ọ na-egosi na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nwụrụ n’ihi ụnwụ, ọrịa, ma ọ bụ ọkụ ọgbụgba, ma ọ bụkwanụ na e gburu ha n’agha.”

b Ebe ọ bụ ozu nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụghị ndị dị ndụ, ka a na-agba ọkụ na Gehena, ebe a abụghị ihe atụ nke ntaramahụhụ ebighị ebi.

Igbe dị na peeji nke 409]

Onyinye E Tere Mmanụ Nye Jehova Site ná Mba Nile

Na 1920, Juan Muñiz si United States gawa Spain, mesịzie gawa Argentina, bụ́ ebe o guzobere ọgbakọ dị iche iche nke ndị e tere mmanụ. Malite na 1923 gaa n’ihu, ìhè nke eziokwu mụkwasịrị ndị nwere obi eziokwu n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa mgbe onye ozi ala ọzọ bụ́ William R. Brown (onye a na-akpọkarị Bible Brown) gawara ịga kwusaa ozi Alaeze ahụ n’ebe ndị dị ka Sierra Leone, Ghana, Liberia, The Gambia, na Nigeria. N’otu afọ ahụ, onye Canada bụ́ George Young gawara Brazil, mesịzie gaa Argentina, Costa Rica, Panama, Venezuela, na ọbụna Soviet Union. Ihe dị ka n’otu oge ahụ, Edwin Skinner ji ụgbọ mmiri si England gawa India, bụ́ ebe ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ ruo ọtụtụ afọ n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ.

[Foto dị na peeji nke 411]

Ụfọdụ ndị Juu na Pentikọst bụ ‘ụmụnne e si ná mba nile kpọpụta’

[Foto dị na peeji nke 413]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya